Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Site n’Ụlọ Mkpọrọ Ndị Gbara Ọchịchịrị Dị n’Okpuru Ala Gaa n’Usoro Ugwu Switzerland

Site n’Ụlọ Mkpọrọ Ndị Gbara Ọchịchịrị Dị n’Okpuru Ala Gaa n’Usoro Ugwu Switzerland

 Akụkọ Ndụ

Site n’Ụlọ Mkpọrọ Ndị Gbara Ọchịchịrị Dị n’Okpuru Ala Gaa n’Usoro Ugwu Switzerland

DỊ KA LOTHAR WALTHER SI KỌỌ

Mgbe m nọsịrị ogologo afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ ndị gbara ochịchịrị dị n’okpuru ala nke dị n’ụlọ mkpọrọ ndị Kọmunist nke East Germany, ọ gụsiri m agụụ ike inwere nnọọ onwe m na ịnọnyeghachiri ezinụlọ m n’ụzọ na-enye obi ụtọ.

OTÚ ọ dị, atụghị m anya ụdị anya nwa m nwoke dị afọ isii, bụ́ Johannes lere m dị ka m bụ onye ọbịa. Kemgbe afọ atọ, ọ hụbeghị nna ya anya. Nye ya, abụ m onye ọbịa.

N’adịghị ka nwa m nwoke, mụ na ndị mụrụ m nwere mkpakọrịta ịhụanya. Ebe obibi anyị dị na Chemnitz, Germany, bụ́ ebe a nọ mụọ m n’afọ 1928, jupụtara nnọọ n’ịhụnanya. Papa m gosipụtara n’ụzọ doro nnọọ anya na ya enweghị mmasị n’okpukpe. O chetara na n’oge Agha Ụwa Mbụ, ndị agha bụ́ “Ndị Kraịst” nọ n’akụkụ nke ọ bụla gọọrọ ndị ogbo ha nọ n’akụkụ nke ọzọ ọfọ “Krismas Ọma” na December 25 ma maliteghachi nnọọ igburịta onwe ha n’echi ya. Nye ya, okpukpe bụ ụdị ihu abụọ kasị njọ e nwere.

Okwukwe Anọchie Ndakpọ Olileanya

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, enweghị m ndakpọ olileanya dị otú ahụ. Agha Ụwa nke Abụọ biri mgbe m dị afọ 17, alagbụrụkwaara m nnọọ ịbụ onye e debara aha ya n’òtù ndị agha. N’agbanyeghị nke ahụ, ajụjụ ndị na-enye nsogbu n’obi ndị dị ka, ‘N’ihi gịnị ka e ji egbusịsị ndị mmadụ? Ònye ka m pụrụ ịtụkwasị obi? Olee ebe m pụrụ inweta ezi nchebe?’ mere ka obi ghara iru m ala. East Germany, bụ́ ebe anyị bi, batara n’okpuru ọchịchị ndị Soviet. Nkwa ndị Kọmunist kwere na a ga-enwe ikpe ziri ezi, ịdị n’otu, nkwekọrịta na mmekọrịta udo masịrị ndị nsogbu nke agha gwụworo ike. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ n’ime ndị a nwere obi eziokwu ga-enwe oké ndakpọ olileanya —na nke ugbu a, ọ bụghị site n’okpukpe, kama site na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ọ bụ n’oge m na-achọ azịza ndị na-eju afọ ka nwanne mama m, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, gwara m banyere okpukpe ya. O nyere m akwụkwọ dabeere na Bible bụ́ nke kpaliri m ịgụcha—na nke mbụ ya—isi nke 24 nke akwụkwọ Matiu. Nkọwa ndị ezi uche dị na ha na ndị doro anya e nyere n’akwụkwọ ahụ metụrụ m n’ahụ́, na-akọwa oge anyị dị ka “ngwụsị nke usoro ihe a” ma na-arụtụ aka n’isi ihe kpatara nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Matiu 24:3; Mkpughe 12:9.

