Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ

Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ

 Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ

‘Ha ga-akpọ isiala n’ihu Gị Onyenwe anyị; ha ga-asọpụrụkwa [ma ọ bụ, “ha ga-etokwa”] aha Gị.’—ABỤ ỌMA 86:9.

1. Gịnị mere anyị ji nwee ike iwetara Chineke otuto karịrị nke ihe ndị e kere eke na-adịghị ndụ pụrụ iwetara ya?

JEHOVA ruru eru ka ihe nile o kere eke too ya. Ọ bụ ezie na ihe ndị o kere eke na-adịghị ndụ na-ewetara ya otuto n’ekwughị okwu, anyị bụ́ ụmụ mmadụ nwere ikike nke iche echiche, ịghọta ihe, inwe ekele, na ife ofufe. Mgbe ahụ, ọ bụ anyị ka ọbụ abụ ahụ na-agwa, sị: “Tikusienụ Chineke mkpu ọṅụ ike, ụwa nile: bụọnụ nsọpụrụ aha Ya n’abụ ọma: meenụ ka otuto Ya dị nsọpụrụ.”—Abụ Ọma 66:1, 2.

2. Olee ndị rubeworo isi n’iwu ahụ e nyere ka e nye aha Chineke otuto, n’ihi gịnịkwa?

2 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe a kpọrọ mmadụ na-ajụ ikwere na Chineke ma ọ bụ inye ya otuto. Otú ọ dị, n’ala 235, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova isii na-egosi na ha na-ahụ ‘àgwà Chineke ndị a na-apụghị ịhụ anya’ site n’ihe ndị o meworo nakwa na ha ‘anụwo’ àmà ihe e kere eke na-agba n’ekwughị okwu. (Ndị Rom 1:20; Abụ Ọma 19:2, 3) Site n’ịmụ Bible, ha abịawokwa mara Jehova ma hụ ya n’anya. Abụ Ọma 86:9, 10 buru amụma, sị: “Mba nile ndị I meworo ga-abịa kpọọ isiala n’ihu Gị, Onyenwe anyị; ha ga-asọpụrụkwa [ma ọ bụ, “ha ga-etokwa”] aha Gị. N’ihi na onye ukwu ka Ị bụ, Ị na-arụkwa oké ọrụ dị iche iche: Gị onwe gị bụ Chineke, nanị Gị.”

3. Olee otú “oké ìgwè mmadụ” si eje “ozi dị nsọ ehihie na abalị”?

3 N’ụzọ yiri nke ahụ, Mkpughe 7:9, 15 na-akọwa “oké ìgwè mmadụ” nke ndị na-efe ofufe dị ka ndị ‘na-ejere Chineke ozi dị nsọ ehihie na abalị n’ụlọ nsọ ya.’ Ọ pụtaghị na Chineke na-amanye ndị ohu ya n’ụzọ nkịtị inye ya otuto n’akwụsịghị akwụsị, ma ndị na-efe ya ofufe bụ nzukọ zuru ụwa ọnụ. N’ihi ya, mgbe chi jiri n’ala ụfọdụ, ndị ohu Chineke nọ n’akụkụ nke ọzọ nke ụwa na-anọ na-agba àmà. N’ụzọ dị otú ahụ, a pụrụ ikwu na chi adịghị eji eji n’iwetara Jehova otuto. N’isi nso, “ihe ọ bụla nke na-eku ume” ga-eweli olu ya ito Jehova. (Abụ Ọma  150:6) Ma, ka ọ dịgodị, gịnị ka anyị pụrụ ime n’otu n’otu iji na-enye Chineke otuto? Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ iche ihu? Ngọzi ndị dịkwa aṅaa na-echere ndị na-enye Chineke otuto? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee ihe ndekọ Bible banyere ebo Gad nke Izrel.

