Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ihi gịnị ka Devid, bụ́ ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, ji kwere ka nwunye ya bụ́ Maịkal nwee terafim, ma ọ bụ arụsị, dị ka e gosiri na 1 Samuel 19:12, 13?

Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe ndekọ ahụ ná mkpirikpi. Mgbe nwunye Devid nụrụ banyere atụmatụ Eze Sọl mere igbu Devid, o mere ihe ozugbo. Bible na-ekwu, sị: “Maịkal wee weda Devid site na windo: o wee jee, gbalaga, wepụga onwe ya. Maịkal wee were terafim ya [bụ́ nke o doro anya na ọ ha ma dị ka mmadụ], tọgbọ ya n’ihe ndina, tinye ákwà ogbugbo e ji ajị ewu mee n’okpuru isi ya, were ákwà mgbokwasị kpuchie ya.” Mgbe ndị ozi Sọl bịara ijide Devid, Maịkal gwara ha, sị: “Ahụ́ adịghị ya ike.” Aghụghọ a nyere Devid oge ịgbalaga, o jikwa oge ahụ gbalaga.—1 Samuel 19:11-16.

Ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala na-enye echiche na n’oge ochie, a na-enwe terafim ọ bụghị nanị maka iji ya eme ihe n’okpukpe kamakwa maka ihe ndị metụtara iwu. Dị nnọọ ka akwụkwọ ikike ala ma ọ bụ ụlọ na akwụkwọ ike ekpe na-ekpebi oruru o ruuru mmadụ inweta ihe nketa taa, otú ahụ ka ọ dị terafim n’oge ochie. O yiri ka inwe terafim pụrụ, n’ọnọdụ ụfọdụ, inye di nwa mmadụ ikike inweta ihe nketa nke ọgọ ya nwoke nwụrụ anwụ. Nke a pụrụ ịkọwa ihe mere Rechel, tupu oge Maịkal, ji were terafim nna ya na ihe mere nna ya ji chọsie nnọọ ike inwetaghachi ya. Na nke ahụ, di Rechel, bụ́ Jekọb, amaghị ihe nwunye ya mere.—Jenesis 31:14-34.

Mgbe ndị Izrel ghọrọ mba, ha natara Iwu Iri ahụ, bụ́ iwu nke abụọ n’ime ya machibidoro kpọmkwem ime arụsị. (Ọpụpụ 20:4, 5) Ka e mesịrị, Samuel onye amụma zoro aka n’iwu a mgbe ọ na-agwa Eze Sọl okwu. Ọ sịrị: “Mmehie nke ịjụ ase n’aka ndị mmụọ ka nnupụisi bụ, ikpere arụsị na terafim ka isi ike bụkwa.” (1 Samuel 15:23) N’ihi nke a, o yighị ka e ji terafim mee ihe maka inweta ihe nketa n’Izrel. Otú o sina dị, o yiri ka ụdị nkwenkwe ụgha ndị Juu oge ochie a ọ̀ dịgidere n’ezinụlọ ụfọdụ nke ndị Izrel. (Ndị Ikpe 17:5, 6; 2 Ndị Eze 23:24) Na Maịkal nwere terafim na-enye echiche na obi ya ezughị okè n’ebe Jehova nọ. Ma ọ́ bụghị na Devid amaghị banyere terafim ahụ ya abụrụ na ọ gbachiri nkịtị n’ihi na Maịkal bụ nwa Eze Sọl.

Otú Devid si ele inye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa anya pụtara ìhè n’okwu ndị a: “N’ihi na Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-eto nke ukwuu: Onye a na-atụ egwu ya ka ọ bụkwa n’elu chi nile. N’ihi na chi nile nke ndị nile dị iche iche bụ ihe efu: ma Jehova mere eluigwe.”—1 Ihe E Mere 16:25, 26.

[Foto dị na peeji nke 29]

Iwu nke abụọ n’ime Iwu Iri ahụ machibidoro ime arụsị dị ka terafim e gosiri ebe a

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ The Holy Land, Mpịakọta nke Abụọ, 1859