Samuel nke Mbụ 19:1-24

  • Sọl kpọkwuru Devid asị (1-13)

  • Devid gbara ọsọ mgbe Sọl chọrọ igbu ya (14-24)

19  Sọl mechara gwa ndị niile na-ejere ya ozi nakwa Jonatan nwa ya na ya chọrọ igbu Devid.+  Ebe ọ bụkwa na ihe Devid dị nnọọ Jonatan nwa Sọl mma,+ ọ gwara Devid, sị: “Sọl nna m na-achọ igbu gị. Biko, kpachara anya n’ụtụtụ, gaakwa zoo n’ebe zoro ezo.  M ga-apụ guzoro n’akụkụ nna m n’ọhịa ebe ị ga-anọ. M ga-agwakwa ya gbasara gị. E nweekwa ihe m chọpụtara, m ga-eme ka ị mara.”+  Jonatan wee gwa Sọl nna ya okwu ọma gbasara Devid.+ Ọ gwara ya, sị: “Eze, i kwesịghị ime ohu gị Devid ihe ọjọọ ọ bụla,* n’ihi na o nweghị ihe o mere gị. Ihe niile o meere gị baara gị uru.  O mere ihe gaara ata isi ya iji gbuo onye Filistia ahụ o gburu.+ Jehova sikwa otú ahụ mee ka Izrel niile merie ezigbo mmeri. Ị hụrụ ya, obi abụrụ gị sọ aṅụrị. Gịnịzi mere ị ga-eji mee onye aka ya dị ọcha ihe ọjọọ? Gịnị mere ị ga-eji gbuo Devid n’enweghị ihe o mere?”+  Sọl wee gee Jonatan ntị, gwakwa ya, sị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, aṅụ iyi na agaghị m egbu ya.”  E mechaa, Jonatan kpọrọ Devid kọọrọ ya ihe a niile. Jonatan kpọkwaara Devid kpọtara Sọl, ya ejewere ya ozi otú ọ na-ejebu.+  Ka oge na-aga, agha dara ọzọ, Devid agaa lụso ndị Filistia agha, sụọ ha akwụ, ndị fọrọ n’ime ha agbaa ọsọ.  Jehova kwere ka mmụọ na-adịghị mma mee ka obi ghara izu Sọl ike*+ mgbe o ji ube ya n’aka nọrọ ọdụ n’ụlọ ya. Devid nọkwa na-akpọ ụbọ akwara.+ 10  Sọl nwara iji ube ahụ tụgide Devid n’ahụ́ ájá, ma o zere ya, ube ahụ a tụzie n’ahụ́ ájá. Devid wee gbapụ n’abalị ahụ. 11  Sọl mechara zie ndị mmadụ ka ha gaa chee ụlọ Devid nche, gbuokwa ya n’ụtụtụ.+ Ma, Maịkal nwunye Devid gwara ya, sị: “Ọ bụrụ na ị gbapụghị n’abalị a, ị ga-abụ onye nwụrụ anwụ echi.” 12  Ozugbo ahụ, Maịkal nyeere Devid aka, ya esi na windo rịda, sikwa ebe ahụ gbafuo. 13  Maịkal wekwaara arụsị ezinụlọ* dowe n’àkwà* ha, tinye ákwà* e ji ajị ewu kpaa n’ebe di ya na-ehiwe isi, werezie ákwà kpuchie ya. 14  Maịkal gwakwara ndị Sọl ziri ka ha kpọta Devid na ahụ́ adịghị ya. 15  Mgbe ha lọtara, Sọl zighachiri ha ka ha gaa hụ Devid. Ọ gwakwara ha, sị: “Burunụ ya n’àkwà* ya butere m ka m gbuo ya.”+ 16  Mgbe ndị ahụ batara n’ụlọ Devid, ha hụrụ na ọ bụ arụsị ezinụlọ* tọgbọ n’àkwà* ya. Ákwà ahụ e ji ajị ewu kpaa dịkwa n’ebe ọ na-ehiwe isi. 17  Sọl wee sị Maịkal: “Gịnị mere i ji ghọọ m ụdị aghụghọ a, hapụ onye iro m+ ya agbaa ọsọ?” Maịkal asị Sọl: “Ọ gwara m na ya ga-egbu m ma ọ bụrụ na mụ ahapụghị ya ka ọ gbaa ọsọ.” 18  Ma Devid gbara ọsọ, gbakwuru Samuel na Rema.+ Ọ gwakwara ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel agazie biri na Nayọt.+ 19  Ka oge na-aga, a gwara Sọl na Devid nọ na Nayọt dị na Rema.” 20  Ozugbo Sọl nụrụ ya, o ziri ndị mmadụ ka ha gaa kpụta Devid. Mgbe ha ruru, ha hụrụ ndị amụma merela okenye ka ha na-ebu amụma, hụkwa na Samuel bụ́ onyeisi ha guzo ebe ahụ. Mgbe ha hụrụ ihe a, mmụọ Chineke dakwasịrị ha, ha ebido mewe ka ndị amụma. 21  Mgbe ha kọọrọ ya Sọl, o zipụrụ ndị ọzọ ozugbo, hanwa ebidokwa ime ka ndị amụma. N’ihi ya, Sọl zipụrụ ndị ọzọ, ndị nke atọ, hanwa ebidokwa ime ka ndị amụma. 22  N’ikpeazụ, yanwa gara Rema. Mgbe o ruru ná nnukwu olulu mmiri dị na Siku, ọ jụrụ ndị mmadụ, sị: “Ebee ka Samuel na Devid nọ?” Ha asị ya: “Ha nọ na Nayọt+ dị na Rema.” 23  Mgbe Sọl si ebe ahụ na-aga Nayọt dị na Rema, mmụọ Chineke dakwasịrị ya, ya ana-aga, na-eme ka onye amụma ruo mgbe ọ banyere Nayọt dị na Rema. 24  O yipụkwara uwe ya, na-eme ka onye amụma n’ihu Samuel, gbarakwa ahụ́ ọtọ* dinara ala ehihie na abalị ahụ niile. Ọ bụ ya mere ha ji asị: “Sọl ò sokwu ná ndị amụma?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “imehie ohu gị Devid.”
Na Hibru, “Mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Jehova nọ dakwasịkwara Sọl.”
Na Hibru, “terafim.”
Ákwà a dị ka nke e ji egbochi anwụnta ịta mmadụ mgbe ọ na-ehi ụra.
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “terafim.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “o nweghịkwa ezigbo ihe o yi.”