Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Jiri Amamihe Chineke Chebe Ụmụ Gị

Ụzọ Isi Jiri Amamihe Chineke Chebe Ụmụ Gị

 Ụzọ Isi Jiri Amamihe Chineke Chebe Ụmụ Gị

KWA ụbọchị, ahụ́ anyị na-anọ n’agha. Ọ ghaghị ịlụ ọgụ megide nje dị iche iche na-akpata ọrịa. Anyị nwere ekele na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ketara ihe ndị na-alụso ọrịa ọgụ bụ́ ndị na-echebe anyị pụọ ná mwakpo ndị ahụ ma mee ka anyị ghara ibute ọtụtụ ọrịa ndị na-efe efe.

N’ụzọ yiri nke ahụ, Ndị Kraịst aghaghị ịlụ ọgụ megide echiche na ụkpụrụ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, nakwa megide nrụgide ndị pụrụ ibibi ahụ́ ike ime mmụọ anyị. (2 Ndị Kọrint 11:3) Iji guzogide mwakpo a a na-awakpo uche na obi anyị kwa ụbọchị, ọ dị anyị mkpa ịzụlite ihe nchebe ime mmụọ.

Ihe nchebe dị otú ahụ dị ụmụ anyị mkpa karịsịa, ebe ọ bụ na ha ebughị ihe nchebe ime mmụọ, bụ́ nke pụrụ imeri mmụọ nke ụwa, pụta ụwa. (Ndị Efesọs 2:2) Ka ụmụaka na-etolite, ọ dị oké mkpa ndị nne na nna inyere ha aka inwe ihe nchebe nke ha. Na gịnị ka ihe nchebe ahụ dabeere? Bible na-akọwa, sị: “Jehova na-enye amamihe; . . . ọ bụkwa ụzọ ndị ebere Ya ka Ọ na-edebe.” (Ilu 2:6, 8) Amamihe Chineke pụrụ ichebe ụzọ nke ndị na-eto eto bụ́ ndị, ma e wezụga ya, pụrụ ịdaba ná mkpakọrịta na-emerụ ahụ́, nrụgide ndị ọgbọ ma ọ bụ ntụrụndụ na-adịghị mma. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gbasoo nduzi Jehova ma kụnye amamihe Chineke n’ime ụmụ ha?

Ịchọ Mkpakọrịta Na-ewuli Elu

N’ụzọ kwere nghọta, ndị nọ n’afọ iri na ụma na-enwe mmasị iso ndị ọgbọ ha akpakọrịta, ma iso nanị ndị ọzọ na-enwebeghị ahụmahụ akpakọrịta agaghị enyere ha aka inweta amamihe Chineke. “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe e kekọtaworo n’obi nwata,” ka ilu dọrọ aka ná ntị. (Ilu 22:15) Oleezi otú ndị nne na nna ụfọdụ siworo nyere ụmụ ha aka itinye amamihe Chineke n’ọrụ n’akụkụ a nke mkpakọrịta?

Otu nna aha ya bụ Don * sịrị: “Ụmụ anyị na-eji oge dị ukwuu anọnyere ndị enyi bụ́ ndị ọgbọ ha, ma ha na-anọ ihe ka ukwuu n’oge ndị ahụ n’ụlọ anyị, n’ebe anyị na-ahụ ha. Anyị  mere ka ụlọ anyị bụrụ mgbe nile ebe ndị na-eto eto na-ejupụta, bụ́ ndị anyị na-enye nri ma mee ka ha nwee ntụsara ahụ́. Obi dị anyị ụtọ ịnagide ụzụ na aghara n’ụlọ anyị n’ihi na anyị chọrọ inwe ebe dị nchebe nke ụmụ anyị pụrụ ikpori ndụ na ya.”

