Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Jehova Kọwara Onwe Ya

Mgbe Jehova Kọwara Onwe Ya

Bịaruo Chineke Nso

Mgbe Jehova Kọwara Onwe Ya

Ọpụpụ 34:6, 7

OLEE otú ị ga-esi kọwaa Chineke, ụdị onye ọ bụ na otú o si eme ihe? Chegodị otú ọ ga-adị gị ma a sị na i nwere ike ịjụ Chineke banyere onwe ya ma nụrụ ka o ji ọnụ ya na-akọwara gị àgwà ndị o nwere. Ọ bụ ụdị ihe meere Mozis onye amụma. Obi dị anyị ụtọ na o si n’ike mmụọ nsọ dee ihe ahụ merenụ.

Mgbe Mozis nọ n’Ugwu Saịnaị, ọ rịọrọ Jehova, sị: “Biko, mee ka m hụ ebube gị.” (Ọpụpụ 33:18) N’echi ya, onye amụma ahụ nwere ohere ọma nke ịhụpere ebube Chineke. * Mozis akọghị ihe niile ọ hụrụ n’ọhụụ ahụ dị ebube. Kama nke ahụ, o dere ihe ka nnọọ mkpa, ya bụ, ihe Chineke kwuru. Ka anyị leba anya n’ihe Jehova kwuru, bụ́ nke e dere n’Ọpụpụ 34:6, 7.

Ihe mbụ Jehova kwuru banyere onwe ya bụ na ya bụ “Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara.” (Amaokwu nke 6) Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na okwu Hibru a sụgharịrị “na-eme ebere” na-egosi na Chineke “nwere ọmịiko, dị nnọọ ka nna na-enwe n’ebe ụmụ ya nọ.” Okwu a sụgharịrị ‘onye na-eme amara’ yiri okwu “e ji akọwa onye obi ya kpaliri inyere onye nọ ná mkpa aka.” O doro anya na Jehova chọrọ ka anyị mara na ya na-eji ịhụnanya si ya n’ala ala obi elekọta ndị na-efe ya ofufe otú ahụ ndị mụrụ ụmụ si elekọta ụmụ ha, ihe ndị na-akpa ha na-emetụkwa ya n’obi.—Abụ Ọma 103:8, 13.

Ihe ọzọ Jehova kwuru bụ na ya bụ “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.” (Amaokwu nke 6) Ọ naghị eweso ndị ohu ya nọ n’ụwa iwe ọsọ ọsọ. Kama nke ahụ, ọ na-enwere ha ndidi, na-edi ezughị okè ha ma na-enye ha ohere ka ha gbanwee omume ọjọọ ha.—2 Pita 3:9.

Chineke kwukwara na “obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.” (Amaokwu nke 6) Obiọma, ma ọ bụ ịhụnanya na-adịgide adịgide, bụ àgwà dị oké mkpa nke na-eme ka Jehova na ndị ya nọgide na-adị n’ezigbo mma. (Diuterọnọmi 7:9) Ọ bụkwa n’ebe Jehova nọ ka eziokwu si malite. O nweghị ike iduhie onye ọ bụla, o nweghịkwa onye nwere ike iduhie ya. Ebe ọ bụ “Chineke nke eziokwu,” anyị nwere ike inwe nnọọ okwukwe n’ihe niile o kwuru, ma ihe ndị o kwere nkwa na ha ga-eme n’ọdịnihu.—Abụ Ọma 31:5.

Eziokwu ọzọ dị mkpa Jehova chọrọ ka anyị mara banyere onwe ya bụ na ọ “na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.” (Amaokwu nke 7) Ọ ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’ nke ndị mmehie chegharịrị echegharị. (Abụ Ọma 86:5) Ma, Jehova anaghị anabatatụ ihe ọjọọ. O kwuru na “ọ gaghị anwa anwa hapụ inye ntaramahụhụ.” (Amaokwu nke 7) Chineke anyị dị nsọ bụ́ onye na-ekpe ikpe ziri ezi agaghị ahapụ inye ndị ma ụma na-eme mmehie ntaramahụhụ. Mee elu mee ala, ha ga-eji isi ha buru ihe ha metara.

Nkọwa a Jehova kọwara àgwà ndị o nwere na-egosi nke ọma na ọ chọrọ ka anyị mara ya, marakwa ụdị onye ọ bụ na otú o si eme ihe. Nke a ọ́ naghị eme ka ị chọọ ịmatakwu àgwà ọma ndị o nwere?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Mozis ejighị anya ya hụ Jehova, n’ihi na ọ dịghị mmadụ ga-ahụ Chineke ma dị ndụ. (Ọpụpụ 33:20) O doro anya na Jehova mere ka Mozis hụ ebube Ya n’ọhụụ, si n’ọnụ mmụọ ozi nke nọchiri anya ya gwa Mozis okwu.