Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ dị mkpa imikpu mmadụ kpam kpam n’ime mmiri ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka e mee ya baptizim ma ya abụrụ na o nwere nkwarụ dị oké njọ ma ọ bụ bụrụ onye ahụ́ na-adịtụghị, bụ́ nke ga-eme ka o sie ike imikpu ya n’ime mmiri?

E si na ngwaa Grik bụ́ baʹpto, nke pụtara imikpu nweta okwu bụ́ “ime baptizim.” Na Bible, “ime baptizim” na “imikpu n’ime mmiri” bụ otu ihe ahụ. Banyere baptizim Filip mere ọnaozi Etiopia, The Emphasised Bible, nke Rotherham dere, na-ekwu, sị: “Ha abụọ banyere n’ime mmiri ahụ, ma Filip ma ọnaozi ahụ,—o mikpukwara ya n’ime mmiri.” (Ọrụ 8:38) N’ihi ya, a na-emikpu onye a na-eme baptizim n’ime mmiri n’ezie.—Matiu 3:16; Mak 1:10.

Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim.” (Matiu 28:19, 20) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Ndịàmà Jehova na-adị eme ndokwa ịnọ n’ọdọ mmiri, osimiri, ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ e nwere mmiri ga-ezu maka imikpu mmadụ kpam kpam, eme baptizim. Ebe ime baptizim site n’imikpu n’ime mmiri bụ ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ, ụmụ mmadụ enweghị ikike ọ bụla ịhapụ ime mmadụ baptizim. N’ihi ya, e kwesịrị ime mmadụ baptizim ọbụna mgbe ọ dị mkpa ime ihe ndị a na-adịghị emekebe n’ihi ọnọdụ ya. Dị ka ihe atụ, ime baptizim ná nnukwu ọ́kwá ịsa ahụ́ abụrụwo ihe enyemaka nye ndị meworo agadi ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa. A pụrụ ime ka mmiri dị n’ọ́kwá ịsa ahụ́ ahụ dịtụ ọkụ, a pụrụ iji nwayọọ kuba onye ahụ a na-aga ime baptizim n’ime mmiri ahụ, ozugbo ahụ́ ya nabatakwara ya, a pụrụ ime ya nke bụ́ baptizim.

Ọbụna e mewo ndị nwere nkwarụ dị oké njọ baptizim. Dị ka ihe atụ, ndị a wara ahụ́ n’akwara ha si eku ume, n’ihi ya kwa, bụrụ ndị nwere oghere na-adịgide adịgide n’olu ha, ma ọ bụ ndị ọ dị mkpa ịkwụnye ígwè e ji eku ume n’ahụ́ ha, abụwo ndị e mikpuru n’ime mmiri. N’ezie, ọ ga-adị mkpa ime nkwadebe zuru ezu maka baptizim nile dị otú ahụ. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya onye nọọsụ a zụrụ nke ọma ma ọ bụ dọkịta ịnọ ya. Otú ọ dị, mgbe e nyere nlekọta ma ọ bụ kpachapụ anya n’ụzọ pụrụ iche, a pụrụ ime mmadụ baptizim n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnọdụ nile. Ya mere, e kwesịrị ime mgbalị nile ezi uche dị na ya iji mee mmadụ baptizim n’ime mmiri ma ọ bụrụ na nke a bụ ezi ọchịchọ onye ahụ nakwa ma ọ bụrụ na ọ chọrọ iburu ihe ize ndụ dị na ya.