Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ụfọdụ Si Nweta Azịza

Otú Ụfọdụ Si Nweta Azịza

 Otú Ụfọdụ Si Nweta Azịza

ỌTỤTỤ nde mmadụ na-ekpe ekpere. Obi na-esi ụfọdụ ike na a na-aza ekpere ha. Ndị ọzọ na-enwe obi abụọ ma a na-anụkwadị ekpere ha. Ndị ọzọkwa na-achọ inweta azịza ma ha echebeghị echiche banyere ịgwa Chineke ihe bụ́ ọchịchọ ha n’ekpere.

Bible na-akọwa ezi Chineke ahụ dị ka “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Ọ bụrụ na i kpee ekpere, ì ji n’aka na ọ bụ ezi Chineke ahụ ka ị na-ekpegara ya? Ekpere gị ọ̀ bụ ụdị nke ọ ga-aza?

Nye ọtụtụ ndị bi n’ebe nile n’ụwa, azịza ya bụ ee! Olee otú ha si nweta azịza? Gịnị ka ha mụtara?

ChinekeÒnye Ka Ọ Bụ?

Otu onye nkụzi nọ na Portugal bụ́ onye ndị nọn na ndị ụkọchukwu ziri ihe, ji ezi obi mee ihe kwekọrọ n’ihe okpukpe ya kụziri. Mgbe chọọchị ahụ gbanwere ma gbahapụ omume ndị a kụziwooro ya na ha dị mkpa, o nwere mgbagwoju anya. Ime njem mere ka ọ mata ụzọ ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa si efe ofufe, ọ malitekwara inwe obi abụọ ma è nwekwara otu ezi Chineke. Olee otú o kwesịrị isi na-efe ofufe? Mgbe ọ jụrụ ụkọchukwu ya banyere ihe ndị dị na Bible, e leghaara ajụjụ ya anya, o wutekwara ya.

Ndị chọọchị Katọlik ekesawo otu akwụkwọ nta n’obodo onye nkụzi a, na-adọ ndị chọọchị ha aka ná ntị ka ha ghara iso Ndịàmà Jehova na-akparịta ụka. Ma ajụjụ ya ka dị ya n’obi. Otu ụbọchị, mgbe Ndịàmà gara n’ụlọ ya, o gere ntị ma gosi mmasị n’ihe ọ nụrụ. Nke ahụ bụ nke mbụ ya na ha kwurịtara okwu.

Iji nweta azịza nye ọtụtụ ajụjụ ya, nwanyị a malitere iso Ndịàmà na-amụ Bible. Kwa izu, ọ na-enwe ọtụtụ ajụjụ ọ ga-ajụ ha. Ọ chọrọ ịmata aha Chineke, ma è nwere nanị otu ezi Chineke, ma ọ̀ na-anabata iji ihe oyiyi efe ofufe, na ihe ndị ọzọ. Ọ chọpụtara na azịza nile o nwetara sitere na Bible, ọ bụghị n’echiche onwe onye, n’ihi ya, ihe ndị ọ na-amụta tụrụ ya n’anya ma nye ya obi ụtọ. Nke nta nke nta, o nwetara azịza nye ọtụtụ ajụjụ ya. Taa, ọ na-efe Jehova ofufe n’ime mmụọ na eziokwu, dị  ka Jizọs Kraịst kwuru na “ndị na-efe ezi ofufe” ga na-eme.—Jọn 4:23.

Na Sri Lanka, otu ezinụlọ na-agụkọ Bible ọnụ mgbe nile, ma ha adịghị enweta azịza nye ọtụtụ ajụjụ ndị dị ha mkpa. Ọ bụ ezie na ha chọrọ enyemaka, onye ụkọchukwu ha apụghị inyere ha aka. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova letara ezinụlọ ahụ ma hapụrụ ha akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ nke nyeere ha aka. Ka e mesịrị, mgbe Ndịàmà Jehova zara ezinụlọ ahụ ajụjụ ha ndị dabeere na Bible n’ụzọ juru ha afọ, ha kweere ịmụ Bible. Ihe ha mụtara n’ọmụmụ ihe ha masịrị ha nke ukwuu.

