Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Ìsì Ozi Ọma

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ndị Ìsì Ozi Ọma

GỊNỊ MERE O JI DỊ MKPA: Ahụ́ anaghị eru ọtụtụ ndị ìsì ala iso ndị ha na-amaghị kwurịta okwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị akọ iji zie ụdị ndị a ozi ọma. Jehova hụrụ ndị ìsì n’anya. (Lev. 19:14) Anyị kwesịrị iṅomi Jehova, na-agbalị akụziri ndị ìsì Okwu Chineke.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Chọọ ndị ìsì. (Mat. 10:11) Ị̀ maara ezinụlọ e nwere onye ìsì na ya? È nwere ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ, ebe a na-elekọta ndị ọrịa ma ọ bụ ebe ndị ọzọ n’ókèala unu ga-achọ ka e wetara ha ihe ndị e wepụtara maka ndị ìsì?

  • Gosi ha na ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi. I gosi ha na ị hụrụ ha n’anya nakwa na ihe banyere ha na-emetụ gị n’obi, ọ ga-eme ka ahụ́ ruo ha ala. Gbalịa jiri ihe na-eme n’ókèala unu ga-amasị ha zie ha ozi ọma

  • Nyere ha aka ịmata Jehova. Nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ ihe maka ndị ìsì na ndị na-adịghị ahụcha ụzọ nke ọma. Jụọ onye ahụ ụdị nke ọ ga-achọ. Onye nlekọta ije ozi kwesịrị ijide n’aka na onye na-ahụ maka akwụkwọ na-atụ ọda ihe ndị onye ìsì chọrọ