Brian na Mary nwere ezigbo ụmụ atọ ma ha kwetara nnọọ na ịzụlite ha adịghịrị ha mfe. Ha kọrọ, sị: “N’ọgbakọ anyị, e nwekarịghị ndị na-eto eto nọ ná ngwụsị afọ iri na ụma ha na nwa anyị nwanyị bụ́ Jane ga na-akpakọ. Otú ọ dị, o nwere otu enyi aha ya bụ Susan, bụ́ onye na-emesapụ ihu, nke nwere omume enyi. Ma ndị mụrụ ya na-anabata ihe karịa anyị. A na-ekwe ka Susan nọọ ọdụ n’èzí karịa Jane, na-eyi sket dị mkpụmkpụ karị, na-ege egwú ndị a na-enyo enyo ma na-ele fim ndị na-adịghị mma. Ruo ogologo oge, o siiri Jane ike ịghọta mkpa ọ dị ile ihe anya otú anyị si ele ya. Nye ya, ndị mụrụ Susan yiri ndị na-aghọta ihe karị, ebe ọ na-ele anyị anya dị ka ndị na-adịghị nnọọ ekwe mmadụ megharịa ahụ́. Ọ bụ nanị mgbe Susan bara ná nsogbu ka Jane ghọtara na nkwụsi ike anyị chebere ya. Obi dị anyị ụtọ nke ukwuu na anyị ebelataghị aka n’ime ihe anyị chere ga-abara nwa anyị uru.”

Dị ka Jane, ọtụtụ ndị na-eto eto ahụtawo amamihe nke ịgbaso nduzi ndị mụrụ ha n’ihe metụtara mkpakọrịta. “Ntị nke na-anụ ịba mba nke ndụ, n’etiti ndị maara ihe ka ọ ga-anọ ọnọdụ abalị,” ka ilu na-ekwu. (Ilu 15:31) Amamihe Chineke na-eduga ndị na-eto eto n’ịchọ iso ndị enyi na-ewuli elu na-akpakọrịta.

Ụzọ Isi Mee Ihe Banyere Ọchịchọ Ịdị Ka Ibe

Mkpakọrịta na nrụgide ndị ọgbọ nwere njikọ chiri anya. Kwa ụbọchị, ọchịchọ ịdị ka ibe na-awakpo ihe nchebe ụmụ anyị. Ebe ọ bụ na ndị ntorobịa na-achọkarị ịbụ ndị ndị ọgbọ ha nabatara, nrụgide ndị ọgbọ pụrụ ime ka ha na-eme ihe kwekọrọ n’ihe ụwa na-ele anya dị ka ihe dị mma.—Ilu 29:25.

Bible na-echetara anyị na “ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya.” (1 Jọn 2:17) N’ihi ya, ndị nne na nna ekwesịghị ikwe ka echiche nke ụwa metụta ụmụ ha gabiga ókè. Olee otú ha pụrụ isi nyere ụmụ ha aka iche echiche n’ụzọ Ndị Kraịst?

“Nwa m nwanyị na-achọ mgbe nile iyi ihe ndị na-eto eto ndị ọzọ na-eyi,” ka Richard kwuru. “N’ihi ya, anyị jiri ndidi soro ya tụgharịa uche n’uru na ọghọm dị n’ihe nke ọ bụla ọ rịọrọ. Ọbụna n’ihe banyere ejiji ndị nke anyị chere na ha adịghị njọ, anyị gbasoro ndụmọdụ anyị nụrụ ọtụtụ afọ gara aga, ‘Ọ bụ onye maara ihe bụ onye na-adịghị ekwe ka ọ bụrụ ya ga-abụ onye mbụ ga-eji ejiji ọhụrụ ma ọ bụkwanụ onye ikpeazụ ga-ahapụ ya.’”

Otu nne aha ya bụ Pauline mere ihe megide nrụgide ndị ọgbọ n’ụzọ ọzọ. O chetara, sị: “Amalitere m inwe mmasị n’ihe ndị na-amasị ụmụ m ma na-aga n’ọnụ ụlọ ha mgbe nile ịgwa ha okwu. Ogologo mkparịta ụka ndị a nyeere m aka ịkpụzi echiche ha ma nyere ha aka ịtụle ụzọ ndị ọzọ isi na-ele ihe anya.”

