Okporo Ụzọ Ndị rom Ihe Ndị Na-echetara Anyị Ọrụ Nkà Ndị Oge Ochie
Okporo Ụzọ Ndị rom Ihe Ndị Na-echetara Anyị Ọrụ Nkà Ndị Oge Ochie
OLEE ihe kasị dị ịrịba ama e ji echeta ndị Rom? Ị̀ ga-asị na ọ bụ ebe ihe nkiri Colosseum, nke a pụrụ ịhụ mkpọmkpọ ebe ya na Rom? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịtụle ihe ndị kasị nọọ ọdụ ndị Rom rụrụ ma ọ bụ ndị metụtara akụkọ oge ochie, ọ ga-abụ okporo ụzọ.
Ọ bụghị nanị ngwá ahịa na ndị agha siri n’okporo ụzọ ndị Rom gafee. Onye na-akọwa ihe odide oge ochie bụ́ Romolo A. Staccioli kwuru na e si n’okporo ụzọ ndị ahụ “gbasaa echiche dị iche iche, ọrụ nkà, na ozizi okpukpe na nke nkà ihe ọmụma,” bụ́ nke gụnyere ozizi Ndị Kraịst.
N’oge ochie, e lere okporo ụzọ ndị Rom anya dị ka ihe ncheta. Ndị Rom ji ọtụtụ narị afọ rụọ ọtụtụ ụzọ ndị gaferịtara ibe ha bụ́ ndị dị puku kilomita iri asatọ n’ogologo n’ebe bụ́ ókèala nke mba 30 ugbu a.
Okporo ụzọ awara awara mbụ dị mkpa, nke a na-akpọ via publica n’oge ahụ, bụ Via Appia, ma ọ bụ Okporo Ụzọ Apiọs. A maara ya dị ka okporo ụzọ kasị mma, o jikọtakwara Rom na Brundisium (nke a na-akpọ Brindisi ugbu a), bụ́ obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri e si aga n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Onye e si n’aha ya nweta aha okporo ụzọ a bụ Apiọs Klọdịọs Caecus, bụ́ onye ọchịchị Rom nke malitere ịrụ ya n’ihe dị ka afọ 312 T.O.A. Okporo ụzọ ndị ọzọ ndị Rom siri na ha mee njem bụ Via Salaria na Via Flaminia, ndị gawachara ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’Oké Osimiri Adriatic, e sikwa ha aga ógbè Balkan, Rhine na ógbè Danube. Via Aurelia gawara Gaul na Ógbè Iberia, bụ́ ndị dị n’ebe ugwu, Via Ostiensis agawakwanụ Ostia, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri ndị Rom ka nwee mmasị isi na ya aga Africa.
Ihe Kasị Ukwuu Ndị Rom Rụrụ
Okporo ụzọ dị obodo Rom mkpa ọbụna tupu ndị bi na ya amalite ịrụ okporo ụzọ ndị ọhụrụ. E wuru obodo ahụ ebe ụzọ ndị e nwere n’oge ochie sọkọtara isi nke bụ́ nanị ebe Osimiri Tiber na-adịghị omimi. Ihe odide oge ochie kwuru na ndị Rom ṅomiri ndị Carthage n’ime ka okporo ụzọ ndị dịbu adị ka mma. Ma o yiri ka ọ̀ bụ nnọọ ndị Etruria bu ndị Rom ụzọ rụwa okporo ụzọ. Okporo ụzọ ndị ha rụrụ ka dị. Ọzọkwa, tupu oge ndị Rom, e nwere ọtụtụ ụzọ ọhịa ndị a na-esikarị na ha eme njem n’ógbè ahụ Rom dị. Ọ pụrụ ịbụ na a na-esi na ha achị anụmanụ site n’otu ebe ịta nri aga n’ebe ịta nri ọzọ. Otú ọ dị, ọ naghị adị mfe isi n’ụzọ ndị ahụ eme njem n’ihi na uzuzu na-eju na ha n’oge ọkọchị, apịtị adịkwa na ha n’udu mmiri. Ọ bụ n’ebe ndị dị otú ahụ ka ndị Rom rụrụ ọtụtụ n’ime okporo ụzọ ha.