Otú o sina dị, ozizi ndị a kụnyeworo n’obi onye nke bụ́ nwunye mgbe ọ bụ nwata gbochiri ya ịhụ na Nna Jizọs Kraịst bụ “nanị ezi Chineke ahụ,” dị ka Jizọs kwuru n’onwe ya. (Jọn 17:1, 3) A kụziworo ya na Jizọs na Nna ahụ hà nhata nakwa na e kwesịghị ịgbagha “ihe omimi” a. O ji ezi obi na obi nkoropụ kpekuo Jehova ekpere, na-eji aha Ya eme ihe, ma rịọ ya ka o gosi ya onye Jizọs bụ. Ya ejirizie nlezianya nyochaghachi akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-ekwu banyere nke ahụ. (Jọn 14:28; 17:21; 1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Dị ka a ga-asị na akpịrịkpa si n’anya ya dapụtasịa, ọ hụziri nke ọma na Jehova—Onye Okike nke eluigwe na ala na Nna nke Jizọs Kraịst—bụ ezi Chineke ahụ.—Aịsaịa 42:8; Jeremaịa 10:10-12.

Nhụjuanya—N’ihi Gịnị?

Nwoke ahụ bụ́ Job tabigara ahụhụ ókè. Oké ifufe gburu ụmụ ya nile, e mekwara ka ọ daa ogbenye. Ọ rịakwara ọrịa na-egbu mgbu ma nagide nrụgide site n’aka ndị enyi ụgha. Ka ihe ndị a nile na-eme, Job kwuru ihe ụfọdụ n’echeghị ha eche. (Job 6:3) Ma Chineke chebaara ọnọdụ ọ nọ na ya echiche. (Job 35:15) Ọ maara ihe dị n’obi Job ma nye Job ndụmọdụ dị ya mkpa. Ọ na-emekwara ndị mmadụ otú ahụ taa.

Na Mozambique, Castro dị nanị afọ iri mgbe mama ya nwụrụ. Obi gbawara ya. “N’ihi gịnị ka o ji nwụọ ma hapụ anyị?” ka ọ jụrụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere ya, ọ dịghịzi ihe nwere isi n’anya ya. Gịnị pụrụ ịkasi ya obi? O nwetara nkasi obi site n’ịgụ ntakịrị Bible Chichewa na n’ịkọrọ ụmụnne ya ndị nwoke tọrọ ya ihe ọ gụtara.

Nke nta nke nta, Castro bịara ghọta na mama ya nwụrụ, ọ bụghị n’ihi ikpe na-ezighị ezi nke Chineke, kama n’ihi ezughị okè e ketara eketa. (Ndị Rom 5:12; 6:23) Nkwa Bible kwere maka mbilite n’ọnwụ kachasị kasie ya obi n’ihi na ọ hụrụ ya dị ka ihe ọ ga-adabere na ya nwee obi ike na ya ga-ahụ mama ya ọzọ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) N’ụzọ dị mwute, mgbe nanị afọ anọ gasịrị, papa ya nwụrụ. Ma n’oge a, Castro nwere ike idi ọnwụ ya nke ọma karị. Taa, ọ hụrụ Jehova n’anya ma jiri iguzosi ike n’ihe jiri ndụ ya na-ejere Chineke ozi. Ọṅụ ọ chọtaworo pụtara ìhè nye ndị nile maara ya.

Ọtụtụ ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụworo na-achọta nkasi obi n’otu eziokwu Bible ahụ nke kasiri Castro obi. Ọtụtụ ndị nweworo oké ihe isi ike n’ihi ihe ndị ajọ mmadụ mere ha, na-ajụ, dị ka Job jụrụ, sị: “Gịnị mere ndị na-emebi iwu na-adị ndụ?” (Job 21:7) Mgbe ndị mmadụ gere ntị n’ezie n’ihe Chineke na-ekwu ná nzaghachi n’Okwu ya, ha na-amụta na ụzọ Chineke si eme ihe na-abụ n’ezie maka ọdịmma ha.—2 Pita 3:9.

