Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?

Anya Chineke Dị n’Ebe Ị Nọ

Anya Chineke Dị n’Ebe Ị Nọ

‘Anya Chineke na-ahụ ụzọ mmadụ, ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile.’—JOB 34:21.

Nne ma ọ bụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya na-aka elebara nwa ya nke dị obere anya

IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: Otu nchọpụta e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọ bụrụ na e buru ihe ruru otu narị ijeri planet (ma ọ bụ ụwa) tinye n’ime ụyọkọ kpakpando nke ụwa anyị a dị na ya, ha niile ga-abanyecha n’ime ya. Ebe ọ bụ na ụyọkọ kpakpando ndị Chineke kere buru ibu otú a, ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: ‘Olee otú Chineke onye pụrụ ime ihe niile ga-esi na-ahụ ihe ụmụ mmadụ na-eme n’ime obere ụwa anyị a?’

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: Chineke enyeghị anyị Baịbụl ma chefuzie anyị. Kama ime otú ahụ, ọ gwara anyị ihe ga-eme ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: “M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.”—Abụ Ọma 32:8.

Ka anyị leba anya n’ihe mere otu nwaanyị Ijipt aha ya bụ Hega. Nwaanyị a dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ tupu a mụọ Kraịst. Mgbe Hega tụụrụ ime, o bidoro ledawa nne ya ukwu bụ́ Seraị anya. N’ihi ya, Seraị wedara ya ala, nke mere na ọ gbagara n’ala ịkpa. Chineke ò chefuziri Hega maka na o mere ihe na-adịghị mma? Baịbụl sịrị: “Mmụọ ozi Jehova hụrụ ya.” Mmụọ ozi ahụ gwara Hega, sị: “Ahụ́ a na-emekpa gị eruwo Jehova ntị.” Hega gwaziri Jehova, sị: “Ị bụ Chineke nke na-ahụ ụzọ.”—Jenesis 16:4-13.

“Chineke nke na-ahụ ụzọ” na-ahụkwa gịnwa. Dị ka ihe atụ, nwaanyị hụrụ ụmụ ya n’anya na-aka eleru ụmụ ya ndị nke obere anya n’ihi na ọ bụ ha ka e kwesịrị ilebara anya karịa ndị nke totụrụla eto. Chineke na-emekwa otú ahụ. Ọ na-aka elebara anyị anya mgbe anyị nọ ná nsogbu nakwa mgbe anyị chọrọ onye ga-enyere anyị aka. Jehova sịrị: “Ọ bụ ebe dị elu na ebe dị nsọ ka m bi, mụ na onye e gburu mmụọ ya na onye mmụọ ya dị ala bikwa, iji mee ka a tụtee mmụọ nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, meekwa ka obi nke ndị e gburu mmụọ ha nwee ume.”—Aịzaya 57:15.

Ma, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Olee otú o si bụrụ na anya Chineke dị n’ebe m nọ? Ọ̀ bụ otú m dị n’anya ka ọ na-ahụ, ka ọ̀ na-ahụ ihe dị m n’obi ma ghọta ụdị onye m bụ?’