Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe anyị ga-akwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa ugbu a?

Jizọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:14) Okwu Grik a sụgharịrị “ọgwụgwụ” n’amaokwu a nakwa n’amaokwu nke 6 na nke 13 bụ teʹlos. Ọ pụtara ọgwụgwụ ụwa Setan n’Amagedọn. (Mkpu. 16:14, 16) N’ihi ya, anyị ga na-ekwusa ozi ọma ruo obere oge tupu Amagedọn. Ihe a gbanwere otú anyị sibu ghọta amaokwu a.

Na mbụ, anyị ghọtara na anyị ga-akwụsị ikwusa ozi ọma ma oké mkpagbu bido, mgbe a ga-ebibi Babịlọn Ukwu. (Mkpu. 17:3, 5, 15, 16) Anyị cheburu na ọ bụ n’oge ahụ ka “afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara” ga-akwụsị. (Aịza. 61:2) Anyị chekwara na ndị ga-alanahụ oké mkpagbu bụ ndị gosiri na ha ji obi ha niile na-efe Jehova tupu oké mkpagbu amalite. Anyị ji ndị ahụ tụnyere ndị Juu lanahụrụ mbibi e bibiri Jeruselem n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. A kara ha akara na a ga-azọpụta ha tupu oge ahụ n’ihi na ha fere Jehova ma kpọ ihe ọjọọ asị. (Ezik. 5:11; 9:4) Mana, ihe a adabaghị n’ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:14, nke gosiri na ndị mmadụ ga-enwe ohere ịnabata ozi ọma ruo obere oge tupu ọgwụgwụ abịa n’Amagedọn.

Ihe ọhụrụ a anyị ghọtara gbasara Matiu 24:14 gbanwekwara ihe anyị ghọtaburu gbasara ozi ahụ dị ka akụ́ mmiri ígwé e kwuru okwu ya ná Mkpughe 16:21. Mgbe anyị lebakwuru amaokwu abụọ ndị a anya, anyị chọpụtara na ha abụọ na-ekwu otu ihe. Olee otú o si bụrụ eziokwu? Ihe nyeere anyị aka ịghọta ya bụ otú Baịbụl si kọwaa ihe ndị mmadụ ga-eme ma e zie ha ozi ọma. Pọl onyeozi dere na ozi ọma ga-abụrụ “ndị a ga-azọpụta” “ísì ndụ.” Ma ọ ga-abụrụ ndị iro Chineke ozi ọjọọ, ya bụ, “ísì ọnwụ.” (2 Kọr. 2:15, 16) Ha achọghị iji ntị anụ ozi ọma n’ihi na ọ na-eme ka a mata na ụwa a ha hụrụ n’anya bụ ụwa ọjọọ nke Setan na-achị, nke a ga-ebibikwa n’oge na-adịghị anya.​—Jọn 7:7; 1 Jọn 2:17; 5:19.

Akụ́ mmiri ígwé ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 16:21 “enweghị atụ.” Ihe a nwere ike ịpụta na n’oge oké mkpagbu, ozi ọma ga-akpụrụkwu ọkụ n’ọnụ, ya bụ na a ga-eme ka a mara aha Jehova otú a na-emetụbeghị ya. (Ezik. 39:7) N’oge ahụ, mgbe e bibichara Babịlọn Ukwu, è nwere ndị ga-anabata ozi ọma, ya adị ha ka ihe na-esi ísì ọma? O nwere ike. Ha nwere ike icheta ma ọ bụ mata na o teela Ndịàmà Jehova na-ekwu na a ga-ebibi okpukpe ụgha.

Ihe a yiri ihe mere n’Ijipt oge ochie, mgbe Jehova tara ndị Ijipt ahụhụ iri. Mgbe Jehova kpechara “chi niile nke Ijipt ikpe ma taa ha ahụhụ,” “ọtụtụ ndị dị iche iche [na-abụghị ndị Izrel] sokwa ha gawa.” (Ọpụ. 12:12, 37, 38) O nwere ike ịbụ na ndị a na-abụghị ndị Izrel kpebiri isoro ndị Jehova mgbe ha hụrụ ka ihe Mosis kwuru gbasara ahụhụ ahụ a tara ndị Ijipt mezuru.

Onye ọ bụla fewere Jehova mgbe e bibichara Babịlọn Ukwu ga-enwe ohere ịkwado ụmụnna Kraịst ndị ka ga-anọ n’ụwa mgbe ahụ. (Mat. 25:34-36, 40) N’eziokwu, a ka ga-enwe ohere ikwu na mmadụ bụ atụrụ ruo mgbe ọ fọrọ obere ka a lụọ agha Amagedọn, mgbe a ga-akpọrọ ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa gaa eluigwe.

Ihe a anyị ghọtakwuru ugbu a na-egosi na Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu ma na-eme ebere. N’eziokwu, “o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”​—2 Pita 3:9.