Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ

Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ

 Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ

“Onye na-agbaso ezi omume na ebere na-achọta ndụ, na ezi omume, na nsọpụrụ.”—ILU 21:21.

1. Ụzọ ndị dị aṅaa nke ndị mmadụ taa kpataworo ọdachi?

“ỤZỌ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.” (Ilu 16:25) Lee ka ilu Bible a si kọwaa ụzọ nke ọtụtụ ndị mmadụ taa n’ụzọ ziri nnọọ ezi! N’ozuzu, ndị mmadụ na-enwe mmasị nanị n’ime ihe ziri ezi n’anya onwe ha, na-eleghara ọbụna mkpa ndị bụ́ isi nke ndị ọzọ anya. (Ilu 21:2) Ha na-ekwu nanị n’ọnụ na ha na-akwanyere iwu na ụkpụrụ nke mba ha ùgwù ma ha na-achọ ụzọ isi zere ha n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Ihe ọ rụpụtaworo bụ ọha mmadụ kewasịrị ekewasị na nke nọ ná mgbagwoju anya.—2 Timoti 3:1-5.

2. Gịnị ka a chọrọ ngwa ngwa maka ọdịmma nke ihe a kpọrọ mmadụ?

2 Maka ọdịmma anyị—nakwa maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ezinụlọ nile nke mmadụ—anyị chọrọ iwu ma ọ bụ ụkpụrụ ziri ezi ngwa ngwa, bụ́ nke mmadụ nile ga-adị njikere ịnakwere na irubere isi. N’ụzọ doro anya, ọ dịghị iwu ma ọ bụ ụkpụrụ nke mmadụ ọ bụla tụpụtara, n’agbanyeghị ókè onye ahụ nweruru ọgụgụ isi ma ọ bụ ezi obi, nke pụrụ igbo mkpa ahụ. (Jeremaịa 10:23; Ndị Rom 3:10, 23) Ọ bụrụ na ụkpụrụ dị otú ahụ dị, ebee ka a pụrụ ịhụ ya, gịnịkwa ka ọ ga-adị ka ya? Ikekwe, ajụjụ ka mkpa bụ, Ọ bụrụ na ụkpụrụ dị otú ahụ dị, ọ̀ ga-atọ gị ụtọ, ị̀ ga-erubekwara ya isi?

Ịchọta Ụkpụrụ Ziri Ezi

3. Ònye kasị ruo eruo inye ụkpụrụ mmadụ nile pụrụ ịnakwere na nke ga-abara ha uru, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

3 Iji chọta ụkpụrụ nke mmadụ nile pụrụ ịnakwere nakwa nke ga-abara ha uru, anyị aghaghị ijekwuru onye agbụrụ, ọdịbendị, na ọchịchị na-adịghị emetụta mkpebi ya nakwa onye elepụlighị anya n’ihu na adịghị ike nke mmadụ na-adịghị egbochi ime ihe. Obi abụọ adịghị ya na onye nanị ya ruru eru bụ Onye Okike pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova Chineke, bụ́ onye kwuru, sị: “Dị ka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otú a ka ụzọ m nile dị elu karịa ụzọ nile unu, ọ bụkwa otú a ka echiche m nile dị elu karịa  echiche nile unu.” (Aịsaịa 55:9) Ọzọkwa, Bible na-akọwa Jehova dị ka “Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) N’akụkụ nile nke Bible, anyị na-achọta okwu bụ́ “Jehova bụ onye ezi omume” ma ọ bụ “onye ezi omume ka Jehova bụ.” (Ọpụpụ 9:27; 2 Ihe E Mere 12:6; Abụ Ọma 11:7; 129:4; 145:17; Abụ Ákwá 1:18) Ee, anyị pụrụ ilegara Jehova anya maka ụkpụrụ kasị elu n’ihi na o kwesịrị ntụkwasị obi, zie ezie, ma bụrụ onye ezi omume.

4. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ezi omume” pụtara?

