Jenesis 27:1-46
27 Mgbe Aịzik mere agadi, mgbe ọ na-anaghịkwa ahụcha ụzọ, ọ kpọrọ Ịsọ+ nwa ya nke okenye, sị ya: “Nwa m.” Ya azaa ya, sị: “Ee, nna m.”
2 Ọ gwara ya, sị: “Emeela m agadi. Amaghị m ụbọchị m ga-anwụ.
3 Ugbu a, biko, were ihe i ji achụ nta, akpa akụ́ gị na ụta gị, gaa n’ọhịa gbatara m anụ.+
4 Siere m ụdị nri dị ụtọ na-amasị m, butekwara m ya. M ga-eri ya ma gọzie gị tupu mụ anwụọ.”
5 Ma, Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik nọ na-agwa Ịsọ nwa ya okwu. Ịsọ wee gawa n’ọhịa ka ọ gaa gbute anụ bulata.+
6 Ribeka gwara Jekọb nwa ya,+ sị: “M ka nụrụ ka nna gị na-agwa Ịsọ nwanne gị, sị,
7 ‘Gbutere m anụ, siere m nri dị ụtọ. M ga-eri ya ma gọzie gị n’ihu Jehova tupu mụ anwụọ.’+
8 Ugbu a, nwa m, gee m ntị nke ọma ma mee ihe m na-agwa gị.+
9 Biko, gaa n’ebe ìgwè anụ ụlọ nọ kpụtara m ụmụ ewu abụọ kacha mma, ka m were ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị ya.
10 Ị ga-ebugara ya nna gị ka o rie, ka o wee gọzie gị tupu ya anwụọ.”
11 Jekọb sịrị Ribeka nne ya: “Ahụ́ Ịsọ nwanne m bụ ajị ajị,+ ma ahụ́ m na-akwọ mụrụmụrụ.
12 Ọ bụrụkwanụ na nna m emetụ m aka n’ahụ́?+ Ọ ga-adịzi ka m̀ na-akwa ya emo, ya emezie ka ọ bụọ m ọnụ kama ịgọzi m.”
13 Nne ya wee sị ya: “Nwa m, ka ọnụ a ga-abụ gị mezuo n’isi m. Naanị mee ihe m kwuru ma gaa kpụtara m ha.”+
14 O wee gaa kpụrụ ha kpụtara nne ya. Nne ya ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya.
15 Mgbe Ribeka sichara, ọ chịịrị ọmarịcha uwe Ịsọ nwa ya nke okenye, nke o dowere n’ụlọ, yiwe Jekọb nwa ya nke nta.+
16 O wekwaara akpụkpọ ụmụ ewu ahụ kee ya n’aka nakwa n’ebe ajị na-adịghị n’olu ya.+
17 O wee bunye Jekọb nwa ya nri ahụ dị ụtọ na achịcha o mere.+
18 O wee bakwuru nna ya, sị ya: “Nna m.” Ya azaa ya, sị: “Ee, nwa m, ị̀ bụ onye?”
19 Jekọb sịrị nna ya: “Abụ m ọkpara gị Ịsọ.+ Emeela m ihe ị gwara m. Biko, bilie, nọrọ ọdụ rie anụ m gbutere, ka i* wee gọzie m.”+
20 Aịzik jụziri nwa ya, sị: “Nwa m, olee otú i si hụ ya ọsọ ọsọ otú a?” Ọ zara ya, sị: “N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nyeere m aka mụ ahụ ya.”
21 Aịzik wee sị Jekọb: “Nwa m, biko, bịa nso ka m metụ gị aka, ka m mara ma ị̀ bụ nwa m Ịsọ n’eziokwu ka ọ̀ bụ na ị bụghị.”+
22 Jekọb wee bịa Aịzik nna ya nso, ya emetụ ya aka. Ọ sịziri: “Olu a bụ olu Jekọb, ma aka a bụ aka Ịsọ.”+
23 Ọ mataghị na ọ bụ Jekọb maka na aka ya dị ajị ajị ka aka Ịsọ nwanne ya. N’ihi ya, ọ gọziri ya.+
24 O mechara jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ nwa m Ịsọ n’eziokwu?” ya asị: “Ee, abụ m.”
25 O wee sị ya: “Nwa m, butere m anụ i gbutere ka m rie wee gọzie gị.” O buteere ya anụ ahụ, ya erie. O butekwaara ya mmanya, ya aṅụọ.
26 Aịzik nna ya wee sị ya: “Nwa m, biko, bịa nso susuo m ọnụ.” +
27 Ọ bịara nso susuo ya ọnụ, ya anụ ísìsì uwe ya.+ O wee gọzie ya, sị:
“Lee, ísìsì nwa m dị ka ísìsì nke ọhịa Jehova gọziri agọzi.
