Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ùnu Bụ Ndị Kraịst?

Ùnu Bụ Ndị Kraịst?

Ee. Anyị bụ Ndị Kraịst. Lee ihe ndị mere anyị ji sị na anyị bụ Ndị Kraịst:

  • Anyị na-agba mbọ ịkụzi ihe Jizọs Kraịst kụziri, na-agbakwa mbọ ịkpa àgwà ka ya.—1 Pita 2:21.

  • Anyị kweere na ọ bụ n’aka Jizọs ka anyị ga-esi nweta nzọpụta, kwerekwa na “aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta anyị.”—Ọrụ Ndịozi 4:12.

  • A na-eme ndị na-aghọ Ndịàmà Jehova baptizim n’aha Jizọs.—Matiu 28:18, 19.

  • Anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs.—Jọn 15:16.

  • Anyị kweere na Jizọs bụ Isi nke nwoke ọ bụla.—1 Ndị Kọrịnt 11:3.

Ma, e nwere ihe ụfọdụ anyị ji dị iche na chọọchị ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst. Anyị kweere na Jizọs bụ Ọkpara Chineke dị ka Baịbụl kwuru, ọ bụghị Pesịn nke abụọ nke Atọ n’Ime Otu. (Mak 12:29) Anyị ekwetaghị na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, anyị ekwetaghịkwa na Baịbụl kwuru na Chineke na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Anyị ekweghị na ndị na-edu ndú ná nzukọ Chineke kwesịrị inwe aha pụrụ iche a ga na-etu ha iji gosi na ha karịrị ndị ọzọ.—Ekliziastis 9:5; Ezikiel 18:4; Matiu 23:8-10.

 

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE

Mkpụrụ Obi Ọ̀ Na-anwụ Anwụ?

Gụọ ihe Baịbụl kwuru banyere mkpụrụ obi.

ỤLỌ NCHE

Ndị Ajọ Omume Hà Na-ata Ahụhụ na Hel?

Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ọ̀ ga-akatali obi na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ruo mgbe ebighị ebi?