Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebee Ka A Pụrụ Ịchọta Ezi Nkasi Obi?

Ebee Ka A Pụrụ Ịchọta Ezi Nkasi Obi?

 Ebee Ka A Pụrụ Ịchọta Ezi Nkasi Obi?

“Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst . . . na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị.”—2 NDỊ KỌRINT 1:3, 4.

1. Olee ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ndị mmadụ nwee mmetụta nke ịbụ ndị nkasi obi dị oké mkpa?

MMADỤ ịda ọrịa na-akwarụ ahụ́ pụrụ ime ka o chewe na ndụ ya agwụla. Ala ọma jijiji, oké ifufe, na ụnwụ nri na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ụkọ. Agha pụrụ igbu onye òtù ezinụlọ, bibie ebe obibi, ma ọ bụ manye ndị nwere ụlọ ịgbahapụ ihe onwunwe ha. Ikpe na-ezighị ezi pụrụ ime ka ndị mmadụ na-eche na ọ dịghị ebe ha pụrụ inweta ahụ́ efe. Ndị ọnọdụ ọjọọ ndị dị otú a metụtara nọ nnọọ ná mkpa nke nkasi obi. Ebee ka a pụrụ ịchọta ya?

2. N’ihi gịnị ka nkasi obi Jehova na-enye ji pụọ iche?

2 Mmadụ ụfọdụ na òtù dị iche iche na-agbalịsi ike inye nkasi obi. A na-enwe ekele maka okwu ọma. Ihe enyemaka nkịtị na-enye aka egbo mkpa ndị na-adịghị adịte aka. Ma, ọ bụ nanị Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ, pụrụ imezi ihe nile ahụ mebirinụ ma weta ụdị enyemaka a chọrọ iji mee ka ọdachi ndị dị otú ahụ ghara ime ọzọ ma ọlị. Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Ka ngọzi dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile, bụ́ onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị, ka anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi site ná nkasi obi ahụ nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Olee otú Jehova si akasi anyị obi?

Iru na Mkpọrọgwụ nke Nsogbu Ahụ

3. Olee otú nkasi obi Chineke na-enye si eru na mkpọrọgwụ nke nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ?

3 Ezinụlọ nile nke mmadụ ketara ezughị okè n’ihi mmehie Adam, nke ahụ na-akpatakwa ọtụtụ nsogbu ndị na-emesị duga n’ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Eziokwu ahụ bụ́ na Setan Ekwensu bụ “onye na-achị ụwa a” na-eme ka ọnọdụ ahụ dịkwuo njọ. (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) Jehova mere ihe karịrị nanị igosipụta mwute maka ọnọdụ ọjọọ ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya. O zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya dị ka ihe mgbapụta iji napụta anyị, Ọ gwakwara anyị na a pụrụ ime ka anyị nwere onwe anyị pụọ ná mmetụta nke mmehie Adam ma ọ bụrụ na anyị egosipụta okwukwe n’Ọkpara Ya. (Jọn 3:16; 1 Jọn 4:10) Chineke bukwara amụma na Jizọs Kraịst, bụ́ onye e nyeworo ikike nile n’eluigwe na n’ụwa, ga-ebibi Setan na ajọ usoro ihe ya dum.—Matiu 28:18; 1 Jọn 3:8; Mkpughe 6:2; 20:10.

4. (a) Gịnị ka Jehova nyeworo iji mee ka obi sikwuo anyị ike ná nkwa ndị o kwere ime ka e nwee ahụ́ efe? (b) Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịmata mgbe a ga-enwe ahụ́ efe?

4 Iji mee ka obi sikwuo anyị ike ná nkwa ya, Chineke edekọwo ọtụtụ ihe àmà na-egosi na ihe ọ bụla o buru n’amụma na-emezu. (Joshua 23:14) Ihe ndị o meworo iji napụta  ndị ohu ya mgbe ha nọ n’ọnọdụ yiri n’anya mmadụ ka a gaghị anapụtali ha na ya, so n’ihe ndị o dekọrọ na Bible. (Ọpụpụ 14:4-31; 2 Ndị Eze 18:13–19:37) Jehova sikwa n’aka Jizọs Kraịst gosipụta na nzube ya na-agụnye ịgwọ ndị mmadụ “ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla,” ọbụna ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. (Matiu 9:35; 11:3-6) Olee mgbe ihe a nile ga-ewere ọnọdụ? N’ịza ya, Bible kọwara otú ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe ochie a ga-adị, bụ́ nke ga-ebute eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke Chineke ụzọ. Nkọwa Jizọs nyere kwekọrọ n’oge anyị na-ebi na ya.—Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5.