Ihe Ịma Aka Oge Ochie

4. Ihe ịma aka dị aṅaa ka ebo Gad chere ihu?

4 Tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, ndị ebo Gad nke Izrel rịọrọ ka e kwere ka ha biri n’obodo a na-azụ anụ ụlọ dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan. (Ọnụ Ọgụgụ 32:1-5) Ibi ebe ahụ ga-apụta ịnagide ihe ịma aka ndị siri ike. Ndagwurugwu Jọdan—bụ́ ihe mgbochi sitere n’okike megide ndị agha mwakpo—ga-echebe ebo ndị dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Jọdan. (Joshua 3:13-17) Otú ọ dị, banyere ala ndị dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan, akwụkwọ bụ́ The Historical Geography of the Holy Land, nke George Adam Smith dere, na-ekwu, sị: “[Ha] nile gbasapụrụ nnọọ n’ala dị larịị nke Arab, n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla. N’ihi ya, ha anọgidewo bụrụ ndị ndị mwagharị agụụ ji na-awakpo kemgbe ụwa, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha na-abịa n’ọnụ ọgụgụ buru ibu kwa afọ maka ahịhịa anụ ha ga-ata.”

5. Olee otú Jekọb gbara ndị agbụrụ Gad ume isi meghachi omume mgbe a wakporo ha?

5 Olee otú ebo Gad ga-esi nagide nsogbu dị otú a na-adịghị akwụsị akwụsị? Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, n’amụma o buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, nna ha ochie bụ́ Jekọb kwuru, sị: “Gad, usuu ndị na-apụnara mmadụ ihe ga-akpagide ya: ma ya onwe ya ga-akpagide ha n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 49:19) E lee ya anya elu elu, okwu ndị ahụ pụrụ iyi ihe na-akụda mmụọ. Ma ha bụ, n’ezie, iwu e nyere ndị Gad imegwara. Jekọb mesiri ha obi ike na ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, ndị mwakpo ahụ ga-alaghachi azụ n’ihi mmechuihu, ndị Gad ga-achụsokwa ha ma kpagide ha n’ikiri ụkwụ.

Ihe Ịma Aka Nye Ofufe Anyị Taa

6, 7. Olee otú ọnọdụ Ndị Kraịst taa si yie nke ebo Gad?

6 Dị ka ebo Gad, Ndị Kraịst taa na-enweta nsogbu site n’aka usoro ihe Setan; ọ dịghị nchebe ọrụ ebube ga-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ na ya. (Job 1:10-12) Ọtụtụ n’ime anyị aghaghị ịnagide nsogbu ndị na-abịa site n’ịga akwụkwọ, ịkpata ihe e ji ebi ndụ, na ịzụ ụmụaka. Ihe ọzọ a na-agaghị eleghara anya bụ nsogbu ndị mmadụ na-enwe n’ime onwe ya. Ụfọdụ aghaghị ịnagide “ogwu n’anụ ahụ́” n’ụdị nkwarụ ma ọ bụ ọrịa siri ike. (2 Ndị Kọrint 12:7-10) Ndị ọzọ na-enwe mmetụta nke enweghị ùgwù onwe onye. “Ụbọchị ihe ọjọọ” nke oge agadi pụrụ igbochi Ndị Kraịst meworo agadi iji mgbasi ike ejere Jehova ozi dị ka ha na-emebu.—Eklisiastis 12:1.

 7 Pọl onyeozi na-echetakwara anyị na “anyị nwere mgba . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) A na-anwa anyị mgbe nile ịnabata “mmụọ nke ụwa,” bụ́ mmụọ nnupụisi na omume rụrụ arụ nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-akwalite. (1 Ndị Kọrint 2:12; Ndị Efesọs 2:2, 3) Dị ka Lọt na-atụ egwu Chineke, anyị onwe anyị taa pụrụ ịbụ ndị ihe rụrụ arụ nke ndị gbara anyị gburugburu na-ekwu ma na-eme na-eme ka ha nwee mwute. (2 Pita 2:7) Setan na-awakpokwa anyị n’onwe ya. Setan na-ebuso ihe fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmanụ, “bụ́ ndị na-edebe ihe ndị Chineke nyere n’iwu, ndị nwekwara ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs,” agha. (Mkpughe 12:17) Setan na-awakpokwa “atụrụ ọzọ” nke Jizọs n’ụdị mmachibido iwu na mmegide.—Jọn 10:16.

