Ebe Jekọb yi uwe Isọ, yirikwa ajị ewu n’olu na n’aka, Aịzik ana-adịda ya aka n’aka.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JENESIS 27-28

Jekọb Nwetara Ngọzi Ruuru Ya

Jekọb Nwetara Ngọzi Ruuru Ya

27:6-10, 18, 19, 27-29

E buru amụma na Aịzik ga-agọzi Jekọb.

  • Map Ala Nkwa ahụ. Ọ na-egosi ala Izrel nke na-emepụta nri nke ọma na ala Idọm nke kpọrọ nkụ, na-anaghịkwa emepụta nri

    27:28—Jehova nyere ụmụ Jekọb ala na-amị mkpụrụ nke “mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”—Diut. 26:15

  • 27:29—Ụmụ Izrel (ya bụ, ụmụ Jekọb) bịara dịrị ike karịa ndị Idọm (ya bụ, ụmụ Isọ).—Jen. 25:23; 2 Sam. 8:14

  • 27:29—A bụrụ ndị Idọm ọnụ ma mechaa bibie ha n’ihi na ha kpọrọ ụmụ Izrel asị.—Ezik. 25:12-14.