4 N’ezie, taa, ọ bụghị mmadụ nile nwere mmasị n’okwu ahụ bụ́ “ezi omume.” N’ezie, ọtụtụ ndị nwere echiche na-ezighị ezi, ọbụna nke nlelị banyere ya, na-eji ya atụnyere mmadụ ime ka ọ bụ onye ezi omume karịa ndị ọzọ, ma ọ bụ mmadụ iji ihu abụọ eme nsọ nsọ. Otú ọ dị, echiche Bible banyere ezi omume na-agụnye echiche nke ikpe ikpe ziri ezi, izi ezi, ime omume ọma, ịbụ onye ikpe na-amaghị, emeghị mmehie, ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ nke iwu Chineke ma ọ bụ ụkpụrụ omume nke a na-anakwere, ime ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụ n’ụzọ ziri ezi. Ọ̀ bụ na iwu ma ọ bụ ụkpụrụ nke nwere àgwà ọma ndị dị otú a agaghị atọ gị ụtọ?

5. Kọwaa otú ezi omume dị, dị ka e gosiri ya na Bible.

5 Banyere otú ezi omume dị, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-ekwu, sị: “Ezi omume abụghị echiche a na-ekwupụta nanị n’ọnụ kama ọ dabeere n’ezie n’ime ihe ziri ezi ma kwesị ekwesị ná mmekọrịta nile.” Dị ka ihe atụ, ezi omume Chineke abụghị nanị àgwà dị n’ime ma ọ bụ nke o nwere n’onwe ya, dị ka ịdị nsọ na ịdị ọcha ya. Kama nke ahụ, ọ bụ ngosipụta nke ọdịdị ya n’ụzọ ndị kwesịrị ekwesị ma zie ezie. A pụrụ ikwu na n’ihi na Jehova dị nsọ ma dị ọcha, ihe nile ọ na-eme na ihe nile na-esite n’ebe ọ nọ ziri ezi. Dị ka Bible na-ekwu, “Onye ezi omume ka Jehova bụ n’ụzọ Ya nile, Ọ dịkwa ebere n’ọrụ Ya nile.”—Abụ Ọma 145:17.

6. Gịnị ka Pọl kwuru banyere ụfọdụ ndị Juu na-ekweghị ekwe n’oge ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Pọl onyeozi mesiri isi ihe a ike n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom. Banyere ụfọdụ ndị Juu na-ekweghị ekwe, o dere, sị: “Ebe ha na-amaghị ezi omume nke Chineke kama na-achọ ime ka nke ha guzosie ike, ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume nke Chineke.” (Ndị Rom 10:3) Gịnị mere Pọl ji zoo aka n’ebe ndị dị otú ahụ nọ dị ka ndị “na-amaghị ezi omume nke Chineke”? Ọ̀ bụ na e zighị ha ihe n’Iwu ahụ, bụ́ ụkpụrụ ezi omume nke Chineke? N’ezie, e ziri ha. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha lere ezi omume anya nanị dị ka omume ọma onwe onye, bụ́ nke a ga-eme site n’iji nlezianya na ịdị uchu na-edebezu ụkpụrụ nduzi okpukpe nile, kama ile ya anya dị ka ụkpụrụ ga na-eduzi ha ná mmekọrịta ha na ụmụ mmadụ ibe ha. Dị ka ndị ndú okpukpe nke oge Jizọs, ha aghọtatụdịghị ihe ikpe ziri ezi na ezi omume pụtara.—Matiu 23:23-28.

7. Olee otú Jehova si egosipụta ezi omume ya?

7 N’ụzọ dị nnọọ iche, Jehova na-egosipụta ezi omume ya n’ihe nile ọ na-eme, a na-ahụkwa ya nke ọma. Ọ bụ ezie na ezi omume ya chọrọ ka ọ ghara nnọọ ileghara mmehie nke ndị ma ụma na-eme mmehie anya, nke ahụ adịghị eme ka ọ bụrụ Chineke na-enweghị mmetụta nke na-achọ oké ihe, onye a ga na-atụ ụjọ na onye a na-adịghị abịaru nso. N’ụzọ dị iche, ihe ndị ziri ezi ọ na-eme emewo ka ihe a kpọrọ mmadụ nwee ihe ha pụrụ ịdabere na ya bịakwute ya ma bụrụ ndị a zọpụtara site n’ajọ ihe ndị na-esi ná mmehie apụta. N’ihi ya, ọ dabara nnọọ adaba na a kọwara Jehova dị ka “Chineke Nke na-eme ezi omume na onye nzọpụta.”—Aịsaịa 45:21.