Nkasi Obi Nye Ndị Nọ ná Nsogbu

5. Mgbe Jehova na-akasi Izrel oge ochie obi, na gịnị ka ọ dọọrọ uche ha gaa?

5 Site n’ụzọ Jehova si mesoo Izrel oge ochie ihe, anyị na-amata otú o si kasie ha obi n’oge ha nọ ná nsogbu. O chetaara ha ụdị Chineke ọ bụ. Nke a mere ka obi sikwuo ha ike ná nkwa ya. Jehova mere ka ndị amụma ya jiri ihe ndị a na-ahụ anya gosi ọdịiche dị n’etiti ya onwe ya dị ka ezi Chineke ahụ dị ndụ na arụsị, bụ́ ndị na-apụghị inyere ma onwe ha ma ndị na-efe ha aka. (Aịsaịa 41:10; 46:1; Jeremaịa 10:2-15) Mgbe Jehova si n’ọnụ Aịzaịa kwuo, sị, “Kasienụ, kasienụ ndị m obi,” ọ kpaliri onye amụma ya iji ihe O kere eke nye ihe atụ na nkọwa iji mesie ịdị ukwuu Jehova dị ka nanị ezi Chineke ahụ ike.—Aịsaịa 40:1-31.

6. Gịnị ka Jehova mere mgbe ụfọdụ iji gosi oge nnapụta ga-ewere ọnọdụ?

6 Mgbe mgbe, Jehova nyere nkasi obi site n’ikwu kpọmkwem oge, nke dị nso ma ọ bụ nke dị anya, a ga-anapụta ndị ya. Ka oge a ga-anapụta ha n’Ijipt nọ na-eru nso, ọ gwara ụmụ Izrel ahụ a na-emegbu emegbu, sị: “Otu ihe otiti fọdụrụ M ga-eme ka ọ bịa n’ahụ́ Fero na n’ahụ́ ndị Ijipt; e mesịa ọ ga-esi n’ebe a zipụ unu.” (Ọpụpụ 11:1) Mgbe mba atọ jikọrọ aka bịa ibuso Juda agha n’oge Eze Jehoshafat, Jehova gwara ha na ya ga-agbatara ha ọsọ enyemaka “echi.” (2 Ihe E Mere 20:1-4, 14-17) N’aka nke ọzọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 200 tupu o mee, Aịzaịa dekọrọ ihe banyere nnapụta a napụtara ha na Babilọn, Jeremaịa nyekwara nkọwa ndị ọzọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ tupu nnapụta ahụ ewere ọnọdụ. Lee ihe agbamume amụma ndị ahụ bụụrụ ndị ohu Chineke mgbe oge nnapụta ha ruru nso!—Aịsaịa 44:26–45:3; Jeremaịa 25:11-14.

7. Gịnị ka a na-agụnyekarị ná nkwa nke nnapụta, oleekwa otú nke a si metụta ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’Izrel?

7 Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na nkwa ndị kasiri ndị Chineke obi na-ekwukarị ihe banyere Mezaịa ahụ. (Aịsaịa 53:1-12) Site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, nke a na-eme ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-enwe olileanya ka ha na-eche ọtụtụ ọnwụnwa ihu. Na Luk 2:25, anyị  na-agụ, sị: “Lee! e nwere nwoke nọ na Jeruselem onye aha ya bụ Simiọn, nwoke a bụkwa onye ezi omume na onye na-asọpụrụ Chineke, onye na-echere ngụgụ obi Izrel [ma ọ bụ, nkasi obi; n’ezie, ọbịbịa nke Mezaịa ahụ], mmụọ nsọ dịkwa n’ahụ́ ya.” Simiọn maara olileanya a na-enwe banyere Mezaịa ahụ bụ́ nke e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, ịtụ anya mmezu ya kpụzikwara ndụ ya. Ọ ghọtaghị ụzọ ọ ga-esi mezuchaa, ya onwe ya anọghịkwa ndụ hụ mgbe e mezuru nkwa nzọpụta ahụ e buru n’amụma, ma ọ ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ matara Onye Chineke ‘ga-eji enye nzọpụta.’—Luk 2:30.