Barbara, bụ́ onye a zụlitere na United States, ataghị ahụhụ n’onwe ya n’ihi ihe ndị agha na-akpata. Ma o tolitere n’ụwa nke agha jupụtara na ya. Akụkọ banyere oké ihe ọjọọ ndị agha na-akpata na-agba n’akwụkwọ akụkọ kwa ụbọchị. Mgbe ọ na-amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ, o juru ya anya ịmata banyere ihe ndị mere n’oge gara aga bụ́ ndị mere n’ụzọ ndị yiri ndị a na-apụghị ichetụ n’echiche. Gịnị kpatara ha? Chineke ọ̀ chọrọ ịma banyere ihe ndị nọ na-eme? O kweere na Chineke dị adị, ma o nwere mgbagwoju anya banyere ya.

Otú ọ dị, echiche Barbara banyere ndụ bịara jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee n’ihi mkpakọrịta nke ya na Ndịàmà Jehova. O gere ha ntị  ma soro ha mụọ Bible. Ọ gara nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọbụna ọ gara otu n’ime mgbakọ ukwu ha. Ọzọkwa, mgbe ọ jụrụ ajụjụ, ọ chọpụtara na ya adịghị enweta echiche dịgasị iche site n’aka Ndịàmà dị iche iche. Kama nke ahụ, Ndịàmà na-ekwu otu ihe n’ihi na echiche ha dabeere na Bible.

Ndịàmà gosiri ya ihe àmà dị na Bible nke na-egosi na ụwa nọ n’ike aka Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye na-achị ụwa, nakwa na ụwa na-egosipụta mmụọ ya. (Jọn 14:30; 2 Ndị Kọrint 4:4; Ndị Efesọs 2:1-3; 1 Jọn 5:19) Ha kọwara na e buru amụma na Bible banyere ihe omume ndị ahụ gbagwojuru Barbara anya. (Daniel, isi 2, 7, na nke 8) Chineke buru amụma banyere ha n’ihi na o nwere ikike ịhụ ihe ga-eme n’ọdịnihu mgbe ọ chọrọ ime otú ahụ. Ọ bụ Chineke mezuru ụfọdụ n’ime ihe omume ndị ahụ. Ndị ọzọ ka o kwere nnọọ ka ha mee. Ndịàmà gosiri Barbara na Bible bukwara amụma banyere ihe omume ndị dị mma na ndị na-adịghị mma maka oge anyị ma na-akọwa ihe ha pụtara. (Matiu 24:3-14) Ha gosiri ya nkwa Bible kwere banyere ụwa ọhụrụ bụ́ ebe ezi omume ga-ejupụta, ebe nhụjuanya na-agaghịzikwa adị.—2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.

Nke nta nke nta, Barbara malitere ịghọta na ọ bụ ezie na ọ bụghị Jehova Chineke na-akpata nhụjuanya nke ụmụ mmadụ, ọ dịghị egbochi ha site n’ịmanye ụmụ mmadụ irube isi n’iwu ya mgbe ha họọrọ ime ihe megidere nke ahụ. (Deuterọnọmi 30:19, 20) Chineke emewo ndokwa nke ga-eme ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ, ma ọ na-enye anyị ohere ugbu a igosipụta ma ànyị ga-ebi ndụ kwekọrọ n’ụzọ ezi omume ya. (Mkpughe 14:6, 7) Barbara kpebiri ịmụta ihe ndị Chineke chọrọ na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha. Ọ hụkwara ụdị ịhụnanya ahụ Jizọs kwuru na a ga-eji mara ezi ndị na-eso ụzọ ya n’etiti Ndịàmà Jehova.—Jọn 13:34, 35.

Gị onwe gị kwa pụrụ irite uru site ná ndokwa ahụ nyeere ya aka.

