Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Meenụ “Ka Obi Na-atọ Jehova Ụtọ”

Meenụ “Ka Obi Na-atọ Jehova Ụtọ”

Ememme Ngụcha Akwụkwọ Nke Klas Nke Otu Narị na Iri Atọ na Otu Nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied

Meenụ “Ka Obi Na-atọ Jehova Ụtọ”

NA SEPTEMBA 10, 2011, e mere ememme ngụcha akwụkwọ nke klas nke otu narị na iri atọ na otu nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ndị bịara ememme ahụ bụ ndị ezinụlọ ndị ahụ gụchara akwụkwọ, ndị enyi ha nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ná mbido nnọkọ ahụ, obi kooro ụmụ akwụkwọ ahụ n’elu, korokwa ndị ga-ekwu okwu. Ma ná ngwụcha nnọkọ ahụ, puku mmadụ itoolu na iri isii na atọ ndị bịara nnọkọ ahụ ji ihu ọchị na obi ụtọ laa n’ihi na okwu, ihe ngosi, na ajụjụ ọnụ ndị a gbara ndị mmadụ n’ụbọchị ahụ tọrọ ha ụtọ.

Stephen Lett, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ onyeisi oche nke nnọkọ ahụ, ọ bụkwa ya kwuru okwu mmeghe. Ọ gụrụ amaokwu Baịbụl ndị kwuru okwu ka à ga-asị na Jehova Chineke nwere anya, ntị, aka, na ogwe aka otú mmadụ nwere, ọ kọwakwara amaokwu ndị ahụ.

Ebe mbụ ọ gụrụ bụ 2 Ihe E Mere 16:9, bụ́ ebe kwuru na “anya Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha jiri obi ha niile na-ejere Jehova ozi. Ọ gwakwara ha ka ha na-ahụ ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma, otú ahụ Chineke si eme. Ebe ọzọ Nwanna Lett gụrụ bụ 1 Pita 3:12, bụ́ ebe kwuru na ntị Jehova dị n’arịrịọ ndị ezi omume na-arịọsi ya ike. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha na-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile, na-eburu n’obi na Jehova chọrọ ka ha na-ekpegara ya ekpere.

Ọkà okwu ahụ gụkwara Aịzaya 41:13, bụ́ ebe Jehova kwere nkwa, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’” Nwanna Lett kwuru otú ọ dị ya n’obi, sị: “Ùnu hụrụ okwu na-akasi obi Jehova kwuru ebe a? Ọ na-amatị aka ya sekpụrụ anyị n’aka.” Ọ gwaziri ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha kwe ka Jehova na-enyere ha aka mgbe niile nakwa ka ha ghara ịjụ enyemaka ya. O kwukwara na ụmụ akwụkwọ ahụ nwere ike ime otú ahụ Jehova si eme. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-enyere ndị ọzọ aka.

N’ikpeazụ, Nwanna Lett gụrụ Aịzaya 40:11. Ọ gwara ndị na-ege ntị na amaokwu Baịbụl ahụ gosiri otú Jehova si hụ anyị n’anya. Nwanna Lett sịrị: “Jehova na-eji ogwe aka ya achịkọta anyị, na-ekurukwa anyị n’obi ya.” Olee ihe anyị kwesịrị ime? Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha na-adị nwayọọ ka nwa atụrụ, ka Jehova nwee ike ikuru ha n’obi ya.

“Anyị Nwere Akụ̀ A n’Arịa E Ji Ụrọ Kpụọ”

David Splane, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, kwuru okwu n’isiokwu a si n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Gịnị bụ akụ̀ ahụ? Ọ̀ bụ amamihe, ọ̀ bụ ihe ọmụma? Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Mba. Akụ̀ ahụ Pọl onyeozi kwuru okwu ya bụ ‘ozi ọma’ nke e ji ‘na-eme ka eziokwu ahụ pụta ìhè.’” (2 Ndị Kọrịnt 4:1, 2, 5) Nwanna Splane chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ọnwa ise ha nọrọ n’ụlọ akwụkwọ a akwadebela ha maka ọrụ pụrụ iche ha ga-arụ n’ozi Chineke. Ha kwesịrị iji ọrụ ahụ kpọrọ nnọọ ihe.

