Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Mụtara Ịtụkwasị Jehova Obi Kpamkpam

Anyị Mụtara Ịtụkwasị Jehova Obi Kpamkpam

Akụkọ Ndụ

Anyị Mụtara Ịtụkwasị Jehova Obi Kpamkpam

DỊ KA NATALIE HOLTORF SI KỌỌ

Ọ bụ na June 1945. Otu ụbọchị n’ọnwa ahụ, otu nwoke tara ahụ́ bịara n’ụlọ anyị ma jiri ndidi kwụrụ n’ọnụ ụzọ nke ihu ụlọ. Nwa m nwanyị nke ikpeazụ, bụ́ Ruth, kụjara ma tie, sị: “Mama, bịa lee onye bịara n’ụlọ anyị!” Ọ maghị na onye ahụ bụ papa ya—ezigbo di m, bụ́ Ferdinand. Afọ abụọ tupu mgbe ahụ, nanị abalị atọ ka a mụsịrị Ruth, Ferdinand pụrụ, e jidere ya, e mesịakwa kpọga ya n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. Ma ugbu a, Ruth mesịrị hụ papa ya, e jikọtaghachikwara ezinụlọ anyị. Mụ na Ferdinand nwere ọtụtụ ihe ịkọrọ ibe anyị!

A MỤRỤ Ferdinand na 1909 n’obodo Kiel, Germany, a mụkwara m na 1907 n’obodo Dresden, nke dịkwa na Germany. Mgbe mbụ ndị ezinụlọ anyị zutere Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, bụ mgbe m dị afọ 12. Mgbe m gbara afọ 19, ahapụrụ m Chọọchị Evangelical ma rara ndụ m nye Jehova.

Ka ọ dịgodị, Ferdinand gụsịrị akwụkwọ na kọleji ebe a na-amụ ka e si akwọ ụgbọ mmiri ma ghọọ ọkwọ ụgbọ mmiri. N’oge ndị ọ nọ na-akwọ ụgbọ mmiri, ọ na-eche ma è nwere Onye Okike. Mgbe o si n’otu njem ụgbọ mmiri lọta, Ferdinand letara nwanne ya nwoke bụ́ Onye Mmụta Bible. Nleta ahụ mere ka o kweta na Bible pụrụ ịza ajụjụ ndị na-enye ya nsogbu. Ọ hapụrụ Chọọchị Lutheran, o kpebikwara ịkwụsị ọrụ ịkwọ ụgbọ mmiri. Mgbe o jesịrị ozi ọma n’ụbọchị mbụ ya, o nwere ọchịchọ siri ike ịrụ ọrụ a ná ndụ ya nile. N’otu abalị ahụ, Ferdinand raara ndụ ya nye Jehova. E mere ya baptizim n’August 1931.

Ọkwọ Ụgbọ Mmiri na Onye Nkwusa

Na November 1931, Ferdinand gbara ụgbọ okporo ígwè gaa Netherlands ịga nye aka n’ọrụ nkwusa n’ebe ahụ. Mgbe Ferdinand gwara nwanna na-ahazi ọrụ nkwusa ná mba ahụ na ya bụbu ọkwọ ụgbọ mmiri, nwanna ahụ tiri mkpu, sị: “Ị bụ nnọọ ụdị onye anyị chọrọ!” Ụmụnna ahụ anatawo ụgbọ mmiri ná ngo ka otu ìgwè ndị ọsụ ụzọ (ndị ozi oge nile) wee nwee ike ịga zisaara ndị bi n’akụkụ mmiri n’ebe ugwu nke mba ahụ ozi ọma. Ụgbọ ahụ nwere mmadụ ise ga-eji ya eme ihe, ma ọ dịghị onye n’ime ha maara akwọ ụgbọ. Ya mere, Ferdinand ghọọrọ ha onyeisi ụgbọ.

Mgbe ọnwa isii gasịrị, a gwara Ferdinand ka o jee ozi dị ka onye ọsụ ụzọ na Tilburg, n’ebe ndịda Netherlands. Ọ bụ ihe dị ka n’oge ahụ ka m bịakwara Tilburg ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ, ezutekwara m Ferdinand. Ma a gwara anyị ozugbo ahụ ka anyị gaa Groningen, n’ebe ugwu nke mba ahụ. Anyị lụrụ n’ebe ahụ n’October 1932, nọọkwa ezumike anyị dị ka di na nwunye ọhụrụ n’otu ụlọ ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ ji eme ihe ka anyị na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ!