Ịchịliri Ya Aka Elu Ka Ọ̀ Bụ Ịlụso Ya Ọgụ?

8. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume nye mwakpo Setan, n’ihi gịnịkwa?

8 Gịnị kwesịrị ịbụ mmeghachi omume anyị nye mwakpo Setan? Dị ka ebo Gad oge ochie, anyị aghaghị ịdị ike n’ụzọ ime mmụọ ma lụsoo ya ọgụ n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi Chineke. N’ụzọ dị mwute ụfọdụ amalitewo ịda mbà n’ihi nsogbu ndị a na-enwe ná ndụ, na-eleghara ibu ọrụ ime mmụọ ha anya. (Matiu 13:20-22) Otu Onyeàmà kwuru nke a banyere ihe mere ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ n’ọgbakọ ya ji dị ala: “Ike agwụwala nnọọ ụmụnna. Ha nile na-enwe nnọọ nchekasị.” N’ezie, ndị mmadụ taa nwere ọtụtụ ihe mere ike ga-eji gwụ ha. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị mfe ịmalite ile ofufe Chineke anya dị ka nsogbu ọzọ, ibu arọ. Ma nke ahụ ọ̀ bụ ụzọ kwesịrị ekwesị—ma ọ bụ nke ziri ezi—isi lee ihe anya?

9. Olee otú ịnyara yok Kraịst si eduga n’inweta ume ọhụrụ?

9 Tụlee ihe Jizọs gwara ìgwè mmadụ nke oge ya bụ́kwa ndị nsogbu nke ndụ na-anyịgbu: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.” Jizọs ọ̀ na-enye echiche na ume ọhụrụ ahụ ga-abịa site na mmadụ ibelata ozi ọ na-ejere Chineke? N’ụzọ megidere nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ.” Yok bụ ihe e ji osisi ma ọ bụ ọla mee bụ́ nke na-enyere mmadụ ma ọ bụ anụmanụ aka ibu ibu arọ. N’ihi gịnịzi ka mmadụ ọ bụla ga-eji chọọ ịnyara yok dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na a dịghị ‘ebogbu anyị n’ibu’ ugbu a? Ee, ma ihe odide Grik ahụ pụkwara ịgụ, sị: “Soronụ m banye n’okpuru yok m.” Cheedị banyere nke ahụ: Jizọs na-ekwe nkwa inyere anyị aka ibu ibu anyị! Ọ dịghị anyị mkpa ibu ya n’ike anyị.—Matiu 9:36; 11:28, 29, ihe odide ala ala peeji NW; 2 Ndị Kọrint 4:7.

10. Gịnị na-esi ná mgbalị anyị na-etinye inye Chineke otuto apụta?

10 Mgbe anyị nyaara yok nke ịbụ onye na-eso ụzọ, anyị na-alụ ọgụ megide Setan. ‘Guzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ,’ ka Jems 4:7 na-ekwe ná nkwa. Nke a apụtaghị na ime otú ahụ dị mfe. Ijere Chineke ozi na-achọ mgbalị dị ukwuu. (Luk 13:24) Ma Bible na-ekwe nkwa a n’Abụ Ọma 126:5: “Ndị ji anya mmiri agha mkpụrụ ga-eji iti mkpu ọṅụ wee ihe ubi.” Ee, anyị adịghị efe Chineke nke na-enweghị ekele. Ọ bụ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ,” ọ na-agọzikwa ndị na-enye ya otuto.—Ndị Hibru 11:6.