Ọkà okwu ahụ kwuru na ‘arịa ahụ e ji ụrọ kpụọ’ bụ ahụ́ anyị. O kwukwara na o nwere ihe dị iche n’arịa e ji ụrọ kpụọ na nke e ji ọlaedo kpụọ. A naghị etinyekarị ihe n’arịa e ji ọlaedo kpụọ, ma a na-etinyekarị ihe na nke e ji ụrọ kpụọ. Ọ bụrụ na anyị etinye akụ̀ dị oké ọnụ ahịa n’arịa e ji ọlaedo kpụọ, anyị nwere ike iwere arịa ahụ ka ihe dị mkpa karịa akụ̀ ahụ anyị tinyere n’ime ya. Nwanna Splane gwara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: ‘Unu ekwesịghị ime ka ndị mmadụ towe unu. Ebe unu ga-abụ ndị na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ, unu kwesịrị ime ka ndị mmadụ na-enye Jehova otuto. Unu bụ arịa nkịtị e ji ụrọ kpụọ.’

Nwanna Splane gakwara n’ihu ịkọwa na n’oge ochie, a kpụrụ arịa ụfọdụ e ji ụrọ kpụọ ka ọkụ ghara imebi ha, e jikwa ihe ga-eme ka ha ghara ịkụpe ngwa ngwa mee ụfọdụ n’ime ha. Olee otú ụmụ akwụkwọ ahụ ga-esi adị ka arịa ndị ahụ? Ọ gwara ha na n’ime ọnwa ole na ole ha malitere ozi n’ebe e zigara ha, ha ga-enwe nsogbu ụfọdụ ndị ga-eme ka ha mụta inwe ndidi. Ọ ga-eme ka ha ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ ma mmadụ gwa ha okwu na-adịchaghị ha mma. Nwanna Splane sịrị: “Unu ga-achọpụta na unu ga-edili nsogbu ndị bịaara unu karịadị ka unu chere.” Ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka Jehova nyere ozi a dị ezigbo mkpa, ọ bụ anyị bụ́ arịa nkịtị e ji ụrọ kpụọ ka o nyere ya. Nwanna Splane sịziri: “Nke ahụ gosiri na Jehova ma na unu ga-ejeli ozi a.”

“I So Ndị Ji Ụkwụ Gbaa Ọsọ . . . Oleezi Otú Ị Ga-esi Soro Ịnyịnya Gbaa Ọsọ?”

Samuel Herd, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ajụjụ a: “Ọ bụrụ na a sị gị gbaa ọsọ, ị̀ ga-agbasili ọsọ ike? Kilomita ole ka ị ga-agbali?” Gịnị mere o ji jụọ ha ajụjụ a? Ọkà okwu ahụ ji ihe ndị mere ụmụ akwụkwọ ahụ tụnyere ihe ndị mere Jeremaya onye amụma. O siiri onye amụma ahụ ike idi nsogbu ndị bịaara ya. Ma nsogbu ndị kadị njọ na-abịa. N’ihi ya, Jehova jụrụ ya, sị: “Ebe ọ bụ na i so ndị ji ụkwụ gbaa ọsọ, ha wee mee ka ike gwụ gị, oleezi otú ị ga-esi soro ịnyịnya gbaa ọsọ?”—Jeremaya 12:5.

Ọkà okwu ahụ kọwara otú ihe ọ na-ekwu si gbasa ụmụ akwụkwọ ahụ. Ọ sịrị: “O nwere ike ịdị unu ka ùnu so ịnyịnya gbaa ọsọ n’ihi ule niile unu lere n’ụlọ akwụkwọ a. Ma ule ndị ahụ dị ka iso ndị ji ụkwụ gbaa ọsọ, ọ bụghị iso ịnyịnya gbaa ọsọ. Mgbe unu ruru n’ebe a ga-eziga unu, unu ga-eso ịnyịnya gbaa ọsọ, ya bụ, unu ga-enwe nsogbu ndị unu na-echetụghịdị n’echiche na unu ga-enwe. Olee ihe unu ga-eme n’oge ahụ? Ihe ndị a kụziiri unu n’ụlọ akwụkwọ Gilied akwadebela unu ka unu nwee ike iso ịnyịnya gbaa ọsọ ma ike agaghị agwụ unu.” Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha na-azụ onwe ha n’ofufe Chineke, ka ha na-amụchi Baịbụl anya, ma na-ekpechi ekpere anya.

