Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ajụ, Sị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”

Ị̀ Na-ajụ, Sị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”

 Ị̀ Na-ajụ, Sị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”

“Ha esiwo n’ebe m nọ jee n’ebe dị anya . . . Ha asịghịkwa, Olee ebe Jehova nọ?”—JEREMAỊA 2:5, 6.

1. Mgbe ndị mmadụ jụrụ, sị, “Olee ebe Chineke nọ?,” gịnị ka ọ pụrụ ịbụ na ha bu n’uche?

“OLEE ebe Chineke nọ?” Ọtụtụ mmadụ ajụwo ajụjụ ahụ. Ụfọdụ n’ime ha anọwo nnọọ na-achọ ịghọta otu eziokwu bụ́ isi banyere Onye Okike, ya bụ, ebe o bi? Ndị ọzọ ajụwo ajụjụ ahụ mgbe ọdachi mesịrị n’ọtụtụ ebe ma ọ bụ mgbe ihe siere ha ike nke na ha apụghị ịghọta ihe mere Chineke ji gbachi nkịtị. Ndị ọzọkwa anaghịdị ajụ ajụjụ ahụ n’ihi na ha ekwenyeghị n’echiche bụ́ na Chineke dị.—Abụ Ọma 10:4.

2. Olee ndị na-achọta Chineke?

2 N’ezie, e nwere ọtụtụ ndị maara ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na Chineke dị. (Abụ Ọma 19:1; 104:24) Ụfọdụ n’ime ha achọghị ihe ọzọ karịa inwe okpukpe ha nọ na ya. Ma oké ịhụnanya ọtụtụ nde ndị ọzọ, n’ala nile, nwere maka eziokwu akpaliwo ha ịchọ ezi Chineke ahụ. Mgbalị ha akụbeghị afọ n’ala n’ihi na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Ọrụ 17:26-28.

3. (a) Ebee ka Chineke bi? (b) Gịnị ka ajụjụ ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́, “Olee ebe Jehova nọ” pụtara?

3 Mgbe mmadụ chọtara Jehova n’ezie, ọ na-amata na “Chineke bụ Mmụọ,” na mmadụ adịghị ahụ ya anya. (Jọn 4:24) Jizọs kpọrọ ezi Chineke ahụ “Nna m nke nọ n’eluigwe.” Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ bụ na ebe Nna anyị nke eluigwe bi bụ, n’ụzọ ime mmụọ, ebe dị elu, ọbụna dị ka eluigwe nkịtị si dị elu karịa ụwa. (Matiu 12:50; Aịsaịa 63:15) Otú ọ dị, ọ bụ ezie na anyị apụghị iji anya nkịtị hụ Chineke, ọ na-eme ka o kwe anyị omume ịmara ya na ịmụta ọtụtụ ihe banyere nzube ya. (Ọpụpụ 33:20; 34:6, 7) Ọ na-aza ajụjụ ndị nwere ezi obi bụ́ ndị na-achọ ịmara nzube nke ndụ, na-ajụ. N’okwu ndị metụtara ndụ anyị, ọ na-enye anyị ezi ihe ndabere nke anyị ga-eji mata ebe ọ kwụ, ya bụ, otú o si ele ihe ndị dị otú ahụ anya nakwa ma ọchịchọ anyị hà kwekọrọ ná nzube ya. Ọ na-achọ ka anyị jụọ ase banyere ihe ndị dị otú ahụ ma tinye mgbalị siri ike iji nweta azịza ha. Site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma, Jehova baara ndị Izrel oge ochie mba n’ihi na ha emeghị otú ahụ. Ha maara aha Chineke, ma ha ajụghị, sị, “Olee ebe Jehova nọ?” (Jeremaịa 2:6) Nzube Jehova abụghị nchegbu ha bụ́ isi. Ha anọghị na-achọ nduzi ya. Mgbe i nwere mkpebi ime, ma ndị ukwu ma ndị nta, ị̀ na-ajụ, sị, “Olee ebe Jehova nọ?”

Ndị Jụrụ Chineke Ase

4. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru n’ihe nlereanya Devid n’ihe banyere ịjụ Jehova ase?

