Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ ga-ekwenyerịrị n’Atọ n’Ime Otu iji bụrụ Onye Kraịst?

Ị̀ ga-ekwenyerịrị n’Atọ n’Ime Otu iji bụrụ Onye Kraịst?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ị̀ ga-ekwenyerịrị n’Atọ n’Ime Otu iji bụrụ Onye Kraịst?

▪ Otu akwụkwọ ọgụgụ ndị ụlọ akwụkwọ sekọndrị, bụ́ World Religions in Denmark, nke e bipụtara na 2007, kọwara Ndịàmà Jehova dị ka obere ìgwè Ndị Kraịst na-agbasochi Baịbụl anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Ndịàmà Jehova bụ okpukpe Ndị Kraịst nke atọ kacha buo ibu na Denmak.

N’agbanyeghị nke ahụ, otu bishọp Chọọchị Mba Denmak katọrọ nnọọ onye dere akwụkwọ ahụ maka ikpebi idenye aha Ndịàmà n’akwụkwọ ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Bishọp ahụ kwuru, sị: “Ahụtụbeghị m ọkà mmụta okpukpe weere [Ndịàmà Jehova] ka Ndị Kraịst. Ha ekweghị n’Atọ n’Ime Otu, bụ́ ozizi bụ́ isi e ji mara okpukpe Ndị Kraịst.”

Onye dere akwụkwọ ahụ, bụ́ ọkà ná mmụta mmekọrịta okpukpe, nke aha ya bụ Anika Fitama, kwuru na mgbe a jụrụ ndị mmadụ ihe mere ha ji lee onwe ha anya ka Ndị Kraịst, ọ na-ara ahụ́ ha azaa na ọ bụ n’ihi na ha kweere na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Ọzọkwa, otu ebe n’akwụkwọ ahụ nke isiokwu ya bụ́ “Ị̀ Bụ Onye Kraịst?” kwuru, sị: “Ozizi Atọ n’Ime Otu bụ otu n’ime nsogbu ndị ka taa akpụ e nwere n’ozizi Ndị Kraịst.” O kwukwara, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịkọwara Ndị Kraịst na-agụghị akwụkwọ ihe mere Chineke Ndị Kraịst ka ji bụrụ otu chi kama ịbụ chi atọ.”

Ihe Baịbụl na-akụzi banyere Chineke na Jizọs doro anya. O sighị ike nghọta. Ma “Atọ n’Ime Otu” ma ihe ọ bụla na-akwado ya adịghị n’Okwu Chineke. Baịbụl kwuru hoo haa na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke, bụ́ onye e bu ụzọ mụọ. (Ndị Kọlọsi 1:15) O kwukwara na Jizọs bụ “onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ.” (1 Timoti 2:5) Baịbụl kwuru banyere Nna ahụ, sị: “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18.

Ndịàmà Jehova kweere na ọ dị ezigbo mkpa inwe okwukwe na Jizọs. (Jọn 3:16) N’ihi ya, ha ji nnọọ iwu a Jizọs nyere kpọrọ ihe: “E dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” (Matiu 4:10) N’ezie, e nwere ike ịkpọ onye na-agbalị irubere iwu Jizọs isi Onye Kraịst.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

“Ozizi Atọ n’Ime Otu bụ otu n’ime nsogbu ndị ka taa akpụ e nwere n’ozizi Ndị Kraịst”