 Nrụgide ndị ọgbọ agaghị akwụsị akwụsị, n’ihi ya, o yiri ka ndị nne na nna hà ga-anọgide na-agbalịsi ike ‘ikpu echiche uche ụwa ihu’ ma na-enyere ụmụ ha aka ịdọrọ echiche ha “n’agha ime ka ọ na-erubere Kraịst ahụ isi.” (2 Ndị Kọrint 10:5) Ma site ‘n’ịnọgidesi ike n’ekpere,’ a ga-ewusi ma ndị mụrụ ụmụ ma ụmụ ha ike ịrụzu ọrụ a dị oké mkpa.—Ndị Rom 12:12; Abụ Ọma 65:2.

Ihe Ndọrọ Dị Ike nke Ntụrụndụ

Mmetụta nke atọ ndị mụrụ ụmụ pụrụ inwe ihe isi ike imeri bụ ntụrụndụ. Obere ụmụaka na-enwekarị mmasị n’egwuregwu. Ọtụtụ ụmụaka ndị tolitetụworonụ na-enwekwa nnọọ mmasị ná ntụrụndụ. (2 Timoti 2:22) Ma, ọ bụrụ na e mejụghị ọchịchọ a n’ụzọ amamihe dị na ya, ọ pụrụ ibelata ihe nchebe ime mmụọ ha. Ihe ize ndụ ahụ na-abịakarị n’ụzọ abụọ.

Nke mbụ, ọtụtụ ntụrụndụ na-egosipụta ụkpụrụ omume dị ala nke ụwa. (Ndị Efesọs 4:17-19) N’agbanyeghị nke ahụ, a na-egosikarị ya n’ụzọ na-akpali akpali na nke na-adọrọ adọrọ. Nke a pụrụ ịbụ ezigbo ihe ize ndụ nye ndị na-eto eto, bụ́ ndị na-apụghị ịhụ ọnyà ndị dị na ya.

Nke abụọ, oge a na-etinye ná ntụrụndụ pụkwara ịkpata nsogbu. Nye ụfọdụ, ikpori ndụ na-aghọ ihe kachasị ha mkpa ná ndụ, na-ewekọrọ nnọọ ihe ka ukwuu n’oge na ike ha. Ilu na-adọ aka ná ntị na “ịracha mmanụ aṅụ hiri nne adịghị mma.” (Ilu 25:27) N’otu aka ahụ, ntụrụndụ gabigara ókè ga-ebelata agụụ maka nri ime mmụọ ma duga n’ịdị umengwụ nke echiche. (Ilu 21:17; 24:30-34) Iji ụwa a eme ihe n’uju ga-egbochi ndị ntorobịa ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie’—ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke. (1 Timoti 6:12, 19) Olee otú ndị nne na nna siworo merie ihe ịma aka ahụ?

Mari Carmen, bụ́ nne nke nwere ụmụ nwanyị atọ kwuru, sị: “Anyị chọrọ ka ụmụ anyị na-enwe ntụrụndụ ndị na-ewuli elu ma na-ekpori ndụ. Ya mere, anyị na-eme mkpapụ mgbe nile dị ka ezinụlọ, ha na ndị enyi ha n’ọgbakọ na-anọkọkwa. Ma anyị debere ntụrụndụ n’ọnọdụ kwesịrị ya. Anyị ji ya tụnyere nri nhicha ọnụ a na-eri ma e richaa nri—ọ na-adị ụtọ ma ọ bụghị ya bụ nri n’onwe ya. Ha mụtara ịrụ ọrụ n’ụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’ọgbakọ.”

Don na Ruth ekweghị ka ntụrụndụ bụrụ ihe a na-eme nanị mgbe oge dapụtara. “Anyị na-ewepụta ụbọchị Saturday dị ka ‘ụbọchị ezinụlọ,’” ka ha kọwara. “Anyị na-aga ozi ubi n’ụtụtụ, gaa gwuo mmiri n’ehihie ma rie nri pụrụ iche n’abalị.”