4 Mgbe Devid, nwa Jesi, ka bụ nwa okorobịa, ọ zụlitere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. Ọ maara Jehova dị ka “Chineke dị ndụ.” Devid n’onwe ya enwetawo nchebe n’aka Jehova. N’ịbụ onye okwukwe na ịhụnanya o nwere n’ebe “aha Jehova” dị kpaliri, Devid gburu dike Filistia ahụ kere ekike agha nke ọma, bụ́ Gọlaịat. (1 Samuel 17:26, 34-51) Otú ọ dị, ihe ịga nke ọma Devid nwere emeghị ka o nwee obi ike onwe onye. O cheghị echiche na ihe ọ bụla o mere ugbu a, Jehova  ga-agọzi ya. N’afọ ndị sochirinụ, Devid jụrụ Jehova ase ugboro ugboro mgbe ọ chọrọ ime mkpebi. (1 Samuel 23:2; 30:8; 2 Samuel 2:1; 5:19) Ọ nọgidere na-ekpe ekpere, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị zikwa m ihe; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke nke nzọpụta m; Gị ka m na-ele anya Gị ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 25:4, 5) Lee ezi ihe nlereanya nke a bụụrụ anyị ịgbaso!

5, 6. Olee otú Jehoshafat si chọọ Jehova n’oge dịgasị iche iche ná ndụ ya?

5 N’oge Eze Jehoshafat, bụ́ eze nke ise n’usoro ndị eze sitere n’eriri Devid, usuu ndị agha nke mba atọ jikọrọ aka bịa ibuso Juda agha. N’ịbụ onye mba ya nọ n’ọnọdụ a chọrọ ime ihe ngwa ngwa, Jehoshafat ‘chere ihu ya ịchọ Jehova.’ (2 Ihe E Mere 20:1-3) Nke a abụghị nke mbụ Jehoshafat chọworo Jehova. Eze ahụ ajụla ofufe Bel nke alaeze ebe ugwu nke Izrel mikpuru onwe ya na ya ma họrọ ije ije n’ụzọ Jehova. (2 Ihe E Mere 17:3, 4) Ugbu a nsogbu chere Jehoshafat ihu, olee otú o si ‘chọọ Jehova’?

6 N’ekpere ihu ọha Jehoshafat kpere na Jeruselem n’oge a e nwere nsogbu, o gosiri na ya chetara ike Jehova nwere dị ka onye pụrụ ime ihe nile. O chebaworo nzube Jehova echiche nke ukwuu bụ́ nke e kpughere site ná nchụpụ Ọ chụpụrụ mba ndị ọzọ ma nye Izrel ala ụfọdụ dị ka ihe nketa. Eze ahụ kwetara na enyemaka Jehova dị ya mkpa. (2 Ihe E Mere 20:6-12) Jehova ò kwere ka a chọta ya n’oge ahụ? Eenụ. Site n’ọnụ Jahaziel, bụ́ onye Livaị, Jehova nyere ntụziaka a kapịrị ọnụ, n’echi ya kwa, O mere ka ndị Ya nwee mmeri. (2 Ihe E Mere 20:14-28) Ị̀ pụrụ isi aṅaa jide n’aka na Jehova ga-ekwe ka ị chọta ya mgbe i chigharịkwuuru ya maka nduzi?

7. Ole ndị ka Chineke na-anụ ekpere ha?

7 Jehova adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-akpọ ndị si ná mba nile òkù iji ekpere na-achọ ya. (Abụ Ọma 65:2; Ọrụ 10:34, 35) Ọ maara ihe ndị na-arịọ ya arịrịọ bu n’obi. Ọ na-emesi anyị obi ike na ya na-anụ ekpere nke ndị ezi omume. (Ilu 15:29) Ọ na-ekwe ka ụfọdụ ndị na-enwebughị mmasị n’ebe ọ nọ, bụ́kwa ndị jizi obi umeala achọ nduzi ya, chọta Ya. (Aịsaịa 65:1) Ọbụna ọ na-anụ ekpere nke ndị mebiworo iwu ya, bụ́kwa ndị jizi obi umeala chegharịa. (Abụ Ọma 32:5, 6; Ọrụ 3:19) Otú ọ dị, mgbe mmadụ na-adịghị edo onwe ya n’okpuru Chineke, ekpere onye ahụ na-abụ ihe efu. (Mak 7:6, 7) Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Ha Rịọrọ Ma Ha Arịọtaghị