Inye Chineke Otuto Dị Ka Ndị Nkwusa Alaeze

11. Olee otú ozi ubi si arụ ọrụ dị ka ihe nchebe pụọ ná mwakpo Setan?

11 Jizọs nyere iwu, sị: “Gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” Ọrụ nkwusa ahụ bụ ụzọ bụ́ isi e si achụrụ Chineke “àjà otuto.” (Matiu 28:19; Ndị Hibru 13:15) Anyị iyi “akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ” bụ akụkụ dị mkpa nke “ekike agha zuru ezu”—ihe anyị ji echebe onwe anyị pụọ ná mwakpo Setan. (Ndị Efesọs 6:11-15) Ito Chineke n’ozi ubi bụ ụzọ dị mma isi na-ewulite okwukwe anyị. (2 Ndị Kọrint 4:13) Ọ na-enyere anyị aka ịghara ịdị na-eche echiche na-ezighị ezi. (Ndị Filipaị 4:8) Ikere òkè n’ozi ubi na-enyere anyị aka iso ndị anyị na ha  na-efekọ ofufe enwe mkpakọrịta na-ewuli elu.

12, 13. Olee otú ikerechi òkè anya n’ozi ubi pụrụ isi baara ezinụlọ uru? Nye ihe atụ.

12 Ọrụ nkwusa pụkwara ịbụ ihe omume na-ewuli elu nye ezinụlọ. N’ezie, ntụrụndụ a haziri ahazi dị ndị na-eto eto mkpa. Otú ọ dị, oge ezinụlọ tinyere n’ozi ubi ekwesịghị ịbụ nke na-agwụ ike. Ndị nne na nna pụrụ ime ka ọ na-atọkwu ụtọ site n’ịzụ ụmụ ha ịdị irè n’ozi ubi. Ọ̀ bụ na ndị na-eto eto adịghị enwe mmasị n’ihe ndị ha na-eme nke ọma? Site n’iji ezi uche eme ihe, ọ bụghị ịmanye ndị na-eto eto ime ihe karịrị ike ha, ndị nne na nna pụrụ inyere ha aka ịchọta ọṅụ n’ozi.—Jenesis 33:13, 14.

13 Tụkwasị na nke ahụ, ezinụlọ nke na-enyekọ Chineke otuto ọnụ na-enwe nkekọ chiri anya. Tụlee ihe banyere otu nwanna nwanyị bụ́ onye di ya na-ekweghị ekwe gbahapụrụ ma hapụrụ ya ụmụ ise. N’ihi ya, o chere ihe ịma aka nke ịrụ ọrụ ego na igbo mkpa anụ ahụ́ nke ụmụ ya ihu. Nke ahụ ò mere ka ọ ghara nnọọ inwe ohere nke na o leghaara ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ya anya? Ọ na-echeta, sị: “Ana m amụchi Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible anya ma na-agbalị itinye ihe m na-amụta n’ọrụ. M na-akpọ ụmụaka m agachi nzukọ na ozi ụlọ n’ụlọ anya. Gịnị si ná mgbalị m pụta? Ụmụ m ise ahụ emechaala baptizim.” Ikere òkè zuru ezu n’ozi pụkwara inyere gị aka ná mgbalị gị ịzụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.”—Ndị Efesọs 6:4.

14. (a) Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi na-enye Chineke otuto n’ụlọ akwụkwọ? (b) Gịnị pụrụ inyere ndị na-eto eto aka ịghara ịbụ ndị ‘ihere ozi ọma ahụ na-eme’?