N’oge na-adịghị anya, enwetakwuru m mbipụta nke Ndịàmà Jehova, ka m jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-agụ ha, aghọtara m na achọtawo m eziokwu m chọsiworo nnọọ ike. Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịmụta na e chiela Jizọs Kraịst eze n’eluigwe n’afọ 1914, nakwa na n’isi nso, ọ ga-ewepụ ihe nile na-emegide Chineke iji wetara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi. Nye m, nchọpụta ọzọ dị ukwuu bụ nghọta doro anya m ghọtara ihe mgbapụta ahụ. O nyeere m aka ịgakwuru Jehova Chineke n’ekpere sitere n’obi, na-arịọ ya maka mgbaghara. Òkù obiọma ahụ a kpọrọ na Jems 4:8 metụrụ m n’ahụ́: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”

N’agbanyeghị oké ịnụ ọkụ n’obi m maka okpukpe m chọtara ọhụrụ, ná mmalite, ndị mụrụ m na nwanne m nwanyị anabatachaghị ihe m gwara ha. Otú ọ dị, nke a ebelataghị ọchịchọ m nwere ịga nzukọ Ndị Kraịst nke otu ìgwè nta nke Ndịàmà na-enwe na Chemnitz. N’ụzọ tụrụ m n’anya, mama m na papa m na nwanne m nwanyị sooro m gaa nzukọ nke mbụ! Nke ahụ bụ n’oge oyi nke agbata afọ 1945 na 1946. N’ikpeazụ, mgbe e hiwere otu ìgwè ọmụmụ Bible na Harthau, bụ́ ebe anyị bi, ezinụlọ m malitere ịgachi nzukọ anya.

“Nwata Ka M Bụ”

Ịmụta eziokwu Bible ndị dị mkpa na isochi ndị Jehova anya kpaliri m ịrara ndụ m nye Jehova, e meekwa m baptizim na May 25, 1946. N’ụzọ nyere m ezi afọ ojuju, ndị òtù ezinụlọ m nwekwara ọganihu n’ụzọ ime mmụọ, ka oge na-agakwa, ha atọ ghọrọ Ndịàmà na-ekwesị ntụkwasị obi. Nwanne m nwanyị ka na-arụsi ọrụ ike n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Chemnitz. Mama m na papa m ji iguzosi ike n’ihe jee ozi ruo mgbe ha nwụrụ, mama m nwụrụ n’afọ 1965, papa m nwụrụ n’afọ 1986.

Ọnwa isii ka e mesịrị m baptizim, amalitere m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche. Nke a bụ mmalite nke ndụ ije ozi, “n’oge dị mma, n’oge nsogbu.” (2 Timoti 4:2) N’oge na-adịghị anya, ohere ije ozi ndị ọhụrụ meghere. E nwere mkpa nke ndị na-ezisa ozi ọma oge nile n’otu ógbè dịpụrụ adịpụ n’ebe ọwụwa anyanwụ Germany. Mụ na otu nwanna nwoke tinyere akwụkwọ maka ọrụ a, ma echere m na enweghị m ahụmahụ na ntozu okè ọrụ a chọrọ. Ebe ọ bụ na m dị nanị afọ 18, enwere m  mmetụta yiri nke Jeremaịa: “Ewo, . . . Jehova! lee, amaghị m ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m bụ.” (Jeremaịa 1:6) N’agbanyeghị ịla azụ m, ụmụnna nwere ibu ọrụ ji obiọma kpebie inye anyị ohere ije ozi. Ya mere, e zigara anyị Belzig, bụ́ obodo nta dị na steeti Brandenburg.

