Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe A Ga-anọ Lụọ Agha Amagedọn?

Olee Ebe A Ga-anọ Lụọ Agha Amagedọn?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ

Olee Ebe A Ga-anọ Lụọ Agha Amagedọn?

O nweghị otu ebe pụrụ iche a ga-anọ lụọ agha Amagedọn. Kama nke ahụ, ụwa dum ga-abụ ọgbọ agha ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ìgwè ndị agha abụọ ndị ga-alụso ibe ha agha ga-adị ọtụtụ nke na otu ebe agaghị aba ha.

Aha ọzọ a na-akpọ Amagedọn, ma ọ bụ Ha-Magedọn, bụ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” Jehova bụ́ Chineke ga-eji Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jizọs, kpọkọta ụsụụ ndị mmụọ ozi ka ha lụso ndị ajọ omume niile na-achị ụwa a agha.—Mkpughe 16:14; 19:11-16.

Ndị agha Setan ga-arata mba niile ka ha soro lụọ agha ahụ. Baịbụl kwuru na “okwu si n’aka ndị mmụọ ọjọọ” na-agakwuru “ndị eze [ya bụ, ndị ọchịchị] nke elu ụwa dum mmadụ bi, ka ha kpọkọta ha . . . n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn n’asụsụ Hibru.”—Mkpughe 16:14-16.

Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ dị na Baịbụl nke dị ka Mkpughe, nke ọ na-abụ ọtụtụ mmadụ na-agụ ha ana-achọ ịmata ihe ihe ha na-agụ pụtara. Ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl bụ́ ndị chere na e kwesịrị ịghọta Mkpughe n’ụzọ nkịtị ekwuola kpọmkwem ebe ha chere agha ahụ ga-amalite, ha na-achọkwa ịmara mgbe niile otú ihe si aga n’ebe ahụ. Ọ bụ n’otu akwụkwọ kacha mee ochie e dere n’asụsụ Grik, nke na-akọwa Mkpughe, bụ́ nke Oecumenius dere n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise gara aga, ka e nwere ike ịhụ echiche ahụ ndị mmadụ nwere nke bụ́ na a ga-alụ agha Amagedọn n’otu ebe.

John F. Walvoord, onye bụbu onyeisi Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ụkọchukwu nke dị na Dallas, kwuru ihe bụ́ echiche ọtụtụ ndị ụkọchukwu. Ọ sịrị na Amagedọn bụ “agha ikpeazụ ndị mmadụ ga-alụ wee gburịta onwe ha n’ihi nsogbu a na-enwe kemgbe n’ala Izrel na mba ndị gbara ya gburugburu.” Walvoord kwuru na ebe a ga-anọ lụọ oké agha a n’ọdịnihu bụ n’Ugwu Megido, bụ́ obere ugwu nke dị n’ebe ugwu Palestaịn, ná nsọtụ otu nnukwu ndagwurugwu.

Ma, akwụkwọ Mkpughe anaghị akọrọ anyị na o nwere otú ebe a na-akpọ Amagedọn. Okwu dị ná mmalite ya sịrị na e gosiri Jọn ihe ndị dị n’ime ya “n’ụzọ ihe atụ.” (Mkpughe 1:1) Ọ dịla anya Ndịàmà Jehova kwuru n’akwụkwọ ha bụ́ Studies in the Scriptures, nke Anọ, sị: “Anyị ekwesịghị ịtụ anya na ndị mmadụ ga-ezukọta n’Ugwu Megido.”

Ihe ndị mere na Megido na-egosi na Megido pụtara ọnọdụ ma ọ bụ ihe ọ ga-abụ ya mee, ndị iro Chineke agaghị enwe ụzọ mgbapụ. Ya mere, n’Amagedọn, Chineke ga-ahụ na e kpochapụrụ nrụrụ aka na ajọ omume niile, n’agbanyeghị ebe ọ bụla ọ dị n’ụwa.—Mkpughe 21:8.

Ndị hụrụ Jehova bụ́ Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, n’anya ekwesịghị ịtụ Amagedọn egwu. Ọ bụ naanị ndị ajọ omume, ndị Chineke hụrụ na ha enweghị mgbanwe, ka Ọ ga-alụso agha. Ọ bụghị mmadụ niile ka agha ya ga-egbu. Baịbụl kwuru na “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:9) Otu nkwa na-enye obi ụtọ nke e dere n’Abụ Ọma 37:34, kwuru, sị: “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa. Mgbe a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ị ga-ahụ ya.”