14 Ndị na-eto eto, ọ bụrụ na unu bi n’ala ebe iwu na-amachibidoghị ya, ùnu na-enye Chineke otuto site n’ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ, ka ùnu na-ekwe ka ụjọ mmadụ na-egbochi unu ime otú ahụ? (Ilu 29:25) Otu Onyeàmà dị afọ 13 na Puerto Rico na-ede, sị: “Ọ dịbeghị mgbe m mere ihere ime nkwusa n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na amaara m na nke a bụ eziokwu ahụ. Na klas, ana m eweli aka m mgbe nile ma na-agwa ha ihe m mụtaworo na Bible. Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe a na-amụ na klas, ana m aga n’ọ́bá akwụkwọ ma na-agụ akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ.” * Jehova ọ̀ gọziwo mgbalị ya? Ọ na-akọ, sị: “Mgbe ụfọdụ, ụmụ klas m na-ajụ m ajụjụ, ọbụna na-agwa m ka m wetara ha akwụkwọ ahụ.” Ọ bụrụ na ị nọwo na-ala azụ n’akụkụ a, ikekwe, ọ ga-adị gị mkpa ịnwapụtara onwe gị “ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè” site n’iji ịdị uchu na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye. (Ndị Rom 12:2) Mgbe o doro gị anya na ihe ị mụtaworo bụ eziokwu ahụ, ọ dịghị mgbe ‘ihere ozi ọma ahụ ga-eme gị.’—Ndị Rom 1:16.

‘Ọnụ Ụzọ E Meghere Emeghe’ nke Ije Ozi

15, 16. Olee “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ” nke ụfọdụ Ndị Kraịst banyeworo, ngọzi ndị dịkwa aṅaa siworo na ya pụta?

15 Pọl onyeozi dere na e megheworo ya “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 16:9) Ọnọdụ gị ọ̀ ga-enye gị ohere ịba n’ọnụ ụzọ nke na-eduga n’ịrụ ọrụ? Dị ka ihe atụ, ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ nke inyeaka na-agụnye itinye awa 70 ma ọ bụ 50 kwa ọnwa n’ọrụ nkwusa. Dị ka o kwesịrị ịdị, Ndị Kraịst ndị ọzọ na-eji ndị ọsụ ụzọ akpọrọ ihe n’ihi ozi ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje. Ma eziokwu ahụ bụ́ na ha na-etinye oge buru ibu karị n’ozi adịghị eme ka ha chee na ha ka ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị ukwuu. Kama nke  ahụ, ha na-azụlite àgwà nke Jizọs gbara ume ka a zụlite: “Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị meworo bụ ihe anyị kwesịrị ime.”—Luk 17:10.

16 Ịsụ ụzọ na-achọ ọzụzụ onwe onye, nhazi onwe onye, na ịdị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Otú ọ dị, ngọzi ndị na-esi na ya apụta ruru mgbalị e mere maka ya. “Inwe ike ijizi Okwu Chineke nke bụ́ eziokwu ejizi bụ nnọọ ngọzi,” ka onye ọsụ ụzọ na-eto eto aha ya bụ Tamika na-ekwu. “Mgbe ị na-asụ ụzọ, ị na-eji Bible eme ihe mgbe mgbe. Ugbu a, mgbe m na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, apụrụ m icheta akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị maka onye nwe ụlọ nke ọ bụla.” (2 Timoti 2:15) Onye ọsụ ụzọ aha ya bụ Mica na-ekwu, sị: “Ịhụ otú eziokwu ahụ si emetụta ndụ ndị mmadụ bụ ngọzi ọzọ dị ịtụnanya.” Onye ntorobịa aha ya bụ Matthew kwukwara ihe yiri nke ahụ banyere “ọṅụ nke na-abịa site n’ịhụ ka mmadụ batara n’eziokwu ahụ. Ọ dịghị ụdị ọṅụ ọzọ a pụrụ iji dochie anya nke a.”