Ime nkwusa n’ókèala ahụ bụ nnọọ ihe ịma aka, ma o nyere m ọzụzụ bara uru. Ka oge na-aga, ọtụtụ ụmụ nwanyị na-achụ nta ego nakweere ozi Alaeze ahụ ma ghọọ Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, nguzo ha weere megidere ọdịnala na egwu gbamiri mkpọrọgwụ n’ógbè nta ahụ. Ma ndị ndú okpukpe Katọlik ma ndị nke Protestant megidere anyị n’ụzọ siri ike ma bo anyị ebubo ụgha n’ihi ọrụ nkwusa anyị. Ma ebe anyị tụkwasịrị Jehova obi maka nduzi na nchebe, anyị nyeere ọtụtụ ndị nwere mmasị aka ịnakwere eziokwu ahụ.

Ekweghị Ibe Nọrọ Amalite Iru Ka Mmiri

Afọ 1948 wetara ma ngọzi ma ihe isi ike ndị a na-atụghị anya ha. Nke mbụ, e zigara m na Rudolstadt, Thuringia, ije ozi dị ka ọsụ ụzọ. N’ebe ahụ, amatara m ọtụtụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị na-ekwesị ntụkwasị obi, mkpakọrịta mụ na ha tọkwara m ụtọ. Enwetara m nnukwu ngọzi ọzọ n’ọnwa July nke afọ ahụ. Alụrụ m Erika Ullmann, bụ́ nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ma na-arụsị ọrụ ike bụ́ onye m matara mgbe m malitere ịga nzukọ n’Ọgbakọ Chemnitz. Anyị abụọ malitere ịsụkọ ụzọ na Harthau, bụ́ obodo m. Otú ọ dị, ka oge na-aga, Erika enweghịzi ike ịnọgide n’ozi oge nile n’ihi nsogbu ahụ́ ike na ihe ndị ọzọ.

Oge ndị ahụ bụ oge ihe siiri ndị Jehova ike. Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Na-ahụ Maka Ndị Ọrụ kagburu kaadị m ji anata nri ná mgbalị ha ịmanye m ịkwụsị ọrụ nkwusa ma rụwa ọrụ ego oge nile. Ụmụnna nwoke ndị nwere ibu ọrụ gbalịrị iji okwu ikpe ahụ metụtara m mee ihe iji hụ na e debara aha anyị n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro. Ma a nabataghị nke ahụ, na June 23, 1950 kwa, ụlọikpe kpebiri na m ga-akwụ nhá ma ọ bụ nọọ abalị 30 n’ụlọ mkpọrọ. Anyị tinyere akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ, ma ụlọikpe ka elu jụrụ akwụkwọ mkpegharị ikpe anyị, a tụkwara m mkpọrọ.

Nke ahụ bụ nanị ihe àmà nke mkpagbu na ihe isi ike ndị na-abịa n’ihu. Mgbe ihe na-erughị otu ọnwa gasịrị, na September 1950, ka ha mesịrị mkpọsa ụgha iji mebie aha anyị n’usoro mgbasa ozi, ọchịchị Kọmunist machibidoro ọrụ anyị iwu. N’ihi otú anyị si na-eto ngwa ngwa na nnọpụiche anyị, a kpọrọ anyị òtù nledo dị ize ndụ nke ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, bụ́ ndị na-arụ “ọrụ a na-enyo enyo” n’aha okpukpe. N’otu ụbọchị ahụ a machibidoro anyị iwu, nwunye m mụrụ nwa anyị nwoke, bụ́ Johannes, n’ụlọ ka m nọ n’ụlọ mkpọrọ. N’agbanyeghị na nwanyị na-ele ya ime nwara igbochi ha, ndị ọrụ Ụlọ Ọrụ Nchebe Obodo wabara n’ụlọ anyị ịchọ ihe àmà iji kwado ebubo ha. N’ezie, ọ dịghị ihe ha hụrụ. Ka o sina dị, ha mechara nwee ihe ịga nke ọma n’izite onye ọgba àmà na nzuzo n’ọgbakọ anyị. Nke a dujere n’ijide ụmụnna nwoke nile nwere ibu ọrụ, tinyere mụ onwe m, n’October 1953.

