Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kpachara Anya Banyere Omenala Ndị Na-adịghị Amasị Chineke

Kpachara Anya Banyere Omenala Ndị Na-adịghị Amasị Chineke

 Kpachara Anya Banyere Omenala Ndị Na-adịghị Amasị Chineke

N’OTU obere mbara èzí, otu igbe ozu ghere oghe ka anwụ na-achasi ike n’otu ebe n’Africa. Ka ndị na-eru újú kwụụrụ n’ahịrị na-agafe n’akụkụ igbe ozu ahụ iji gosi mwute ha, otu agadi nwoke kwụsịtụrụ. N’ịbụ onye anya mmiri juru anya, o hulatara n’ebe isi nke ozu ahụ ma malite ikwu, sị: “Gịnị mere ị na-ejighị gwa m na ị lawala? Gịnị mere i ji si otú a hapụ m? Ugbu a ị lara, ị̀ ka ga na-enyere m aka?”

N’akụkụ ọzọ nke Africa, a mụrụ nwa ọhụrụ. E kweghị ka onye ọ bụla hụ nwa ahụ. Ọ bụ nanị mgbe oge ụfọdụ gasịrị ka e kupụtara nwa ọhụrụ ahụ n’ihu ọha ma nye ya aha dị ka omenala si dị.

Nye ụfọdụ ndị, ịgwa onye nwụrụ anwụ okwu ma ọ bụ izo nwa a mụrụ ọhụrụ ka ndị mmadụ ghara ịhụ ya anya pụrụ iyi ihe ijuanya. Otú ọ dị, n’ọdịnala na n’obodo ụfọdụ, nkwenkwe siri ike ndị mmadụ nwere, nke bụ́ na ndị nwụrụ anwụ anwụghị anwụ n’ezie kama na ha dị ndụ n’ebe ọzọ ma mara ihe na-emenụ, na-emetụta omume ha na otú ha si ele ọnwụ na ọmụmụ anya.

Nkwenkwe a siri ike nke ukwuu nke na ọ bụ akụkụ dị mkpa nke omenala na ememe ndị metụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ  nile nke ndụ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde mmadụ kweere na akụkụ ndị dị mkpa nke ndụ—dị ka ọmụmụ, oge uto, alụmdi na nwunye, ịmụ nwa na ọnwụ—bụcha akụkụ nke njem na-eduga n’ógbè ndị mmụọ nke ndị nna ochie. N’ebe ahụ, dị ka e kweere, onye ahụ nwụrụ anwụ na-anọgide na-ekere òkè dị ukwuu ná ndụ nke ndị ọ nwụnahụrụ. Ọ pụkwara ịnọgide na-adịghachi ndụ site n’ịlọ ụwa.

Iji hụ na akụkụ nile nke ngafere a gara nnọọ nke ọma, a na-eme ọtụtụ omenala na ememe. A na-eme omenala ndị a n’ihi nkwenkwe bụ́ na ọ dị ihe dị n’ime anyị nke na-adịghị anwụ anwụ. Ezi Ndị Kraịst na-ezere omenala ọ bụla ya na nkwenkwe a nwere njikọ. N’ihi gịnị?

Gịnị Bụ Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ?

Bible mere ka ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ doo anya. O kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, na mgbe dị anya gara aga ka ọ laworo n’iyi . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị n’ala mmụọ [ma ọ bụ, “Shiol,” ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ], ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:5, 6, 10) Ọ dịwo anya ezi ndị na-efe Chineke ofufe nakweere eziokwu a bụ́ isi nke Bible. Ha aghọtawo na mkpụrụ obi, kama ịbụ ihe na-adịghị anwụ anwụ, pụrụ ịnwụ anwụ, na a pụkwara ibibi ya ebibi. (Ezikiel 18:4) Ha amatawokwa na ọ dịghị ihe dị ka mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. (Abụ Ọma 146:4) N’oge ochie, Jehova nyesiri ndị ya iwu ike ikewapụ onwe ha kpamkpam site n’omenala ma ọ bụ ememe ọ bụla e jikọtara ya na nkwenkwe bụ́ na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, na ha pụkwara inwe mmetụta n’ahụ́ ndị dị ndụ.—Deuterọnọmi 14:1; 18:9-13; Aịsaịa 8:19, 20.