28 Ka ezi Chineke nye gị igirigi nke eluigwe+ nakwa ala nke na-eme nri,+ ka o nyekwa gị ọka* na mmanya ọhụrụ n’ụba.+
29 Ka ndị dị iche iche jeere gị ozi, ka mba dị iche iche kpọọkwara gị isiala. Bụrụ onyeisi ụmụnne gị, ka ụmụnne gị kpọọkwara gị isiala.+ Ka onye ọ bụla bụrụ gị ọnụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ, ka onye ọ bụla gọziri gị bụrụkwa onye a gọziri agọzi.”+
30 Mgbe Aịzik gọzichara nnọọ Jekọb, Jekọb esi n’ebe Aịzik nna ya nọ pụta, Ịsọ nwanne ya si ịchụ nta lọta.+
31 Ịsọ siri nri dị ụtọ ma butere ya nna ya. Ọ sịrị nna ya: “Nna m, bilie rie anụ nwa gị gbutere, ka i* wee gọzie m.”
32 Aịzik nna ya jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ onye?” ya azaa ya, sị: “Abụ m Ịsọ nwa gị, ọkpara gị.”+
33 Aịzik malitere ịma jijiji nke ukwuu, ọ sịrị: “Ònyekwanụ gbutere anụ wetara m? M richaala ya tupu gị abata. M gọziri ya, ọ ga-abụkwa onye a gọziri agọzi!”
34 Mgbe Ịsọ nụrụ ihe nna ya kwuru, ọ malitere ibe ákwá ma na-etisi mkpu ike, sị nna ya: “Gọzie m, nna m, gọziekwa mụnwa!”+
35 Ma ọ sịrị ya: “Nwanne gị nwoke ji aghụghọ bịa nara ngọzi ị gaara enweta.”
36 Ịsọ wee sị: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị ya mere e ji gụọ ya Jekọb,* ka o wee napụ m ihe ruuru m ugboro abụọ a?+ Ọ narala m ihe m kwesịrị inweta dị ka ọkpara.+ Ugbu a, ọ narakwala ngọzi m.”+ Ọ sịkwara: “Ọ̀ bụ na e nweghị ngọzi i doweere m?”
37 Ma Aịzik zara Ịsọ, sị: “Lee, emeela m ya onyeisi gị.+ Ekwuola m na ụmụnne ya niile ga-abụ ndị na-ejere ya ozi nakwa na ọ ga-enwe ọka* na mmanya ọhụrụ n’ụba.+ Nwa m, olee ihe fọrọnụ m ga-emere gị?”
38 Ịsọ sịrị nna ya: “Nna m, ọ̀ bụ naanị otu ngọzi ka i nwere? Gọzie m, nna m, gọziekwa mụnwa!” Ịsọ wee besiwe ákwá ike.+
39 Aịzik nna ya sịziri ya:
“Lee, ị ga-ebi n’ala na-anaghị eme nri, igirigi nke eluigwe agaghịkwa na-adara gị.+
40 Ị ga na-ebu mma agha gị n’oge niile ị nọ ndụ,+ ị ga-ejekwara nwanne gị nwoke ozi.+ Ma, mgbe ọ na-ekweghịzi gị odidi, ị ga-akwụsị ịgbara ya ohu.”*+
41 Ma, Ịsọ buuru Jekọb iwe n’obi maka na ọ bụ Jekọb ka nna ya gọziri.+ Ịsọ nọ na-asị n’obi ya: “Oge a ga-eru uju nna m na-eru nso.+ E mechaa, m ga-egbu Jekọb nwanne m nwoke.”
42 Mgbe a kọọrọ Ribeka ihe Ịsọ nwa ya nke okenye kwuru, o ziri ozi ozugbo kpọọ Jekọb nwa ya nke nta ma sị ya: “Ịsọ nwanne gị na-akpa nkata igbu gị ka o wee megwara gị ihe i mere ya.
43 Nwa m, ngwa mee ihe m na-agwa gị. Bilie, gbaga na nke Leban nwanne m nwoke n’obodo Heran.+
44 Biri na nke ya ruo mgbe ọnụma nwanne gị nwoke dajụrụ,
45 ruo mgbe obi ga-ajụrụ nwanne gị nwoke, ya echefuokwa ihe i mere ya. M ga-ezizi gị ozi ka ị lọta. Gịnị mere m ga-eji gbara aka unu abụọ n’otu ụbọchị?”
46 Mgbe e mechara, Ribeka nọ na-agwa Aịzik, sị: “Ụmụ nwaanyị Het a emeela ka ike ndụ gwụ m.+ Ọ bụrụ na Jekọb anwaa anwaa lụta otu n’ime ụmụ nwaanyị Het, dị ka ụmụ nwaanyị a bụ́ ndị obodo a, olee uru ndụ m baara m?”+

