Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Na Nehemaya 8:10, a gwara ndị Juu ka ha ‘rie ihe mara abụba,’ ma Iwu Chineke nyere na Levitikọs 3:17 sịrị: “Unu erila abụba ọ bụla ma ọlị.” Olee otú e kwesịrị isi ghọta okwu abụọ a?

N’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, okwu e si na ya sụgharịta “ihe mara abụba” na Nehemaya 8:10 na okwu e si na ya sụgharịta “abụba” na Levitikọs 3:17, abụghị otu. Okwu Hibru bụ́ che’lev, nke a sụgharịrị ịbụ “abụba” na Levitikọs 3:17, bụ abụba anụ ma ọ bụ nke dị mmadụ n’ahụ́. (Lev. 3:3; Ikpe 3:22) Ihe e kwuru n’amaokwu ndị bu ụzọ tupu amaokwu nke 17 ahụ na-egosi na ndị Izrel agaghị eri abụba dị gburugburu eriri afọ na akụrụ ụmụ anụmanụ ndị a chọrọ iji chụọ àjà ma ọ bụ nke dị n’úkwù ha n’ihi na “ọ bụ Jehova nwe abụba niile.” (Lev. 3:14-16) N’ihi ya, a gaghị eri abụba dị n’ahụ́ ụmụ anụmanụ a chọrọ iji chụọrọ Jehova àjà.

N’aka nke ọzọ, okwu a sụgharịrị ịbụ “ihe mara abụba” na Nehemaya 8:10 bụ mash·man·nim’, ọ bụkwa naanị n’ebe a ka okwu ahụ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. E si na ngwaa bụ́ sha·men’, nke pụtara “buo ibu, maa abụba” nweta ya. O yiri ka okwu ndị ha na ngwaa a na-agakọ bụ ndị nke na-ekwu banyere inwe akụnụba na ahụ́ ike. (Tụlee Aịzaya 25:6.) Otu n’ime okwu ndị a na-esikarị na ngwaa a nweta bụ mkpọaha bụ́ she’men, bụ́ nke a na-asụghakarị ịbụ “mmanụ,” tinyere nke dị n’okwu bụ́ “mmanụ oliv.” (Diut. 8:8; Lev. 24:2) Dị ka ọ dị na Nehemaya 8:10, o yiri ka e ji okwu ahụ bụ́ mash·man·nim’ na-akọwa nri a wụjuru mmanụ mgbe a na-esi ya, o nwekwara ike ịbụ anụ nwere abụba na ya, ma ọ bụghị nke abụba anụ juru n’ime ya.

Ọ bụ ezie na a gwara ụmụ Izrel ka ha ghara iri abụba anụ, nke a apụtaghị na ha agaghị enwe ike iri nri dị ụtọ e ji ihe ndị dị mma sie. A na-eji mmanụ e si n’ihe ọkụkụ nweta, nke na-abụkarị mmanụ oliv, eghe ihe ndị e ji ntụ ọka mee, a dịghị eji mmanụ e nwetara n’ụmụ anụmanụ eme nke a. (Lev. 2:7) Ọ bụ nke a mere akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, ji kwuo na “ihe mara abụba” e kwuru okwu ya ebe a “bụ ihe ndị ahụ́ dị mma, ọ bụghị ihe ndị tara ahụ́ ma ọ bụ kpọọ nkụ, kama ọ bụ nri ndị dị ụtọ, nke gụnyere nri ndị e ji mmanụ e si n’ihe ọkụkụ nweta sie.”

Ma Ndị Kraịst kwesịrị icheta na iwu a machibidoro ka a ghara iri abụba anụ so n’Iwu Mozis. Ha anọghị n’okpuru Iwu Mozis, a chọghịkwa ka ha ka na-eme ihe ụfọdụ dị n’Iwu ahụ nke gụnyere iji ụmụ anụmanụ achụ àjà.—Rom 3:20; 7:4, 6; 10:4; Kọl. 2:16, 17.