Ezi Omume na Nzọpụta

8, 9. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Iwu ahụ si gosipụta ezi omume Chineke?

8 Iji ghọta njikọ dị n’etiti ezi omume Chineke na ọrụ nzọpụta o ji ịhụnanya arụ, tụlee Iwu ahụ o nyere mba Izrel site n’aka Mozis. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Iwu ahụ ziri ezi. N’okwu ikpeazụ ya, Mozis chetaara ụmụ Izrel, sị: “Olee mba ukwu dịkwa, nke nwere ụkpụrụ na ikpe ziri ezi dị ka iwu a nile, nke Mụ onwe m na-etinye  n’ihu unu taa?” (Deuterọnọmi 4:8) Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Eze Devid nke Izrel kwuru, sị: “Ikpe nile nke Jehova bụ eziokwu, ha nile ziri ezi n’otu.”—Abụ Ọma 19:9.

9 Site n’Iwu ahụ, Jehova mere ka ụkpụrụ ya banyere ezi ihe na ihe ọjọọ doo anya. Iwu ahụ kwuru hoo haa na n’ụzọ zuru nnọọ ezu otú ụmụ Izrel ga-esi na-akpa àgwà, ọ bụghị nanị n’ihe banyere okpukpe kamakwa, n’ihe banyere mmekọrịta azụmahịa, nke alụmdi na nwunye, ihe oriri, ịdị ọcha, na ọbụna ikpe ikpe. Iwu ahụ kwukwara ntaramahụhụ siri ike a ga-enye ndị dara ya, ọbụna na-ekwupụta amamikpe ọnwụ n’ọnọdụ ụfọdụ. * Ma, ihe ndị ziri ezi nke Chineke chọrọ n’aka ndị ahụ, dị ka e depụtara ha n’Iwu ahụ, hà bụ ibu dị arọ ma na-agwụ ike, na-anapụ ha nnwere onwe na ọṅụ, dị ka ọtụtụ ndị taa na-ekwu?

10. Olee otú iwu Jehova na-adị ndị hụrụ Ya n’anya?

10 Iwu ezi omume Jehova tọrọ ndị hụrụ Ya n’anya ụtọ nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, ọ bụghị nanị na Eze Devid kwenyere na ihe ndị Jehova kpere n’ikpe bụ eziokwu ma zie ezie, dị ka anyị hụworo, kamakwa o nwere mmasị na ekele sitere n’obi maka ha. Banyere iwu na ikpe Jehova, o dere, sị: “Ihe a na-achọsi ike ka ha bụ, karịa ọlaedo, ee, karịa ọtụtụ ọlaedo a nụchara anụcha: ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, bụ́ nke si n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ na-atasị. Ọzọ, e ji ha dọọ ohu Gị aka ná ntị: n’idebe ha ka ọkpụkpụ ọrụ hiri nne na-apụta.”—Abụ Ọma 19:7, 10, 11.

11. Olee otú Iwu ahụ si bụrụ ‘onye nduzi nke na-eduga na Kraịst’?

11 Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Pọl mere ka ọbụna abamuru ka ukwuu nke Iwu ahụ pụta ìhè. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Galeshia, o dere, sị: “Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduga na Kraịst, ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe.” (Ndị Galeshia 3:24) N’oge Pọl, onye nduzi (onye nkụzi, Kingdom Interlinear) bụ ohu e nwere n’ezinụlọ buru ibu. Ọ bụ ọrụ dịịrị ya ichebe ụmụaka na iduga ha n’ụlọ akwụkwọ. N’otu aka ahụ, Iwu ahụ chebere ụmụ Izrel pụọ n’omume na ihe omume okpukpe ndị rụrụ arụ nke mba ndị gbara ha gburugburu na-eme. (Deuterọnọmi 18:9-13; Ndị Galeshia 3:23) Tụkwasị na nke ahụ, Iwu ahụ mere ka ụmụ Izrel mara ọnọdụ mmehie ha na mkpa mgbaghara na nzọpụta dị ha. (Ndị Galeshia 3:19) Ndokwa e mere maka ịchụ àjà gosipụtara mkpa àjà mgbapụta dị ma nye ihe atụ amụma bụ́ nke a ga-esi na ya mata ezi Mezaịa ahụ. (Ndị Hibru 10:1, 11, 12) Ya mere, ọ bụ ezie na Jehova gosipụtara ezi omume ya site n’Iwu ahụ, o bu ọdịmma na nzọpụta ebighị ebi nke ndị ahụ n’uche wee mee ya.