Ndị Rom na-akpachapụ anya eme atụmatụ ụzọ ndị ha ga-arụ, ha na-arụkwa ha otú ha ga-esi ike, baa uru ma maa mma. Ndị Rom na-achọ igbu ụzọ ha ebe ọ ga-akasị dị nso, ọ bụkwa ya mere ọtụtụ n’ime ha ji enwe ebe ndị na-agbagọghị agbagọ ruo ebe dị anya. Ma, mgbe mgbe, ụzọ ndị ahụ aghaghị ikwekọ n’otú ebe ahụ dị. Ebe ọ bụla o kwere omume, n’ebe ndị bụ́ ugwu, ndị Rom na-arụ ụzọ na-arụrụ ya gbagotetụ n’ugwu, ha na-arụkwa ya ka o si n’akụkụ ugwu ahụ ebe anyanwụ na-achakarị gafee. Nke a na-eme ka
ụzọ ahụ ghara inyecha ndị na-esi na ya agafe nsogbu mgbe ihu igwe na-adịghị mma.Ma, olee nnọọ otú ndị Rom si arụ okporo ụzọ ha? E nwere ụzọ dị iche iche ha si arụ ya, ma nke anyị na-abịa ịkọ ugbu a bụ otú ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị ọkà mmụta ihe ochie gwupụtara n’ala gosiri ha si arụ okporo ụzọ ha.
A na-ebu ụzọ ekpebi ebe ụzọ ahụ ga-esi gafee. Ndị a na-enye ọrụ a bụ ndị sọfịa e nwere n’oge ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị agha, ndị ọrụ e goro ego, na ndị ohu na-amalitezi ọrụ ike nke igwu ala ebe a ga-arụ ụzọ ahụ. A na-egwu olulu n’akụkụ ya abụọ. Ya dịkarịa ala, agbata olulu abụọ ahụ ga-afọ obere ka o ruo mita abụọ na ọkara, ma ọ na-adịkarị mita anọ, ọ na-akarịdị otú ahụ n’ebe ụzọ gbagọrọ agbagọ. Mbara ụzọ a rụchara arụcha pụrụ ịdị mita iri, gụnyere ebe e mere maka ndị ụkwụ n’akụkụ ya abụọ. A na-egwupụzi aja dị n’agbata olulu abụọ ahụ bụ́ nke na-eme ka ebe ahụ mie emie. Ozugbo ha gwururu ebe siri ike, a na-eji ihe atọ ma ọ bụ anọ dị iche iche awụchi ebe ahụ e gwuru egwu, a wụchaa otu a wụkwasị ya ibe ya n’elu. Ihe mbụ e nwere ike ibu ụzọ wụọ na ya bụ nnukwu okwute ma ọ
bụ ibé brik. A na-awụkwasịzi ya iberibe okwute ma ọ bụ okwute ndị dị mbadamba, ma eleghị anya gwakọta ha na siment. Mgbe nke ahụ gasịrị, a na-awụ ya irighiri okwute ma jiri ihe sụsie ya ike.Nanị ihe ị ga-ahụ n’elu ụfọdụ okporo ụzọ ndị Rom bụ iberibe okwute ndị a sụkọtara asụkọta. Ma, ihe dọọrọ mmasị nke ndị oge ahụ bụ ụzọ ndị elu ha dị larịị. Ihe a na-ejikarị arụ elu okporo ụzọ ndị dị otú ahụ bụ nnukwu okwute ndị dị mbadamba, okwute ndị ahụ na-abụkarị ndị e nwetara n’ógbè ahụ. A na-arụ okporo ụzọ ndị ahụ otú etiti ha ga-adị elu, akụkụ ha akpọdaa akpọdaa ka mmiri zoro ezo nwee ike ịsọba n’ọwara mmiri ndị dị n’akụkụ ha abụọ. Otú a ndị Rom si arụ ụzọ so mee ka okporo ụzọ ndị a nọọ nnọọ ọdụ, o mekwara ka ụfọdụ nọruo oge anyị.
Ihe dị ka narị afọ itoolu ka a rụsịrị Okporo Ụzọ Apiọs, onye Byzantium na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Procopius kwuru na ọ dị “ebube.” O dere banyere mbadamba okwute ndị e ji rụọ elu ya, sị: “N’agbanyeghị afọ ole ha nọrọla na ọtụtụ ibu ndị e burula gbaa n’elu ha, ha ka dị nnọọ otú ha dị, ha ka na-akwọkwa mụrụmụrụ otú ha na-akwọbu.”