N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst narị afọ mbụ zeere omenala ma ọ bụ ememe ọ bụla nke ya na ozizi okpukpe ụgha nwere njikọ. (2 Ndị Kọrint 6:15-17) Taa, Ndịàmà Jehova, n’agbanyeghị agbụrụ, ebo ma ọ bụ nzụlite ha, na-ajụ ọdịnala na omenala ndị e jikọtara ha na ozizi ụgha ahụ bụ́ na ọ dị ihe dị n’ime mmadụ nke na-adịghị anwụ anwụ.

Dị ka Ndị Kraịst, gịnị pụrụ iduzi anyị n’ikpebi ma ànyị ga-eme omenala ụfọdụ ma ọ bụ na anyị agaghị eme ha? Anyị aghaghị iche echiche nke ọma banyere njikọ ọ pụrụ ịbụ na ya na ozizi na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, dị ka nkwenkwe bụ́ na mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ na-emetụta ndị dị ndụ, nwere. Ọzọkwa, ọ dị anyị mkpa ịtụle ma anyị ikere òkè n’omenala ma ọ bụ ememe dị otú ahụ, ọ̀ pụrụ ime ka ndị ọzọ maara ihe Ndịàmà Jehova kweere ma na-akụzi sụọ ngọngọ. N’iburu isi ihe ndị ahụ n’uche, ka anyị tụlee ebe abụọ e nwere nsogbu—ọmụmụ na ọnwụ.

Ememe Ọmụmụ na Ịgụ Aha

Ọtụtụ omenala ndị e jikọtara ha na ọmụmụ nwa kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, n’obodo ndị a na-ele ọmụmụ anya dị ka isite n’ógbè mmụọ nke ndị nna ochie gafeta na nke ndị mmadụ, ezi Ndị Kraịst aghaghị ịkpachara anya. Dị ka ihe atụ, n’akụkụ ụfọdụ nke Africa, a na-ahapụ nwa a mụrụ ọhụrụ n’ime ụlọ, a dịghịkwa agụ ya aha ruo mgbe oge ụfọdụ gasịrị. Ọ bụ ezie na oge nchere ahụ pụrụ ịdị iche site n’otu ebe gaa n’ọzọ, n’ikpeazụ, a na-eme ememe ịgụ aha, bụ́ mgbe a ga-ekupụta nwa ahụ èzí ma gosi ya ikwu na ibe. N’oge ahụ, a na-agwa ndị bịara ememe ahụ aha a gụrụ nwa ahụ.

N’ịkọwa ihe mere omenala ahụ ji dị ịrịba ama, akwụkwọ bụ́ Ghana—Understanding the People and Their Culture na-ekwu, sị: “N’ụbọchị asaa mbụ ya, a na-ewere ya na nwa ọhụrụ bịara ‘nleta,’ nakwa na ọ ka si n’ụwa ndị mmụọ na-agafeta ná ndụ elu ala. . . . A naghị ekupụtakarị nwa ahụ èzí, a naghịkwa ekwe ka ndị na-abụghị ndị ezinụlọ ya hụ ya.”