Ndụ nke Nwere Nzube

Ọbụna ndị yiri ka ihe ọ na-agara ha nke ọma ná ndụ pụrụ ịchọ azịza nye ajụjụ ndị na-agbagwoju ha anya. Dị ka ihe atụ, Matthew, bụ́ nwa okorobịa nọ na Britain, anọwo na-enwe ọchịchọ siri ike ịchọta ezi Chineke ahụ na nzube nke ndụ. Papa Matthew nwụrụ mgbe Matthew dị afọ 17. Mgbe nke ahụ gasịrị, Matthew nwetara akara ugo mmụta n’egwú na mahadum. Ọ bịaziri matakwuo nke ọma na ụzọ ndụ ya nke ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ ihe efu. Ọ hapụrụ ụlọ ije biri na London, mgbe o rukwara ebe ahụ, ọ malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịga egwú abalị, ịgụ kpakpando, ime mgbaasị, na ikpe okpukpe Buddha nke Zen na ịmụ nkà ihe ọmụma ndị ọzọ—ihe a nile bụ n’ihi na ọ na-achọ ụzọ ndụ na-eju afọ. N’enweghịzi olileanya, o tikuru Chineke mkpu ka o nyere ya aka ịchọta eziokwu ahụ.

Ụbọchị abụọ ka e mesịrị, Matthew zutere onye bụbu enyi ya ma kọọrọ ya nsogbu ya. Nwoke a esorowo Ndịàmà Jehova mụọ ihe. Mgbe e gosiri Matthew ihe dị na 2 Timoti 3:1-5, ọ tụrụ ya n’anya otú Bible si nnọọ kọwaa kpọmkwem ihe na-eme n’ụwa gbara anyị gburugburu. Mgbe ọ gụrụ banyere Ozizi Elu Ugwu ahụ, o metụrụ ya n’obi. (Matiu, isi 5-7) Na mbụ, ọ lara azụ n’ihi na ọ gụwo akwụkwọ ụfọdụ katọrọ Ndịàmà Jehova, ma n’ikpeazụ, o kpebiri ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nso.

Ihe Matthew nụrụ tọrọ ya ụtọ, ọ malitekwara iso otu okenye ọgbakọ na-amụ Bible. N’oge na-adịghị anya, ọ ghọtara na ihe ya na-amụ bụ ihe ya nọworo na-achọ, azịza nye ekpere o kpegabuuru Chineke. O ritere ọtụtụ uru ka ọ hapụrụ omume ndị na-adịghị atọ Jehova ụtọ. Ka ọ malitere ịtụ Chineke egwu n’ụzọ ziri ezi, a kpaliri ya ime ka ndụ ya kwekọọ n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu. Matthew mụtara na ụdị ndụ dị otú ahụ nwere ezi nzube.—Eklisiastis 12:13.

E bughị ụzọ kaa ya akaa na Matthew na ndị ọzọ a kpọtụrụ aha n’isiokwu a ga-achọta ụzọ ndụ na-eju afọ. Otú o sina dị, ha mụtara na Jehova Chineke nwere nzube ịhụnanya nke na-emetụta  ndị nile ji obi ụtọ họrọ irube isi n’iwu ya. (Ọrụ 10:34, 35) Nzube ahụ gụnyere ndụ ebighị ebi n’ime ụwa nke agha, ọrịa na agụụ—ọbụna ọnwụ—na-adịghị na ya. (Aịsaịa 2:4; 25:6-8; 33:24; Jọn 3:16) Nke ahụ ọ̀ bụ ihe ị na-achọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịmụtakwu banyere ụzọ e si achọta isi ihe na-eduga n’ibi ndụ na-eju afọ site n’ịga nzukọ ndị dabeere na Bible a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. E ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ime otú ahụ.

[Foto dị na peeji nke 7]

Jiri ezi obi kpegara Chineke ekpere, na-eji aha aka ya eme ihe

[Foto dị na peeji nke 7]

Soro ndị na-akụzi ihe dị na Bible n’ezie na-amụ Bible

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji 4]

Onye na-eme mkpagharị n’elu ugwu: Chad Ehlers/Index Stock Photography