8. Gịnị mere Jehova azaghị ekpere Eze Sọl?

8 Mgbe Samuel onye amụma gwasịrị Eze Sọl na Chineke ajụwo ya n’ihi nnupụisi ya, Sọl kpọrọ isiala nye Jehova. (1 Samuel 15:30, 31) Ma nke ahụ bụ nanị ka a sịkwa. Ọchịchọ Sọl abụghị irubere Chineke isi, kama ọ bụ ka ndị obodo sọpụrụ ya. Ka e mesịrị, mgbe ndị Filistia nọ na-ebuso Izrel agha, Sọl jụrụ Jehova ase iji mezuo iwu. Otú ọ dị, mgbe a na-azaghị ya, ọ gakwuuru onye na-ajụ ndị mmụọ ase, n’agbanyeghị na ọ maara na Jehova katọrọ ya. (Deuterọnọmi 18:10-12; 1 Samuel 28:6, 7) N’igbu  okwu ahụ nkenke, 1 Ihe E Mere 10:14 na-ekwu banyere Sọl, sị: “Ọ jụghị Jehova ase.” N’ihi gịnị? N’ihi na Sọl ejighị okwukwe kpee ekpere ya. N’ihi ya, ọ dị ka a ga-asị na o kpeghị ekpere ma ọlị.

9. Olee ihe na-ezighị ezi banyere arịrịọ Zedekaịa rịọrọ Jehova maka nduzi?

9 N’ụzọ yiri nke ahụ, ka alaeze Juda na-abịa ná njedebe, e kpere ọtụtụ ekpere ma jụọ ndị amụma Jehova ase. Otú ọ dị, ndị ahụ nọ na-ekpere arụsị ma na-asị na ha na-efe Jehova ofufe. (Zefanaịa 1:4-6) Ọ bụ ezie na ha nọ na-ajụ Chineke ase iji mezuo iwu, ha edozighị obi ha ime uche ya. Eze Zedekaịa rịọrọ Jeremaịa ka ọ jụọ Jehova ase n’aha ya. Jehova adịlarị mbụ gwa eze ahụ ihe o kwesịrị ime. Ma n’ihi enweghị okwukwe na ịtụ egwu mmadụ, eze ahụ egeghị ntị n’olu Jehova, Jehova enyeghịkwa ya azịza ọ bụla ọzọ nke ga-aka amasị ya.—Jeremaịa 21:1-12; 38:14-19.

10. Olee ihe dị njọ banyere ụzọ Johanan si chọọ nduzi Jehova, gịnịkwa ka anyị na-amụta site n’ụzọ o hiere?

10 Mgbe e bibisịrị Jeruselem, ndị agha Babilọn adọrọkwa ndị Juu n’agha laa, Johanan jikeere ịkpọrọ obere ìgwè ndị Juu fọdụrụ na Juda gaa Ijipt. Ha mere atụmatụ ha, ma tupu ha agawa, ha gwara Jeremaịa ka o kpee ekpere n’isi ha ma chọọrọ ha nduzi n’aka Jehova. Otú ọ dị, mgbe ha na-enwetaghị azịza ha chọrọ, ha gara nnọọ n’ihu ma mee ihe ha mere atụmatụ ya. (Jeremaịa 41:16–43:7) Ị̀ na-ahụ n’ihe ndị a merenụ ihe mmụta ndị pụrụ ịbara gị uru ka ọ ga-abụ mgbe ị na-achọ ihu ọma Jehova, ya ekwe ka ị chọta ya?

“Nọgidenụ Na-ejide n’Aka”

11. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-etinye ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:10 n’ọrụ?