N’ihi gịnị ka e ji echere ruo oge ụfọdụ tupu a gụọ nwa ahụ aha n’ụzọ omenala? Akwụkwọ bụ́ Ghana in Retrospect na-akọwa, sị: “Tupu ụbọchị nke asatọ, a na-ewere ya na nwa ahụ abụghị mmadụ. A na-elekarị ya anya dị ka  onye ka nọ n’ụwa nke ọzọ ahụ o si bịa.” Akwụkwọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ebe ọ bụ na a na-ewere ya na ọ bụ aha na-eme ka nwatakịrị ahụ ghọọ mmadụ, mgbe ụjọ ji ndị mụrụ ya na nwa ha ga-anwụ, ha na-ahapụkarị inye ya aha ruo mgbe ha jidere n’aka na ọ ga-adị ndụ. . . . N’ihi ya, a na-eche na ememe ngafeta a, bụ́ nke a na-akpọ mgbe ụfọdụ ikupụta nwa, bụ ihe omume dị ezigbo mkpa nye nwa ahụ na ndị mụrụ ya. Ọ bụ ememe ahụ na-eme ka nwa ahụ bata n’etiti ma ọ bụ n’ụwa nke ndị bụ́ mmadụ.”

Ọ na-abụkarị onye ikwu kataworo ahụ́ nke ezinụlọ ahụ na-anọ n’isi n’ememe ịgụ aha dị otú ahụ. Ihe ndị a na-eme n’ememe ahụ na-adị iche site n’otu ebe gaa n’ọzọ, ma ememe ahụ na-agụnyekarị ịtụpụrụ ndị nna ochie mmanya, ịgọ ọfọ iji kelee mmụọ nke ndị nna ochie maka idurute nwa ahụ n’udo, na omenala ndị ọzọ.

Ihe bụ́ isi a na-eme n’ememe ahụ bụ ikwupụta aha nwa ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị mụrụ nwa ahụ ga-agụ ya aha, ndị ikwu ya ndị ọzọ na-esokarị ekpebi aha a ga-agụ ya. Aha ụfọdụ pụrụ ịpụta ihe ụfọdụ n’asụsụ ógbè, dị ka “onye gara ma lọghachi,” “nne alọghachila,” ma ọ bụ “nna alọghachila.” A na-ezube iji ihe aha ndị ọzọ pụtara egbochi ndị nna ochie ịkpọrọghachi nwa ọhụrụ ahụ gaa n’ụwa nke ndị nwụrụ anwụ.

N’ezie, ọ bụghị ihe ọjọọ ịṅụrị ọṅụ na a mụrụ nwa ọhụrụ. Omenala nke ịgụ nwa ọhụrụ aha onye ọzọ na ịgụ ya aha nke na-egosi ihe ndị mere n’oge a mụrụ ya dịcha mma, ọ bụkwa mmadụ ga-ekpebiri onwe ya oge ọ chọrọ iji gụọ nwa ya aha. Otú ọ dị, Ndị Kraịst bụ́ ndị na-achọ ime ihe na-amasị Chineke kwesịrị ịkpachara anya iji zere omenala na ememe ọ bụla na-enye echiche na ha kweere na nwa ọhụrụ ahụ bụ “onye ọbịa” nke si n’ụwa ndị mmụọ nke ndị nna ochie na-agafeta n’ụwa nke ndị dị ndụ.

Tụkwasị na nke a, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị n’ógbè ha na-ewere ememe ịgụ aha dị ka omenala ngafeta dị oké mkpa, Ndị Kraịst kwesịrị ichebara akọ na uche nke ndị ọzọ echiche ma tụlee ihe ha na-akụnye n’uche ndị na-ekweghị ekwe. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ụfọdụ ndị pụrụ ikwubi ma ọ bụrụ na ezinụlọ Ndị Kraịst ekweghị ka ndị ọzọ hụ nwa ọhụrụ ha ruo mgbe e mere ememe ịgụ aha? Gịnị ka ha ga na-akụnye n’uche ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ha agụọ aha ndị megidere nzọrọ ha na-azọrọ na ha bụ ndị na-akụzi eziokwu Bible?