N’ụlọ Mkpọrọ Ndị Gbara Ọchịchịrị Dị n’Okpuru Ala

Mgbe e kwusịrị na ikpe mara anyị ma gwa anyị ogologo oge anyị ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ, ụfọdụ afọ anọ, ndị ọzọ afọ ise na isii, anyị sonyeere ọtụtụ ụmụnna anyị n’ụlọ mkpọrọ ruru unyi ma gbaa ọchịchịrị nke dị n’okpuru ala nke Osterstein Castle dị na Zwickau.  N’agbanyeghị ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha dị n’ebe ahụ, ọ bụ nnọọ ihe ọṅụ isoro ụmụnna tozuru okè na-akpakọrịta. Na anyị enwereghị onwe anyị apụtaghị na nri ime mmụọ kọrọ anyị. Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị ndị ọchịchị ledara anya ma machibido iwu, Ụlọ Nche na-abata n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ọbụna n’ime ụlọ nga anyị! N’ụzọ dị aṅaa?

E kenyere ụfọdụ ụmụnna ọrụ n’ebe a na-egwupụta coal, bụ́ ebe ha na-ezute Ndịàmà na-anọghị n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ndị na-enye ha magazin ndị ahụ. Ụmụnna ndị ahụ na-ezobatazi magazin ndị ahụ n’ụlọ mkpọrọ ma jiri nnọọ akọ nye anyị nile nri ime mmụọ dị anyị ezigbo mkpa. Enwere m nnọọ obi ụtọ ma bụrụ onye a gbara ume n’ihi inweta nlekọta na nduzi Jehova n’ụzọ dị otú a!

Ná ngwụsị afọ 1954, a kpọfere anyị n’ụlọ mkpọrọ nwere aha ọjọọ nke dị na Torgau. Ndịàmà nọ n’ebe ahụ nwere obi ụtọ ịnabata anyị. Ruo mgbe ahụ, ha nọgidere na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ site n’ikwughachi ihe ndị ha pụrụ icheta site ná mbipụta Ụlọ Nche ndị ochie. Lee ka ha siworo tụsie anya nri ime mmụọ ndị ọhụrụ ike! Ugbu a, ọ bụ ọrụ anyị ịkọrọ ha ihe ndị anyị mụrụ na Zwickau. Ma olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ ebe ọ bụ na a machibidoro anyị iso ibe anyị ekwurịta okwu mgbe anyị na-agagharị kwa ụbọchị? Ụmụnna ahụ agwawo anyị otú anyị ga-esi mee ya, aka nchebe dị ike nke Jehova dịkwasịkwara anyị. Nke a kụziiri anyị ịdị mkpa nke iji ịdị uchu na-amụ Bible ma na-atụgharị uche mgbe anyị nweere onwe anyị na mgbe ohere dịịrị anyị ime otú ahụ.

Oge Maka Ime Mkpebi Ndị Dị Mkpa

Site n’enyemaka Jehova, anyị guzosiri ike. N’ụzọ tụrụ anyị nnọọ n’anya, a tọhapụrụ ọtụtụ n’ime anyị ná ngwụsị afọ 1956. O siri ike ịkọwa ụdị obi ụtọ anyị nwere mgbe e meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ! Ka ọ na-erule mgbe ahụ, nwa m nwoke agbaala afọ isii, ọ bụkwaara m oké ọṅụ isonyeghachiri nwunye m na ikere òkè n’ịzụ nwa anyị. Ruo oge ụfọdụ, Johannes mesoro m ihe dị ka onye ọbịa, ma n’oge na-adịghị anya, mụ na ya malitere inwe nkekọ ịhụnanya.

Ndịàmà Jehova nọ na East Germany nọ na-eche oge siri oké ike ihu. Mmegide na-esiwanye ike a na-emegide ozi Ndị Kraịst anyị na nnọpụiche anyị pụtara na anyị aghaghị ịnọ n’ụjọ mgbe nile—ndụ nke jupụtara n’ihe ize ndụ, nchegbu, na ike ọgwụgwụ. N’ihi ya, mụ na Erika aghaghị iji nlezianya na ekpere tụlee ọnọdụ anyị, anyị chekwara na ọ dị anyị mkpa ịkwaga ebe ọzọ iji wee bie ndụ n’ọnọdụ ndị katụ mma ka anyị wee ghara ichegbubịga onwe anyị ókè. Anyị chọrọ inwere onwe anyị iji jeere Jehova ozi na iji chụsoo ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ.

