Ọnụ Ọgụgụ 14:1-45

  • Ndị Izrel chọrọ ịlaghachi n’Ijipt (1-10)

    • Akụkọ ọma Joshụa na Keleb kọrọ (6-9)

  • Iwe were Jehova; Mosis rịọchiteere ndị Izrel arịrịọ (11-19)

  • Ahụhụ ha ga-ata: Ha ga-agagharị n’ala ikpa afọ iri anọ (20-38)

  • Ndị Amalek meriri ndị Izrel (39-45)

14  Nzukọ ahụ niile wee malite ibe ákwá. Ha nọ na-eti mkpu, na-ebesikwa ákwá ike n’abalị ahụ niile.+  Ndị Izrel niile wee malite ịkatọ* Mosis na Erọn.+ Nzukọ ahụ niile kwukwara okwu ọjọọ banyere ha, sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ n’Ijipt ma ọ bụkwanụ ma a sị na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a.  Gịnị mere Jehova ji akpọta anyị n’ala a ka e jiri mma agha gbuo anyị?+ A ga-akpọkọrọ ndị nwunye anyị na ụmụ anyị.+ Ọ́ kaghị mma ka anyị laghachi n’Ijipt?”+  Ha nọ na-agwadị ibe ha, sị: “Ka anyị mee otu onye onye ndú anyị ma laghachi n’Ijipt!”+  Mosis na Erọn wee gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala n’ihu nzukọ Izrel niile ndị gbakọrọ n’ebe ahụ.  Joshụa+ nwa Nọn na Keleb+ nwa Jefune, bụ́ ndị so gaa nyopụta otú ala ahụ dị, dọwara uwe ha.  Ha wee gwa nzukọ Izrel niile, sị: “Ala ahụ anyị gara nyopụta otú ọ dị bụ nnọọ ezigbo ala.+  Ọ bụrụ na ihe anyị dị Jehova mma, ọ ga-akpọba anyị n’ala ahụ ma nye anyị ya. Ọ bụ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+  Ma, unu anwala anwa nupụrụ Jehova isi. Unu atụla ndị ala ahụ egwu+ n’ihi na anyị ga-emeri ha.* E wepụla ihe na-echebe ha. Jehova nọnyeere anyị.+ Unu atụla ha egwu.” 10  Ma, nzukọ ahụ niile kwuru ka a tụọ ha nkume.+ Ma, ebube Jehova pụtara n’elu ụlọikwuu nzute n’ihu ndị Izrel niile.+ 11  Jehova gwaziri Mosis, sị: “Olee mgbe ndị a ga-akwụsị ịkparị m?+ Olee mgbe ha ga-amalite inwe okwukwe n’ebe m nọ ebe ọ bụ na ha ahụla ọrụ ebube niile m rụrụ* n’ihu ha?+ 12  Ka m mee ka ha rịawa ọrịa ọjọọ ma chụpụ ha. Ka m mezie ka ị bụrụ nnukwu mba, nke dị ike karịa ha.”+ 13  Ma Mosis gwara Jehova, sị: “Ndị Ijipt, bụ́ ndị i ji ike gị kpọpụta ndị a n’aka ha, ga-anụ ya.+ 14  Ha ga-agwakwa ya ndị bi n’ala a. Ndị bi n’ala a anụkwala na gịnwa, bụ́ Jehova, nọnyeere ndị a+ nakwa na ha ahụla gị ihu na ihu.+ Ị bụ Jehova. Ígwé ojii gị dị n’elu isi ha. I ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị.+ 15  Ọ bụrụ na i gbuchapụ ndị a otu mgbe, mba ndị nụrụ ude gị ga-asị: 16  ‘Jehova enweghị ike ịkpọba ndị a n’ala ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ha, ọ bụ ya mere o ji gbuo ha n’ala ịkpa.’+ 17  Ugbu a, Jehova, biko, gosi ike gị dị ukwuu, otú i kwere ná nkwa, sị: 18  ‘Jehova, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya* dị ukwuu,+ onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu. Ma ọ gaghị anwa anwa hapụ ịta onye ikpe mara ahụhụ, kama ọ na-ata ụmụ nakwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha mere.’+ 19  Biko, n’ihi ịhụnanya gị* dị ukwuu, gbaghara ndị a mmehie ha, otú i si na-agbaghara ha malite n’Ijipt ruo ugbu a.”+ 20  Jehova wee sị: “Agbagharala m ha otú i kwuru.+ 21  Ma, ebe ọ bụ na mụnwa bụ́ Jehova na-adị ndụ, ebube m ga-ejupụta ụwa niile.+ 22  Ma e nweghị otu onye n’ime ndị niile hụrụ ebube m nakwa ọrụ ebube+ ndị m rụrụ* n’Ijipt nakwa n’ala ịkpa ma ka na-anwa m ọnwụnwa+ ugboro iri a, gharakwa ige m ntị,+ 23  ga-ahụ ala m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na m ga-enye ha. N’eziokwu, e nweghị otu onye n’ime ndị na-akparị m ga-ahụ ya.