Olee otú okporo ụzọ ndị a pụrụ isi gafee ihe ndị e kere eke nwere ike igbochi ha, dị ka osimiri? Otu ihe a na-eme n’ebe ndị dị otú ahụ bụ ịrụ àkwà mmiri, ndị ụfọdụ n’ime ha ka dị taa. Àkwà mmiri ndị ahụ na-egosi na ndị Rom oge ochie bụ ọkaibe n’ọrụ nkà. O nwere ike ịbụ na ọtụtụ mmadụ amaghị banyere ụzọ okpuru ala ndị gafere okpuru okporo ụzọ ndị Rom, ma ịwa ha abụghị obere ọrụ n’ihi otú e si awa ha n’oge ahụ. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ndị injinia Rom . . . rụrụ ọrụ ha otú a na-agaghị enwe nke ga-ama ha aka ruo ọtụtụ narị afọ.” Ụzọ okpuru ala Furlo nke gafere n’okpuru okporo ụzọ Via Flaminia bụ otu ihe atụ. Laa azụ n’afọ 78 O.A., mgbe ndị injinia jisịrị nlezianya hazie otú ha ga-esi arụ ụzọ okpuru ala a, ha si ná nnukwu okwute waa ụzọ a dị mita 40 n’ogologo, nke mbara ya na elu ya dịcha mita ise. Ihe a ha rụrụ dị nnọọ ebube, n’ihi ụdị ngwá ọrụ ndị e nwere n’oge ahụ. Ịrụ ụzọ dị otú ahụ bụ otu n’ime ọrụ ndị kasị sie ike ma dị ize ndụ ụmụ mmadụ rụtụrụla.
Ebe Ndị Njem Si Gafee na Ebe E Si Gbasaa Echiche Dị Iche Iche
Ndị agha, ndị ahịa, ndị na-ekwusa ozi ọma, ndị njem, ndị na-eme ihe nkiri na ndị na-alụ ọgụ ọnwụ n’ámá egwuregwu sicha n’okporo ụzọ ndị a gafee. Ndị ji ụkwụ pụrụ ịga ihe dị ka kilomita 25 ruo 30 n’ụbọchị. Ndị njem nwere ike ịmata otú ebe ha na-aga dịruru n’anya site n’ile anya n’okwute ndị e gwunyere n’akụkụ ụzọ bụ́ ebe ndị e dere otú ebe dị iche iche dịruru n’anya. Okwute ndị a na-adị n’ụdị dị iche iche, ma ha na-adịkarị gburugburu ma dị ogologo, a na-egwunyekwa ha
kwa maịl—maịl ndị Rom na-adị otu puku mita, narị mita anọ na iri asatọ. E nwekwara ebe izu ike dị iche iche, ebe ndị njem nwere ike ịgbanwe ịnyịnya ha, zụrụ nri, ma ọ bụ hie ụra abalị mgbe ụfọdụ. Ụfọdụ n’ebe izu ike ndị a mesịrị ghọọ obodo.Obere oge tupu Iso Ụzọ Kraịst amalite, Siza Ọgọstọs malitere usoro a ga-eji na-edozi okporo ụzọ. Ọ họpụtara ndị isi ga na-elekọta otu okporo ụzọ ma ọ bụ karịa. O gwunyere ihe a na-akpọ miliarium aureum, nke bụ́ okwute ọlaedo na-egosi otú ebe dịruru n’anya, n’Ebe Ezumezu Ndị Rom. Okwute a e ji ọla nchara a gbazere agbaze dee ihe na ya bụ nnọọ ebe okporo ụzọ nile nke ndị Rom dị n’Ịtali jedebere. Ọ bụ otú a ka e si nweta otu ilu a na-atụkarị n’asụsụ Bekee, nke bụ́: “Ụzọ nile na-eduje na Rom.” Ọgọstọs debekwara map nke okporo ụzọ nile dị n’alaeze ukwu ya ebe a pụrụ ịhụ ya anya. O yiri ka a bịa n’otú e si arụ ụzọ n’oge ahụ, a rụziri okporo ụzọ ndị ahụ arụzi, ha gbokwara nnọọ mkpa ndị mmadụ nke ọma.