N’oge opupu ihe ubi nke afọ 1957, ohere ịkwaga Stuttgart, West Germany dapụtaara anyị. A machibidoghị ọrụ nzisa ozi ọma iwu n’ebe ahụ, anyị pụkwara isoro ụmụnna anyị kpakọrịta n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla. Ha nyere anyị nkwado ịhụnanya dị ukwuu. Anyị nọrọ afọ asaa n’ọgbakọ dị na Hedelfingen. N’ime afọ ndị ahụ, nwa anyị nwoke malitere ịga akwụkwọ ma nwee ezigbo ọganihu. Na September 1962, enwere m ihe ùgwù nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze na Wiesbaden. N’ebe ahụ, a gbara m ume ịkpọrọ ezinụlọ m kwaga n’ebe a chọrọ ndị na-akụzi Bible n’asụsụ German iji jee ozi. Nke a gụnyere ógbè ụfọdụ nke Germany na Switzerland.

Ịga n’Usoro Ugwu Switzerland

N’ihi ya, na 1963 anyị kwagara Switzerland. A gwara anyị ka anyị soro otu obere ọgbakọ dị na Brunnen rụkọọ ọrụ, nke dị na Lake Lucerne mara mma, n’etiti Usoro Ugwu Switzerland. Nye anyị, ọ dị ka ịnọ na paradaịs. Anyị aghaghị ime ka asụsụ German a na-asụ n’ebe ahụ, ụzọ ndụ ha, na ụzọ iche echiche ha mara anyị ahụ́. Ka o sina dị, anyị rụrụ ọrụ ma mee nkwusa n’etiti ndị hụrụ udo n’anya. Anyị nọrọ afọ 14 na Brunnen. Nwa anyị nwoke toro n’ebe ahụ.

 N’afọ 1977, mgbe ọ fọrọ nke nta ka m gbaa afọ 50, a kpọrọ anyị òkù ije ozi na Betel Switzerland nke dị na Thun. Anyị weere ya dị ka ihe ùgwù anyị na-atụghị anya ya ma jiri obi ụtọ nakwere ya. Mụ na nwunye m jere ozi na Betel ruo afọ itoolu, bụ́ nke anyị na-echeta dị ka ihe pụrụ iche ná ndụ anyị dị ka Ndị Kraịst na n’uto ime mmụọ anyị. Anyị sokwara ndị nkwusa nọ na Thun na gburugburu ya mee nkwusa, na-ekiri “oké ọrụ” Jehova mgbe nile, bụ́ ugwu ndị dị n’Usoro Ugwu Bern ndị dị ebube bụ́ ndị snow na-ekpuchi elu ha.—Abụ Ọma 9:1.

Ịkwafekwa Ebe Ọzọ

Nkwapụ anyị ọzọ bụ ná mmalite afọ 1986. A gwara anyị ka anyị gaa jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ókèala buru ibu nke e kenyere Ọgbakọ Buchs n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Switzerland. Ọzọkwa, anyị aghaghị ịmụta ụzọ ndụ ọzọ. Otú ọ dị, n’ịbụ ndị ọchịchọ nke ijere Jehova ozi n’ebe ọ bụla anyị ga-akasị aba uru kwaliri, anyị nakweere ọrụ ọhụrụ a ma nweta ngọzi Ya. Mgbe ụfọdụ, arụchiteere m ndị nlekọta sekit ọrụ, na-eleta ma na-agba ọgbakọ dị iche iche ume. Afọ 18 agafeela, anyị enwewokwa ọtụtụ ahụmahụ na-enye obi ụtọ n’ije ozi n’ógbè a. Ọgbakọ dị na Buchs etowo, anyị na-ezukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mara mma, bụ́ nke a raara nye afọ ise gara aga.