17. Olee otú otu Onye Kraịst si kwụsị inwe echiche na-ezighị ezi banyere ịsụ ụzọ?

17 Ị̀ pụrụ ịtụle ịbanye n’ọnụ ụzọ na-eduga n’ịsụ ụzọ? Eleghị anya, ọ ga-amasị gị ime otú ahụ ma ị na-eche na i rughị eru. “Enwere m echiche na-ezighị ezi banyere ịsụ ụzọ,” ka nwanna nwanyị na-eto eto aha ya bụ Kenyatte kwetara. “Echere m na erughị m eru. Amaghị m otú e si akwadebe okwu mmeghe ma ọ bụ otú e si eji Akwụkwọ Nsọ atụgharị uche.” Otú ọ dị, ndị okenye kenyere otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ tozuru okè ka ya na ya rụkọọ ọrụ. “Ọ tọrọ m ụtọ iso ya rụọ,” ka Kenyatte na-echeta. “Nke ahụ mere ka m chọọ ịsụ ụzọ.” Ọ bụrụ na i nweta agbamume na ọzụzụ ụfọdụ, ikekwe gị onwe gị kwa ga-achọ ịsụ ụzọ.

18. Ngọzi ndị dị aṅaa pụrụ ịbịara ndị banyere n’ozi ala ọzọ?

18 Ịsụ ụzọ pụrụ imeghe ọnụ ụzọ na-eduga n’ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ di na nwunye pụrụ iru eru maka ọzụzụ ozi ala ọzọ ịbụ ndị e zipụrụ ịga mee nkwusa ná mba ọzọ. Ndị ozi ala ọzọ aghaghị ime mgbanwe iji kwekọọ ná mba ọhụrụ, ikekwe n’asụsụ ọhụrụ, ọdịbendị ọhụrụ, na ná nri ọhụrụ. Ma ngọzi ndị na-esi na ya apụta na-eme ka ihe isi ike ndị dị otú ahụ pee nnọọ mpe. Mildred, bụ́ onye ozi ala  ọzọ nweworo ahụmahụ nọ na Mexico, na-ekwu, sị: “Ọ dịbeghị mgbe m kwara ụta maka mkpebi m mere ịghọ onye ozi ala ọzọ. Ọ bụwo ọchịchọ m kemgbe m bụ nwatakịrị.” Ngọzi ndị dị aṅaa ka o nwetaworo? “Mgbe m nọ n’obodo m, ịchọta onye a ga-amụrụ Bible siri ike. N’ebe a, enwewo m ihe ruru mmadụ anọ m na-amụrụ Bible malitere ịga ozi ubi n’otu mgbe!”

19, 20. Olee otú ozi Betel, ije ozi ná mba ọzọ, na Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi siworo wetara ọtụtụ ndị ngọzi?

19 Ngọzi bara ụba na-abịakwara ndị nọ n’ozi Betel n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Sven, bụ́ nwanna nwoke na-eto eto nke na-eje ozi na Germany, na-ekwu banyere ọrụ ya na Betel, sị: “M na-eche na ana m eme ihe nwere abamuru na-adịgide adịgide. M gaara eji nkà m mee ihe n’ụwa. Ma ọ gaara adị ka itinye ego n’ụlọ akụ̀ na-achọ ịdakpọ adakpọ.” N’eziokwu, ije ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo a na-adịghị akwụ ụgwọ ọnwa gụnyere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Ma Sven na-ekwu, sị: “Mgbe i si ọrụ lọta, ị na-ama na ihe nile i mere n’ụbọchị ahụ bụ maka Jehova. Nke ahụ na-enyekwa gị ụdị ọṅụ ‘pụrụ iche.’”

20 Ụfọdụ ụmụnna enwetawo ngọzi nke ije ozi ná mba ndị ọzọ, na-arụ ọrụ n’iwu ihe owuwu alaka ná mba ndị ọzọ. Otu di na nwunye jeworo ozi ná mba asatọ dere, sị: “Ụmụnna ndị nọ ebe ahụ dị nnọọ obiọma. Ọ ga-abụ ihe obi mgbawa ịhapụ ha—obi ‘agbawawo’ anyị ugboro asatọ. Lee ahụmahụ magburu onwe ya anyị nweworo!” E nwekwara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Ọ na-enye ụmụnna nwoke na-alụbeghị nwunye bụ́ ndị ruru eru ọzụzụ ime mmụọ. Otu onye gụsịworo akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ dere, sị: “Amaghị m otú m ga-esi kelee unu maka ụlọ akwụkwọ dị otú ahụ magburu onwe ya. Olee nzukọ ọzọ ga-etinye mgbalị buru nnọọ ibu otú a n’inye ọzụzụ?”