Nkasi Obi E Si n’Aka Kraịst Nye

8. Olee ọdịiche dị n’etiti aka Jizọs nyeere ndị mmadụ na ihe ọtụtụ chere na ọ bụ ihe dị ha mkpa?

8 Ka Jizọs Kraịst na-eje ozi elu ala ya, ọ bụghị mgbe nile ka o wetara ụdị enyemaka ndị mmadụ chere na ọ bụ ihe dị ha mkpa. Ụfọdụ tụrụ anya Mezaịa nke ga-eme ka ha nwere onwe ha pụọ na yok ndị Rom bụ́ nke ha kpọrọ asị. Ma Jizọs akwadoghị ịkwatu ọchịchị; ọ gwara ha ka ha ‘kwụghachi Siza ihe nke Siza.’ (Matiu 22:21) Nzube Chineke gụnyere ihe karịrị nnọọ ịnapụta ndị mmadụ pụọ n’ịbụ ndị ọchịchị ụfọdụ na-emegbu. Ndị ahụ chọrọ ime Jizọs eze, ma o kwuru na ya ga-enye “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28; Jọn 6:15) Oge erubeghị ka e chie ya eze, ọ bụkwa Jehova gaje ichi ya eze, ọ bụghị ìgwè mmadụ ahụ́ na-agbakasị.

9. (a) Olee ozi nkasi obi Jizọs kpọsara? (b) Olee otú Jizọs si gosipụta mkpa ozi ahụ dị nye ọnọdụ ndị mmadụ n’otu n’otu na-eche ihu? (ch) Gịnị ka ozi Jizọs nyere ihe ndabere maka ya?

9 Nkasi obi Jizọs nyere hiwere isi ‘n’ozi ọma banyere alaeze Chineke.’ Ihe a bụ ozi Jizọs kpọsara n’ebe ọ bụla ọ gara. (Luk 4:43) O mesiri ike mkpa ozi ahụ dị nye nsogbu ndị mmadụ na-enwe kwa ụbọchị site n’igosipụta ihe ya onwe ya dị ka Onye Ọchịchị bụ́ Mezaịa ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ. O mere ka ndị na-ata ahụhụ hụ ihe mere ha ga-eji dịrị ndụ site n’ime ka ndị ìsì hụ ụzọ nakwa ka ndị ogbi kwuo okwu (Matiu 12:22; Mak 10:51, 52), site n’ịgwọ ndị nwere nkwarụ n’aka na n’ụkwụ (Mak 2:3-12), site n’ịgwọ ndị Izrel ibe ya ọrịa ha ndị na-asọ oyi (Luk 5:12, 13), nakwa site n’ịgwọ ha ọrịa ndị ọzọ jọgburu onwe ha. (Mak 5:25-29) O mere ka ndị òtù ezinụlọ na-eru újú nwee ahụ́ efe dị ukwuu site n’ịkpọlite ụmụ ha n’ọnwụ. (Luk 7:11-15; 8:49-56) O gosipụtara ikike o nwere ịchịkwa oké ifufe ndị dị ize ndụ na inyeju oké ìgwè mmadụ afọ. (Mak 4:37-41; 8:2-9) Ọzọkwa, Jizọs kụziiri ha ụkpụrụ nke ibi ndụ bụ́ ndị pụrụ inyere ha aka iji nlezianya na-edozi nsogbu ndị ha na-enwe mgbe ahụ, ndị ga-emekwa ka ha na-atụsi anya ọchịchị ezi  omume nke Mezaịa ahụ ike. N’ihi ya, ka Jizọs nọ na-eje ozi ya, ọ bụghị nanị na ọ kasiri ndị ji okwukwe gee ya ntị obi kamakwa o nyere ihe ndabere maka ịgba ndị mmadụ ume ruo ihe dị ka puku afọ abụọ n’ihu.

