Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Echiche Gị Banyere Ọnwụ?

Gịnị Bụ Echiche Gị Banyere Ọnwụ?

 Gịnị Bụ Echiche Gị Banyere Ọnwụ?

ỌNWỤ na-esogharị anyị n’azụ ka anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị, n’agbanyeghị otú ahụ́ si gbasie anyị ike ma ọ bụ otú anyị baruru n’ọgaranya. Ọ pụrụ igbu anyị n’oge ọzọ anyị gafere n’okporo ámá ma ọ bụ dinara n’ihe ndina. Ọdachi ndị dị ka mwakpo ahụ ndị na-eyi ọha egwu mere na September 11, 2001, na New York City nakwa na Washington, D.C., na-eme ka anyị ghọtakwuo eziokwu ahụ bụ́ na “onye iro ikpeazụ,” bụ́ ọnwụ, na-egbu ndị na-arụ ụdị ọrụ nile nakwa ndị nọ n’afọ ndụ nile, mgbe ụfọdụ na-egbu ọtụtụ puku mmadụ n’ime minit ole na ole.—1 Ndị Kọrint 15:26.

N’agbanyeghị nke ahụ, o yiri ka ọnwụ ọ na-akpali mmasị ndị mmadụ. Ọ dịghị ihe yiri ka ọ ga-eme ka e repụ akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ mee ka ọtụtụ mmadụ kiriwe telivishọn karịa akụkọ banyere ọnwụ, karịsịa ọnwụ nke ìgwè mmadụ bụ́ ndị nwụrụ n’ọnọdụ ndị na-eyi egwu. O yiri ka akụkọ ya adịghị agwụ ndị mmadụ ike, ọ sọkwa ya ya bụrụ ọnwụ nke agha, ọdachi ndị na-emere onwe ha, mpụ, ma ọ bụ ọrịa kpatara. Ndị mmadụ na-egosipụta ụra a ọnwụ na-echu ha n’ụzọ kasị atụ n’anya site n’oké mmetụta ha na-egosipụta mgbe ndị a maara aha ha nwụrụ.

Ihe a nile bụ ihe a na-apụghị ịgbagha agbagha. Ọnwụ—ọnwụ nke ndị ọzọ—anọgidewo na-akpali mmasị ndị mmadụ. Otú ọ dị, mgbe ha chere ọnwụ nke ha ihu, egwu ejichie ha. Ọnwụ nke anyị bụ isiokwu ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-achọghị ichetụ n’echiche.

Ọnwụ Ọ̀ Na-eju Gị Anya?

Anyị ichetụ n’echiche na anyị ga-anwụ adịghị mgbe ọ na-atọ anyị ụtọ, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-atọ anyị ụtọ. Gịnị mere o ji dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Chineke ekenyewo anyị ọchịchọ siri ike nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. “Mgbe ebighị ebi ka O tinyeworo n’obi ha,” ka Eklisiastis 3:11 na-ekwu. Ya mere, mgbanahụ a na-apụghị ịgbanahụ ọnwụ emewo ka ụmụ mmadụ na-enwe oké nchegbu na obi nkoropụ na-adịghị akwụsị akwụsị. Iji mee ka oké nchegbu a kwụsị na iji mejuo ọchịchọ ha bu pụta ụwa nke ịnọgide na-adị ndụ, ụmụ mmadụ echepụtawo nkwenkwe dịgasị iche iche, site n’ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi ruo na nkwenkwe ịlọ ụwa.

Ka o sina dị, ọnwụ bụ ihe na-eyi egwu, egwu ọnwụ zukwara ebe nile. Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na ọha mmadụ n’ozuzu ha hụrụ ọnwụ dị ka atụmanya na-eme ka ike gwụ mmadụ. Otu ihe bụ na ọnwụ na-ekpughe oké ihe efu dị ná ndụ e mikpuru n’ịchụ akụ̀ na ụba na ikike.

Ọnwụ Ò Kewapụrụ Gị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ?

