Ezikiel 25:1-17

  • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Amọn (1-7)

  • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Moab (8-11)

  • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Ịdọm (12-14)

  • Ihe e buru n’amụma na a ga-eme ndị Filistia (15-17)

25  Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, chee ndị Amọn ihu+ ma buo amụma ihe a ga-eme ha.+  Gwa ndị Amọn, sị, ‘Nụrụnụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Mgbe e merụrụ ụlọ nsọ m, mee ka ala Izrel tọgbọrọ nkịtị, dọrọkwa ndị Juda n’agha, unu sịrị ha ntọọ!  N’ihi ya, m ga-enyefe unu n’aka ndị Ọwụwa Anyanwụ. Ebe unu bi ka ha ga-arụ ebe ha ga-ebi. Ha ga-amakwa ụlọikwuu ha ebe unu mara nke unu. Ha ga-ata mkpụrụ osisi unu, ṅụọkwa mmiri ara ehi unu.  M ga-eme ka Raba+ bụrụ ebe kamel ga na-ata ahịhịa, meekwa ka ala ndị Amọn bụrụ ebe ìgwè ewu na atụrụ ga na-ezu ike. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.”’”  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na unu* kụrụ aka,+ wụlie elu,* ṅụrịakwa ọṅụ iji kwaa ndị Izrel ezigbo emo,+  m ga-eweli aka m mee unu ihe. M ga-eme ka ndị mba ọzọ bukọrọ ihe unu. M ga-egbu unu, bibiekwa unu ka unu gharazie ịbụ mba.+ M ga-ala unu n’iyi. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘Ebe ọ bụ na Moab+ na Sia+ sịrị: “Ndị Juda dịzi ka mba niile ọzọ,”  m ga-eme ka ndị iro bịa lụso ndị Moab bi n’ókè Moab na mba ndị ọzọ agha. Ndị Moab a bi ná mkpọda ugwu, ebe ndị mere ka Moab maa mma, ya bụ, Bet-jeshimọt, Bel-mion, nakwa Kiriateyim.+ 10  M ga-enyefe ndị Moab na ndị Amọn n’aka ndị Ọwụwa Anyanwụ,+ ka mba dị iche iche ghara icheta ndị Amọn ọzọ.+ 11  M ga-emekwa Moab ihe m kpebiri ime ya.+ Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’ 12  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Ndị Ịdọm ataala ndị Juda ahụhụ, meekwa ezigbo ihe ọjọọ, n’ihi na ha gara megwara ndị Juda ihe ha mere ha.+ 13  N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “M ga-eweli aka m mee ndị Ịdọm ihe. M ga-egbu ma mmadụ ma anụ ụlọ. M ga-emekwa ka obodo ha tọgbọrọ nkịtị.+ Malite na Timan ruo Didan, a ga-eji mma agha bibie ha.+ 14  ‘M ga-esi n’aka Izrel ndị m taa ndị Ịdọm ahụhụ.+ M ga-esi n’aka ha jiri iwe na ọnụma mee ndị Ịdọm ihe. Ndị Ịdọm ga-amarakwa na mụ ataala ha ahụhụ ihe ha mere.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”’ 15  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘N’ihi otú obi si fee ndị Filistia azụ, ha ejirila obi ọjọọ na-emegwara ndị mere ha ihe, na-egbukwa ha.+ 16  N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “M ga-eweli aka m mee ndị Filistia ihe.+ M ga-egbukwa ndị Keretaịt,+ bibiekwa ndị ọzọ niile bi n’ụsọ oké osimiri.+ 17  M ga-eji ezigbo iwe taa ha ahụhụ maka ihe ha mere. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m tara ha ahụhụ.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “zọọ ụkwụ n’ala.”