Na 1935, anyị mụrụ ada anyị nwanyị bụ́ Esther. Ọ bụ ezie na anyị enwechaghị ego, anyị kpebisiri ike ịnọgide na-asụ ụzọ. Anyị kwagara n’otu obodo nta, bụ́ ebe anyị bi n’otu obere ụlọ. M na-anọ n’ụlọ iji lekọta nwa anyị, di m ejiri otu ụbọchị dum gaa ozi ọma. N’echi ya, m na-aga ozi ọma, ya anọdụ n’ụlọ. Otú a ka anyị nọ na-eme ruo mgbe Esther toruru iso anyị aga ozi ọma.

N’oge na-adịghị anya, a malitere nwewe nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Europe. Anyị nụrụ banyere mkpagbu a na-akpagbu Ndịàmà na Germany, anyị matakwara na nke anyị ga-ebido n’isi nso. Anyị nọ na-eche otú anyị ga-esi tachie obi n’okpuru mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Na 1938, ọchịchị Netherlands nyere iwu ka ndị ala ọzọ ghara ịdị na-arụ ọrụ colporteur site n’ikesa akwụkwọ okpukpe. Iji nyere anyị aka ịnọgide n’ozi anyị, Ndịàmà bụ́ ndị Netherlands depụtaara anyị aha ndị gosiworo mmasị n’ọrụ anyị, anyị mụkwaara ụfọdụ n’ime ha Bible.

Ihe dị ka n’oge ahụ, a na-aga inwe mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ego iji gbaa ụgbọ okporo ígwè gaa n’ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ, anyị chọrọ ịga. N’ihi ya, anyị malitere njem were ụbọchị atọ, nke anyị ji ịnyịnya ígwè mee, buru obere nwa anyị bụ́ Esther n’oche a rụnyere n’ihu ịnyịnya ígwè. Anyị na-ehi n’ụlọ Ndịàmà bi n’ụzọ e si aga mgbakọ ahụ. Lee obi ụtọ anyị nwere ịnọ ya ná mgbakọ mba mbụ anyị! Ihe omume mgbakọ ahụ wusiri anyị ike maka ule ndị na-abịa n’ihu. Karịsịa, e chetaara anyị ịtụkwasị Chineke obi. Okwu ndị dị n’Abụ Ọma 31:6 ghọrọ ụkpụrụ nduzi anyị: “Mụ onwe m atụkwasịwo obi na Jehova.”

Ndị Ndị Nazi Na-achụgharị

Na May 1940, ndị Nazi wakporo Netherlands. N’oge na-adịghị anya, ndị Gestapo, ma ọ bụ ndị uwe ojii nzuzo, bịara n’ụlọ anyị na mberede ka anyị nọ na-ahazi akwụkwọ ndị dabeere na Bible e buteere anyị. A kpụgara Ferdinand n’isi ụlọ ọrụ ndị Gestapo. Mụ na Esther na-aga eleta ya ebe ahụ mgbe nile, mgbe ụfọdụkwa, a gbara ya ajụjụ ọnụ ma tie ya ihe n’ihu anyị. Na December, a hapụrụ Ferdinand na mberede, ma nnwere onwe ya adịteghị aka. N’otu mgbede ka anyị si esi na-abata, anyị hụrụ ụgbọala ndị Gestapo n’akụkụ ụlọ anyị. Ferdinand gbalagara ma mụ na Esther bara n’ụlọ. Ndị Gestapo nọ anọ na-eche anyị. Ọ bụ Ferdinand ka ha na-achọ. N’otu abalị ahụ, mgbe ndị Gestapo lasịrị, ndị uwe ojii Netherlands bịara kpọrọ m ịgba m ajụjụ. N’echi ya, mụ na Esther gara zoo n’ụlọ otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà e mere baptizim ọhụrụ, Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Norder, bụ́ ndị nyere anyị ụlọ, chebekwa anyị.

