Pita Nke Abụọ 1:1-21

  • Ekele (1)

  • Gbalịsienụ ike ka unu ghara ịkwụsị ịna-efe Chineke (2-15)

    • Ihe ndị ọzọ anyị ga na-eme ma e wezụga inwe okwukwe (5-9)

  • Obi siri anyị ike na amụma ndị Chineke buru ga-emezu (16-21)

1  Abụ m Saịmọn Pita, ohu Jizọs Kraịst na onyeozi ya. M na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị a kụziiri ọmarịcha eziokwu a kụzikwaara anyịnwa* maka na Chineke na Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta anyị, bụ ndị ezi omume. 2  Ka Chineke meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu n’ihi na unu amatala ya na Onyenwe anyị Jizọs nke ọma.+ 3  N’ihi otú a anyị si mata ha nke ọma, Chineke enyela anyị ike ya, nyekwa anyị ihe niile anyị kwesịrị inwe iji na-efe ya. Ọ kpọrọ anyị+ maka na ọ dị ebube, nweekwa obiọma. 4  Ọ bụkwa ya mere o ji mee ka anyị mara ọmarịcha nkwa ndị na-enweghị atụ o kwere,+ ka anyị wee dịrị ike otú ọ dị+ n’ihi nkwa ndị ahụ o kwere anyị maka na anyị anaghị eme omume ọjọọ ndị ụwa na-eme, nke agụụ ihe ọjọọ na-akpata. 5  N’ihi ya, na-agbasinụ mbọ ike+ ka unu nwee okwukwe, na-akpakwa àgwà ọma.+ Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu mara ihe,+ 6  na-ejide onwe unu,+ na-atachi obi, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.+ 7  Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu hụ ụmụnna niile n’anya ka ụmụnne. Hụkwanụ mmadụ niile n’anya.+ 8  Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, na-emekwa ha mgbe niile, unu ga-eji ihe unu ma nke ọma gbasara Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-arụ ihe dị mma, unu agaghịkwa anọ nkịtị.+ 9  Ma, onye ọ bụla na-anaghị eme ihe ndị a kpuru ìsì. O mechiri anya ya ka ọ ghara ịhụ ìhè,*+ chefuokwa na Chineke asachapụla mmehie ndị o mere+ n’oge gara aga. 10  N’ihi ya, ụmụnna m, gbalịsienụ ike ka unu ghara ịkwụsị ịna-efe Chineke, ebe ọ kpọrọ unu,+ họrọkwa unu. Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị akwụsị ife Chineke.+ 11  N’eziokwu, ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, a ga-agọzi unu otú na-enweghị atụ, ya bụ, unu ga-abanye n’Alaeze ga-adịru ebighị ebi+ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.+ 12  N’ihi ya, m chọrọ ịna-echetara unu ihe ndị a mgbe niile n’agbanyeghị na unu ma ha, bụrụkwa a kwaa a kwụrụ n’eziokwu a na-akụziri anyị. 13  Ma, ebe ọ bụ na m ka dị ndụ n’anụ ahụ́,*+ echere m na ọ dị mma ichetara unu ihe ndị a.+ 14  O doro m anya na anụ ahụ́* m agaghịzi adịte aka, otú Onyenwe anyị Jizọs Kraịst gwara m.+ 15  M ga na-eme ike m mgbe niile otú ọ ga-abụ mgbe m na-anọghịzi, unu ga-enwe ike ịna-echeta ihe ndị a n’onwe unu. 16  Ihe anyị gwara unu gbasara ike Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na ọnụnọ ya abụghị akụkọ ụgha ndị mmadụ chepụtara iji duhie ibe ha, kama ọ bụ ihe anyị ji anya anyị hụ gbasara ebube ya.+ 17  N’ihi na Chineke bụ́ Nna mere ka ọ dị ebube, meekwa ka a na-asọpụrụ ya. Chineke, onye ebube na-enweghị atụ na-esi n’aka ya, mere ihe a mgbe o kwuru gbasara ya, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+ 18  N’eziokwu, anyị nụrụ olu si n’eluigwe kwuo ihe a mgbe anyị na ya nọ n’ugwu nsọ. 19  Ọ bụ ya mere obi ji sie anyị ike na amụma ndị Chineke buru ga-emezu. Ọ dị mma na unu na-echebara amụma ndị a echiche. N’ime obi unu, ha ga-adị ka ọkụ*+ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị, nke na-enwugide ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ+ apụta. 20  N’ihi na unu bu ụzọ mara na o nweghị amụma dị n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ echiche mmadụ. 21  N’ihi na o nwetụbeghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma,+ kama mmụọ nsọ nọ na-edu ndị mmadụ, ha ana-ekwu ihe Chineke chọrọ ka ha kwuo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “unu ndị nwere okwukwe pụrụ iche anyịnwa nwekwara.”
O nwere ike ịbụ, “ka o kpuo ìsì, ghara ịhụcha ụzọ.”
Na Grik, “m ka nọ n’ụlọikwuu a.”
Na Grik, “ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “oriọna.”