Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ị Ga-enwe Mmasị Ịjụ Chineke?

Gịnị Ka Ị Ga-enwe Mmasị Ịjụ Chineke?

Gịnị Ka Ị Ga-enwe Mmasị Ịjụ Chineke?

NDỊ mmadụ gburugburu ụwa nwere ajụjụ ndị gbara ọkpụrụkpụ ịjụ banyere ndụ. Ọ̀ dị nke i nwere? Ọtụtụ ndị ajụwo ndị ụkọchukwu ajụjụ ha ma ha enwetabeghị azịza ndị na-eju afọ. Ndị ọzọ atụgharịwo uche n’ajụjụ ndị a n’onwe ha. Ụfọdụ ekpewo ekpere maka nduzi. Ò kwere omume n’ezie inweta azịza site n’aka Chineke banyere ihe ndị na-agbagwoju gị anya? Ụfọdụ n’ime ajụjụ ọtụtụ ndị sịrị na ha ga-enwe mmasị ịjụ Chineke bụ ndị a.

Chineke, ònyedị ka ị bụ?

Ọdịbendị ụmụ mmadụ, okpukpe ndị mụrụ ha na-ekpe, na ma eleghị anya nhọrọ ha na-eme na-emetụta otú ha si ele Chineke anya. Ụfọdụ ndị na-akpọ ya aha ha na-akpọ Chi ha; ndị ọzọ na-akpọ ya nnọọ Chineke. Ọ̀ dị ihe o mere n’ezie? È nwere nanị otu ezi Chineke, bụ́ onye na-ekpughere anyị onye ọ bụ na ihe bụ́ aha ya?

N’ihi gịnị ka e ji nwee oké nhụjuanya?

Ọ bụrụ na mmadụ adaa ọrịa ma ọ bụ daa ogbenye n’ihi ndụ aghara na nke omume rụrụ arụ ọ na-ebi, ọ pụrụ ime mkpesa. Ma ọ pụrụ n’ezie ịma ihe mere o ji na-ata ahụhụ.

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọzọ na-ata ahụhụ nke ukwuu n’ihi ihe ọ na-abụghị ha kpatara. Ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa ndị na-adịghị ala ala. Ndị ọzọ na-adọlịsi ike inweta ebe ha ga-ebi na nri ga-ezuru ha na ezinụlọ ha. Ọtụtụ nde mmadụ bụ ndị e mesoro mpụ, ndị agha kpara aka ọjọọ, ndị e mesoro ihe ike ugboro ugboro, ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha kpara aka ọjọọ, ma ọ bụ ndị ndị nọ n’ọchịchị kpere ikpe na-ezighị ezi.

O kwere nghọta na ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: ‘N’ihi gịnị ka ọnọdụ ndị dị otú ahụ ji ju ebe nile? N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya a nile dịrị?’

N’ihi gịnị ka m ji nọdụ n’ebe a? Gịnị bụ nzube nke ndụ?

Ajụjụ ndị a na-ebilitekarị n’ihi obi mgbawa nke onye na-adịghị enweta ezigbo afọ ojuju n’ọrụ ụbọchị ya—otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ mmadụ. Ọtụtụ nde ndị ọzọ kweere na Chineke ebuwo ụzọ kpebie n’ụzọ ụfọdụ otú ndụ onye ọ bụla ga-adị. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Ọ bụrụ n’ezie na ọ dị nzube pụrụ iche Chineke nwere maka gị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-achọ ịma ihe ọ bụ.

N’ime akwụkwọ nile dị n’ụwa, e nwere otu nke na-ekwu n’ụzọ doro anya na e dere ya n’ike mmụọ nsọ Chineke. Dị ka ị pụrụ ịtụ anya ya banyere ozi nke sitere n’aka Chineke n’ezie nye ihe a kpọrọ mmadụ, e nwere akwụkwọ a n’ọtụtụ asụsụ karịa nnọọ ka e nwere akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ọ bụ Bible Nsọ. N’ime ya, Onye Okike nke eluigwe na ala, bụ́ Chineke n’onwe ya, na-ekpughe onye ọ bụ na ihe bụ́ aha ya. Ị̀ maara aha ahụ? Ị̀ maara ihe Bible na-ekwu banyere ụdị Onye Chineke bụ? Ị̀ maara ihe ọ na-ekwu banyere ihe Chineke na-achọ n’aka gị?

[Ebe e si nweta foto dị na peeji 2]

IHU AKWỤKWỌ: Chad Ehlers/Index Stock Photography

[Ebe e si nweta Foto dị na peeji 3]

Ugwu: Chad Ehlers/Index Stock Photography