Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ò Nwere Ike Inwe Mwute?

Chineke Ò Nwere Ike Inwe Mwute?

Bịaruo Chineke Nso

Chineke Ò Nwere Ike Inwe Mwute?

NDỊ IKPE 2:11-18

EBE anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị niile na-enwe mwute mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike inwe mwute mgbe anyị ghọtara na anyị emejọọla ihe. Baịbụl kwuru otu ihe na-eju anya nke bụ́ na Jehova na-enwe mwute. I nwere ike ikwu, sị, ‘Ma Chineke zuru okè. Ọ naghị emejọ ihe!’ Oleezi otú Chineke si enwe mwute? Azịza ya nwere ike inyere anyị aka ịghọta ihe dị ịtụnanya: Ihe na-emetụ Jehova n’ahụ́, omume anyị nwekwara ike imetụ ya n’ahụ́. Ka anyị tụlee ihe e dere ná Ndị Ikpe 2:11-18.

Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ndị Ikpe kọrọ banyere otu oge mba Izrel nọ ná nsogbu. Mba ahụ ebirila na Kenan, bụ́ ala Chineke kwere nkwa inye Ebreham. N’ime ọtụtụ narị afọ ndị sochirinụ, e nwere ike ikebi ihe ndị nọ na-eme ná ndụ ndị Izrel ụzọ anọ: nnupụisi, mmegbu, arịrịọ, na nnapụta. *

Nnupụisi. Mgbe ndị Izrel mụtara àgwà ndị Kenan, ha ‘hapụrụ Jehova’ ma malite ife chi ha; karịsịa, ha malitere “ife Bel na ihe oyiyi Ashtọret.” * Nnupụisi ahụ bụ nnọọ ndapụ n’ezi ofufe. Ka a sịkwa ihe mere ndị Izrel ji ‘kpasuo Jehova iwe,’ bụ́ Chineke nke napụtara ha n’Ijipt!—Amaokwu 11-13; Ndị Ikpe 2:1.

Mmegbu. Jehova na-ewe iwe ezi omume ma kwụsị ichebe ndị ahụ gbakụtara ya azụ. Ndị Izrel na-adabazi n’aka “ndị iro ha,” bụ́ ndị na-abịa akwakọrọ ihe ha.—Amaokwu 14.

Arịrịọ. Mgbe ndị Izrel tawara ahụhụ, ihe ọjọọ ndị ha mere na-ewute ha, ha arịọkwa Chineke ka o nyere ha aka. Okwu bụ́ “na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha” nwere ike ime ka anyị ghọta ụdị arịrịọ ha na-arịọ. (Amaokwu 18) Ịrịọ Chineke ka o nyere ha aka so n’ihe ndị ha na-eme mgbe niile. (Ndị Ikpe 3:9, 15; 4:3; 6:6, 7; 10:10) Olee ihe Chineke na-eme?

Nnapụta. Jehova na-anụ ude ụmụ Izrel na-asụ, ya ‘ewutekwa’ ya. Okwu Hibru a sụgharịrị “na-ewute” nwere ike ịpụta “mmadụ ịgbanwe obi ma ọ bụ ebumnobi ya.” Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru, sị: “Mgbe ude ha na-asụ metụrụ Jehova n’ahụ́, ọ na-agbanwe nzube ya nke bụ́ inye ha ntaramahụhụ ka ọ bụrụ ịnapụta ha.” N’ihi ebere Jehova, ọ ‘na-enye ha ndị ikpe,’ bụ́ ndị na-anapụta ndị ya n’aka ndị iro ha.—Amaokwu 18.

Ị̀ chọpụtara ihe na-akpali Chineke inwe mwute, ma ọ bụ ịgbanwe obi ya? Ọ bụ n’ihi otú ndị ya si gbanwee omume ha. Sigodị otú a lee ya anya: Nna hụrụ nwa ya n’anya nwere ike ịdọ nwa ya mere ihe ọjọọ aka ná ntị, ikekwe site n’ịnapụ ya ihe ụfọdụ. Ma, mgbe nna nwa ahụ hụrụ na ihe ahụ nwa ahụ mere wutere nnọọ nwa ahụ, o nwere ike ikpebi ịkwụsị ntaramahụhụ ahụ.

Olee ihe anyị mụtara banyere Jehova n’akụkọ a? Ọ bụ ezie na ịma ụma eme mmehie na-akpasu ya iwe, ọ na-emere ndị si n’ala ala obi ha chegharịa ebere. Ịghọta na ihe anyị na-eme nwere ike imetụ Chineke n’ahụ́ ga-eme ka anyị chee echiche. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụta otú i nwere ike isi na-eme ka ‘obi Jehova ṅụrịa’? (Ilu 27:11) Ị gatụghị akwa mmakwaara ma i mee nke a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndị Ikpe 2:11-18 so n’okwu mmeghe nke akụkọ chịkọtara àgwà ụmụ Izrel, bụ́ nke a kọchara n’isiakwụkwọ ndị sochirinụ.

^ par. 6 Bel bụ chi ndị Kenan a kacha mara amara, a na-elekwa chi nwaanyị bụ́ Ashtọret anya ka nwunye Bel.