Ndị Chineke Gụrụ ná Ndị Ezi Omume

12. Gịnị ka ụmụ Izrel gaara enweta site n’iji nlezianya na-edebe Iwu ahụ?

12 Ebe ọ bụ na Iwu ahụ Jehova nyere ziri ezi n’ụzọ nile, ụmụ Izrel gaara enwe ezi nguzo n’ihu Chineke site n’irube isi na ya. Mozis chetaara ụmụ Izrel mgbe ọ fọrọ nke nta ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ, sị: “Ezi omume ka ọ ga-abụkwara anyị, mgbe anyị ga-elezi anya ime ihe a nile e nyere n’iwu n’ihu  Jehova, bụ́ Chineke anyị, dị ka O nyere anyị iwu.” (Deuterọnọmi 6:25) Tụkwasị na nke ahụ, Jehova ekwewo nkwa, sị: “Unu ga-edebekwa ụkpụrụ m nile na ikpe m nile: nke mmadụ ga-eme, dị ndụ n’ime ha: Mụ onwe m bụ Jehova.”—Levitikọs 18:5; Ndị Rom 10:5.

13. Jehova ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi n’ịchọ ka ndị ya debe Iwu ahụ ziri ezi? Kọwaa.

13 N’ụzọ dị mwute, dị ka otu mba, ụmụ Izrel ‘emeghị ihe a nile e nyere n’iwu n’ihu Jehova,’ n’ihi ya kwa, ha enwetaghị ngọzi ndị ahụ e kwere ná nkwa. Ha edebelighị ihe nile Chineke nyere n’iwu n’ihi na Iwu Chineke zuru okè ma ha ezughị okè. Nke a ọ̀ pụtara na Chineke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ bụrụ onye ajọ omume? Ọ dịghị ma ọlị. Pọl dere, sị: “Gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Tụfịakwa!” (Ndị Rom 9:14) Nke bụ́ eziokwu bụ na, tupu e nye Iwu ahụ nakwa mgbe e nyesịrị ya, Chineke agụwo mmadụ dị iche iche ná ndị ezi omume n’agbanyeghị na ha bụ ndị na-ezughị okè na ndị mmehie. Ndị dị otú ahụ na-atụ egwu Chineke na-agụnye Noa, Ebreham, Job, Rehab, na Daniel. (Jenesis 7:1; 15:6; Job 1:1; Ezikiel 14:14; Jems 2:25) Mgbe ahụ, ajụjụ bụ: Na gịnị ka Chineke dabeere wee gụọ ndị a ná ndị ezi omume?

14. Gịnị ka Bible bu n’uche mgbe ọ na-ekwu na mmadụ bụ “onye ezi omume”?

14 Mgbe Bible na-ekwu na mmadụ bụ “onye ezi omume,” ọ pụtaghị na onye ahụ adịghị eme mmehie ma ọ bụ na o zuru okè. Kama nke ahụ, ọ pụtara mmadụ ịrụ ọrụ dịịrị ya n’ihu Chineke na n’ihu mmadụ. Dị ka ihe atụ, a kpọrọ Noa “onye ezi omume” na onye “[na-enweghị ntụpọ, NW] n’ọgbọ ya nile” n’ihi na ‘o mere dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.’ (Jenesis 6:9, 22; Malakaị 3:18) Zekaraịa na Elizabet, bụ́ ndị mụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim, “bụ ndị ezi omume n’ihu Chineke n’ihi ije ije n’ụzọ na-enweghị ụta n’ikwekọ n’ihe nile Jehova nyere n’iwu na ihe ndị ọ chọrọ n’iwu.” (Luk 1:6) A kọwakwara otu onye na-abụghị onye Izrel, bụ́ onyeisi ndị agha nke mba Ịtali onye aha ya bụ́ Kọniliọs, dị ka “nwoke ezi omume nke na-atụkwa egwu Chineke.”—Ọrụ 10:22.