Nwanna Herd kwuru na ụfọdụ n’ime ndị a a ga-eziga obodo ọzọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma ga-enwe nsogbu ndị nwere ike ịkụda ha mmụọ ma ọ bụkwanụ ndị mmadụ agaghị ege ha ntị. Nsogbu ga-abịara ndị ọzọ bụ ọrịa ma ọ bụ ya adị ụfọdụ ka ha erughị eru ịrụ ọrụ ndị e nyere ha. Ma ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka obi sie ha ike na ha nwere onye ga-enyere ha aka imeri nsogbu ọ bụla bịaara ha ma mee ka ike ghara ịgwụ ha. Ọ gwaziri ha, sị: “Ma ùnu so ndị ji ụkwụ ma ọ bụ ịnyịnya agba ọsọ, tụkwasịnụ Chineke obi na ọ ga-enyere unu aka ka unu gbaruo ọsọ ahụ n’isi. Ọ bụ mgbe unu tụkwasịrị Jehova obi ka unu ga-eme nke ọma n’ozi unu ma wetara Jehova nsọpụrụ na otuto.”

Okwu Ndị Ọzọ E Kwuru ná Nnọkọ Ahụ

“Ewetala Ole na Ole.” John Ekrann, onye so na kọmitii na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Amerịka, kwuru okwu n’isiokwu a. Ọ kọrọ akụkọ Ịlaịsha onye amụma na otu nwaanyị di ya nwụrụ, onye a chọrọ ire ụmụ ya ka ha gbawa ohu. (2 Ndị Eze 4:1-7) Nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nwere otu obere ite mmanụ. Ịlaịsha gwara ya ka ọ gaa na nke ndị agbata obi ya rịọta ha ite mmanụ. Ọ sịrị ya: “Ewetala ole na ole.” Jehova si n’aka Ịlaịsha rụọ ọrụ ebube nke mere ka mmanụ ju n’ite mmanụ niile nwaanyị ahụ wetara. Nwaanyị ahụ reziri mmanụ ahụ, jiri ego o retara kwụọ ụgwọ o ji, jirikwa nke fọrọ zụọ ụmụ ya ruo oge ụfọdụ.

Gịnị ka ụmụ akwụkwọ ahụ ga-amụta n’akụkọ a? Mgbe nwaanyị ahụ di ya nwụrụ na-anata ndị mmadụ ite mmanụ ndị ahụ, o doro anya na ọ gaghị họwa ite ọ ga-anara ahọwa. Ọkà okwu ahụ kwuru, sị: “Ọ ga-abụrịrị na ọ naara arịa ọ bụla e nwere ike iji tinye mmanụ, obi ga-atọdị ya ụtọ ma ọ bụrụ na e nyere ya ndị nke buru ibu.” Nwanna Ekrann gbaziri ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha nara ọrụ ọ bụla e nyere ha, ma ò buru ibu ma ọ̀ dị obere. Ọ sịrị ha: “Unu ahọla ọrụ.” O chetakwaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ọ bụ n’ihi na nwaanyị ahụ di ya nwụrụ gere Ịlaịsha ntị mere o ji nweta ngọzi buru ibu. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ọ bụ otú okwukwe anyị haruru na otú anyị jiruru ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ga-ekpebi otú ngọzi anyị ga-enweta ga-aha. Ọkà okwu ahụ sịziri: “Unu emeterela onwe unu ebere.”