10. Olee ihe àjà mgbapụta Jizọs mere ka o kwe omume?

10 Ihe karịrị afọ 60 mgbe Jizọs chụsịrị ndụ mmadụ ya n’àjà, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe, e nyere Jọn onyeozi ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ụmụntakịrị m, m na-edetara unu ihe ndị a ka unu wee ghara ime mmehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst, onye ezi omume. Ọ bụkwa àjà ime udo maka mmehie anyị, ma ọ bụghị nanị maka nke anyị kamakwa maka nke ụwa dum.” (1 Jọn 2:1, 2) N’ihi uru nke àjà mmadụ zuru okè nke Jizọs, anyị na-abụ ndị a kasiri obi nke ukwuu. Anyị maara na anyị pụrụ ịbụ ndị a gbaghaara mmehie ha, ndị nwere akọ na uche dị ọcha, ndị ha na Chineke dị ná mma, na ndị nwere atụmanya nke ndụ ebighị ebi.—Jọn 14:6; Ndị Rom 6:23; Ndị Hibru 9:24-28; 1 Pita 3:21.

Mmụọ Nsọ Dị Ka Ihe Nkasi Obi

11. Olee ndokwa ọzọ e mere maka nkasi obi nke Jizọs kwere nkwa ya tupu ọnwụ ya?

11 Ka Jizọs na ndịozi ya nọ n’abalị ikpeazụ ahụ tupu ọnwụ ịchụàjà ya, o kwuru banyere ndokwa ọzọkwa nke Nna ya nke eluigwe mere iji kasie ha obi. Jizọs kwuru, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka [ihe nkasi obi; Grik, pa·raʹkle·tos] ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ.” Jizọs mesiri ha obi ike, sị: “Ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ, . . . ga-akụziri unu ihe nile ma chetara unu ihe nile m gwara unu.” (Jọn 14:16, 17, 26) Olee otú mmụọ nsọ si kasie ha obi n’ezie?

12. Olee otú òkè mmụọ nsọ keere n’inyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka icheta ihe siworo nye aka n’ịkasi ọtụtụ ndị obi?

12 Jizọs akụziworo ndịozi ahụ ọtụtụ ihe. N’ezie, ha agaghị echezọ ahụmahụ ahụ, ma hà ga-echeta ihe ndị o kwuru n’ezie? Hà ga-echezọ ntụziaka ndị dị mkpa n’ihi ikike ncheta ha na-ezughị okè? Jizọs mesiri ha obi ike na mmụọ nsọ ‘ga-echetara ha ihe nile ọ gwaworo ha.’ N’ihi ya, ihe dị ka afọ asatọ mgbe Jizọs nwụsịrị, Matiu bịara nwee ike ide nke mbụ n’ime Oziọma ndị ahụ, bụ́ ebe o dekọrọ Ozizi Elu Ugwu na-akpali akpali nke Jizọs, ọtụtụ ihe atụ ndị o nyere banyere Alaeze ahụ, na nkọwa zuru ezu o nyere banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. Ihe karịrị afọ 50 mgbe e mesịrị, Jọn onyeozi bịara nwee ike ide akụkọ a pụrụ ịtụkwasị obi bụ́ nke ọ nọ na ya kọọ ọtụtụ ihe banyere ụbọchị ole na ole ndị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Lee ka ihe ndekọ ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ siworo bụrụ ihe na-enye agbamume ruo kpọmkwem n’oge anyị!

13. Olee otú mmụọ nsọ si rụọrọ Ndị Kraịst oge mbụ ọrụ dị ka ihe nduzi?

13 E wezụga ichetara ha ihe, mmụọ nsọ kụziiri ndị ahụ na-eso ụzọ ihe ma duzie ha ịghọtakwu nzube Chineke. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ka nọ, ọ kụziiri ha ihe ha na-aghọtaghị nke ọma n’oge ahụ. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, n’ịbụ ndị mmụọ nsọ kpaliri, Jọn, Pita, Jems, Jud, na Pọl dere banyere ihe ndị ọzọ merenụ ná nzube Chineke. N’ụzọ dị otú a, mmụọ nsọ rụrụ ọrụ dị ka ihe nduzi, na-emesi ha obi ike n’ụzọ bara uru na Chineke na-eduzi ha.