15. Gịnị ka e jikọrọ ya na ezi omume n’ụzọ chiri anya?

15 Ọzọkwa, mmadụ ịbụ onye ezi omume nwere nnọọ ihe jikọrọ ya na ihe dị onye ahụ n’obi—okwukwe nakwa ekele na ịhụnanya onye ahụ nwere n’ebe Jehova nọ nakwa ná nkwa ya dị iche iche—ọ bụghịkwa nanị n’onye ahụ ime ihe Chineke na-achọ. Akwụkwọ Nsọ na-asị na Ebreham “kwere na Jehova; O wee gụọ ya nye ya n’ezi omume.” (Jenesis 15:6) Ọ bụghị nanị na Ebreham kweere na Chineke dị  adị kamakwa o kweere ná nkwa ya banyere “mkpụrụ” ahụ. (Jenesis 3:15; 12:2; 15:5; 22:18) Ná ndabere nke okwukwe dị otú ahụ nakwa n’ọrụ kwekọrọ n’okwukwe, Jehova pụrụ iso Ebreham na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nwee mmekọrịta ma gọzie ha, ọ bụ ezie na ha ezughị okè.—Abụ Ọma 36:10; Ndị Rom 4:20-22.

16. Gịnị ka inwe okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ rụpụtaworo?

16 N’ozuzu, ndị mmadụ ịbụ ndị ezi omume dabeere n’okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. Banyere Ndị Kraịst narị afọ mbụ, Pọl dere, sị: “Ọ bụkwa dị ka onyinye e nyere n’efu ka a na-akpọ ha ndị ezi omume site n’obiọma [Chineke] na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke sitere n’ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ.” (Ndị Rom 3:24) N’ebe a, Pọl na-ekwu banyere ndị ahụ a họọrọ iso Kraịst ketakọọ ihe n’Alaeze eluigwe. Ma àjà mgbapụta Jizọs meghekwaara ọtụtụ nde ndị ọzọ ohere nke inwe ezi nguzo n’ihu Chineke. N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, . . . na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ, na-eyi uwe mwụda ọcha.” Uwe mwụda ahụ dị ọcha na-ese onyinyo ha ịbụ ndị dị ọcha na ndị ezi omume n’ihu Chineke n’ihi na ha ‘asawo uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’—Mkpughe 7:9, 14.

Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ

17. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka a na-aghaghị iwere n’ịchụso ezi omume?

17 Ọ bụ ezie na Jehova ejiwo ịhụnanya nye Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, dị ka ụzọ ụmụ mmadụ nwere isi nwee nguzo ezi omume n’ihu ya, n’ezie a dịghị enweta ya n’arụghị ọrụ. Mmadụ aghaghị igosipụta okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, mee ka ndụ ya kwekọọ n’uche Chineke, rara onwe ya nye Jehova, ma gosipụta ya site na baptizim ime mmiri. E mesịa, onye ahụ aghaghị ịnọgide na-achụso ezi omume, nakwa àgwà ime mmụọ ndị ọzọ. Pọl dụrụ Timoti, bụ́ Onye Kraịst e mere baptizim nke nwere ọkpụkpọ eluigwe, ọdụ sị: “Chụsoo ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ n’obi.” (1 Timoti 6:11; 2 Timoti 2:22) Jizọs mesikwara ike mkpa ọ dị ịnọgide na-eme mgbalị mgbe ọ sịrị: “Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.” Anyị pụrụ ịdị na-arụsi nnọọ ọrụ ike ịchọ ngọzi dị iche iche nke Alaeze Chineke, ma ànyị na-arụsikwa ọrụ ike ịchụso ụzọ ezi omume dị iche iche nke Jehova?—Matiu 6:33.

18. (a) Gịnị mere na ọ dịghị mfe ịchụso ezi omume? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Lọt?