N’ihi ya, mgbe Ndị Kraịst na-ekpebi otú ha ga-esi gụọ nwa ha aha na mgbe ha ga-eme ya, ha na-agbalịsi ike ime “ihe nile ka e wee nye Chineke otuto” ka ha wee ghara ịghọ ihe na-eme ka mmadụ sụọ ngọngọ. (1 Ndị Kọrint 10:31-33) Ha adịghị ‘eleghara ihe Chineke nyere n’iwu anya iji wee jigide ọdịnala’ ndị e zubere nnọọ iji sọpụrụ ndị nwụrụ anwụ. N’ụzọ dị iche, ha na-enye Chineke dị ndụ, bụ́ Jehova, nsọpụrụ na otuto.—Mak 7:9, 13.

Isi n’Ọnwụ Gafere ná Ndụ

Dị ka ọmụmụ, ọtụtụ mmadụ na-ewere ọnwụ dị ka ngafere; onye ọ bụla nwụrụnụ na-esite n’ụwa a na-ahụ anya gafere n’ógbè a na-adịghị ahụ anya nke mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ. Ọtụtụ ndị kweere na ọ gwụla ma e mere omenala na ememe olili ozu ụfọdụ mgbe mmadụ nwụrụ, a ga-akpasu mmụọ nke ndị nna ochie, bụ́ ndị e kweere na ha nwere ikike ịta ndị dị ndụ ahụhụ ma ọ bụ inye ha ụgwọ ọrụ, iwe. Nkwenkwe a na-ekpebi n’ụzọ dị ukwuu otú a ga-esi hazie ma mee ememe olili ozu.

Ememe olili ozu ndị e zubere iji mee ka obi jụrụ ndị nwụrụ anwụ na-agụnyekarị mmetụta ndị dịgasị iche—malite n’iti mkpu ákwá n’ebe a dọbara ozu ahụ ruo n’oriri na nkwari mgbe e lisịrị onye ahụ. Oriri a na-achịkwaghị achịkwa, ịṅụbiga mmanya ókè na ịgba egwú ndị na-ada oké ụda na-abụkarị ihe ndị e ji ama ememe olili ozu ndị dị otú ahụ. A na-eji ememe olili ozu akpọrọ ihe nke ukwuu nke na ọbụna ezinụlọ ndị kasị daa ogbenye na-agbalịsi ike inweta ego ga-ezunụ iji “kwaa” onye ha nwụrụ anwụ, n’agbanyeghị na ọ pụrụ itinye ha n’ihe isi ike na n’ụgwọ.

 Kemgbe ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova agbawo ememe olili ozu ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị n’anwụ. * Ememe ndị ahụ na-agụnye ịmụ anya abalị, ịtụpụrụ ndị nna ochie mmanya, ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu na ịrịọ ha arịrịọ, akwamozu na ememe ndị ọzọ na-akwado nkwenkwe bụ́ na ọ dị ihe dị n’ahụ́ mmadụ nke na-adịghị anwụ anwụ. Omenala ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị na-ewetara Chineke nkọcha, “rụrụ arụ,” bụrụkwa “aghụghọ efu” ndị dabeere ‘n’ọdịnala mmadụ,’ ọ bụghị n’Okwu eziokwu nke Chineke.—Aịsaịa 52:11; Ndị Kọlọsi 2:8.

Nrụgide Ịdị Ka Ibe

Izere omenala obodo aghọworo ụfọdụ ndị ihe ịma aka, karịsịa n’ala ebe ndị a na-ewere ịkwanyere ndị nwụrụ anwụ ùgwù dị ka ihe dị oké mkpa. N’ihi ịjụ ime omenala ndị dị otú ahụ, e nyowo Ndịàmà Jehova enyo ma ọ bụ bo ha ebubo na ha adịghị achọ iso ndị ọzọ emekọ ihe, nakwa na ha adịghị akwanyere ndị nwụrụ anwụ ùgwù. Nkatọ na nrụgide siri ike emeela ka ụfọdụ ndị na-atụ egwu ịnọpụ iche n’agbanyeghị na ha ghọtara eziokwu Bible nke ọma. (1 Pita 3:14) Ndị ọzọ echewo na omenala ndị a bụ akụkụ nke ọdịnala ha, nakwa na a pụghị izere ha kpamkpam. Ọzọkwa, ndị ọzọ echewo na ịjụ ịgbaso omenala pụrụ ime ka ndị obodo kpọọ ndị Chineke asị.

