Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Jọn 15:13—“Ọ Dịghị Onye Ọ Bụla Nwere Ịhụnanya Karịrị nke A Ukwuu”

Jọn 15:13—“Ọ Dịghị Onye Ọ Bụla Nwere Ịhụnanya Karịrị nke A Ukwuu”

 “E nweghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-enye ndụ ya maka ndị enyi ya.”​—Jọn 15:13, Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịrị nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.”​—Jọn 15:13, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Jọn 15:13 Pụtara

 Jizọs nọ na-enyere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta na ha kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya nke ukwuu nke na ha ga-adị njikere ịnwụrụ ibe ha.

 Jizọs bu ụzọ gwa ndịozi ya, sị: “Ihe m nyere unu n’iwu bụ ka unu hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya.” (Jọn 15:12) Olee otú Jizọs si hụ ha n’anya? O ji obi ya niile hụ ha n’anya, na-echekwa banyere ha. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-egbo mkpa ndị na-eso ụzọ ya nakwa nke ndị ọzọ karịadị mkpa nke ya. Ọ gwọrọ ndị mmadụ ọrịa dị iche iche, kụziekwara ha gbasara Alaeze Chineke. a Ọ rụdịrị ọrụ a na-eleda anya ka o wee nyere ndị ọzọ aka. (Matiu 9:35; Luk 22:27; Jọn 13:3-5) Ma, na Jọn 15:13, Jizọs na-ekwu banyere ụdị ịhụnaya pụrụ nnọọ iche. Ka awa ole na ole o kwuru ihe a gara, o gosiri ịhụnanya a pụrụ iche mgbe o ji obi ya niile “nye ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28; 22:39) O si nnọọ n’ụzọ dị ịtụnanya gosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya karịa ka ọ hụrụ onwe ya.

 Jizọs hụrụ mmadụ niile n’anya. Ma, ndị ọ kacha hụ n’anya bụ ndị na-eme ihe ọ na-akụzi. O weere ndị na-eso ụzọ ya ka ezigbo ndị enyi ya maka na ha na-erubere ya isi, ha ahapụghịkwa ya mgbe ọnwụnwa bịaara ya. (Luk 22:28; Jọn 15:14, 15) N’ihi ya, o nwere ezigbo ihe mere o ji jiri ndụ ya chụọ àjà maka ha.

 Ndị Kraịst oge ochie mere nnọọ ihe Jizọs kwuru, ha dị njikere ịnwụ maka ụmụnna ha. (1 Jọn 3:16) Nke bụ́ eziokwu bụ na ụdị ịhụnanya ahụ Jizọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya mechara bụrụ isi ihe e ji ama ezigbo Ndị Kraịst.​—Jọn 13:34, 35.

Ihe Ndị Gbara Jọn 15:13 Gburugburu

 Ihe e dere na Jọn isi 13 ruo isi 17 bụ okwu ikpeazụ Jizọs gwara mmadụ iri na otu bụ́ ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi nakwa ekpere ikpeazụ ya na ha kpere. Ọ nwụrụ ka awa ole na ole gara. N’isi nke 15, Jizọs ji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere alaka ndị na-amị mkpụrụ dị n’osisi vaịn. O ji ihe atụ a gosi na ha na ya kwesịrị ịdị n’otu iji mee ka a mara na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya n’eziokwu. Ọ gbakwara ha ume ka ha “na-amị mkpụrụ dị ukwuu.” (Jọn 15:​1-5, 8) Otu n’ime ụzọ ha si amị mkpụrụ ahụ bụ iji obi ha niile hụ ndị ọzọ n’anya. Ikwusa ozi ọma Jizọs kwusara, ya bụ, “ozi ọma Alaeze Chineke” so na ya.​—Luk 4:43; Jọn 15:10, 17.

 Lee obere vidio a ka ịhụ ihe akwụkwọ Jọn na-ekwu.

a Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe. Chineke hiwere Alaeze ahụ ka ọ chịa ụwa niile ma mezuo ihe o bu n’obi kee ụwa. (Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?” ka ị matakwuo banyere ya.