18 N’ezie, ọ dịghị mfe ịchụso ezi omume. Nke a bụ n’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè nweekwa ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ime ajọ omume. (Aịsaịa 64:6) Ọzọkwa, ndị na-enwechaghị nkwanye ùgwù maka ụzọ ezi omume nke Jehova gbara anyị gburugburu. Ọnọdụ anyị yiri nnọọ nke Lọt, bụ́ onye biri n’obodo ọjọọ a ma ama bụ́ Sọdọm. Pita onyeozi kọwara ihe mere Jehova ji lee ya anya na o kwesịrị ekwesị ịnapụta Lọt ná mbibi na-abịanụ. Pita sịrị: “Onye ezi omume ahụ site n’ihe ọ hụrụ ma nụ n’oge o bi n’etiti ha site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị bụ onye a na-emekpa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ́ n’ihi omume mmebi iwu ha.” (2 Pita 2:7, 8) Ya mere, onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịjụ, sị: ‘N’obi m, àna m anabata omume rụrụ arụ anyị na-ahụ gburugburu anyị? Àna m ele ihe ntụrụndụ na egwuregwu ndị na-ewu ewu bụ́ ndị a na-egosi ihe ike na ha anya nanị dị ka ihe na-adịghị adọrọ mmasị? Ka abụ m onye omume ọjọọ ndị dị otú ahụ na-emekpa ahụ́ dị ka o mekpara Lọt?’

19. Ngọzi ndị dị aṅaa pụrụ ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na ezi omume Chineke na-atọ anyị ụtọ?

19 N’ụbọchị ndị a dị oké egwu a na-ejighị  n’aka, ịbụ onye ezi omume Jehova na-atọ ụtọ bụ isi ihe na-eme ka a nọrọ ná ntụkwasị obi ma nwee nchebe. Maka ajụjụ bụ́: “Jehova, ònye ga-anọ dị ka ọbịa n’ụlọikwuu Gị? Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ Gị?” Eze Devid zara, sị: “Onye na-eje ije [n’ụzọ na-enweghị ntụpọ, NW], nke na-arụkwa ọrụ ezi omume.” (Abụ Ọma 15:1, 2) Site n’ịchụso ezi omume Chineke nakwa site n’ịbụ ndị ọ na-atọ ụtọ, anyị pụrụ ịnọgide soro ya na-enwe ezi mmekọrịta ma nọgide na-enweta ihu ọma na ngọzi ya. N’ụzọ dị otú a, ndụ anyị ga-abụ nke na-eju afọ, anyị enweekwa ùgwù onwe onye, na udo nke uche. “Onye na-agbaso ezi omume na ebere na-achọta ndụ, na ezi omume, na nsọpụrụ.” ka Okwu Chineke na-ekwu. (Ilu 21:21) Ọzọkwa, ịnwa ike anyị ime ihe n’ụzọ eleghị mmadụ anya n’ihu na n’ụzọ ziri ezi n’ihe nile anyị na-eme, na-eme ka anyị na ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta na-enye obi ụtọ, na-emekwa ka anyị na-ebi ụdị ndụ ka mma—n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ndị ihe na-agara nke ọma ka ndị na-edebe ikpe bụ, ha na onye na-eme ezi omume na mgbe nile.”—Abụ Ọma 106:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Maka nkọwa zuru ezu banyere otú Iwu Mozis saruru na mbara, lee isiokwu bụ́ “Some Features of the Law Covenant,” (Akụkụ Ụfọdụ nke Ọgbụgba Ndụ Iwu Ahụ) nke dị na peeji nke 214-220 ná Mpịakọta nke 2 nke Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị bụ ezi omume?

• Olee otú nzọpụta na ezi omume Chineke si nwee njikọ?

• Na gịnị ka Chineke na-adabere agụ ụmụ mmadụ ná ndị ezi omume?

• Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị ezi omume nke Jehova na-atọ ụtọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Eze Devid kwupụtara mmasị sitere n’obi o nwere n’ebe iwu Chineke dị

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Chineke gụrụ Noa, Ebreham, Zekaraịa na Elizabet, na Kọniliọs ná ndị ezi omume. Ị̀ maara ihe kpatara ya?