Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

“Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ.”—ABỤ ỌMA 139:16

Chineke Ọ̀ Na-aghọta Gị?

Chineke Ọ̀ Na-aghọta Gị?

IHE IHE NDỊ CHINEKE KERE NA-AKỤZIRI ANYỊ

Chegodị gbasara ụmụ ejima yiri ibe ha. Ha bụ otu n’ime ndị ha na ibe ha na-emekọrịta ihe nke ọma. Ha na-adị n’ezigbo mma. E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Nancy Segal. Ọ bụ ejima, bụrụkwa onyeisi Twin Studies Center. O kwuru, sị: “Ụmụ ejima na-ekwurịta okwu nke ọma, na-aghọtakwa ibe ha nke ọma.” Mgbe otu nwaanyị na-ekwu otú ya na ejima ya si emekọrịta, ọ sịrị: “Anyị ma nnọọ ihe niile gbasara ibe anyị.”

Gịnị mere ha ji aghọta onwe ha nke ọma? Nchọpụta e mere gosiri na ihe so akpata ya bụ otú e si zụlite ha na ebe a nọ zụlite ha. Ma, ihe kacha akpata ya si n’ọbara.

CHEGODỊ IHE A: O doro anya na Onye kere mmadụ otú a kacha mara onye ọ bụla n’ime anyị nke ọma. Devid kwuru, sị: “I kpuchiri m ekpuchi n’ime afọ nne m. E zonahụghị gị ọkpụkpụ m mgbe i mere m na nzuzo. . . . Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị.” (Abụ Ọma 139:13, 15, 16) O nweghị onye ma anyị nke ọma otú Chineke si mara anyị. Ọ bụkwa naanị ya ghọtara ihe niile gbasara ahụ́ anyị nakwa otú ihe ndị merela ná ndụ anyị si mee ka anyị bụrụ ụdị ndị anyị bụ. Ebe ọ bụ na Chineke maara anyị nke ọma, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-aghọta ihe niile gbasara anyị.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ BANYERE OTÚ CHINEKE SI AGHỌTA ANYỊ

Devid gwara Jehova, sị: “Jehova, i nyochawo m, ị makwaara m. Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m biliri ọtọ. Ị na-anọ n’ebe dị anya tụlee ihe m na-eche. N’ihi na ọ dịghị okwu dị n’ire m, ma, Jehova, lee! ị marachaala ya.” (Abụ Ọma 139:1, 2, 4) Jehova makwa ihe ndị dị anyị n’obi, “ọ na-amatakwa ihe niile mmadụ na-eche n’echiche.” (1 Ihe E Mere 28:9; 1 Samuel 16:6, 7) Gịnị ka amaokwu Baịbụl ndị a na-agwa anyị banyere Chineke?

Ọ bụrụgodị na anyị agaghị akọwali ihe dị anyị n’obi ma ọ bụ ekwuchali otú ọ dị anyị n’obi ma anyị kpewe ekpere, Jehova na-ahụ ihe ọ bụla anyị mere iji kọwaa nsogbu anyị, ọ na-aghọtakwa ya. Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-aghọta ihe ọma ndị anyị bu n’obi ime, ọ bụrụgodị na ihe ụfọdụ emee ka anyị ghara ime ha. Ebe ọ bụ na Chineke kere anyị otú anyị ga na-ahụ ndị ọzọ n’anya, ọ na-ahụ mgbe anyị chọrọ ime ihe ọma na ihe mere anyị ji chọọ ime ya.—1 Jọn 4:7-10.

Chineke na-ahụ ihe niile. Ọ na-ahụ ahụhụ niile anyị na-ata, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ amaghị banyere ya ma ọ bụ na ha aghọtachaghị ihe anyị na ya na-alụ

 Baịbụl kwuru, sị:

  • “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.”—1 PITA 3:12.

  • Chineke kwere nkwa, sị: “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso. M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.”—ABỤ ỌMA 32:8.

IHE GBASARA ANYỊ NA-EMETỤ CHINEKE N’OBI

Ịmara na Chineke na-aghọta otú ihe si dịrị anyị na ihe dị anyị n’obi ò nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu anyị nwere? Chegodị ihe mere otu nwaanyị bi na Naịjirịa aha ya bụ Anna. O kwuru, sị: “Ọnọdụ ọjọọ m nọ na ya mere ka m chewe na ndụ m dị enweghịzi isi. Di m anwụọla, m nọkwa n’ụlọ ọgwụ na-elekọta nwa m nwaanyị na-erubeghị afọ iri na-arịa ọrịa mere ka isi ya buo ibu n’ihi mmiri juru ya n’ụbụrụ. A na-akpọ ọrịa a hydrocephalus. Ọ bụ mgbe ahụ ka a chọpụtakwara na m nwere ọrịa kansa. Ihe ọ pụtara bụ na a ga-awa m ahụ́, na-enyekwa m ọgwụ ndị siri ike. Ọ dịghịrị m mfe mụ na nwa m nwaanyị ịnọ n’ụlọ ọgwụ na-arịa ọrịa otu mgbe.”

Gịnị nyeere Anna aka idi nsogbu a? O kwuru, sị: “M chebaara amaokwu Baịbụl ụfọdụ echiche. Otu n’ime ha bụ Ndị Filipaị 4:6, 7. Ebe ahụ sịrị na ‘udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.’ Mgbe ọ bụla m chetara amaokwu Baịbụl a, ọ na-eme ka m mata na Jehova bụ ezigbo enyi m ebe ọ bụ na m ma na ọ na-aghọta ọnọdụ m karịa m. Ndị mụ na ha so na-efe Jehova nyekwaara m ezigbo aka.

“Ọ bụ eziokwu na mụ na ọrịa ahụ ka na-alụ, ma ọ kala mma. Nke nwa m nwaanyị adịkwuokwala mma. Anyị anaghịzi echegbu onwe anyị ma anyị nwee nsogbu ahụ n’ihi na anyị ma na Jehova nọnyeere anyị. Ihe Jems 5:11 kwuru na-eme ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: ‘Anyị na-akpọ ndị tachiri obi ndị obi ụtọ. Unu anụwo banyere ntachi obi Job, unu ahụwokwa ihe Jehova mesịrị mee, na Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.’” Jehova ghọtara ọnọdụ Job nke ọma, obi kwesịkwara isi anyị ike na ọ na-aghọta ọnọdụ ọ bụla anyị nọ na ya.