14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka mmụọ nsọ si nyere ndị Jehova aka?

14 Onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ nyekwara aka mee ka o doo anya na Chineke akwụsịla inwe ihu ọma n’ebe Izrel anụ ahụ́ nọ ma na-enwezi ya n’ebe ọgbakọ Ndị Kraịst nọ. (Ndị Hibru 2:4) Mkpụrụ mmụọ ahụ na-amị ná ndụ ndị mmadụ n’otu n’otu sokwa n’ihe dị mkpa e ji amata ndị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ezie. (Jọn 13:35; Ndị Galeshia 5:22-24) Mmụọ nsọ wusikwara ndị nọ n’ọgbakọ ahụ ike ịbụ ndị àmà nwere obi ike, ndị na-adịghịkwa atụ egwu.—Ọrụ 4:31.

 Aka E Nyere Mgbe A Nọ ná Nrụgide Gabigara Ókè

15. (a) Olee nrụgide Ndị Kraịst cheworo ihu n’oge gara aga na n’oge a? (b) N’ihi gịnị ka ndị na-enye agbamume pụrụ iji bụrụ ndị ọ dị mkpa ka e nye ya mgbe ụfọdụ?

15 Ndị nile raara onwe ha nye Jehova bụ́kwa ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya na-enweta mkpagbu n’ụzọ ụfọdụ. (2 Timoti 3:12) Otú ọ dị, ọtụtụ Ndị Kraịst enwetawo nrụgide kpụ ọkụ n’ọnụ gabiga ókè. N’oge a, ìgwè ndị iwe ji amajawo ụfọdụ ndị ma tụba ha n’ogige ịta ahụhụ, n’ụlọ mkpọrọ, na n’ogige ọrụ mmanye dị iche iche n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha. Gọọmenti dị iche iche jizi aka ha eweta mkpagbu, ma ọ bụkwanụ na-ekwe ka ndị na-emebi iwu na-akpa ike ha n’enwetaghị ntaramahụhụ. Ọzọkwa, Ndị Kraịst enwewo ajọ nsogbu ahụ́ ike ma ọ bụ nke ezinụlọ. Onye Kraịst tozuru okè nke na-enyere ọtụtụ ndị kwere ekwe ibe ya aka idozi nsogbu ndị tara akpụ pụkwara inwe nrụgide. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, onye na-enye agbamume pụkwara ịbụ onye ọ dị mkpa ka e nye ya.

16. Mgbe Devid nọ n’oké nrụgide, olee otú o si nweta enyemaka?

16 Mgbe Eze Sọl na-achụ Devid igbu ya, Devid chigharịkwuuru Chineke dị ka Onye Inyeaka ya: “Chineke, nụrụ ekpere m,” ka ọ rịọrọ. “Na ndo nke nkù Gị abụọ ka m ga-agbaba.” (Abụ Ọma 54:2, 4; 57:1) Devid ò nwetara enyemaka? Ee, o nwetara. N’oge ahụ, Jehova si n’ọnụ Gad onye amụma na onye nchụàjà bụ́ Abaịata nye Devid nduzi, O jikwa Jonatan nwa Sọl wusikwuo nwa okorobịa ahụ ike. (1 Samuel 22:1, 5; 23:9-13, 16-18) Jehova kwekwara ka ndị Filistia bịa busoo ala ahụ agha, si otú a mee ka Sọl kwụsị ịchụ Devid.—1 Samuel 23:27, 28.

17. Mgbe Jizọs nọ ná nrụgide kpụ ọkụ n’ọnụ, ebee ka ọ gara maka enyemaka?

17 Jizọs Kraịst n’onwe ya nọ ná nrụgide kpụ ọkụ n’ọnụ ka ndụ elu ala ya na-eru ọgwụgwụ ya. Ọ maara nke ọma otú omume ya pụrụ isi metụta aha Nna ya nke eluigwe nakwa ihe ọ pụrụ ịpụtara ọdịnihu nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. O kpesiri ekpere ike, ọbụna ‘malite inwe obi erughị ala.’ Chineke hụrụ na Jizọs nwetara nkwado dị ya mkpa n’oge ahụ ihe siiri ya ike.—Luk 22:41-44.

