Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịtọrọ Mmadụ—Ihe Iyi Egwu E Ji Achụ Ego

Ịtọrọ Mmadụ—Ihe Iyi Egwu E Ji Achụ Ego

 Ịtọrọ Mmadụ—Ihe Iyi Egwu E Ji Achụ Ego

“ỊTỌRỌ mmadụ adịghị ka ime mpụ metụtara ihe onwunwe. Ọ bụ mmeso aghụghọ, nke obi ọjọọ na nke enweghị ọmịiko megide njikọ bụ́ isi nke ụmụ mmadụ, bụ́ ezinụlọ” ka Mark Bles na-ekwu, n’akwụkwọ ya bụ́ The Kidnap Business. Ịtọrọ mmadụ na-akpatara ndị òtù ezinụlọ mkpaghasị uche. Kwa minit na kwa awa, ha nwetụ olileanya ha enwetụ obi nkoropụ ka mmetụta obi amamikpe, ịkpọasị, na amaghị ihe a ga-eme na-enye ha nsogbu. Ahụmahụ ọjọọ ahụ pụrụ ịdịgide ruo ọtụtụ ụbọchị, izu, ọnwa ma ọ bụ, mgbe ụfọdụ, ọbụna ọtụtụ afọ.

N’oké ọchịchọ ha na-achọ ego, ndị ntọ na-eji mmetụta nke ezinụlọ eme ihe. Otu ìgwè ndị ntọ manyere onye ha tọọrọ ide ihe ndị na-esonụ n’akwụkwọ ozi o degaara ụlọ ọrụ mgbasa ozi: “Agwara m Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi ka ha bipụta ihe a n’ebe nile ma ọ bụrụ na alọghachighị m ka ụta wee dịrị ndị tọọrọ m ma dịkwara ezinụlọ m bụ́ ndị gosiri na ego dị ha mkpa karịa ka m dị ha.” Ndị ntọ nọ n’Itali amanyewo ndị mmadụ iweta ego mgbapụta site n’ibepụta ụfọdụ akụkụ ahụ ma zigara ha ndị ikwu onye ahụ ma ọ bụ ụlọ ọrụ TV. Otu onye ntọ na Mexico ọbụna tara ndị ọ tọọrọ ahụhụ ka o so ezinụlọ ha na-ekwu ọnụ ahịa iji gbapụta ha.

Ndị ntọ ụfọdụ, n’aka nke ọzọ, na-agbalị inweta ihu ọma nke ndị ha tọọrọ. Dị ka ihe atụ, na Philippines e debere otu onye ọchụ ntá ego a tọọrọ ná nnukwu họtel dị na Manila, bụ́ ebe ndị tọọrọ ya nọ nye ya mmanya ma na-akpọtara ya ndị akwụna ruo mgbe a kwụrụ ihe mgbapụta ya. Otú ọ dị, a na-akpọchibido ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-atọrọ n’ajụghị ase banyere mkpa anụ ahụ ma ọ bụ nke ịdị ọcha ha. A na-emekpọ ọtụtụ ọnụ. Otú o sina dị, onye a tọọrọ aghaghị ịnọ n’egwu mgbe nile ka ọ na-eche ihe ga-eme ya.

Ịnagide Mkpasasị Uche Ọ Na-akpata

Ọbụna mgbe a tọhapụsịrị ndị a tọọrọ, ha pụrụ ịnọgide na-enwe mmetụta ọjọọ. Otu nọọsụ bụ́ onye Sweden nke a tọọrọ na Somalia  kwupụtara echiche a: “Otu ihe dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ị ghaghị isoro ndị enyi na ndị ikwu gị kwurịta okwu ma nweta enyemaka onye ọkachamara ma ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa.”

Ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa n’ejighị ọgwụ ewepụtawo usoro iji nyere ndị dị otú ahụ a tọọrọ aka. N’ọtụtụ nnọkọ na-ewe mkpirikpi oge, ndị ahụ a tọọrọ na-akọwa ahụmahụ ha site n’enyemaka nke onye ọkachamara tupu ha ezute ezinụlọ ha ma maliteghachi ibi ndụ otú ha na-ebibu. “Ọgwụgwọ e nyere n’oge na-adịghị anya a tọhapụsịrị mmadụ na-ebelata ihe ize ndụ nke inwe mmerụ ahụ na-adịgide adịgide,” ka Rigmor Gillberg na-ekwu, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ịgwọ ọrịa n’ejighị ọgwụ mgbe e nwere ọdachi bụ́ onye nọ n’òtù Red Cross.