Ihe ndị a ndị nne na nna a kwuru na-egosi uru nke inwe ntụrụndụ dị mma nke a haziri ahazi ma na-enye ya ọnọdụ kwesịrị ya ná ndụ Onye Kraịst.—Eklisiastis 3:4; Ndị Filipaị 4:5

Tụkwasị Jehova Obi

N’ezie, ọ na-ewe ọtụtụ afọ iji zụlite ihe nchebe ime mmụọ. Ọ dịghị ọgwụ ọrụ ebube ga-eme ka ụmụaka nweta amamihe Chineke, na-akpali ha ịtụkwasị Nna ha nke eluigwe obi. Kama, ndị nne na nna aghaghị ‘ịnọgide na-azụlite ụmụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.’ (Ndị Efesọs 6:4) ‘Nduzi echiche a’ na-aga n’ihu n’ihu pụtara inyere ụmụaka aka ile ihe anya dị ka Chineke si ele ya. Olee otú ndị nne na nna ga-esi mezuo nke ahụ?

Inwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya bụ ihe dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma. Ọmụmụ ihe ahụ ‘na-ekpughe anya ụmụaka ka ha wee legide oké ihe dị iche iche si n’iwu Chineke pụta.’ (Abụ Ọma 119:18) Diego ji ọmụmụ ihe ezinụlọ ya kpọrọ ihe nke ukwuu, sikwa otú ahụ  nyere ụmụ ya aka ịbịaru Jehova nso karị. “M na-akwado nnọọ nke ọma maka ọmụmụ ihe ahụ,” ka o kwuru. “Site n’iji akwụkwọ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ eme nnyocha, m na-eme ka ndị e kwuru banyere ha na Bible yie ndị dị adị n’ezie. M na-agba ụmụ m ume ịchọpụta onye ha dị ka ya ná ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Nke a chetaara nnọọ ụmụ m ihe na-atọ Jehova ụtọ.”

Ụmụaka na-amụtakwa ihe n’oge na-abụghị oge e wepụtara iji kụziere ha ihe. Mozis gbara ndị nne na nna ume ikwu banyere ihe ncheta Jehova ‘mgbe ha na-anọdụ n’ụlọ ha, na mgbe ha na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ha na-edina ala, na mgbe ha na-ebili ọtọ.’ (Deuterọnọmi 6:7) Otu nna kọwara, sị: “Ọ na-ewe nwa m nwoke oge ikwupụta ihe dị ya n’obi. Mgbe anyị gara mkpagharị ma ọ bụ rụkọọ otu ọrụ ọnụ, ọ na-emesị nwere onwe ya ikwupụta nchegbu ya. N’oge ndị a, anyị na-enwe ezigbo mkparịta ụka ndị na-abara anyị abụọ uru.”

Ekpere ndị nne na nna na-ekpe na-enwekwa mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ụmụ ha. Ịnụ ka nne na nna ha ji obi umeala na-agakwuru Chineke n’ekpere ịrịọ ya arịrịọ maka enyemaka na mgbaghara na-akpali ụmụaka ahụ “ikwere na ọ dị adị.” (Ndị Hibru 11:6) Ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma na-emesi ike mkpa ekpere ezinụlọ dị, tinyere ekpere ndị gụnyere ihe ndị metụtara ụlọ akwụkwọ na ihe ndị ọzọ na-echegbu ụmụ ha. Otu nna kwuru na nwunye ya na-eso ụmụ ha ekpe ekpere mgbe nile tupu ha agawa ụlọ akwụkwọ.—Abụ Ọma 62:8; 112:7.

“Ka Anyị Ghara Ịda Mbà n’Ime Ihe Dị Mma”

Nne na nna nile na-emehie ihe, ha pụkwara ịkwa ụta n’ihi otú ha si mee ihe n’ọnọdụ ụfọdụ. Otú o sina dị, Bible na-agba anyị ume ịnọgide na-agbalị, ghara “ịda mbà n’ime ihe dị mma.”—Ndị Galeshia 6:9.

