Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?

Gịnị Mere Ndịàmà Jehova Anaghị Agba Ista?

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwukarị

 Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Ista bụ maka na ha abụghị Ndị Kraịst.

 Nke bụ́ eziokwu: Anyị kweere na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị. Anyị na-emekwa ike anyị niile ‘isochi nzọụkwụ ya anya.’—1 Pita 2:21; Luk 2:11.

 Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Unu ekweghị na Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.

 Nke bụ́ eziokwu: Anyị kweere na Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. O so n’ihe bụ́ isi Onye Kraịst ọ bụla ga-ekwere, anyị na-ekwụkarịkwa ya ma anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.—1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4, 12-15.

 Ihe ndị mmadụ na-ekwu: Ọ nadịghị emetụ unu n’ahụ́ na ụmụaka unu esoghị na-enwe obi ụtọ a na-enwe n’oge Ista.

 Nke bụ́ eziokwu: Anyị hụrụ ụmụaka anyị n’anya. Anyị na-agbakwa mbọ na-azụ ha ma na-enyere ha aka inwe obi ụtọ.—Taịtọs 2:4.

Gịnị mere Ndịàmà Jehova anaghị agba Ista?

  •   Ememme Ista esighị na Baịbụl.

  •   Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-echeta ọnwụ ya, ọ bụghị mbilite n’ọnwụ ya. Anyị na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ n’oge dabara n’oge Baịbụl kwuru na ọ nwụrụ.—Luk 22:19, 20.

  •   Anyị ma na Ista adịghị Chineke mma n’ihi na ihe ndị a na-eme na ya si n’ememme ndị oge ochie na-emere chi ọmụmụ ma ọ bụ chi na-eme ka ihe a kụrụ n’ubi too. Chineke chọrọ “ofufe a na-ekewaghị ekewa,” ọ ga-ewekwa ya iwe ma onye sịrị na ya na-efe ya na-eme ememme ndị ọ na-anabataghị.—Ọpụpụ 20:5; 1 Ndị Eze 18:21.

 Anyị kwetasiri ike na ihe mere anyị anaghị agba Ista bụ n’ihi ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara anyị ka jiri “ezi amamihe na ikike iche echiche” anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme kama iso omenala. (Ilu 3:21; Matiu 15:3) Ọ bụ eziokwu na anyị na-agwa ndị mmadụ ihe anyị kweere banyere Ista ma ha jụọ anyị, ma anyị na-ahapụ onye ọ bụla ka o jiri aka ya kpebie ma ọ̀ ga-agba Ista ma ọ bụ na ọ gaghị agba.—1 Pita 3:15.