Ná ngwụsị nke January 1941, e jidere otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ, bụ́ ndị bi n’ụlọ a rụnyere n’ụgbọ mmiri. N’echi ya, otu onye nlekọta sekit (onye ozi na-ejegharị ejegharị) na di m gawara ebe ahụ ịkwapụta ụfọdụ ngwongwo nke di na nwunye ahụ, ma ndị na-akwado ndị Gestapo wakporo ha. Ferdinand jisiri ike gbanahụ ha ma jiri ịnyịnya ígwè ya gbalaga. Otú ọ dị, a tụbara onye nlekọta sekit ahụ n’ụlọ mkpọrọ.

Ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ gwara Ferdinand ka ọ nọchie anya onye nlekọta sekit ahụ. Nke ahụ pụtara na ọ gaghị enwe ike ịlọta ụlọ ma nọọ ihe karịrị ụbọchị atọ n’otu ọnwa. Nke a bụụrụ anyị ihe ịma aka ọhụrụ, ma anọgidere m na-asụ ụzọ. Ndị Gestapo amalitela ịchọsi Ndịàmà ike, n’ihi ya anyị aghaghị ịdị na-akwagharị. Na 1942, anyị kwagharịrị ugboro atọ. N’ikpeazụ, anyị gara biri n’obodo ukwu bụ́ Rotterdam, bụ́ ebe dị anya site n’ebe Ferdinand nọ na-eje ozi nzuzo ya. N’oge ahụ, adị m ime nwa m nke abụọ. Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Kamp, bụ́ ndị a kpụgara ụmụ ha ndị nwoke abụọ n’ogige ịta ahụhụ n’oge na-adịbeghị anya, ji obiọma nabata anyị n’ụlọ ha.

Ndị Gestapo Chụgharịrị Anyị

A mụrụ nwa anyị nke abụọ, bụ́ Ruth, na July 1943. Mgbe a mụsịrị Ruth, anyị na Ferdinand nọrọ ruo ụbọchị atọ, ma o mesịziri pụọ, nke ahụ bụkwa anya ikpeazụ anyị hụrụ ya ruo ogologo oge. Ihe dị ka izu atọ ka e mesịrị, e jidere Ferdinand n’Amsterdam. A kpụgara ya n’ụlọ ọrụ ndị Gestapo bụ́ ebe a nọrọ mata onye ọ bụ nke ọma. Ndị Gestapo jụrụ ya ọtụtụ ajụjụ ná mgbalị ịmanye ya ịgwa ha banyere ọrụ nkwusa anyị. Ma nanị ihe Ferdinand kwere agwa ha bụ na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nakwa na ya adịghị etinye aka n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla. Ndị Gestapo were iwe na Ferdinand, bụ́ nwa afọ Germany, ewepụtaghị onwe ya ije ozi agha, ha yikwara egwu igbu ya dị ka onye sabo.

Ruo ọnwa ise ọzọ, e tinyere Ferdinand n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ebe a na-eyi ya egwu mgbe nile na a ga-agbagbu ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ kwụsịghị iguzosi ike n’ihe nye Jehova. Gịnị nyeere ya aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ụzọ ime mmụọ? Ọ bụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ọ bụ ezie na, dị ka Onyeàmà, e kweghị ka Ferdinand nwee Bible. Ma, ndị mkpọrọ ndị ọzọ pụrụ ikwu ka e wetara ha Bible. Ya mere, Ferdinand gwara onye mkpọrọ ibe ya ka ọ gwa ndị ezinụlọ ya ka ha zitere ya Bible, nwoke ahụ mekwara otú ahụ. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, mgbe ọ bụla Ferdinand na-ekwu banyere nke a, ọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-ekwu, sị: “Lee otú Bible ahụ si kasie m obi!”

Ná mmalite nke January 1944, a kpọfere Ferdinand na mberede n’ogige ịta ahụhụ dị na Vught, na Netherlands. N’ụzọ a na-atụghị anya ya, nke a ghọọrọ ya ngọzi n’ihi na n’ebe ahụ, o zutere Ndịàmà 46 ọzọ. Mgbe m nụrụ banyere ngafe ya, obi dị m nnọọ ụtọ ịmara na ọ ka dị ndụ!

