Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Banyere “Ọgwụgwụ”

Banyere “Ọgwụgwụ”

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere “Ọgwụgwụ”

Gịnị ga-agwụ?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’ (Matiu 24:3) Mgbe Jizọs na-aza ajụjụ ahụ, o kwughị na ụwa nkịtị ga-agwụ. O kwubuola banyere “usoro ihe,” ndị o bukwa n’obi mgbe o kwuru ya bụ ndị ọchịchị, ndị achụmnta ego na ndị okpukpe niile Setan na-edu. (Matiu 13:22, 40, 49) Ya mere, ọ bụ ha bụ usoro ihe o bu n’obi mgbe o kwuru na “ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.

Olee otú Jizọs si kọwaa ọgwụgwụ ahụ?

Ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a bụ “ozi ọma.” Jizọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” Lee otú Jizọs si kọwaa ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na e meghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta anụ ahụ́ ọ bụla.”—Matiu 24:14, 21, 22.

Olee ndị a ga-ebibi?

Ọ bụ naanị ndị na-ahụghị Jehova na Jizọs n’anya ma na-ejere ha ozi ka a ga-ebibi. Ndị dị otú ahụ anaghị ege Chineke ntị. Jizọs sịrị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, . . . ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.” (Matiu 24:36-39) Jizọs sịrị na ọtụtụ ndị nọ n’okporo ụzọ nke na-eduba ná mbibi. Ma, o mesiri anyị obi ike na e nwere ‘okporo ụzọ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ.’—Matiu 7:13, 14.

Olee mgbe usoro ihe a ga-agwụ?

Mgbe a jụrụ Jizọs banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya “na nke ọgwụgwụ usoro ihe a,” ọ zara, sị: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha, a ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji . . . n’ihi ịba ụba nke mmebi iwu, ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.” (Matiu 24:3-12) Ya mere, akụkọ ọjọọ niile a na-anụ taa na-egosi na ihe ọma na-aga imere ụmụ mmadụ, ya bụ, n’oge na-adịghị anya, ọchịchị Alaeze Chineke ga-ewetara ụmụ mmadụ na-erube isi udo. Jizọs sịrị: “Mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na alaeze Chineke dị nso.”—Luk 21:31.

Gịnị ka i kwesịrị ime?

Jizọs sịrị na Chineke “nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Iji nwee okwukwe na Chineke nakwa n’Ọkpara ya, ọ dị mkpa ka ị mata ha nke ọma. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Kpachara anya ka nchegbu na nsogbu ghara igbochi gị ịmụta otú ị ga-esi na-egosi na ị hụrụ Chineke n’anya. Jizọs sịrị: “Lezienụ onwe unu anya ka a ghara inwe mgbe . . . nchegbu nke ndụ ga-anyịgbu obi unu, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede n’otu ntabi anya dị ka ọnyà. N’ihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile.” Ọ bụrụ na i gee ntị n’ịdọ aka ná ntị Jizọs, ị ga-enwe ike “ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme.”—Luk 21:34-36.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere oge ọgwụgwụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ànyị Na-ebi ‘n’Ụbọchị Ikpeazụ’?,” n’isi nke 9 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.