Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ọ̀ Na-eji Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Ata Anyị Ahụhụ?

Chineke Ọ̀ Na-eji Nsogbu Ndị Anyị Na-enwe Ata Anyị Ahụhụ?

E NWERE OTU NWATAKỊRỊ NA-ETE ỤKWỤ. AHA YA BỤ LUZIA. Mgbe ọ dị obere, o butere ọrịa polio. Mgbe ọ dị afọ iri na isii, otu nwaanyị ọ rụụrụ ọrụ gwara ya, sị: “Chineke kwarụrụ gị ụkwụ iji taa gị ahụhụ maka isi ị na-enupụrụ mama gị.” Ihe a gbawara Luzia obi. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Luzia ka na-echeta otú obi si gbawaa ya maka ihe ahụ ọ gwara ya.

MGBE A GWARA OTU NWAANYỊ AHA YA BỤ DAMARIS NA O NWERE ỌRỊA KANSA N’ỤBỤRỤ, papa ya jụrụ ya, sị: “Gịnị ka i metara? Ọ ga-abụrịrị na o nwere ihe ọjọọ i mere. Ọ bụ ya mere Chineke ji ata gị ahụhụ.” Ihe a nna Damaris kwuru gbawara ya obi.

Ọ dịla anya ndị mmadụ chewere na Chineke ji ọrịa ata ndị mmadụ ahụhụ. Akwụkwọ bụ́ Manners and Customs of Bible Lands kwuru na ọtụtụ ndị n’oge ndịozi Jizọs kweere na “ihe mere mmadụ ji arịa ọrịa bụ mmehie o mere ma ọ bụkwanụ nke onye ikwu ya mere, nakwa na e ji ọrịa ata onye ahụ ahụhụ n’ihi mmehie ahụ.” Otu akwụkwọ bụ́ Medieval Medicine and the Plague kwuru na n’ihe dị ka narị afọ asaa gara aga, “ụfọdụ ndị kweere na Chineke ziteere ha ọrịa iji taa ha ahụhụ maka mmehie ha”. Mgbe ahụ ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ n’ihi ọrịa na-efe efe kpara mkpamkpa na Yurop n’ihe dị ka narị afọ asaa gara aga, Chineke ò ji ya taa ndị ọjọọ ahụhụ? Ka ọ̀ bụ ihe ndị dọkịta mechara chọpụta, ya bụ, na ọ bụ nje kpatara ya? Ụfọdụ nwere ike ịjụ ma ọ̀ bụ eziokwu na Chineke ji ọrịa ata ndị mmadụ ahụhụ maka mmehie ha? *

CHEGODỊ IHE A: Ọ bụrụ na ọrịa na ahụhụ ndị anyị na-ata bụ ihe Chineke ji ata anyị ahụhụ, gịnị mere Jizọs, Ọkpara Chineke, ji gwọọ ndị ọrịa? Ọ́ gaghị apụta na Jizọs na-azọ ndị nna ya na-ata ahụhụ, na-agbakwa ha ume inupụrụ Chineke isi? (Matiu 4:23, 24) O nweghị mgbe Jizọs ga-eme ihe megidere ihe Chineke na-eme. Jizọs kwuru, sị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.” O kwukwara, sị: “Ọbụna dị ka Nna m nyere m iwu ka m mee, otú ahụ ka m na-eme.”—Jọn 8:29; 14:31.

Ihe Baịbụl kwuru doro anya. Ọ sịrị na ‘ikpe na-ezighị ezi adịghị n’ebe Jehova Chineke nọ.’ (Diuterọnọmi 32:4) Dị ka ihe atụ, o nweghị mgbe Chineke ga-eme ka ụgbọelu kpọkaa, gbuo ọtụtụ narị mmadụ nọ n’ime ya n’ihi na ọ chọrọ ịta otu onye n’ime ha ahụhụ. Ebreham, onye ji obi ya niile fee Chineke, kwuru na o nweghị mgbe Chineke ‘ga-ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume,’ n’ihi na ọ bụ onye ezi omume. Ọ sịrị: ‘Tụfịakwa! Ọ gaghị eme otú a.’ (Jenesis 18:23, 25) Baịbụl kwukwara na “Chineke adịghị eme ihe ọjọọ.” Ọ naghị ‘eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.’—Job 34:10-12.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI BANYERE NSOGBU ANYỊ NA-ENWE

Chineke ejighị nsogbu ndị anyị na-enwe ata anyị ahụhụ maka mmehie anyị. Ihe Jizọs kwuru gbasara okwu a doro anya. Mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya na-agafe, ha hụrụ otu nwoke kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. “Ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya, sị: ‘Rabaị, ònye mehiere, ọ̀ bụ nwoke a ka ọ̀ bụ ndị mụrụ ya, nke mere o ji kpuo ìsì mgbe a mụrụ ya?’ Jizọs zara, sị: ‘Ma nwoke a ma ndị mụrụ ya emehieghị, kama ọ bụ ka e wee mee ka ọrụ Chineke pụta ìhè n’ebe ọ nọ.’”—Jọn 9:1-3.

Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị n’oge ahụ kweere na ọrịa bụ ihe Chineke ji ata mmadụ ahụhụ, ọ ga-abụ na o juru ndị na-eso ụzọ Jizọs anya mgbe ọ gwara ha na ọ bụghị mmehie nwoke ahụ ma ọ bụ nke ndị  mụrụ ya mere o ji kpuo ìsì. Jizọs gwọrọ nwoke ahụ, si otú ahụ mee ka o doo anya na Chineke anaghị eji nsogbu ndị na-abịara anyị ata anyị ahụhụ. (Jọn 9:6, 7) Taa, obi ga-atọ ndị na-arịa ezigbo ọrịa ụtọ ịmara na ọrịa ha esighị Chineke n’aka.

Ọ bụrụ na Chineke ji ọrịa na-ata mmadụ ahụhụ, gịnị mere Jizọs ji gwọọ ndị ọrịa?

Baịbụl kwuru, sị:

  • “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (JEMS 1:13) N’eziokwu, n’oge na-adịghị anya a ga-ewepụ “ihe ọjọọ” ndị nọ na-enye ụmụ mmadụ nsogbu kemgbe ọtụtụ afọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ọrịa, ahụ́ mgbu, na ọnwụ.

  • Jizọs Kraịst ‘gwọrọ ndị niile ahụ́ na-adịghị mma.’ (MATIU 8:16) Mgbe Ọkpara Chineke gwọrọ ndị niile a kpọtaara ya, o gosiri ihe Alaeze Chineke ga-eme n’ụwa niile ma o bido chịwa ụwa.

  • “Ọ [ya bụ, Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—MKPUGHE 21:3-5.

ÒNYE NA-AKPATA AHỤHỤ NIILE ANYỊ NA-ATA?

Gịnị meziri ụmụ mmadụ ji atagbu onwe ha n’ahụhụ? Ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ a kemgbe ọtụtụ afọ. Ebe ọ bụ na ahụhụ anyị na-ata esighị Chineke n’aka, ònyekwanụ ka o si n’aka? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 4 Ọ bụ eziokwu na o nweela mgbe Chineke nyere ndị mmadụ ntaramahụhụ maka mmehie ha mere, Baịbụl ekwughị na Jehova na-eji ọrịa ma ọ bụ ọdachi ata mmadụ ahụhụ maka mmehie ya.