11 Ezi ofufe na-agụnye ihe karịrị igosipụta nraranye anyị site na baptizim ime mmiri, ịga nzukọ ọgbakọ, na ikere òkè n’ozi a na-eje maka ọha. Ọ na-agụnye ụzọ ndụ anyị dum. Kwa ụbọchị, anyị na-enweta nrụgide—ụfọdụ adịghị apụta ìhè, ụfọdụ na-apụta ìhè karị—ndị pụrụ ịdọpụ anyị n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke. Olee otú anyị ga-esi emeghachi omume na ha? Mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’Efesọs akwụkwọ, ọ gbara ha ume, sị: “Nọgidenụ na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma.” (Ndị Efesọs 5:10) A na-ahụ amamihe dị n’ime otú ahụ n’ọtụtụ ọnọdụ ndị a kọrọ banyere ha n’Akwụkwọ Nsọ.

12. N’ihi gịnị ka obi na-ejighị dị Jehova ụtọ mgbe Devid butere igbe ọgbụgba ndụ ahụ na Jeruselem?

12 Mgbe e bughachisịịrị Izrel igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ya anọọkwa ọtụtụ afọ na Kiriat-Jearim, Eze Devid bịara chọọ ibuga ya Jeruselem. Ọ kpọkọrọ ndị isi nke ndị ahụ ma kwuo na a ga-ebugota Igbe ahụ ma ‘ọ bụrụ na ọ dị ha mma, ọ bụrụkwa na o sitere na Jehova.’ Ma o meghị ezi nchọpụta iji mata ihe bụ́ uche Jehova n’okwu ahụ. A sị na o mere otú ahụ, a gaaraghị adọnye Igbe ahụ n’ụgbọala. Ndị Livaị si n’agbụrụ Kohat gaara eburuwo ya n’ubu ha, dị ka Chineke nyeworo ntụziaka doro anya banyere ya. Ọ bụ ezie na Devid na-ajụ Jehova ase mgbe mgbe, o meghị otú ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’oge a. Nke ahụ kpatara ọdachi. Devid mesịrị kweta, sị: “Jehova, bụ́ Chineke anyị, tiwapụtara megide anyị, n’ihi  na anyị achọghị Ya dị ka ikpe Ya si dị.”—1 Ihe E Mere 13:1-3; 15:11-13; Ọnụ Ọgụgụ 4:4-6, 15; 7:1-9.

13. Olee ihe ncheta dị n’abụ a bụrụ mgbe e nwere ihe ịga nke ọma n’iburu Igbe ọgbụgba ndụ ahụ?

13 Mgbe ndị Livaị mesịrị si n’ụlọ Obed-edọm buga Igbe ahụ Jeruselem, a bụrụ abụ Devid rọrọ. Ọ na-agụnye ihe ncheta a sitere n’ala ala obi, bụ́: “Na-achọnụ Jehova na ike Ya; chọọnụ ihu Ya mgbe nile. Chetanụ oké ọrụ Ya nile nke Ọ rụworo; ihe ebube Ya nile, na ikpe nile nke ọnụ Ya.”—1 Ihe E Mere 16:11, 12.

14. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ezi ihe nlereanya Solomọn nakwa site n’ụzọ o hiere n’oge agadi ya?

14 Tupu Devid anwụọ, ọ dụrụ nwa ya bụ́ Solomọn ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ [Jehova], Ọ ga-eme ka ị chọta Ya.” (1 Ihe E Mere 28:9) Ozugbo e chiri Solomọn eze, ọ gara Gibiọn, bụ́ ebe ụlọikwuu nzute dị, ma chụọrọ Jehova àjà. N’ebe ahụ, Jehova gwara Solomọn, sị: “Rịọ ihe M ga-enye gị.” N’ime ihe Solomọn rịọrọ, Jehova ji mmesapụ aka nye ya amamihe na ihe ọmụma iji kpee Izrel ikpe, Ọ tụkwasịkwara akụ̀ na ụba na nsọpụrụ n’elu ya. (2 Ihe E Mere 1:3-12) N’iji ụkpụrụ ụlọ nke Jehova nyere Devid mee ihe, Solomọn wuru ụlọ nsọ dị ebube. Ma a bịa n’ihe banyere ụmụ nwanyị ndị ọ lụrụ, Solomọn achọghị Jehova. Solomọn lụrụ ụmụ nwanyị na-adịghị efe Jehova ofufe. N’oge agadi ya, ha wezụgara obi ya n’ebe Jehova nọ. (1 Ndị Eze 11:1-10) N’agbanyeghị otú anyị pụrụ iyiru ndị a ma ama, ndị nwere amamihe, ma ọ bụ ihe ọmụma, ọ dị mkpa ‘ịnọgide na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma’!

