Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Okwukwe?

Gịnị Bụ Okwukwe?

Gịnị Bụ Okwukwe?

OLEE otú ị ga-esi akọwa okwukwe? Ụfọdụ na-asị na ọ bụ mmadụ ịnụ na ọ dị iri, ya achịrị wụnye n’akpa. Onye America a ma ama, bụ́ onye edemede na onye nta akụkọ aha ya bụ H. L. Mencken, nwere mgbe o kwuru na okwukwe bụ mmadụ “ikwere na ihe na-enweghị ike ime eme ga-eme.”

Ma, Baịbụl ekwughị na okwukwe bụ mmadụ ikwere ihe ọ na-ejighị n’aka ma ọ bụ ikwere na ihe na-enweghị ike ime eme ga-eme. Okwu Chineke kwuru, sị: “Okwukwe bụ atụmanya e ji n’aka na ihe ndị a na-ele anya ha ga-emezu, ihe àmà doro anya na ihe ndị a na-adịghị ahụ anya dị adị n’ezie.”—Ndị Hibru 11:1.

Ebe ọ bụ na ndị mmadụ nwere ụzọ dị iche iche ha si akọwa okwukwe, ka anyị leba anya n’azịza nke ajụjụ ndị a:

Olee otú ihe Baịbụl kwuru na okwukwe bụ si dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-ebu n’obi mgbe ha na-ekwu banyere okwukwe?

Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị nwee ụdị okwukwe ahụ Baịbụl kọwara?

Olee otú ị ga-esi mee ka okwukwe gị sie ike?

Akwụkwọ Na-enye Ikike na Ihe Àmà Doro Anya

N’oge e dere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ndị Hibru, ndị mmadụ na-ekwukarị okwu Grik a sụgharịrị “atụmanya e ji n’aka” mgbe ha na-ekwu okwu. A na-edekarị ya n’akwụkwọ achụmnta ego, ọ na-egosikwa na e ji n’aka na mmadụ ga-emecha nweta ihe e dere n’akwụkwọ ahụ. N’ihi ya, otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa Ndị Hibru 11:1 bụ: “Okwukwe bụ akwụkwọ na-enye ikike maka ihe ndị a na-atụ anya ha.”

Ọ bụrụ na ị zụtụla ihe n’aka ụlọ ọrụ a tụkwasịrị obi ma chere ka ha butere gị ya, i gosiri ụdị okwukwe ahụ. Risit e nyere gị mere ka i kwere na ụlọ ọrụ ahụ ị zụrụ ihe ahụ ga-enye gị ihe ị zụrụ. E nwere ike ịsị na risit ahụ bụ akwụkwọ nyere gị ikike, ihe mere ka obi sie gị ike na ị ga-enweta ihe ị zụrụ. Ọ bụrụ na risit ahụ funahụrụ gị ma ọ bụ na ị tụfuru ya atụfu, ọ pụtara na ị tụfuola ihe na-egosi na ọ bụ gị nwe ihe ahụ. N’otu aka ahụ, obi siri ndị nwere okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa ya ike na ha ga-enweta ihe ha na-atụ anya ya. Ma, ndị na-enweghị okwukwe, ma ọ bụ ndị tụfuru okwukwe ha, enweghị ike inweta ihe ndị Chineke kwere ná nkwa.—Jems 1:5-8.

Ihe nke abụọ Ndị Hibru 11:1 kwuru na okwukwe bụ, bụ́ nke a sụgharịrị “ihe àmà doro anya,” pụtara iwepụta ihe akaebe na-egosi na ihe yiri ka ọ gaghị eme eme ga-eme. Dị ka ihe atụ, o yiri ka anyanwụ ọ̀ na-agba ụwa gburugburu, ya waa n’ebe ọwụwa anyanwụ, ya adaa n’ebe ọdịda anyanwụ. Ma, ihe ndị a mụtarala banyere mbara igwe nakwa ná mgbakọ na mwepụ na-egosi na ụwa anọghị n’etiti mbara igwe. Ozugbo ihe àmà ahụ doro gị anya, gị ekwetakwa na ọ bụ eziokwu, ị ga-ekwere na ụwa na-agba anyanwụ gburugburu, n’agbanyeghị ihe anya gị na-agwa gị. A gaghị asị na ị nụrụ na ọ dị iri, chịrị wụnye n’akpa. Kama nke ahụ, okwukwe gị mere ka i nwee ike ịhụ ihe kpọmkwem otú ha dị, ọ bụghị naanị ịhụ ihe ha yiri.

Olee Otú Okwukwe Siri Ike Dịruru ná Mkpa?

Ọ bụ ụdị okwukwe a ka Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị nwee, ya bụ, okwukwe siri ike nke nwere ihe e ji n’aka mere anyị ji nwee ya, a sịgodị na ọ pụtara na anyị ga-agbanwe ihe anyị kwebuuru. Ụdị okwukwe a dị ezigbo mkpa. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị ya ezi mma, n’ihi na onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

E nwere ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka o siere mmadụ ike inwe okwukwe siri ike. Ma, ọ bụrụ na i mee ụzọ ihe anọ a ga-atụle na peeji ndị sonụ, ị ga-enwe ike ime ka okwukwe gị sie ike.