18. Olee nkasi obi Chineke nyere Ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị a kpagburu n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ?

18 Mkpagbu a kpagburu Ndị Kraịst mgbe e guzobesịrị ọgbakọ narị afọ mbụ ahụ kpụ nnọọ ọkụ n’ọnụ nke na mmadụ nile ma e wezụga ndịozi ahụ si na Jeruselem gbapụ. E  si n’ebe obibi ha dọkpụpụta ndị ikom na ndị inyom n’ụzọ nkịtị. Olee nkasi obi Chineke nyere ha? Ọ bụ mmesi obi ike dị n’Okwu ya nke bụ́ na ha nwere “ihe onwunwe ka mma na nke na-adịgide adịgide,” bụ́ ihe nketa na-adịghị agha agha nke ha ga-eso Kraịst keta n’eluigwe. (Ndị Hibru 10:34; Ndị Efesọs 1:18-20) Ka ha nọgidere na-eme nkwusa, ha hụrụ ihe àmà na-egosi na mmụọ Chineke dịnyeere ha, ahụmahụ ha mekwara ka ha nwekwuo ihe mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ.—Matiu 5:11, 12; Ọrụ 8:1-40.

19. Ọ bụ ezie na Pọl nwetara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, olee otú nkasi obi Chineke na-enye dị ya?

19 Ka oge na-aga, Sọl (Pọl), onye bụ́kwa onye mkpagbu dị obi ọjọọ, ghọkwara onye a kpagburu n’ihi na ọ ghọrọ Onye Kraịst. N’àgwàetiti Saịprọs, e nwere dibịa afa nke nwara iji wayo na aghụghọ gbochie ozi Pọl. Na Galeshia, a tụrụ Pọl nkume ma hapụ ya mgbe e chere na ọ nwụọla. (Ọrụ 13:8-10; 14:19) Na Masedonia, e ji ígwè tie ya ihe. (Ọrụ 16:22, 23) Mgbe ìgwè ndị iwe ji wakposịrị ya n’ike n’Efesọs, o dere, sị: “Anyị nọ n’oké nrụgide nke karịrị ike anyị, nke mere na anyị ejighị ọbụna ndụ anyị n’aka ma ọlị. N’eziokwu, anyị chere n’ime onwe anyị na a mawo anyị ikpe ọnwụ.” (2 Ndị Kọrint 1:8, 9) Ma n’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pọl dere okwu nkasi obi ahụ e hotara na paragraf nke 2 nke isiokwu a.—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

20. Gịnị ka anyị gaje ịtụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Olee otú ị pụrụ isi kere òkè n’inye nkasi obi dị otú ahụ? E nwere ọtụtụ ndị n’oge anyị a bụ́ ndị ọ dị mkpa mgbe ha na-eru újú, ma ọ́ bụghị n’ihi ọdachi nke dakwasịrị ọtụtụ puku mmadụ ọ bụrụ n’ihi mkpagbu nke nanị ha na-enwe. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú e si enye nkasi obi na nke ọ bụla n’ime ọnọdụ abụọ ahụ.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka nkasi obi Chineke na-enye ji bụrụ nke kasị baa uru?

• Olee nkasi obi e si n’aka Kraịst na-enye?

• Olee otú mmụọ nsọ siworo bụrụ ihe nkasi obi?

• Nye ihe atụ nke nkasi obi Chineke nyere mgbe ndị ohu ya nọ ná nrụgide kpụ ọkụ n’ọnụ.

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Bible na-egosi anyị na Jehova wetara nkasi obi site n’ịnapụta ndị ya

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Jizọs wetara nkasi obi site n’izi ihe, site n’ịgwọ ọrịa, na site n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ

[Foto dị na peeji nke 18]

Jizọs nwetara enyemaka site n’elu