Ime Nkwusa n’Ogige Ịta Ahụhụ n’Esepụghị Aka

Ihe siri nnọọ ike n’ogige ịta ahụhụ ahụ. Ha adịghị eri ezigbo nri ma ọlị, ha enweghị efe oyi, oké oyi na-atụkwa ebe ahụ. Ferdinand malitere ịrịa ọrịa mgbapịa nkọlọ. Ka ha nọsịrị ogologo oge n’oké oyi ka a na-akpọ ndị mkpọrọ aha otu otu, Ferdinand gara n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa. A na-ekwe ka ndị ọ̀tụ̀tụ̀ oyi ọmụma ha ruru 40 degrees Celsius ma ọ bụ karịa ghara ịga ọrụ. Ma izu ike adịghịrị Ferdinand n’ihi na ọ̀tụ̀tụ̀ oyi na-ama ya bụ nanị 39 degrees Celsius! A gwara ya ka ọ gaghachi n’ọrụ. Otú ọ dị, ndị mkpọrọ ibe ya, bụ́ ndị nwere ọmịiko, nyeere ya aka site n’ịdị na-ezo ya n’ebe na-ekpo ọkụ ruo nwa oge. O nwetakwuru onwe ya mgbe oyi belatara. Ọzọkwa, mgbe ụmụnna ụfọdụ nwetara nri, ha na-eso ndị ọzọ ekerịta ya, n’ihi ya Ferdinand nwetaghachitụrụ ume.

Tupu a tụọ di m mkpọrọ, ikwusa ozi ọma bụ ụzọ ndụ ya, mgbe ọ nọkwa n’ogige ahụ, ọ nọgidere na-agwa ndị ọzọ banyere nkwenkwe ya. Ndị na-elekọta ogige ahụ na-ejikarị purple triangle ya, bụ́ ihe e ji amata ndị mkpọrọ bụ́ Ndịàmà, ama ya njakịrị. Ma Ferdinand lere njakịrị ndị ahụ anya dị ka ohere iji soro ha nwee mkparịta ụka. Na mbụ, ókèala ụmụnna ahụ na-eme nkwusa na ya bụ nanị n’ogige ahụ, bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ na ya bụ Ndịàmà. Ụmụnna ahụ jụrụ onwe ha, sị, ‘Olee otú anyị pụrụ isi kwusakwuoro ọtụtụ ndị mkpọrọ ozi ọma?’ N’amaghị ama, ndị na-elekọta ogige ahụ zara ajụjụ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?

Ụmụnna ahụ na-ezobata akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ha nwekwara Bible 12. Otu ụbọchị, ndị nche hụrụ ụfọdụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ma ha apụghị ịchọpụta onye nwe ha. Ya mere, ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ kwubiri na a ghaghị itisa ịdị n’otu nke Ndịàmà ahụ. N’ihi ya, dị ka ụzọ isi taa ha ahụhụ, a kpọgara ụmụnna nile ahụ n’ogige dịgasị iche iche ndị ndị mkpọrọ bụ́ Ndịàmà na-anọghị na ha. Ọzọkwa, ụmụnna ahụ aghaghị ịnọdebe ndị na-abụghị Ndịàmà ka ha na-eri nri. Ndokwa a ghọrọ ngọzi. Ugbu a, ụmụnna ahụ pụrụ ime ihe ahụ ha chọburu ime—ikwusara ọtụtụ ndị mkpọrọ dị ka o kwere mee ozi ọma.

Ịzụ Ụmụ Anyị Nwanyị Abụọ Nanị M

Ka ọ dịgodị, mụ na ụmụ m abụọ ka bi na Rotterdam. Oge oyi nke agbata afọ 1943 na 1944 dị egwu. N’azụ ụlọ anyị, e nwere ogbunigwe e ji agbatu ụgbọelu, bụ́ nke ndị agha Germany na-elekọta. Ọdụ Ụgbọ Mmiri Waal, bụ́ ebe bụ́ isi ndị agha Jikọrọ Aka lekwasịrị anya ịtụkasị, nọkwa n’ihu ụlọ anyị. Ebe ahụ abụtụghị ebe dị nchebe izo. Ọzọkwa, nri dị ụkọ. Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, anyị mụtara ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam.—Ilu 3:5, 6.