Anyị adịghị achọ imejọ ndị ọzọ n’ụzọ na-enweghị isi. N’agbanyeghị nke ahụ, Bible na-adọ anyị aka ná ntị na iguzosi ike n’akụkụ nke eziokwu ahụ ga-eme ka ụwa nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ kpọọ anyị asị. (Jọn 15:18, 19; 2 Timoti 3:12; 1 Jọn 5:19) Anyị na-eji ọchịchọ obi ewere nguzo dị otú ahụ, na-amara na anyị aghaghị ịdị iche n’ebe ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ nọ. (Malakaị 3:18; Ndị Galeshia 6:12) Dị nnọọ ka Jizọs guzogidere ọnwụnwa Setan nke ime ihe na-adịghị amasị Chineke, otú a ka anyị si eguzogide nrụgide nke ime ihe na-adịghị amasị Chineke. (Matiu 4:3-7) Kama ịtụ egwu mmadụ, nchegbu bụ́ isi nke ezi Ndị Kraịst bụ ime ihe na-amasị Jehova Chineke na ịsọpụrụ ya dị ka Chineke nke eziokwu. Ha na-eme otú ahụ site n’ịghara imebi ụkpụrụ Bible maka ofufe dị ọcha n’ihi nrụgide sitere n’aka ndị ọzọ.—Ilu 29:25; Ọrụ 5:29.

Ịkwanyere Ndị Nwụrụ Anwụ Ùgwù—Ịsọpụrụ Jehova

Ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị inwe oké mwute na iru újú mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ. (Jọn 11:33, 35) Icheta ihe ndị dị mma banyere onye a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ na ili ya n’ụzọ dị ùgwù bụ ụzọ ndị dị mma ma kwesị ekwesị isi gosipụta ịhụnanya anyị. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova na-anagide oké mwute nke ọnwụ na-akpata n’etinyeghị aka n’omenala ọ bụla na-adịghị amasị Chineke. Nke a anaghị adịrị ndị a zụlitere n’ebe e nwere omenala nke ịtụ ndị nwụrụ anwụ egwu mfe. Ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi mgbe anyị na-eru újú nke ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya. Ka o sina dị, Jehova, bụ́ “Chineke nke nkasi obi nile,” na-ewusi Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ike, ha na-eritekwa uru site ná nkwado ịhụnanya nke ndị kwere ekwe ibe ha. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Okwukwe ha siri ike na ndị nwụrụ anwụ na-amaghị ihe ọ bụla, bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke, ga-adị ndụ ọzọ, na-eme ka ezi Ndị Kraịst nwee ezi ihe mere ha ga-eji kewapụ onwe ha kpamkpam n’ememe olili ozu ndị na-emegide nkwenkwe Ndị Kraịst na mbilite n’ọnwụ.

Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ na Jehova akpọpụtawo anyị “n’ọchịchịrị gaa n’ìhè ya dị ebube”? (1 Pita 2:9) Ka anyị na-enwe ọṅụ nke ọmụmụ nwa ma na-eru újú ọnwụ, ka ọchịchọ anyị siri ike ime ihe ziri ezi na ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ na-akpali anyị mgbe nile ‘ịnọgide na-eje ije dị ka ụmụ nke ìhè.’ Ka anyị gharatụ ikwe ka omenala ndị na-emegide ụkpụrụ Ndị Kraịst na ndị na-adịghị amasị Chineke merụọ anyị n’ụzọ ime mmụọ.—Ndị Efesọs 5:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 23 Biko lee broshuọ ndị bụ́ Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.