Diuterọnọmi 26:1-19

  • Ndị Izrel ga-enye mkpụrụ mbụ ha (1-11)

  • Otu ụzọ n’ụzọ iri a ga-enye n’afọ nke atọ (12-15)

  • Ndị Izrel bụụrụ Jehova ndị pụrụ iche (16-19)

26  “Mgbe unu ga-emecha banye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu, unu ewee weghara ya ma biri na ya, 2  unu ga-eweta ụfọdụ n’ime mkpụrụ mbụ nke ihe niile ala ahụ mepụtara, bụ́ ndị unu ga-eweta n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu. Unu ga-etinye ha na nkata ma buru ha gaa n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya.+ 3  Unu ga-agakwuru onye nchụàjà na-eje ozi n’oge ahụ ma sị ya, ‘Taa, m bịara ịgwa Jehova bụ́ Chineke gị na abatala m n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna anyị hà iyi na ọ ga-enye anyị.’+ 4  “Onye nchụàjà ga-eburu nkata ahụ unu butere ma busa ya n’ihu ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke unu. 5  Ị ga-ekwuzi n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Nna m bụ onye Eram*+ na-agagharị agagharị.* Ọ gara n’Ijipt+ bụrụ onye mbịarambịa n’ebe ahụ, ya na mmadụ ole na ole bụ́ ndị ezinụlọ ya.+ Ma ọ nọ n’ebe ahụ ghọọ mba ukwu, nke ndị ya dị ike ma dị ọtụtụ.+ 6  Ndị Ijipt mesiri anyị ike ma megbuo anyị, jiri anyị mere ndị ohu, chiekwa anyị ọnụ n’ala.+ 7  Anyị wee malite ibesara Jehova bụ́ Chineke nna nna anyị hà ákwá. Jehova wee nụ olu anyị ma hụ na a na-emekpa anyị ahụ́, na anyị nọ ná nsogbu, nakwa na a na-emegbu anyị.+ 8  N’ikpeazụ, Jehova ji aka ya siri ike na ike ya kpọpụta anyị n’Ijipt.+ O mekwara ihe ndị dị egwu na ihe àmà dị iche iche, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche mgbe ọ na-akpọpụta anyị.+ 9  O wee kpọta anyị n’ebe a ma nye anyị ala a, bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ 10  Ugbu a, ewetala m mkpụrụ mbụ nke ihe ala Jehova nyere m mepụtara.’+ “Ị ga-ebusa ha n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị ma kpọọ isiala n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị. 11  Ị ga-aṅụrịzi ọṅụ maka ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị na ezinụlọ gị, gị na onye Livaị na onye mbịarambịa nke bi n’obodo unu.+ 12  “Mgbe i wekọtachara otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke ihe niile ala gị mepụtara n’afọ nke atọ, bụ́ afọ a na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri, ị ga-enye ya onye Livaị, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna,* na nwaanyị di ya nwụrụ. Ha ga-eri ya n’ime obodo gị rijuo afọ.+ 13  Ị ga-ekwuzi n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, sị, ‘Ewepụla m ihe dị nsọ n’ụlọ m. Enyekwala m ya onye Livaị, onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna, na nwaanyị di ya nwụrụ,+ otú i nyere m n’iwu. Emebighị m ihe ndị i nyere n’iwu, elegharaghị m ha anya. 14  Erighị m ihe ọ bụla si na ya n’oge m na-eru uju. Ewepụghị m ihe na ya mgbe m na-adịghị ọcha. Enyeghịkwa m nke ọ bụla n’ime ya maka onye nwụrụ anwụ. M gere ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke m. Emeekwala m ihe niile i nyere m n’iwu. 15  Si n’eluigwe, bụ́ ebe dị nsọ i bi, ledata anya gọzie ndị gị bụ́ Izrel, gọziekwa ala i nyere anyị,+ otú ị ṅụụrụ nna nna anyị hà n’iyi,+ bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’*+ 16  “Taa, Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu iwu ka unu soro ntụziaka ndị a, na-emekwa ihe ndị o kpebiri. Jirinụ obi unu niile+ na mkpụrụ obi* unu niile na-edebe ha ma na-eme ha. 17  Taa, Jehova agwala unu na ya ga-abụ Chineke unu nakwa na unu ga-eme ihe o nyere unu n’iwu, soro ntụziaka ya,+ debe iwu ya+ ma na-eme ihe ndị o kpebiri,+ nakwa na unu ga-ege ntị n’olu ya. 18  Taa, unu agwakwala Jehova na unu ga-abụ ndị ya, ndị ya pụrụ iche,+ otú o kwere unu ná nkwa, nakwa na unu ga-edebe ihe niile o nyere n’iwu, 19  nakwa na ọ ga-eme ka unu ka mba ndị ọzọ niile o kere,+ mee ka a na-eto unu, ka a mara unu ama nakwa ka unu dị ebube otú o kwere ná nkwa, ma ọ bụrụ na unu abụụrụ Jehova bụ́ Chineke unu ndị dị nsọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Siria.”
O nwere ike ịbụ, “na-anwụ anwụ.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.