Esther bụ́ onye dị afọ asatọ nyeere obere ezinụlọ anyị aka site n’ịdị na-akwụnye n’ahịrị n’ebe a na-eke nri. Otú ọ dị, mgbe mgbe, tupu ya eruoro ya inweta nri, nri na-agwụ. N’otu n’ime oge ndị ọ gara ịchọta nri, ụgbọelu malitere ịtụ bọmbụ. Egwu jidere m mgbe m nụrụ ụda bọmbụ ndị ahụ, ma nchegbu m ghọziri ọṅụ mgbe ọ lọtara n’enweghị ihe mere ya, ọbụna jiri sugar beet ole na ole lọta. Ihe mbụ pụrụ m n’ọnụ bụ, “Gịnị mere?” O ji olu dị nro zaa, sị: “Mgbe bọmbụ ndị ahụ dara, emere m nnọọ ihe papa m gwara m ka m na-eme, ‘Daa n’ala, makpuru ala, ma kpee ekpere.’ Ọ dịghịkwa nke tụtara m!”

N’ihi olu okwu ndị Germany m, ọ kaara anyị mma ka Esther na-aga azụta obere ihe ndị anyị ka pụrụ ịzụta. Ndị agha Germany maara banyere nke a, ha malitekwara ịjụ Esther ajụjụ. Ma ọ dịghị ihe nzuzo ọ bụla o kpugheere ha. N’ụlọ, ana m akụziri Esther Bible, ebe ọ bụkwa na ọ pụghị ịga akwụkwọ, ana m akụziri ya ka e si agụ na ka e si ede ihe na nkà ndị ọzọ.

Esther nyekwaara m aka n’ozi ọma. Tupu m gawa iduziri mmadụ ọmụmụ Bible, Esther na-ebu ụzọ gaa leta ma ala ọ̀ dịkwa mma, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ na-ele ma ihe mgbaàmà nke mụ na onye m na-eduziri Bible kwekọrịtara na ya ọ̀ dịkwa. Dị ka ihe atụ, onye m na-aga ileta ga-adọba okooko osisi n’otu ebe n’ọnụ windo iji gwa m na m pụrụ ịbata. Ka ọmụmụ Bible ahụ na-aga n’ihu, Esther na-anọ n’èzí iji hụta mgbe agwọ nọ n’akịrịka, ka o ji ihe e ji ebu ụmụaka na-akwagharị obere Ruth n’okporo ámá.

Ịga Sachsenhausen

Oleekwanụ ka Ferdinand na ije si na-aga? Na September 1944, e duuru ya na ọtụtụ ndị ọzọ gaa n’otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè bụ́ ebe a kwabara ìgwè ndị mkpọrọ 80 n’ụgbọ okporo ígwè ndị e ji ebu ibu bụ́ ndị nọ na-eche eche. Nke ọ bụla n’ime ụgbọ ndị ahụ nwere otu bọket nke e ji mere mposi, na otu maka ịgbanye mmiri ọṅụṅụ. Njem ahụ were ụbọchị atọ, e nweghịkwa ebe a pụrụ ịnọdụ ala! Ọ dịghị ebe ikuku si abata. A kuchiri ụgbọ okporo ígwè ndị ahụ akụchi, nanị ihe e nwere n’akụkụ nile bụ ebe e si enyopụta anya. Okpomọkụ, agụụ, na akpịrị ịkpọ nkụ—ka a gharadị ikwu ísì ọjọọ—ha na-aghaghị idi enyeghị ọnụ okwu.

Ụgbọ okporo ígwè ahụ kwụsịrị n’ajọ ogige ịta ahụhụ Sachsenhausen. A napụrụ ndị mkpọrọ nile ihe ọ bụla ha ka nwere—e wezụga obere Bible 12 Ndịàmà ahụ ji bịa!