“Ha Bụụrụ Anyị Ihe Oriri.” William Samuelson, onye na-elekọta Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, kwuru okwu n’isiokwu a si n’Ọnụ Ọgụgụ 14:9. O kwuru banyere àgwà ọma Jọshụa na Keleb kpara. “Ihe oriri” e kwuru okwu ya n’amaokwu ahụ pụtara na ọ ga-adịrị ndị Izrel mfe imeri ndị Kenan nakwa na ọ bụrụ na ha emerie ha, obi ga-esikwu ndị Izrel ike. Gịnị ka ụmụ akwụkwọ ahụ ga-amụta na nke a? Ọkà okwu ahụ sịrị: “N’ebe ọ bụla unu ga-aga ikwusa ozi ọma n’ọdịnihu, werenụ ihe isi ike ọ bụla ga-abịara unu ka ihe ga-agba unu ume ma mee ka okwukwe unu sikwuo ike.”

“Okwukwe Ha Ọ̀ Ga-esi Ike Ma Nsogbu Bịara Ha n’Ọdịnihu?” Sam Roberson, otu n’ime ndị nkụzi n’ụlọ akwụkwọ Gilied, kwuru okwu n’ihe Pọl onyeozi kwuru banyere ụfọdụ ndị ‘okwukwe ha kpuru dị ka ụgbọ.’ (1 Timoti 1:19) Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha nyere ndị ọzọ aka ka ha nwee okwukwe siri ike na Jehova Chineke. Ọ sịrị: “E nwere ike iji ọrụ unu tụnyere ọrụ onye na-akpụ ụ́zụ́.” Olee otú ọrụ ha si yie ọrụ onye na-akpụ ụ́zụ́? Onye na-akpụ ụ́zụ́ na-akpụ obere ígwè dị iche iche ma jikọta ha ọnụ ka ha bụrụ otu agbụ ígwè. A na-eji agbụ ígwè ahụ ekegide ụgbọ mmiri n’otu ebe ka mmiri ghara iburu ya. Otú ahụkwa ka ụmụ akwụkwọ a ga-esi enyere ndị ha na-akụziri Baịbụl aka na-akpa àgwà ndị na-atọ Jehova ụtọ, nke ga-enyekwara ha aka inweta nzọpụta.

Ọkà okwu ahụ kwuru na obere ígwè ndị ahụ e jikọtara ka ha bụrụ agbụ ígwè nọchiri anya àgwà asatọ e kwuru okwu ha na 2 Pita 1:5-8. Nwanna Roberson kwuru na ọ bụrụ na ụmụ akwụkwọ ahụ enyere ndị ha na-amụrụ Baịbụl aka ịhụ otú Jehova si akpa àgwà ndị ahụ, ndị ha na-amụrụ Baịbụl na Jehova ga-ebido ịdị n’ezigbo mma. Ha ga-enwekwa ike imeri ọnwụnwa ọ bụla bịaara ha.

Ajụjụ Ọnụ na Ihe Ndị Mere n’Ozi Ọma

Michael Burnett, onye ọzọ bụ́ onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ ahụ, gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha kọọ ihe ụfọdụ mere mgbe ha gara ozi ọma n’oge ahụ ha nọ n’ụlọ akwụkwọ, nakwa ka ha gosi otú ihe ndị ahụ si mee. Obi tọrọ ndị na-ege ntị ụtọ mgbe ụmụ akwụkwọ ahụ kọrọ otú ha si kwusaara ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ha, n’ebe a na-ere ahịa, n’ọdụ ụgbọelu, nakwa otú otu n’ime ha si zie otu onye ozi ọma na fon mgbe onye ahụ kpọrọ ebe ọ na-ebughị n’obi ịkpọ.

