Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Amụ Mmadụ Ọzọ?

Gịnị Mere E Ji Amụ Mmadụ Ọzọ?

Gịnị Mere E Ji Amụ Mmadụ Ọzọ?

ỌTỤTỤ ndị kweere na ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ bụ ka o nweta nzọpụta ebighị ebi. Ma, buru n’obi ihe Jizọs kwuru banyere ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Ya mere, ihe mere e ji amụ mmadụ ọzọ bụ ka onye ahụ banye n’Alaeze Chineke, ọ bụghị ka o nweta nzọpụta. Ụfọdụ nwere ike ịsị, ‘Ma, ịbanye n’Alaeze ahụ na inweta nzọpụta ọ́ bụghị otu ihe?’ Mba, ha abụghị otu ihe. Iji ghọta ihe dị iche na ha abụọ, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe “alaeze Chineke” pụtara.

Alaeze bụ ọchịchị. Ya mere, “alaeze Chineke” pụtara “ọchịchị Chineke.” Baịbụl na-akụzi na Jizọs Kraịst, bụ́ “nwa nke mmadụ,” bụ Eze nke Alaeze Chineke nakwa na Kraịst nwere ndị ya na ha ga-eso chịa. (Daniel 7:1, 13, 14; Matiu 26:63, 64) Ọhụụ e kpugheere Jọn onyeozi gosikwara na ndị ha na Kraịst ga-achị ga-abụ ụmụ mmadụ e “si n’ebo niile na asụsụ niile na ndị niile na mba niile” họrọ, nakwa na ‘ha ga-achị ụwa dị ka ndị eze.’ (Mkpughe 5:9, 10; 20:6) Okwu Chineke gosikwara na ndị ahụ ga-aghọ ndị eze bụ “ìgwè atụrụ nta” ndị dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, “bụ́ ndị e si n’ụwa zụta.”—Luk 12:32; Mkpughe 14:1, 3.

Olee ebe Alaeze Chineke ga-esi na-achị? Aha ọzọ a kpọrọ “alaeze Chineke” bụ “alaeze eluigwe,” nke na-egosi na Jizọs na ndị ya na ha ga-eso chịa ga-esi n’eluigwe na-achị. (Luk 8:10; Matiu 13:11) Ya mere, Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe nke ndị ọchịchị ya bụ Jizọs Kraịst na ndị eze ibe ya e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ.

Ajụjụ bụzi, olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na mmadụ ‘apụghị ịbanye n’alaeze Chineke’ ọ gwụla ma a mụrụ ya ọzọ? Ihe ọ na-ekwu bụ na a ga-amụ mmadụ ọzọ ka onye ahụ nwee ike iso Kraịst chịa n’eluigwe. N’igbu ya nkenke, ihe mere Chineke ji mee ka a mụọ ndị mmadụ ọzọ bụ iji kwadebe obere ìgwè mmadụ ka ha chịa n’eluigwe.

Ka ọ dị ugbu a, anyị ahụla na ịmụ mmadụ ọzọ dị oké mkpa, hụkwa na ọ bụ Chineke na-eme ka a mụọ mmadụ ọzọ, nakwa na ọ na-akwadebe obere ìgwè mmadụ ka ha chịa n’eluigwe. Ma, oleedị otú e si amụ mmadụ ọzọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 7]

Ihe mere Chineke ji mee ka a mụọ ndị mmadụ ọzọ bụ iji kwadebe obere ìgwè mmadụ ka ha chịa n’eluigwe

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọ bụ Jizọs Kraịst na ndị eze ibe ya e si n’etiti ụmụ mmadụ họrọ bụ ndị ọchịchị Alaeze Chineke