15. Mgbe Zira onye Etiopia bịara ibuso Juda agha, olee ihe mere Esa ji nwee ike ikpegara Jehova ekpere na-enwe obi ike na ọ ga-anapụta Juda?

15 E mesikwuru mkpa nke a dị ike n’ihe ndekọ banyere ọchịchị Esa, bụ́ onye si n’eriri Solomọn. Afọ 11 ka Esa ghọsịrị eze, Zira bụ́ onye Etiopia duuru usuu ndị agha dị otu nde mmadụ bịa ibuso Juda agha. Jehova ọ̀ ga-anapụta Juda? Ihe karịrị afọ 500 tupu mgbe ahụ, Jehova ekwuwo n’ụzọ doro anya ihe ndị ya pụrụ ịtụ anya ya ma ọ bụrụ na ha egee ya ntị ma na-edebe iwu ya na ihe ha pụrụ ịtụ anya ya ma ọ bụrụ na ha adịghị eme otú ahụ. (Deuterọnọmi 28:1, 7, 15, 25) Ná mmalite ọchịchị ya, Esa wepụrụ ebe ịchụàjà na ogidi ndị e ji fee ofufe ụgha. Ọ gbawo ndị ya ume ka ha “chọọ Jehova.” Esa echereghị ruo mgbe ọdachi chere ya ihu tupu ya emewe ihe ndị a. Ya mere, n’ịbụ onye nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, Esa bịara nwee ike ikpegara ya ekpere ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka. Gịnị si na ya pụta? E mere ka Juda nwee mmeri pụtara ìhè.—2 Ihe E Mere 14:2-12.

16, 17. (a) Ọ bụ ezie na Esa nwere mmeri, gịnị ka Jehova chetaara ya? (b) Mgbe Esa mere ihe n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya, aka dị aṅaa ka e nyeere ya, ma olee otú o si meghachi omume? (ch) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịtụle omume Esa?

16 Otú o sina dị, mgbe Esa si ná mmeri n’agha ahụ lọta, Jehova zigara Azaraịa ka ọ gaa zute eze ahụ ma gwa ya, sị: “Nụrụnụ, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọnyeere unu, mgbe unu nọnyeere Ya; ọ bụrụkwa na unu achọọ Ya, Ọ ga-eme ka unu chọta Ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ Ya, Ọ ga-ahapụ unu.” (2 Ihe E Mere 15:2) Esa bịara jirighachi ịnụ ọkụ n’obi kwalite ezi ofufe. Afọ 24 mgbe nke a gasịrị, mgbe agha chere Esa ihu ọzọ, ọ chọghị Jehova. Ọ tụleghị Okwu Chineke, o chetaghịkwa ihe Jehova mere mgbe usuu ndị agha Etiopia wakporo Juda. Ọ bịara jiri nzuzu soro Siria jikọọ aka.—2 Ihe E Mere 16:1-6.

17 N’ihi nke a, Jehova mere ka Hanani onye ọhụ ụzọ dọọ Esa aka ná ntị. Ọbụna n’oge ahụ, bụ́ mgbe a kọwara ihe bụ́ echiche Jehova n’okwu ahụ, Esa gaara eritewo uru. Kama nke ahụ, o were iwe ma tinye Hanani n’ụlọ ọtọsị. (2 Ihe E Mere 16:7-10) Lee ihe mwute ọ bụ! Gịnị banyere anyị? Ànyị na-achọ Chineke ma n’otu mgbe ahụ na-ajụ ịnara ndụmọdụ ya? Mgbe onye okenye nke na-enwe nchegbu ma na-eche banyere anyị ji Bible dụọ anyị ọdụ  n’ihi na anyị na-emikpu onwe anyị n’ime ụwa, ànyị na-enwe ekele maka aka ahụ e ji ịhụnanya na-enyere anyị iji mara “ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma”?