+ 24  Ma ebe ọ bụ na otú Keleb+ ohu m si ele ihe anya dị iche,* ya ejirikwa obi ya niile na-eso m, m ga-eme ka ọ banye n’ala ahụ ọ gara, ụmụ ya ga-enwetakwa ya.+ 25  Tụgharịanụ echi gawa n’ala ịkpa dị n’ụzọ Oké Osimiri Uhie+ ebe ọ bụ na ndị Amalek na ndị Kenan+ bi na ndagwurugwu.” 26  Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 27  “Olee mgbe nzukọ ọjọọ a ga-akwụsị nkatọ a ha na-akatọ m?*+ Anụla m nkatọ ndị Izrel na-akatọ m.+ 28  Gwa ha, sị, ‘Jehova kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-eme unu ihe m nụrụ unu kwuru.+ 29  N’ala ịkpa a ka ozu unu ga-atọgbọrọ,+ ya bụ, unu niile ndị katọrọ m,* bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe.+ 30  E nweghị onye n’ime unu ga-aba n’ala ahụ m ṅụrụ iyi na unu ga-ebi na ya,+ ma e wepụ Keleb nwa Jefune na Joshụa nwa Nọn.+ 31  “‘“M ga-akpọrọ ụmụ unu, ndị unu sịrị na a ga-akpọkọrọ,+ kpọba ha n’ala ahụ. Ha ga-ekpori ndụ n’ala ahụ unu jụrụ.+ 32  Ma ozu unu ga-atọgbọrọ n’ala ịkpa a. 33  Ụmụ unu ndị nwoke ga na-azụ atụrụ n’ala ịkpa a ruo afọ iri anọ.+ Ha ga-aza ajụjụ maka na unu hapụrụ m.* Ha ga-aza ya ruo mgbe ozu onye nke ikpeazụ n’ime unu dara n’ala ịkpa a.+ 34  Unu ga-aza ajụjụ maka mmehie unu afọ iri anọ+ ka unu wee mata ihe ịhapụ m pụtara.* Ụbọchị iri anọ unu ji nyopụta otú ala ahụ dị+ nọchiri anya afọ iri anọ, otu ụbọchị nọchiri anya otu afọ, otu ụbọchị nọchiri anya otu afọ. 35  “‘“Mụnwa bụ́ Jehova ekwuola ya. Ihe a ka m ga-eme nzukọ ọjọọ a, bụ́ ndị zukọtara ka ha maa m aka: N’ala ịkpa a ka a ga-ebibi ha. Ọ bụkwa n’ebe a ka ha ga-anwụ.+ 36  Ụmụ nwoke ndị ahụ Mosis zipụrụ ka ha gaa nyopụta otú ala ahụ dị, ndị mekwara ka nzukọ a niile katọwa ya* mgbe ha lọtara kọọ akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ,+ 37  n’eziokwu, a ga-ata ụmụ nwoke ndị ahụ kọrọ akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ ahụhụ. Ha ga-anwụkwa n’ihu Jehova.+ 38  Ma, Joshụa nwa Nọn na Keleb nwa Jefune, bụ́ ndị so gaa nyopụta otú ala ahụ dị, ga-adị ndụ.”’”+ 39  Mgbe Mosis gwara ndị Izrel niile ihe ndị a, ha malitere iru uju nke ukwuu. 40  Ha bilikwara n’isi ụtụtụ gbagowe n’elu elu ebe bụ́ ugwu ugwu, na-asị, “Anyị adịla njikere ịgbago n’ebe ahụ Jehova kwuru okwu ya, n’ihi na anyị emehiela.”+ 41  Ma Mosis kwuru, sị: “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Jehova? Ihe a agaghị agaziri unu. 42  Unu agbagola n’ihi na Jehova anọnyereghị unu. Ndị iro unu ga-emeri unu.+ 43  Ndị Amalek na ndị Kenan nọ n’ebe ahụ ịlụso unu agha.+ A ga-ejikwa mma agha gbuo unu. Ebe ọ bụ na unu kwụsịrị iso Jehova, Jehova agaghị anọnyere unu.”+ 44  Ma, ha gbagoro n’elu elu ebe bụ́ ugwu ugwu maka na ha dị mpako.+ Ma Mosis na igbe ọgbụgba ndụ Jehova esighị n’etiti ebe ha mara ụlọikwuu pụọ.+ 45  Ndị Amalek na ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ugwu ahụ, wee gbadata gbuo ha ma chụsasịa ha ruo Họma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Na Hibru, “n’ihi na ha bụụrụ anyị achịcha.”
Ma ọ bụ “ihe àmà niile m mere.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche nke.”
Ma ọ bụ “ihe àmà ndị m mere.”
Na Hibru, “na Keleb nwere mmụọ dị iche.”
Ma ọ bụ “ntamu a ha na-atamu n’ihi m.”
Ma ọ bụ “tamuru ntamu n’ihi m.”
Na Hibru, “maka na unu gbara akwụna.”
Ma ọ bụ “ihe ịbụ onye iro m pụtara.”
Ma ọ bụ “tamuwe ntamu n’ihi ya.”