Otú ọ dị, ndị nne na nna pụrụ ịda mbà mgbe ụfọdụ mgbe ha na-apụghị nnọọ ịghọta ụmụ ha. Ọ ga-adị nnọọ mfe ikwubi na ndị na-eto eto nke oge a dị iche ma sie ike nchịkwa. Ma, n’ezie, ụmụaka nke oge a nwere otu adịghị ike ndị ahụ ụmụaka oge mbụ nwere, na-echekwa ọnwụnwa ndị yiri ndị nke ha ihu, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na nrụgide imehie ihe amụbawo. N’ihi ya, otu nna, mgbe ọ gbazichara nwa ya nwoke, mere ka okwu ya dị nro site n’iji obiọma gbakwụnye, sị: “Obi gị na-achọ nnọọ ka i mee ihe ndị obi m chọrọ ka m mee mgbe m ha ka gị.” Ọ pụrụ ịbụ na ndị nne na nna amachaghị ihe banyere kọmputa, ma ha maara ihe nile banyere ọchịchọ nke anụ  ahụ́ na-ezughị okè.—Matiu 26:41; 2 Ndị Kọrint 2:11.

Ikekwe, ụmụaka ụfọdụ adịghị adịcha njikere ịnabata nduzi ndị mụrụ ha, ọbụnakwa na-ajụ ịnabata ịdọ aka ná ntị ndị a na-enye ha. Otú ọ dị, nke a chọkwara nnọọ ntachi obi. N’agbanyeghị na ha na-alatụ azụ na mbụ ịnabata ndụmọdụ ma ọ bụ jụ ya kpamkpam, ọtụtụ ụmụaka na-emecha nabata ya. (Ilu 22:6; 23:22-25) Matthew, nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst nke na-eje ozi ugbu a n’otu alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, kọrọ, sị: “Mgbe m dị afọ iri na ụma, m chere na mgbochi ndị mụrụ m na-egbochi m adịghị mma. M na-eche, sị, Ọ bụrụ na ndị mụrụ ndị enyi m na-ekwe ha mee ihe ụfọdụ, olee ihe mere ndị mụrụ m na-apụghị iji mee otú ahụ? Mgbe ụfọdụ, ezigbo iwe wekwara m mgbe ha nyere m ntaramahụhụ site n’ịghara ikwe ka m gaa ịkwọ ụgbọ mmiri—ihe na-atọ m ụtọ nke ukwuu. Otú ọ dị, mgbe m leghachiri anya azụ, ana m aghọta na ịdọ aka ná ntị ndị mụrụ m nyere m dị irè ma dị mkpa. Enwere m ekele na ha nyere m nduzi dị m mkpa mgbe ọ dị m mkpa.”

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụmụ anyị pụrụ mgbe ụfọdụ ịnọ na gburugburu ebe na-adịghị ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ, ma ha ka pụrụ itolite ịghọ ezi Ndị Kraịst. Dị ka Bible kwere ná nkwa, amamihe Chineke pụrụ ime ka ha nweta ihe nchebe ime mmụọ. “Amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ.”—Ilu 2:10-12.

Ibu nwa n’afọ ruo ọnwa itoolu adịghị mfe. Afọ 20 ndị na-esochi pụkwara iweta ma ihe mgbu ma obi ụtọ. Ma n’ihi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-agbalịsi ike iji amamihe Chineke na-echebe ụmụ ha. Mmetụta ha na-enwe banyere ụmụ ha dị ka nke Jọn onyeozi nwere banyere ụmụ ime mmụọ ya: “Ọ dịghị ihe ga-akpatara m inwe obi ekele nke karịrị ihe ndị a, na m ga na-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 A gbanwere aha ụfọdụ dị n’isiokwu a.

[Foto dị na peeji nke 24]

“Anyị mere ka ụlọ anyị bụrụ mgbe nile ebe ndị na-eto eto na-ejupụta”

[Foto dị na peeji nke 25]

Na-enwe mmasị n’ihe ndị na-amasị ụmụ gị

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

“M na-akwado nnọọ nke ọma maka ọmụmụ ihe ahụ”