A kpọgara Ferdinand na ụmụnna nwoke asatọ ndị ọzọ n’ogige ọzọ Sachsenhausen na-elekọta, nke dị na Rathenow, ịrụpụta ngwá agha. Ọ bụ ezie na a na-eyikarị ha egwu na a ga-egbu ha, ụmụnna ahụ jụrụ ịrụ ụdị ọrụ ahụ. Iji gbarịta onwe ha ume iguzosi ike, kwa ụtụtụ, ha na-atụle otu amaokwu Bible, dị ka Abụ Ọma 18:2, ka ha wee nwee ike ịtụgharị uche na ya n’ụbọchị ahụ. Nke a nyeere ha aka ịtụgharị uche n’ihe ime mmụọ.

N’ikpeazụ, oké ụda ogbunigwe mere ka a mata na ndị agha Jikọrọ Aka na ndị agha Russia abịarutewela. Ndị Russia bu ụzọ rute n’ogige ahụ Ferdinand na ndị ibe ya nọ. Ha nyere ndị mkpọrọ ahụ nri ma gwa ha ka ha si n’ogige ahụ pụọ. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke April 1945, ndị agha Russia hapụrụ ha ka ha laa.

Ịnọkọtaghachi Dị Ka Ezinụlọ

Na June 15, Ferdinand rutere Netherlands. Ụmụnna ndị Groningen nabatara ya nnọọ nke ọma. N’oge na-adịghị anya, ọ nụrụ na anyị ka dị ndụ, na anyị bi n’otu ebe ná mba ahụ, anyị nụkwara na ọ lọtala. Anyị tụsiri nnọọ anya ya ike. Ma n’ikpeazụ, otu ụbọchị, obere Ruth tiri mkpu, sị: “Mama, bịa lee onye bịara n’ụlọ anyị!” Ọ bụ di na papa anyị anyị hụrụ n’anya!

E nwere ọtụtụ nsogbu ndị ọ dị mkpa ka e dozie tupu anyị adịghachi otú ezinụlọ kwesịrị ịdị. Anyị enweghị ụlọ, otu ihe ịma aka siri ike bụkwa inweteghachi akwụkwọ ikike ibi na Netherlands. Ebe ọ bụ na anyị bụ ndị Germany, ruo ọtụtụ afọ, ndị Netherlands mesoro anyị ihe dị ka ndị osu. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ahụ́ mesịrị ruo anyị ala n’ebe ahụ, anyị malitekwara ibi ụdị ndụ gụsịrị anyị agụụ ike—nke ifekọ Jehova ọnụ dị ka ezinụlọ.

“Mụ Onwe M Atụkwasịwo Obi na Jehova”

N’afọ ndị sochirinụ, mgbe ọ bụla mụ na Ferdinand na ụfọdụ ndị enyi anyị, bụ́ ndị biri ndụ n’oge ihe isi ike ndị ahụ dị ka anyị biri, nọkọtara, anyị na-echeta nchebe ịhụnanya Jehova n’oge ihe isi ike ndị ahụ. (Abụ Ọma 7:1) Anyị ṅụrịrị ọṅụ na n’afọ ndị ahụ, Jehova kwere ka anyị kere òkè n’ime ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ gaa n’ihu. Anyị na-ekwukwa mgbe mgbe otú obi dịruru anyị n’ụtọ na anyị tinyere oge ntorobịa anyị n’ozi dị nsọ nke Jehova.—Eklisiastis 12:1.

Mgbe oge mkpagbu ndị Nazi gasịrị, mụ na Ferdinand jekọọrọ Jehova ozi ruo ihe karịrị afọ 50 ọzọ tupu ya ejesịa ozi elu ala ya na December 20, 1995. N’oge na-adịghị anya, aga m agba afọ 98. Kwa ụbọchị, ana m ekele Jehova na ụmụ anyị kwadoro anyị n’afọ ndị ahụ tara akpụ, nakwa na m ka pụrụ ime ike m n’ozi ya iji wetara aha ya otuto. Enwere m ekele maka ihe nile Jehova mewooro m, ọ bụkwa ọchịchọ obi m ịnọgide na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ nduzi m: “Mụ onwe m atụkwasịwo obi na Jehova.”—Abụ Ọma 31:6.

[Foto dị na peeji nke 19]

Mụ na Ferdinand n’October 1932

[Foto dị na peeji nke 19]

Ụgbọ mmiri “Almina” e ji mee nkwusa na ndị ji ya mee ihe

[Foto dị na peeji nke 22]

Mụ na Ferdinand na ụmụ anyị