Jehova ejiriwo nnọọ mmesapụ aka lekọta anyị. Anyị etinyewo akụkụ ka ukwuu nke ndụ anyị n’ozi oge nile, ma ọ dịbeghị ihe kọrọ anyị. Anyị nwere ọṅụ na afọ ojuju nke ịhụ nwa anyị, nwunye ya, na ụmụ ha, tinyekwara ezinụlọ nke ụmụ ha, ka ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ije n’ụzọ Jehova.

N’ileghachi anya azụ, m na-eche n’ezie na anyị ejeworo Jehova ozi “n’oge dị mma, n’oge nsogbu.” Ịchụso ozi Ndị Kraịst esitewo n’ụlọ mkpọrọ ndị gbara ọchịchịrị nke ndị Kọmunist bụ́ ndị dị n’okpuru ala kpọga m n’ugwu ndị mara mma nke Usoro Ugwu Switzerland. Ọ dịtụbeghị mgbe mụ na ezinụlọ m kwara ụta.

[Igbe dị na peeji nke 28]

“Ndị Ọdachi Gbara Mkpị Dakwasịrị” Eguzosie Ike n’Oge Mkpagbu

Na German Democratic Republic (GDR), nke a makwaara dị ka East Germany, e lekwasịrị Ndịàmà Jehova anya imekpọ ha ọnụ n’ụzọ obi ọjọọ. Ihe ndekọ na-egosi na e zigara ihe karịrị Ndịàmà 5,000 n’ogige ọrụ mmanye na ụlọ mkpọrọ dị iche iche n’ihi ozi Ndị Kraịst na nnọpụiche ha.—Aịsaịa 2:4.

A kọwawo ụfọdụ n’ime ndị a dị ka “ndị ọdachi gbara mkpị dakwasịrị.” A tụọla ihe dị ka mmadụ 325 n’ime ha mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ na ụlọ mkpọrọ ndị Nazi. Mgbe ahụ, n’afọ ndị 1950, ndị Stasi, bụ́ Ụlọ Ọrụ Nchebe Obodo nke GDR, chụgharịrị ma tụọ ha mkpọrọ. Ọbụna ụfọdụ n’ime ụlọ mkpọrọ ndị ahụ rụrụ ụzọ ọrụ abụọ—nke mbụ dị ka ụlọ mkpọrọ ndị Nazi, e mesịakwa dị ka ụlọ mkpọrọ ndị Stasi.

N’ime afọ iri mbụ nke mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, malite na 1950 ruo 1961, Ndịàmà 60—ndị ikom na ndị inyom—nwụrụ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi mmeso ọjọọ, erighị nri ndị na-edozi ahụ, ọrịa, na nká. A tụrụ Ndịàmà 12 nga mkpụrụ ọka, bụ́ ndị e mesịrị gbubilata ịbụ mkpọrọ afọ 15.

Taa, n’ebe bụbu isi ụlọ ọrụ ndị Stasi na Berlin, e nwere ebe ngosi na-adịgide adịgide bụ́ ebe na-egosi mmegide ndị ọchịchị megidere Ndịàmà Jehova na East Germany ruo afọ 40. Foto na akụkọ ndị mmadụ kọrọ bụ́ ndị dị n’ebe ahụ na-agba akaebe n’ekwughị okwu nye obi ike na ume ime mmụọ nke Ndịàmà a kwesịrị ntụkwasị obi n’oge mkpagbu.

[Map dị na peeji 24, 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

EAST GERMANY

Rudolstadt

Belzig

Torgau

Chemnitz

Zwickau

[Foto dị na peeji nke 25]

Osterstein Castle, nke dị na Zwickau

[Ebe E Si Nweta Foto]

Fotosammlung des Stadtarchiv Zwickau, Deutschland

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na nwunye m, bụ́ Erika