Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne Bu Ọrịa AIDS Na-eche Ọnọdụ Amaghị Ihe A Ga-eme Ihu

Ndị Nne Bu Ọrịa AIDS Na-eche Ọnọdụ Amaghị Ihe A Ga-eme Ihu

 Ndị Nne Bu Ọrịa AIDS Na-eche Ọnọdụ Amaghị Ihe A Ga-eme Ihu

CYNTHIA, * bụ́ nwanyị bi na West Indies, aghaghị ịhọrọ ma ọ̀ ga-enye nwa ọhụrụ ya ara ka ọ̀ ga-eji karama nye ya nri. Mkpebi ahụ pụrụ iyi nke dị mfe. E kwuwerị, ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike anọwo na-akwado ara nne dị ka “ihe oriri kasị enye ahụ ike” maka ụmụ ọhụrụ. E wezụga nke ahụ, ụmụ ọhụrụ e ji karama nye nri n’ógbè ndị dara ogbenye ji ihe dị ka ugboro 15 yikarịa ka hà ga-anwụ n’ọrịa afọ ọsịsa karịa ndị e nyere ara. N’eziokwu, Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) na-akọ na ihe dị ka ụmụaka 4,000 na-anwụ kwa ụbọchị n’ihi ihe ize ndụ ndị dị n’ihe ndị e ji edochi anya mmiri ara.

Otú ọ dị, n’ọnọdụ Cynthia, mkpebi ọ ga-eme banyere inye nwa ara metụtara ihe ize ndụ ọzọ kpam kpam. Di ya ebufewo ya nje virus na-ebelata ikike ahụ mmadụ ji alụso ọrịa ọgụ (HIV), bú nke na-akpata ọrịa AIDS. Mgbe ọ mụsịrị nwa, Cynthia chọpụtara na ohere nwatakịrị nne ya bu nje HIV nwere ibute nje ahụ site ná mmiri ara bụ 1 n’ime 7. * N’ihi ya, ọ ghaghị ime mkpebi na-agbawa obi: ikpughepụ nwa ya nye ihe ize ndụ nke inye ya ara ma ọ bụ itinye ya n’ihe ize ndụ nke iji karama nye ya nri.

N’akụkụ ụwa ebe ntiwapụ nke ọrịa AIDS kasị njọ, ndị inyom 2 ma ọ bụ 3 n’ime ndị inyom 10 ọ bụla dị ime bu nje HIV. N’otu mba, ihe karịrị ọkara nke ndị inyom nile dị ime e lere ahụ bu nje ahụ. “Ọnụ ọgụgụ a dị egwu,” ka Redio òtù UN na-akọ, “emewo ka ndị ọkà mmụta sayensị chọwa ihe ngwọta ya ngwa ngwa.” N’iji mee ihe banyere ihe iyi egwu a, njikọ isii nke òtù UN ejikọtawo ahụmahụ, mgbalị, na ego ha iji guzobe Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV/AIDS, nke a maara dị ka UNAIDS. * Ma ihe òtù UNAIDS chọpụtara bụ na ihe ngwọta nke nsogbu ọrịa AIDS adịghị mfe otú ahụ.

Ihe Ndị Dị Mgbagwoju Anya Na-egbochi Ihe Ngwọta Dị Mfe

Dị ka Edith White si kwuo, bụ́ ọkachamara n’ihe banyere inye nwa ara na nne ibufe nwa ya nje HIV, ndị ọrụ ahụ ike na-adụ ụmụ nwanyị bu nje HIV nọ ná mba ndị mepere emepe ọdụ ka ha ghara inye ụmụ ha ara, ebe ọ bụ na nke a na-afọdụ  nke nta ka o jiri okpukpu abụọ mụbaa ohere nwa ahụ nwere ibute nje ahụ. Inye nri nwa ọhụrụ yiri ka ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya. Ma ná mba ndị ka na-emepe emepe—ebe ihe isi ike na-adịghị ekwe ka e mee ihe e chepụtara—ọ na-esi ike iji ihe ngwọta a dị mfe mee ihe.

Otu n’ime ihe mgbochi ndị e nwere metụtara ụmụ mmadụ. Ná mba ebe ndị a na-enyekarị ụmụaka ara, ndị inyom na-enye ụmụ ha nri nwa pụrụ isi otú a na-ekwu na ha ebutewo nje HIV. Nwanyị pụrụ ịtụ egwu na a ga-ata ya ụta, gbahapụ ya, ma ọ bụ ọbụna tie ya ihe ma a mata banyere ọnọdụ ya. Ndị inyom ụfọdụ nọ n’ọnọdụ a na-eche na ha enweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma e wezụga inye ụmụ ha ara iji zochie na ha bu nje HIV.