Ihe Ndị Ọzọ Ọ Na-akpata

Ọ bụghị nanị ndị a tọọrọ na ezinụlọ ha ka ịtọrọ mmadụ na-emetụta. Ụjọ ịbụ onye a tọọrọ pụrụ ime ka ime njem nleta kwụsị ma belata atụmatụ achụmnta ego; ọ na-akpatakwa mmetụta nke anọghị ná nchebe nke ọha mmadụ. N’ime ọnwa ole na ole nanị na 1997, ụlọ ọrụ isii nwere ndị ọrụ ná mba ndị ọzọ kwapụrụ na Philippines n’ihi iyi egwu nke ịtọrọ mmadụ. Otu nwanyị bụ́ onye Philippines na-arụrụ òtù a na-akpọ Ụmụ Amaala Na-alụso Mpụ Ọgụ ọrụ kwuru, sị: “Ndụ anyị jupụtara n’ahụmahụ ọjọọ.”

Otu isiokwu pụtara na magazin bụ́ The Arizona Republic na-ekwu, sị: “N’etiti ndị isi ọrụ nọ na Mexico, ụjọ ịbụ ndị a tọọrọ fọrọ nke nta ka ọ gabiga ókè, o nwekwara ezi ihe kpatara ya.” Magazin Brazil bụ́ Veja na-akọ na ndị ntọ na ndị ohi anọchiwo anụ ọjọọ ná nrọ ọjọọ nke ụmụaka ndị Brazil. Na Taiwan, a na-akụzi otú e si ezere ịbụ onye a tọọrọ n’ụlọ akwụkwọ, na United States kwa, a rụnyewo kamera ndị e ji eche nche n’ụlọ akwụkwọ ọta akara dị iche iche iji gbochie ịtọrọ mmadụ.

Ahịa Uru Nye Ndị Ọkà n’Ihe Banyere Iche Nche

Ịrị elu nke ịtọrọ mmadụ na okwu ndị chọrọ nlezianya na-eso ya emewo ka ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka iche ndị mmadụ nche nwee uru  ahịa. N’obodo ukwu Rio de Janeiro dị na Brazil, e nwere ihe karịrị ụdị ụlọ ọrụ 500 dị otú ahụ, na-enweta ijeri $1.8.

Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka iche nche bụ́ ndị nwere ndị ọrụ ná mba ndị ọzọ na-akụzi ụzọ isi gbochie ịbụ onye a tọọrọ, na-ebipụta akụkọ banyere ebe ndị dị ize ndụ, na-ekwukwa okwu ihe mgbapụta. Ha na-enye ezinụlọ na ụlọ ọrụ ndụmọdụ, na-akụziri ha usoro ndị ntọ ji eme ihe ma na-enyere ha aka ịnagide mkpaghasị mmetụta uche ha. Ụfọdụ ụlọ ọrụ na-agbalị ọbụna ijide ndị ntọ ahụ ma nataghachi ego mgbapụta ahụ mgbe ha tọhapụsịrị onye ha ji eji. Otú ọ dị, ha adịghị arụ ọrụ n’efu.

N’agbanyeghị mgbalị ndị dị otú ahụ, ịtọrọ mmadụ na-amụba n’ọtụtụ ala. N’ikwu banyere ọnọdụ ahụ na Latin America, Richard Johnson, bụ́ osote onyeisi ụlọ ọrụ Seitlin & Company na-ekwu, sị: “Ihe mmadụ nile na-atụ anya ya bụ na ịtọrọ mmadụ ga-amụba.”

Ihe Ndị Kpatara Mmụba Ahụ

Ndị ọkachamara na-ekwu ọtụtụ ihe mere o ji mụbaa n’oge a. Ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba dị n’ebe ụfọdụ bụ otu. Otu onye ọrụ enyemaka nọ n’obodo Nal’chik, Russia, kwuru, sị: “Ụzọ kasị mma isi nweta ego bụ site n’ụzọ ọjọọ a, ịtọrọ mmadụ.” N’ụfọdụ mba ndị dịbu na Soviet Union, a sịrị na e ji ego e nwetara n’ịtọrọ mmadụ elekọta usuu ndị agha nke ndị ọchịagha obodo.

Ọtụtụ ndị na-emewanye njem maka achụmnta ego ma ọ bụ maka njem nleta karịa ka ọ dịbu, si otú a na-emepere ndị ntọ na-achọ ndị ha ga-akpara aka ohere ọzọ. Ọnụ ọgụgụ ndị si mba ọzọ a na-atọrọ amụbawo okpukpu abụọ n’ime afọ ise. N’agbata afọ 1991 na 1997, a tọọrọ ndị na-eme njem nleta n’ihe dị ka ala 26.

Olee ebe ndị ntọ a si? Agha ụfọdụ akwụsịwala, na-eme ka ndị bụbu soja ghara inwe ọrụ, gharakwa inwe ego. Ndị a nwere nkà nile dị mkpa iji malite ọrụ a na-enye ezigbo ego.