Michael Hansen, onye na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Amerịka, gbaziri ụmụnna nwoke atọ ajụjụ ọnụ. Ha atọ ekwusaala ozi ọma ọtụtụ afọ ná mba ndị ọzọ. Ha bụ Stephen McDowell, onye na-ekwusa ozi ọma na Panama, Mark Noumair, onye kwusara ozi ọma na Kenya, nakwa William Yasovsk, onye kwusara ozi oma na Paragụwaị. Ihe ndị ha kwuru mere ka isiokwu okwu ahụ nke bụ́, “Ka Ime Uche Jehova Na-atọ Gị Ụtọ” doo anya. (Abụ Ọma 40:8) Dị ka ihe atụ, Mark Noumair kọrọ ihe ndị mere ya na nwunye ya obi ụtọ mgbe ha jere ozi n’obodo e zigara ha. Ihe mere ha obi ụtọ bụ otú ha na ọtụtụ Ndịàmà Jehova bi n’obodo ahụ si ghọọ ezigbo ndị enyi. Ihe ndị ọzọ mere ha obi ụtọ bụ ịhụ otú Ndịàmà Jehova bi ebe ahụ si na-eme ihe ọgbakọ Jehova gwara ha mee, mgbanwe ndị ha mere ná ndụ ha, nakwa otú Jehova si gọzie ha. Ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ na a ka nwere ihe ndị ga-emekwu ha obi ụtọ n’ọdịnihu.

Otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ gụrụ akwụkwọ ozi ekele ụmụ akwụkwọ ahụ dere. Nwanna Lett mechikwara nnọkọ ahụ mgbe ọ gwara ụmụ akwụkwọ ahụ ka ha na-akpa àgwà ka ndị maara ihe. O kwuru na ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ha ga-eme “ka obi na-atọ Jehova ụtọ.” O doro anya na ụmụ akwụkwọ a ga-eme ka obi na-atọ Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na ha ejiri obi ha niile na-eje ozi n’ebe e zigara ha.—Aịzaya 65:19.

[Chaatị/Map dị na peeji nke 31]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Mba ole ha si 10

Nkezi afọ ndụ ha 35

Nkezi afọ ole ha nọrọla kemgbe e mere ha baptizim 19

Nkezi afọ ole ha kwusarala ozi ọma oge niile 14

[Map]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E zigara ha mba ndị e depụtara n’okpuru ebe a

EBE NDỊ E ZIGARA HA

BENIN

BRAZIL

BỌLGERIA

BURUUNDI

KAMERUUN

KANADA

SENTRAL AFRỊKAN RỊPỌBLIK

JAMANỊ

GANA

HỌNG KỌNG

INDONISHA

KENYA

LAỊBERỊA

LITUENIA

MALESHA

MOZAMBIK

NIPỌL

PANAMA

PARAGỤWAỊ

SIERA LIỌN

SLOVAKỊA

SAỤT AFRỊKA

AMERỊKA

VENEZUWELA

[Foto dị na peeji nke 30]

Ebe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ahụ na-egosi ihe mere mgbe ha gara ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị Gụchara Akwụkwọ na Klas nke Otu Narị na Iri Atọ na Otu nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied

N’aha ndị e dere n’okpuru ebe a, ahịrị nke ọ bụla nwere nọmba malite n’ihu gaa n’azụ. N’ahịrị nke ọ bụla, aha ha si n’aka ekpe gaa n’aka nri.

(1) Lesch, C.; Lesch, N.; Shakarjian, P.; Shakarjian, T.; Budden, R.; Budden, K.; Nash, T.; Nash, L.

(2) Tremblay, E.; Tremblay, C.; Garvey, D.; Garvey, G.; Gaunt, R.; Gaunt, P.; Lau, J.; Lau, J.

(3) Davis, S.; Davis, S.; Sargeant, J.; Sargeant, J.; Fonseca, C.; Fonseca, S.; Thenard, E.; Thenard, A.

(4) Petratyotin, A.; Petratyotin, R.; Reyes, N.; Reyes, N.; Eisiminger, B.; Eisiminger, S.; Hacker, J.; Hacker, C.

(5) Hartman, E.; Hartman, T.; Goolia, W.; Goolia, K.; Thomas, J.; Thomas, E.; Okazaki, N.; Okazaki, M.

(6) Mills, C.; Mills, A.; Benning, L.; Benning, T.; Sobiecki, S.; Sobiecki, T.; Gagnon, L.; Gagnon, E.

(7) Hansen, B.; Hansen, M.; Fahie, A.; Fahie, M.; Dalgaard, J.; Dalgaard, J.; Andersson, M.; Andersson, R.