Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ka Anyị Weta Onyinye A Ga-enye Jehova’

‘Ka Anyị Weta Onyinye A Ga-enye Jehova’

‘Ka Anyị Weta Onyinye A Ga-enye Jehova’

Ọ BỤRỤ na mmadụ emeere gị ihe ọma, olee otú ị ga-esi gosi ya na obi dị gị mma? Ka anyị tụlee otú ndị isi agha ndị Izrel si gosi Chineke mgbe ha na ndị Midian lụchara agha na obi dị ha mma maka aka o nyeere ha. Ha lụrụ agha ahụ mgbe ụmụ Izrel fechara Bel nke Piọ. Chineke mere ka ha merie ndị Midian. Puku mmadụ iri na abụọ lụrụ agha ahụ na ụmụ Izrel ndị ọzọ ekee ihe ha kwatara n’agha ahụ. Ndị agha ahụ rubeere Jehova isi site n’inye ndị nchụàjà ụfọdụ n’ime ihe ha ketara, ụmụ Izrel ndị ọzọ nyekwara ndị Livaị ihe ha ka nke ahụ ndị agha nyere ndị nchụàjà.—Ọnụ Ọgụ. 31:1-5, 25-30.

Ma, ndị isi ndị agha ahụ chọrọ imekwu ihe. Ha gwara Mozis, sị: “Ndị ohu gị agụwo ndị agha anyị na-achị ọnụ, ọ dịghị onye e kwuru na a na-achọ achọ.” Ha kpebiri inye Jehova ọlaedo na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma. Ihe niile e ji achọ mma e ji ọlaedo mee ha nyere n’onyinye dị otu narị kilogram na iri itoolu.—Ọnụ Ọgụ. 31:49-54.

Taa, ọtụtụ ndị na-egosikwa na obi dị ha mma n’ihi ihe Jehova meere ha. Ọ bụghị naanị ndị ohu Chineke raara onwe ha nye ya na-eme ihe na-egosi na obi dị ha mma. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2009, otu ọkwọ ụgbọala bugara ụmụnna bịara mgbakọ mba niile n’ámá egwuregwu dị na Bolonia, nke dị n’Ịtali, bulatakwa ha. Ụmụnna ndị ahụ o buru n’ụgbọala ya nyere ya kaadị iji kelee ya maka otú o si kpachara anya ma jiri obiọma buo ha. Ha nyekwara ya ego mmiri oyi na akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nke a mere ka ọ gwa ha sị: “M ji obi ụtọ na-anara kaadị na akwụkwọ unu nyere m, ma, agaghị m anara ego a n’ihi na m chọrọ inye ya n’onyinye ka unu tinyekwuo ya n’ọrụ unu na-arụ. N’agbanyeghị na abụghị m Onyeàmà Jehova, m chọrọ inye onyinye a n’ihi na ahụla m na unu nwere ịhụnanya.”

Otu n’ime ụzọ i nwere ike isi gosi Jehova na obi dị gị ụtọ maka ihe o meere gị bụ inye onyinye iji kwado ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụwa dum. (Mat. 24:14) E dere ụzọ ụfọdụ ndị họọrọ ha si enye onyinye a n’igbe dị n’isiokwu a.

[Igbe dị na peeji nke 20, 21]

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ HỌỌRỌ ISI NA-ENYE ONYINYE

MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ mawapụta ego iche, bụ́ nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị a mapawara akwụkwọ e dere “Worldwide Work.” (ya bụ, “Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ”)

N’ọnwa ọ bụla, ọgbakọ dị iche iche na-eziga ego ha nwetara n’igbe a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya ziga ego onyinye n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya. (Mmadụ nwekwara ike iziga nke ọ bụla n’ime onyinye e kwuru okwu ha n’igbe a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya.) E kwesịrị ide “Watch Tower” n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. E nwekwara ike inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike irete ego. Onye na-ezite ihe ndị a kwesịrị izitekọta ha na obere akwụkwọ ozi iji kọwaa na ha bụ onyinye.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

E wezụga inye onyinye ego, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ihe maka ozi Alaeze nke a na-eje n’ụwa niile. Ha gụnyere:

Ịnshọransị: E nwere ike idenye aha Watch Tower dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụkwanụ dị ka ndị ga-eso keta ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ego E Tinyere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye Watch Tower ego o debere n’ụlọ akụ̀, ego ọ gbazinyere ụlọ akụ̀, ma ọ bụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ, a ga-eme nke a n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ya na-agbaso.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye Watch Tower aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego n’onyinye.

Ala na Ụlọ: E nwere ike inye ala na ụlọ e nwere ike ire ere, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya ma ka biri na ya n’oge niile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-enye ya ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: E nwere ike idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, e nwekwara ike ikwu na Watch Tower ga-erite uru n’atụmatụ ego.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi, onye na-enye ụdị onyinye a kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.

Iji matakwuo banyere ụzọ ndị a e si enye onyinye, i nwere ike ịkpọtụrụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Naịjirịa, site n’ịkpọ ha na telefon ma ọ bụ idegara ha akwụkwọ ozi, n’adres e dere n’okpuru ebe a ma ọ bụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba unu.

Jehovah’s Witnesses

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria.

Telefon: 07080662020