N’oge ndị gara aga, a na-ekwekarị ka onye na-arịa ọrịa ga-egbu ya ma ọ bụ onye merụrụ ahụ́ n’ụzọ dị oké njọ nwụọ n’ebe obibi ya bụ́ ebe ọ  maara nke ọma ma nwee mmasị na ya. Otú ahụ ka a na-emekarị n’oge Bible, a ka na-emekwa otú ahụ n’ebe ụfọdụ. (Jenesis 49:1, 2, 33) N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ezinụlọ na-ezukọ ọnụ, ụmụaka na-esonyekwa ná mkparịta ụka. Nke a na-eme ka onye nke ọ bụla so n’ezinụlọ ahụ nwee mmetụta na ọ bụghị nanị ya na-eru újú, ọ na-emekwa ka obi ruo ya ala na ọ bụghị nanị ya bu ibu ahụ nakwa na ọ bụghị nanị ya ka mmadụ nwụnahụrụ.

Nke a dị nnọọ iche n’ihe na-eme n’ọha mmadụ ebe ikwurịta banyere ọnwụ bụ ihe a na-asọ nsọ, ebe e weere ya dị ka ihe na-eyi egwu, na ebe a na-adịghị ekwe ka ụmụaka soro na-ekwu ya n’ebumnobi na ha “agaghị ebuli” ihe dị na ya. Otú e si anwụ n’oge a dị iche n’ọtụtụ ụzọ, mmadụ na-anọkarịkwa nanị ya wee na-anwụ. Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ga-enwe mmasị ịnwụ n’ebe obibi ha, bụrụ ndị ezinụlọ ha ji udo na ịhụnanya lekọta, ihe ọjọọ na-adakwasị ọtụtụ ndị bụ na ha na-anwụ n’ụlọ ọgwụ, nanị ha na-anọkarị ka ha na-enwe ihe mgbu, bụrụ ndị a kwụnyejuru ọkpọka ígwè ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị na-eyi egwu n’ahụ́. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ n’ụzọ a na-amaghị—ndị a na-amaghị ihu ha bụ́ ndị mgbukpọ agbụrụ, ụnwụ nri, ọrịa AIDS, agha obodo, ma ọ bụ ogbenye ọnụ ntụ riri isi ha.

Okwu A Ga-echebara Echiche

Bible adịghị emegide iche banyere ọnwụ. N’ezie, Eklisiastis 7:2 na-agwa anyị, sị: “Ọ dị mma ije n’ụlọ oruru újú, karịa ije n’ụlọ ọṅụṅụ mmanya vaịn: n’ihi na nke ahụ bụ nsọtụ mmadụ nile.” Mgbe ọnwụ gburu mmadụ, anyị pụrụ iwepụ ihe ndị na-echegbukarị anyị n’obi ma ọ bụ ghara ime ihe omume ndị anyị na-emekarị ma lekwasị anya n’ịdị mkpụmkpụ nke ndụ. Nke a pụrụ inyere anyị aka ibi ndụ anyị n’ụzọ ka nwee nzube kama ịdị na-ebi ya nnọọ n’ụzọ na-enweghị nzube ma ọ bụ ịdị na-ala ya n’iyi.

Gịnị bụ echiche gị banyere ọnwụ? Ì nyochawo mmetụta, nkwenkwe, olileanya, na egwu i nwere banyere ọgwụgwụ nke ndụ gị?

Dị ka ọ dị n’ihe banyere ndụ, ọnwụ karịrị ike mmadụ ịkọwa na ịghọta. Nanị onye pụrụ itinye ọnụ n’okwu a n’ụzọ a pụrụ ịdabere na ya bụ Onye Okike anyị. N’ebe ọ nọ ka “isi iyi ndụ” dị, ọ bụkwa ya “nwe ụzọ nile isi n’ọnwụ pụọ.” (Abụ Ọma 36:9; 68:20) Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ihe na-eju anya, iji Okwu Chineke nyochaa nkwenkwe ụfọdụ a ma ama banyere ọnwụ ga-abụ ma ihe na-akasi obi ma ihe na-enye ume ọhụrụ. Ọ ga-ekpughe na ọnwụ abụchaghị nsọtụ nke ihe nile.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Eziokwu ahụ bụ́ na anyị pụrụ ịnwụ na-enyere anyị aka ibi ndụ anyị n’ụzọ ka nwee nzube