21. Ihe ịma aka dị aṅaa ka Ndị Kraịst nile na-eche ihu n’ozi ha na-ejere Chineke?

21 Ee, ọtụtụ ọnụ ụzọ na-eduga n’ịrụ ọrụ emeghewo. N’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị enweghị ike ije ozi na Betel ma ọ bụ n’ala ọzọ. Jizọs n’onwe ya kwetara na Ndị Kraịst ga-amị “mkpụrụ” n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche n’ihi ọnọdụ dịgasị iche iche. (Matiu 13:23) Mgbe ahụ, ihe ịma aka anyị nwere dị ka Ndị Kraịst bụ iji ọnọdụ anyị mee ihe n’ụzọ kasị mma—ikere òkè zuru ezu n’ozi Jehova dị ka ọnọdụ anyị kwere anyị mee. Mgbe anyị mere nke ahụ, anyị na-enye Jehova otuto, anyị pụkwara ijide n’aka na ọ na-atọ ya ụtọ nke ukwuu. Tụlee ihe banyere Ethel, bụ́ nwanna nwanyị meworo agadi onye nọ n’ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike. Ọ na-agbara ndị ya na ha bi n’ebe ahụ àmà mgbe nile, ọ na-ejikwa telifon agba àmà. N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị o nwere, o ji obi ya dum na-eje ozi.—Matiu 22:37.

22. (a) Olee ụzọ ọzọ ndị anyị pụrụ isi na-ewetara Chineke otuto? (b) Oge dị aṅaa magburu onwe ya na-echere anyị?

22 Otú ọ dị, cheta na ime nkwusa bụ nanị otu ụzọ anyị si ewetara Jehova otuto. Site n’ịbụ ezi ihe nlereanya n’omume na n’ọdịdị anyị mgbe anyị nọ n’ebe ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, na n’ụlọ, anyị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ilu 28:20 na-ekwe nkwa, sị: “Onye ọ bụla nke kwesịrị ntụkwasị obi ga-enwe ọtụtụ ngọzi.” Ya mere, anyị kwesịrị ‘ịgha mkpụrụ n’ụba’ n’ozi Chineke, na-amara na anyị ga-aghọta ngọzi bara ụba. (2 Ndị Kọrint 9:6) N’ime otú ahụ, anyị ga-enwe ihe ùgwù nke ịdị ndụ n’oge ahụ dị ebube mgbe “ihe ọ bụla nke na-eku ume” ga-enye Jehova otuto bụ́ nke o ruru nnọọ eru inweta!—Abụ Ọma 150:6.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ahụ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú ndị Chineke si ejere Jehova ozi “ehihie na abalị”?

• Ihe ịma aka dị aṅaa ka ebo Gad chere ihu, gịnịkwa ka nke ahụ na-akụziri Ndị Kraịst taa?

• Olee otú ozi ubi si arụ ọrụ dị ka ihe nchebe pụọ ná mwakpo Setan?

• ‘Ọnụ ụzọ dị aṅaa e meghere emeghe’ ka ụfọdụ baworo, ngọzi ndị dịkwa aṅaa ka ha nwetaworo?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Dị ka ndị Gad lụsoro ndị mwakpo na-apụnara mmadụ ihe ọgụ, Ndị Kraịst aghaghị ịlụso mwakpo Setan ọgụ

[Foto dị na peeji nke 17]

Anyị na-eso ibe anyị enwe mkpakọrịta na-ewuli elu n’ozi ubi

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ọrụ ọsụ ụzọ pụrụ imeghe ụzọ maka ihe ùgwù ije ozi ndị ọzọ, ndị gụnyere:

1. Ije ozi ná mba ọzọ

2. Ozi Betel

3. Ozi ala ọzọ