E nwekwara ihe mgbochi ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, tụlee Margaret dị afọ 20. E lebeghị ya ahụ, dịkwa ka a na-elebeghị ma ọ dịkarịa ala pasent 95 nke ụmụ nwanyị nọ n’ime ime obodo na Uganda, iji chọpụta ma o bu nje HIV. Ma ọ dị ihe mere Margaret ji na-enwe nchegbu. Nwa mbụ ya anwụwo, nke abụọ adịghị ike ma na-arịa ọrịa. Margaret na-enye nwa ya nke atọ ara ugboro iri n’ụbọchị, n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na Margaret pụrụ ibu nje HIV. “Agaghị m enwe ike inye nwa m nri nwa,” ka ọ na-ekwu. N’ihi gịnị? Ihe ọ na-efu inye otu nwatakịrị nri nwa, ka Margaret na-ekwu, ji otu okpukpu na ọkara karịa ego ole otu ezinụlọ n’obodo nta ha na-akpata n’otu afọ. Ọ bụrụgodị na a na-enweta nri nwa n’efu, a ka ga-enwe nsogbu nke inweta mmiri dị ọcha iji mee ka nri nwa ahụ bụrụ nke dị mma. *

A pụrụ ibelata ụfọdụ n’ime ihe mgbochi ndị a ma ọ bụrụ na e mee ka ndị nne bu nje HIV nwee usoro idebe ihe ọcha kwesịrị ekwesị, ihe ndị zuru ezu e ji edochi anya mmiri ara, na mmiri dị ọcha. Hà dị oké ọnụ? Ma eleghị anya. Ma, ọ bụ ihe ijuanya na ime ka e nwee ihe ndị dị otú ahụ yiri ka ọ̀ bụ okwu banyere ịkpọ ya mkpa karịa ịchọta ego. N’ezie, òtù UN na-akọ na ego ụfọdụ n’ime mba ndị ka na-emepe emepe bụ́ ndị kasị daa ogbenye na-emefu n’agha ji ihe dị ka okpukpu abụọ karịa ihe ha na-emefu n’ahụ ike na n’agụmakwụkwọ.

Gịnị Banyere Ọgwụ Ọrịa AIDS

Ndị ọkà mmụta sayensị òtù UN kọrọ na ọgwụ dị mfe, na-adịchaghịkwa oké ọnụ, nke a na-akpọ AZT pụrụ ibelata mbufe nje HIV nke nne na-ebufe nwa ya, n’ụzọ pụtara ìhè. Site n’enyemaka nke òtù UNAIDS, e wetulatawo ego ole ọgwụgwọ a na-efu ịbụ $50. Ọzọkwa, ndị na-eme nnyocha banyere ọrịa AIDS mara ọkwa na July 1999 na iji ọgwụ nevirapine ọnụ ego ya bụ nanị $3 agwọ ndị nne bu nje HIV na ụmụ ha yiri ka ọ̀ dịkwu irè karịa ọgwụ AZT n’igbochi mbufe nke nje HIV. Ndị ọkachamara ahụ ike na-ekwu na ọgwụ nevirapine pụrụ igbochi ihe ruru ụmụ ọhụrụ 400,000 kwa afọ ibu nje HIV malite ndụ.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-akatọ ụdị ọgwụgwọ dị otú ahụ, na-ekwu na ebe ọ bụ na nanị ihe ha na-eme bụ igbochi nne ibufe nwa ya nje HIV, ọrịa AIDS ga-emesị gbuo nne ahụ ma hapụ nwa ahụ n’enweghị nne. Òtù UN na-azaghachi na ajọ ihe ọzọ a pụrụ ime bụ ịhapụ ụmụ ọhụrụ ka ha bute nje HIV, si otú a mee ka ụmụaka a aka ha dị ọcha jiri nwayọọ nwayọọ nwụọ ajọ ọnwụ. Ha na-arụkwa ụka na ndị nne bu nje HIV pụrụ ịdịgide ndụ ruo ọtụtụ afọ. Tụlee Cynthia, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite. Ọ chọpụtara na ya bu nje HIV na 1985, bụ́ mgbe ọ mụrụ nwa, ma ọ daghị ọrịa ruo afọ asatọ ka e mesịrị. Ọ bụ ezie na nwa ya bukwa nje HIV mgbe a mụrụ ya, ka ọ na-erule afọ abụọ, nwa ahụ ebukwaghị ya.

Mmesi obi ike nke Bible ji akasi anyị obi bụ na gburugburu ebe obibi na-adịghị ize ndụ na ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye ihe otiti ndị dị ka ọrịa AIDS dị nso. (Mkpughe 21:1-4) Jehova Chineke na-ekwe nkwa ụwa ọhụrụ ebe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ọ ga-amasị Ndịàmà Jehova ịkọrọ gị banyere ihe ngwọta a na-adịgide adịgide. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ ndị bipụtara magazin a ma ọ bụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

^ par. 3 Dị ka òtù UNICEF si kwuo, ihe dị ka ụmụ ọhụrụ 500 ruo 700 na-ebute nje ahụ kwa ụbọchị site ná mmiri ara nke nne ha bu nje HIV.

^ par. 4 Njikọ isii ndị ahụ bụ òtù UNICEF, Usoro Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu, Òtù Na-ahụ Maka Ụba Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu, Òtù Ahụ Ike Ụwa, Ụlọ Akụ̀ Ụwa na Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu. E guzobere òtù UNAIDS na 1995.

^ par. 8 Otu nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya na-egosi na inyekọta nri nwa na ara pụrụ ịmụba ohere e nwere ibute nje HIV nakwa na mmiri ara pụrụ inwe ihe ndị na-egbu nje na-enye aka eme ka nje ahụ ghara ịkpa ike. Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, inye nanị ara—ọbụna n’agbanyeghị ihe ize ndụ ya—pụrụ ịbụ nhọrọ ka mma. Otú ọ dị, a nwapụtabeghị nchọpụta a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

WHO/E. Hooper