Echefula Ịjụ

18. Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe Elaịhu gwara Job?

18 Mgbe e nwere nrụgide, ọbụna onye a maara nke ọma dị ka onye na-ejere Jehova ozi pụrụ imehie ihe. Mgbe e ji ọrịa na-asọ oyi tie Job ihe otiti, ụmụ ya na ihe onwunwe ya efunahụ ya, ndị enyi ya ebookwa ya ebubo ụgha, ọ bịara chewe nanị banyere onwe ya. Elaịhu chetaara ya, sị: “Ọ dịghị onye sịrị, Olee ebe Chineke nọ, bụ́ Onye mere m?” (Job 35:10) Ọ dị Job mkpa ka e mee ka o cheta Jehova ma tụlee otú O si lee ọnọdụ ahụ anya. Job ji obi umeala nakwere ihe ncheta ahụ, ihe nlereanya ya pụkwara inyere anyị aka ime otu ihe ahụ.

19. Gịnị ka ndị Izrel na-emeghị mgbe mgbe?

19 Ndị Izrel maara ihe ndekọ banyere otú Chineke si mesoo mba ha ihe. Ma mgbe mgbe, ha echetaghị ya mgbe ha na-ahụ maka ọnọdụ ụfọdụ ná ndụ ha. (Jeremaịa 2:5, 6, 8) Mgbe ha nwere mkpebi ndị ha ga-eme ná ndụ, ha chụsoro ihe ụtọ nke ha kama ịjụ, sị, “Olee ebe Jehova nọ?”—Aịsaịa 5:11, 12.

Nọgide Na-ajụ, Sị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”

20, 21. (a) Olee ndị gosipụtaworo mmụọ Ịlaịsha n’oge a n’ịchọ nduzi Jehova? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ma rite uru n’ihe nlereanya nke okwukwe ha?

20 Mgbe Ịlaịja jesịrị ozi ihu ọha ya, onye na-ejere ya ozi bụ́ Ịlaịsha weere uwe mwụda si n’ahụ́ Ịlaịja dapụ gaa na Jọdan, kụọ ya ná mmiri ahụ, ma jụọ, sị: “Olee ebe Jehova nọ, bụ́ Chineke Ịlaịja?” (2 Ndị Eze 2:14) Jehova zara ya site n’igosi na mmụọ ya dịzi n’ahụ́ Ịlaịsha. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?

 21 Ihe yiri nke ahụ mere n’oge a. Ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị buteworo ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ nwụrụ. Ndị e nyefere ọrụ nlekọta n’oge ahụ nyochara Akwụkwọ Nsọ ma kpegara Jehova ekpere maka nduzi. Ha jụrụ mgbe nile, sị, “Olee ebe Jehova nọ?” N’ihi ya, Jehova anọgidewo na-edu ndị ya ma na-eme ka ọrụ ha na-aga nke ọma. Ànyị na-eṅomi okwukwe ha? (Ndị Hibru 13:7) Ya bụrụ otú ahụ, anyị ga-anọ nzukọ Jehova nso, na-anakwere nduzi ya, ma na-ekere òkè zuru ezu n’ọrụ ọ na-arụ n’okpuru nduzi Jizọs Kraịst.—Zekaraịa 8:23.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’uche na-ajụ, sị, “Olee ebe Jehova nọ?”

• Olee otú anyị pụrụ isi na-enweta azịza nye ajụjụ bụ́, “Olee ebe Jehova nọ?”

• Gịnị mere na a dịghị aza ekpere ụfọdụ a na-ekpe maka nduzi Chineke?

• Olee ihe atụ Bible ndị na-egosi mkpa ọ dị ‘ịnọgide na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma’?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Olee otú Eze Jehoshafat si chọọ Jehova?

[Foto dị na peeji nke 10]

N’ihi gịnị ka Sọl ji gakwuru onye na-ajụ ndị mmụọ ase?

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Na-ekpe ekpere, na-amụ ihe, ma na-atụgharị uche iji na-achọpụta “ebe Jehova nọ”