Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Obi Na-adị Chineke ma Ọ Hụ Ka Ị Na-ata Ahụhụ?

Olee Otú Obi Na-adị Chineke ma Ọ Hụ Ka Ị Na-ata Ahụhụ?

Ụfọdụ ndị kweere na Chineke anaghị ahụ ahụhụ ha na-ata, na ọ chọghịkwa ịma.

LEGODỊ IHE BAỊBỤL KWURU

  • Chineke na-ahụ ahụhụ ị na-ata, ọ na-emetụkwa ya n’obi

    “Jehova hụrụ na ihe ọjọọ nke mmadụ dị ukwuu n’ụwa . . . , o wee wute ya n’obi.”—Jenesis 6:5, 6.

  • Chineke ga-eme ka ahụhụ niile kwụsị

    “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

  • Ihe Chineke chọrọ imere gị

    “‘Mụ onwe m maara nke ọma ihe m na-echere unu,’ ka Jehova kwuru, ‘echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi, ime ka unu nwee ọdịnihu na olileanya. Unu ga-akpọku m, bịakwa kpekuo m ekpere, m ga-egekwa unu ntị.’”—Jeremaya 29:11, 12.

    “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.