Ụfọdụ ndị njem n’oge ahụ na-eleredị anya ná ntụziaka ndị e dere ede iji nyere ha aka iru ebe ha na-aga ngwa ngwa. Ntụziaka ndị a kọwara otú ebe dị iche iche ndị njem na-akwụsị dịruru n’anya, kọwaakwa ihe ndị a na-eme n’ebe ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, ọ bụghị onye ọ bụla nwere ntụziaka ndị ahụ, n’ihi na ha dị oké ọnụ.
N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst na-ekwusa ozi ọma haziri ma mee ọtụtụ ogologo njem. Pọl onyeozi, dịkwa ka ndị ha na ya dịkọrọ ndụ, na-esikarị n’oké osimiri eme njem mgbe ọ na-aga n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ihi na ifufe ga-eme ka o ruo ebe ọ na-aga ngwa ngwa karị. (Ọrụ 14:25, 26; 20:3; 21:1-3) N’Oké Osimiri Mediterenian, oké ifufe na-esi n’ebe ọdịda anyanwụ efe n’oge okpomọkụ. Ma, mgbe Pọl na-eme njem aga n’ebe ọdịda anyanwụ, ọ na-esikarị n’okporo ụzọ ndị Rom eme njem. Ọ bụ otú a ka Pọl si hazie njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ na nke atọ. (Ọrụ 15:36-41; 16:6-8; 17:1, 10; 18:22, 23; 19:1) * N’ihe dị ka afọ 59 O.A., Pọl si n’Okporo Ụzọ Apiọs gaa Rom ma zute ndị kwere ekwe ibe ya n’Ebe Ezumezu Appii ma ọ bụ n’Ahịa Apiọs, bụ́ nke dị kilomita 74 site n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Rom. Ndị ọzọ nọ na-eche ya n’ebe ezumike nke Ụlọ Atọ nke Ndị Ije, bụ́ nke dị kilomita 14 site na Rom. (Ọrụ 28:13-15) N’ihe dị ka n’afọ 60 O.A., Pọl nwere ike ikwu na e kwusaala ozi ọma “n’ụwa nile” dị ka a maara ụwa n’oge ahụ. (Ndị Kọlọsi 1:6, 23) Okporo ụzọ ndị ahụ so mee ka nke ahụ kwe omume.
Ya mere, okporo ụzọ ndị Rom bụ ihe ncheta bụ́ ịgba nke bụ́ anwụ anwụ—sorokwa mee ka a gbasaa ozi ọma nke Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 Lee map dị na peeji nke 33, n’akwụkwọ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 14]
Okwute ndị Rom gwunyere n’akụkụ okporo ụzọ iji gosi otú ebe mmadụ na-aga dịruru n’anya
[Foto dị na peeji nke 15]
Okporo ụzọ dị n’obodo Ostia oge ochie, Ịtali
[Foto dị na peeji nke 15]
Akara ndị ụgbọ njem mgbe ochie kara n’okporo ụzọ, Austria
[Foto dị na peeji nke 15]
Ebe e gwuneyre okwute n’okporo ụzọ ndị Rom, Jọdan
[Foto dị na peeji nke 15]
Okporo ụzọ Via Appia dị ná mpụga Rom
[Foto dị na peeji nke 16]
Ili ochie ndị dị n’okporo ụzọ Via Appia nke dị n’azụ obodo Rom
[Foto dị na peeji nke 16]
Ụzọ Okpuru Ala Furlọ, nke gafere n’okpuru okporo ụzọ Via Flaminia, n’ógbè Marche
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Àkwà mmiri Taịbiriọs nke dị n’okporo ụzọ Via Emilia nke dị na Rimini, Ịtali
[Foto dị na peeji nke 17]
Pọl zutere ndị kwere ekwe ibe ya n’Ebe Ezumezu nke Appii ma ọ bụ n’Ahịa Apiọs
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 15]
N’isi isi aka ekpe, Ostia: ©danilo donadoni/Marka/age fotostock; n’isi isi aka nri, okporo ụzọ nke nwere okwute ndị na-egosi otú ebe dịruru anya: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.