N’otu aka ahụ, iji usoro ndị dịkwu irè egbochi izu ohi n’ụlọ akụ̀ na ihe ndị e mere iji belata ahịa ọgwụ ọjọọ emewo ka ndị omekome malite ịtọrọ mmadụ dị ka ihe ga na-enyezi ha ego. Mike Ackerman, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ịtọrọ mmadụ kọwara, sị: “Ka anyị na-eme ka o sikwuo ike izuru ihe onwunwe n’ebe nile, otú ahụ ka ọ na-eme ka a na-ezuru ndị mmadụ.” Ịkpọsa ihe mgbapụta buru ibu pụkwara ịkpali ndị chọburu ịtọrọ mmadụ.

Nzube Ha Anaghị Abụcha Otu

Ihe ka n’ọtụtụ ndị ntọ chọrọ nanị ego. Ihe mgbapụta ha na-ana na-adịgasị iche site na  dollar ole na ole ruo nde $60 kasị elu bụ́ nke a kwụrụ iji gbapụta otu aka ji akụ̀ na Hong Kong bụ́ onye a na-atọhapụghị n’agbanyeghị ego e nyere.

N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị ntọ ejiriwo maka ndị ha tọọrọ bụrụ ndị a ma ama, nweta ihe oriri, ọgwụ, redio, na ụgbọala tinyekwara ụlọ akwụkwọ ọhụrụ, ụzọ, na ụlọ ọgwụ. A tọhapụrụ otu onyeisi a tọọrọ n’Esia mgbe e nyesịrị ndị ntọ ahụ uwe egwuregwu basketball na bọl ya. Òtù ụfọdụ na-ejikwa ịtọrọ mmadụ achụpụ ma na-emenye ndị na-achụ nta ego na ndị nleta si mba ọzọ bịa egwu, iji kwụsị mmebi a na-emebi ala na ihe ndị sitere n’okike.

Ya mere nzube ha dị ọtụtụ, ụzọ e si eme ya dị ọtụtụ, ndị ga-atọrọ mmadụ ma ọ bụ ndị a ga-atọrọ dị ọtụtụ. Ihe ngwọta ya ọ̀ dịkwa ọtụtụ otú ahụ? Olee ụfọdụ n’ime ha, hà pụkwara igbo mkpa ahụ? Tupu anyị azaa ajụjụ ndị dị otú ahụ, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị na-apụtaghị ìhè, bụ́ isi ihe ndị na-akpata mmụba nke ịtọrọ mmadụ.

[Igbe dị na peeji nke 15]

Ọ Bụrụ na A Tọrọ Gị

Ndị nyochaworo ọnọdụ ahụ na-atụrụ ndị a pụrụ ịtọrọ aro ndị na-esonụ.

• Mee ihe a sị gị mee; zere isi ọnwụ. A na-emekpọkarị ndị e jichiri ejichi bụ́ ndị na-adịghị ekwe ekwe ọnụ, ha na-aka etinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e gburu ma ọ bụ ndị a ga-enye ahụhụ ma hapụ ndị ọzọ.

• Atụla ụjọ. Buru n’uche na a na-emesị tọhapụ ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a na-atọrọ.

• Chepụta ụzọ ị ga-esi amata ihe oge na-ekwu.

• Gbalịa ịmalite ihe ụfọdụ ị ga na-eme kwa ụbọchị.

• Na-emega ahụ, ọ bụ ezie na ohere i nwere ịkpagharị pụrụ ịdị nta.

• Anya dịrị gị nkọ; gbalịa ibute ihe dị iche iche n’isi, ịmata ụda, na ísì. Mata ihe ụfọdụ banyere ndị tọọrọ gị.

• Soro ha kparịtatụ ụka ma o kwe mee, gbalịakwa imepe ụzọ nkwurịta okwu. Ọ bụrụ na ndị tọọrọ gị ahụ gị dị ka mmadụ, o yikarịghị ka ha ga-emerụ gị ahụ ma ọ bụ gbuo gị.

• Jiri nkwanye ùgwù mee ka ha mara ihe na-akpa gị.

• Anwala ikwu okwu banyere ihe mgbapụta gị.

• Ọ bụrụ na ị hụ na e nwere ndị bịara ịnapụta gị, daa n’ala ma nọrọ nnọọ n’ebe ahụ ka ihe na-emenụ na-eme.

