Nehemaya 8:1-18

  • A gụụrụ ndị mmadụ Iwu ma kọwaa ya (1-12)

  • Ha mere Ememme Ụlọ Ndò (13-18)

8  Mmadụ niile wee jiri otu obi zukọta n’ámá dị n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri.+ Ha gwara Ezra+ bụ́ odeakwụkwọ* ka o weta akwụkwọ Iwu Mosis,+ bụ́ iwu Jehova nyere Izrel.+  Ezra onye nchụàjà wee weta Iwu ahụ n’ebe ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ndị niile nwere ike ige ntị ma ghọta ihe gbakọtara,+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa.+  O wee nọrọ n’ámá dị n’ihu Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri gụpụta ya+ n’ihu ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ndị niile nwere ike ịghọta ihe, malite n’ụtụtụ ruo n’etiti ehihie. Mmadụ niile gere ntị nke ọma+ n’ihe a na-agụpụta n’akwụkwọ Iwu ahụ.  Ezra bụ́ odeakwụkwọ* guzo n’ihe dị elu e ji osisi rụọ maka nnọkọ a. Matitaya, Shima, Anaya, Yuraya, Hilkaya, na Measaya guzo n’aka nri ya. Pedaya, Mishel, Malkaịja,+ Heshọm, Hash-badana, Zekaraya, na Meshọlam guzo n’aka ekpe ya.  Ezra meghere akwụkwọ ahụ, mmadụ niile ana-ahụ ya n’ihi na ebe o guzo dị elu karịa ebe mmadụ niile nọ. Mgbe o meghere ya, mmadụ niile biliri ọtọ.  Ezra wee too Jehova bụ́ ezi Chineke, onye bụ́ Onye ukwu. Mmadụ niile wee chịlie aka elu, sị, “Amen!* Amen!”+ Ha hulataziri kpọọrọ Jehova isiala.  Ndị Livaị bụ́ Jeshụa, Benaị, Sherebaya,+ Jemin, Akọb, Shabetaị, Hodaya, Measaya, Kelaịta, Azaraya, Jozabad,+ Henan, Peleya, nọ na-akọwara ndị mmadụ Iwu ahụ+ mgbe ndị mmadụ guzo ọtọ.  Ha wee na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ ahụ, ya bụ, ihe dị n’Iwu ezi Chineke. Ha nọ na-akọwa ya nke ọma, na-emekwa ka o doo anya. Ha wee nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe a na-agụpụta.+  Nehemaya, onye bụ́ gọvanọ* n’oge ahụ, Ezra,+ onye bụ́ onye nchụàjà na odeakwụkwọ,* nakwa ndị Livaị ndị nọ na-akụziri ndị mmadụ ihe wee gwa mmadụ niile, sị: “Taa bụ ụbọchị dị nsọ n’anya Jehova bụ́ Chineke unu.+ Unu erula uju, unu ebekwala ákwá.” N’ihi na mmadụ niile nọ na-ebe ákwá mgbe ha nụrụ ihe dị n’Iwu ahụ. 10  Ọ sịrị ha: “Laanụ, rienụ ihe kacha mma,* ṅụọkwanụ mmanya na-atọ ụtọ, zigakwaranụ onye na-enweghị ihe ọ bụla nri.+ N’ihi na taa dị nsọ n’anya Onyenwe anyị, obi ajọkwala unu njọ n’ihi na ọṅụ Jehova bụ ebe unu a rụsiri ike.”* 11  Ndị Livaị nọkwa na-agụgụ mmadụ niile, na-asị ha: “Kwụsịnụ ibe ákwá n’ihi na taa dị nsọ, obi ajọkwala unu njọ.” 12  Mmadụ niile wee lawa ka ha gaa rie ihe, ṅụọ mmanya ma zigara ndị ọzọ nri. Ha ṅụrịkwara nnukwu ọṅụ+ n’ihi na ha ghọtara okwu ndị a kọwaara ha.+ 13  N’ụbọchị nke abụọ, ndị isi ọnụmara dị iche iche, ndị nchụàjà, na ndị Livaị zukọtara n’ebe Ezra bụ́ odeakwụkwọ* nọ ka ha ghọtakwuo ihe dị n’Iwu* ahụ. 14  Ha wee chọpụta na e dere n’Iwu ahụ Jehova si n’aka Mosis nye ndị Izrel na ha ga-ebi n’ụlọ ndò n’oge ememme ha na-eme n’ọnwa nke asaa,+ 15  nakwa na ha ga-akọsa+ ma kwusaa n’obodo ha niile nakwa na Jeruselem niile, sị: “Gaanụ n’ebe bụ́ ugwu ugwu gbute akwụkwọ osisi oliv, akwụkwọ osisi paịn,* akwụkwọ osisi metụl* na igu nkwụ, nakwa akwụkwọ osisi ndị ọzọ nwere alaka a ga-eji rụọ ụlọ ndò, otú e dere ya.” 16  Ndị mmadụ gara gbute ihe ndị ahụ ka ha jiri ha rụọrọ onwe ha ụlọ ndò n’elu ụlọ ha, n’ogige ha, n’ogige dị n’ụlọ ezi Chineke,+ n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Mmiri,+ nakwa n’ámá Ọnụ Ụzọ Ámá Ifrem.+ 17  Ọgbakọ ahụ niile, bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, wee rụọ ụlọ ndò ma biri n’ụlọ ndò ndị ahụ n’ihi na ndị Izrel emetụbeghị ememme a otú a malite n’oge Joshụa+ nwa Nọn ruo n’ụbọchị ahụ. Ha wee ṅụrịa nnukwu ọṅụ.+ 18  Kwa ụbọchị, a na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ Iwu ezi Chineke+ malite n’ụbọchị mbụ ruo n’ụbọchị ikpeazụ. Ha mere ememme ahụ ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, e nwere nzukọ pụrụ iche otú e kwuru ka a na-enwe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ!”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ma ọ bụ “Tesheta.” Ọ bụ aha ndị Peshia na-akpọ gọvanọ na-achị ógbè.
Na Hibru, “ihe abụba juru.”
Ma ọ bụ “ike unu.”
Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ọ bụ obere osisi akwụkwọ ya na-egbuke egbuke, okooko ya na-acha ọcha, na-esikwa ísì ọma.
Ya bụ, osisi nwere mmanụ.