Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ka Alaeze Gị Bịa” Bụ Ekpere Ọtụtụ Nde Mmadụ Na-ekpekarị

“Ka Alaeze Gị Bịa” Bụ Ekpere Ọtụtụ Nde Mmadụ Na-ekpekarị

Ọ̀ dịtụla mgbe i kpere ekpere ka Alaeze Chineke bịa? Kemgbe ụwa, ọtụtụ nde mmadụ ekpeela ekpere a bụ́ “Ka alaeze gị bịa” ugboro ugboro. Gịnị mere ha ji na-ekpe ekpere a ugboro ugboro? Ọ bụ n’ihi na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs aghọtaghị ihe niile Jizọs kwuru gbasara Alaeze Chineke ná mmalite. E nwere mgbe ha jụrụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ ga-eme ka Izrel nwetaghachi alaeze ha n’oge a?” Ọ ga-abụ na o juru ha anya na Jizọs agwaghị ha kpọmkwem mgbe Alaeze ahụ ga-abịa. (Ọrụ 1:6, 7) Nke a ọ̀ pụtara na anyị agaghị amatali ihe Alaeze Chineke bụ na mgbe ọ ga-abịa? Mbanụ!

Ụlọ Nche a ga-enyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere Alaeze Chineke ji dị anyị mkpa?

  • Ònye bụ Eze nke Alaeze Chineke?

  • Olee mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa a?

  • Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ?

  • Gịnị mere i kwesịrị iji na-akwado Alaeze Chineke ugbu a?

  • Gịnị bụ Alaeze Chineke?