[Igbe dị na peeji nke 16]

Inshọransị Maka Ntọrọ Mmadụ​—⁠Ihe A Na-arụrụ Ụka

Otu ụlọ ọrụ na-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma nke so na-akpata mmụba nke ntọrọ mmadụ bụ ụlọ ọrụ inshọransị. Ụlọ ọrụ Lloyd’s of London anọwo na-enwe mmụba dị pasent 50 kwa afọ n’inshọransị maka ntọrọ mmadụ n’afọ ndị 1990. Ọtụtụ ụlọ ọrụ na-enyewanye inshọransị dị otú ahụ. Ụlọ ọrụ inshọransị ahụ na-akwụ onye na-ekwu okwu ihe mgbapụta ụgwọ maka enyemaka ya, kwụọ ihe mgbapụta ahụ, mgbe ụfọdụ kwa kwụọ ụgwọ mbọ ndị ọkachamara gbara iji nwetaghachi ihe mgbapụta ahụ. Otú ọ dị, a na-arụrụ ihe banyere inshọransị ahụ ezigbo ụka.

Ndị na-emegide inshọransị ahụ maka ntọrọ mmadụ na-ekwu na ọ na-eme ka mpụ ahụ bụrụ ihe e ji akpa ego nakwa na ọ bụ ihe rụrụ arụ inweta ego site n’ịtọrọ mmadụ. Ha na-ekwukwa na onye nwere akwụkwọ inshọransị ahụ nwere ike ghara ichebe onwe ya nakwa na inshọransị ahụ ga-akwalite nzube ndị ntọ nke bụ́ ịnapụ ndị mmadụ ego, si otú a na-akwalite mpụ a. Ọbụna ụfọdụ na-atụ egwu na inshọransị ga-akpali ndị mmadụ ime ndokwa ka a tọrọ ha iji nweta ego inshọransị ahụ. A machibidoro inshọransị maka ntọrọ mmadụ iwu na Germany, Colombia, na n’Itali.

Ndị na-akwado inshọransị maka ntọrọ mmadụ na-akọwa na dị ka inshọransị ọ bụla ọzọ, ọ na-eme ka ọtụtụ ndị kwụọ ụgwọ mfu mmadụ ole na ole. Ha na-akọwa na inshọransị na-echebe mmadụ ruo n’ókè ụfọdụ, ebe ọ bụ na ọ na-eme ka ezinụlọ na ụlọ ọrụ ndị nwere inshọransị nwee ike ịkwụ ụgwọ enyemaka nke ndị ọkachamara ruru eru, bụ́ ndị pụrụ ime ka obi ruo mmadụ ala, kwuo okwu ego mgbapụta dị ala, ma mee ka ọ dị mfe karị ijide ndị ntọ ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 17]

Ihe A Na-ahụ na Stockholm

Ntọrọ a tọọrọ Patty Hearst na 1974, bụ́ nwa nwanyị Randolph A. Hearst, onye bara oké ọgaranya nke na-ebi akwụkwọ akụkọ, ghọrọ ihe dị mgbagwoju anya mgbe nwa ya ahụ dụnyeere ndị tọọrọ ya úkwù ma soro ígwè ahụ jiri égbè gaa ohi. Onye Spain na-akụ bọl a tọọrọ gbaghaara ndị tọọrọ ya ma kwuo ka ihe gaziere ha.

Ná mmalite afọ ndị 1970, a kpọrọ ihe a na-eju anya Ihe A Na-ahụ na Stockholm, mgbe e jichisịrị ndị mmadụ na 1973 n’ụlọ akụ̀ dị na Stockholm, Sweden. N’oge ahụ ụfọdụ n’ime ndị ahụ e jichiri na ndị jichiri ha ghọrọ ndị enyi. Mmekọrịta dị otú ahụ chebere ndị ahụ a tọọrọ, dị ka akwụkwọ bụ́ Criminal Behavior na-akọwa: “Ka ndị a tọọrọ na ndị tọọrọ ha na-amata onwe ha karị, otú ahụ ka o yiri ka hà ga-enwe mmasị n’ebe ibe ha nọ karị. Ihe ijuanya a na-egosi na mgbe oge ụfọdụ gasịrị onye ahụ jichiri mmadụ eyikebeghị ka ọ̀ ga-emerụ onye o jichiri ahụ.”

Otu onye England a tọọrọ na Chechnya bụ́ onye e dinara n’ike ná mmalite nke ntọrọ ya, kwuru, sị: “Echere m na mgbe onye nche ahụ matara anyị, ọ ghọtara na o zighị ezi idina m n’ike. Ọ kwụsịrị idina m n’ike ma rịọ m mgbaghara.”

[Foto dị na peeji nke 14]

Nye ndị òtù ezinụlọ, ịtọrọ mmadụ bụ otu n’ime ihe ndị kasị egbu mgbu n’obi, ma na-akpata mkpaghasị uche a pụrụ ichetụ n’echiche

[Foto dị na peeji nke 15]

Ndị a tọọrọ chọrọ nkasi obi

[Foto dị na peeji nke 17]

A na-akpọchibido ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-atọrọ ụzọ n’elebaghị anya ná mkpa anụ ahụ ma ọ bụ nke ịdị ọcha ha