Ozi Ọma Matiu Dere 20:1-34

  • A kwụrụ ndị rụrụ ọrụ n’ubi vaịn otu ihe (1-16)

  • Jizọs kwukwara ọzọ na a ga-egbu ya (17-19)

  • Nne ụmụ Zebedi rịọrọ Jizọs ka o nye ụmụ ya ọkwá n’Alaeze Chineke (20-28)

    • Jizọs nyere ndụ ya ka a gbapụta ọtụtụ mmadụ (28)

  • Jizọs gwọrọ ndị ìsì abụọ (29-34)

20  “N’ihi na Alaeze eluigwe dị ka onyeisi ezinụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya.+ 2  Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego dinarịọs* maka otu ụbọchị, o zigara ha n’ubi vaịn ya. 3  Mgbe ọ pụkwara n’ihe dị ka n’awa nke atọ,* ọ hụrụ ndị ọzọ ka ha guzo n’ọma ahịa n’enweghị ihe ha na-arụ. 4  O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m. M ga-enye unu ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị.’ 5  Ha wee gawa. Ọ pụrụ ọzọ n’ihe dị ka n’awa nke isii* nakwa n’awa nke itoolu* wee mee otu ihe ahụ. 6  N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’ihe dị ka n’awa nke iri na otu* hụ ka ndị ọzọ guzo, wee sị ha, ‘Gịnị mere unu ji guzo ebe a ụbọchị niile n’enweghị ihe unu na-arụ?’ 7  Ha sịrị ya, ‘N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.’ O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m.’ 8  “Mgbe o ruru uhuruchi, onye nwe ubi vaịn ahụ gwara onye na-elekọtara ya ọrụ, sị, ‘Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha,+ malite n’onye ikpeazụ ruo n’onye mbụ.’ 9  Mgbe ndị awa nke iri na otu bịara, onye ọ bụla n’ime ha natara otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 10  N’ihi ya, mgbe ndị mbụ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka ukwuu. Ma a kwụkwara ha otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 11  Mgbe ha natara ya, ha malitere ịkatọ onyeisi ezinụlọ ahụ 12  wee sị ya, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa. Ma, ị kwụrụ anyị ihe ị kwụrụ ha n’agbanyeghị na anyị nọ n’anwụ na-arụgbu onwe anyị n’ọrụ kemgbe ụtụtụ.’ 13  Ma ọ gwara otu n’ime ha, sị, ‘Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. Ihe mụ na gị kwekọrịtara ọ́ bụghị na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs?*+ 14  Were ego gị lawa. Otu ihe ahụ m nyere gị ka m chọrọ inye onye ikpeazụ a. 15  Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị iji ihe m mee ihe masịrị m? Ka ị̀ na-emere m anyaụfụ* maka na m bụ ezigbo mmadụ?’*+ 16  Otú a ka ndị ikpeazụ ga-esi bụrụ ndị mbụ, ndị mbụ abụrụkwa ndị ikpeazụ.”+ 17  Mgbe Jizọs na-agbago Jeruselem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya iche, wee gwa ha n’okporo ụzọ,+ sị: 18  “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ n’ebe ahụ. Ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ.+ 19  Ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha were ya mee ihe ọchị, pịakwa ya ihe ma kpọgide ya n’osisi.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+ 20  Nne ụmụ Zebedi+ wee bịakwute ya, ya na ụmụ ya ndị nwoke, kpọọrọ ya isiala. Ọ bịara ịrịọ ya ka o meere ya ihe.+ 21  Jizọs sịrị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?” Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Kwuo ka ụmụ m ndị nwoke abụọ a soro gị nọdụ ala n’Alaeze gị, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị.”+ 22  Jizọs wee sị: “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Ùnu ga-aṅụli ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ?”+ Ha asị ya: “Anyị ga-aṅụli ya.” 23  O wee sị ha: “Unu ga-aṅụ ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ,+ ma ọ bụghị m na-ekpebi onye ga-anọ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.”+ 24  Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe a, ha wesoro ụmụnne abụọ ahụ iwe.+ 25  Ma Jizọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Ọ sịrị ha: “Unu ma na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị isi ha na-ejikwa aka ike achị ha.+ 26  O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ.+ Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 27  Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu.+ 28  Otú ahụ ka Nwa nke mmadụ mere. Ọ bịaghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi+ ma nye ndụ* ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.”+ 29  Mgbe ha si Jeriko na-apụ, ìgwè mmadụ sooro ya. 30  Ma, mgbe ndị ìsì abụọ ndị nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ nụrụ na Jizọs na-agafe, ha tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”+ 31  Ma ìgwè mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ. Ma ha tisikwuru mkpu ike, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 32  Jizọs wee kwụsị, kpọọ ha, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33  Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, mee ka anyị hụwa ụzọ.” 34  Jizọs meteere ha ebere, bitụ ha aka n’anya,+ ha ahụwa ụzọ ozugbo wee soro ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

^ Gụọ B14.
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
^ Ya bụ, ihe dị ka n’elekere ise nke mgbede.
^ Gụọ B14.
^ Gụọ B14.
^ Gụọ B14.
^ Na Grik, “anya gị ọ̀ dị njọ.”
^ Ma ọ bụ “m na-emesapụ aka.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”