Ezikiel 39:1-29

  • A ga-ebibi Gọg na ndị agha ya (1-10)

  • A ga-eli Gọg na ndị agha ya na Ndagwurugwu Hemọn-Gọg (11-20)

  • A ga-akpọghachite ndị Izrel n’ala ha (21-29)

    • Chineke ga-enye ndị Izrel mmụọ nsọ ya (29)

39  “Nwa nke mmadụ, buo amụma ihe a ga-eme Gọg.+ Sị ya, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Gọg, onyeisi Mishek na Tubal,+ m ga-eme gị ihe.  M ga-eme ka ị tụgharịa. M ga-eduru gị na-aga, mee ka i si n’ime ime ebe ugwu pụta,+ kpọtakwa gị n’ugwu ndị dị n’Izrel.  M ga-akụpụ ụta i ji n’aka ekpe, meekwa ka akụ́ i ji n’aka nri dapụ.  Ị ga-ada n’ugwu ndị dị n’Izrel,+ gị na ndị agha gị niile na ndị gị na ha ga-eso abịa. M ga-eme ka nnụnụ na-eri anụ na anụ ọhịa jiri gị mere anụ oriri.”+  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ị ga-ada n’ọhịa,+ n’ihi na ọ bụ mụnwa kwuru ihe a.’  “‘M ga-eme ka ọkụ gbaa Megọg na ndị obi ruru ala bi n’agwaetiti.+ Ndị mmadụ ga-amarakwa na m bụ Jehova.  M ga-eme ka ndị Izrel bụ́ ndị m mara aha nsọ m. M gaghị ekwe ka e mebie aha nsọ m ọzọ. Mba niile ga-amara na m bụ Jehova,+ Onye Nsọ n’Izrel.’+  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị, ‘Ihe e buru n’amụma ga-eme. Ọ ga-emezurịrị. Ụbọchị ọ ga-eme bụ ụbọchị m kwuru gbasara ya.  Ndị bi n’obodo niile dị n’Izrel ga-aga jiri ngwá agha dị iche iche mere nkụ, ma ọta nta ma ọta ukwu ma ụta ma akụ́ ma okpiri nwere isi ígwè* ma ube. Ha ga-eji ha mere nkụ+ ruo afọ asaa. 10  Ha agaghị aga n’ọhịa chọwa osisi ha ga-eburu. Ha agaghịkwa akpa nkụ ọ bụla n’ọhịa, n’ihi na ha ga-eji ngwá agha mere nkụ.’ “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga-akwakọrọ ngwongwo nke ndị na-akwakọrọ ihe ha, bukọrọkwa ngwongwo nke ndị na-ebukọrọ ihe ha.’ 11  “‘N’ụbọchị ahụ, m ga-enye Gọg+ otu ebe a na-eli ozu n’Izrel, ya bụ, ndagwurugwu ndị na-agafe n’ebe ọwụwa anyanwụ oké osimiri na-esi agafe. Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịna-agafe ebe ahụ. A ga-eli Gọg na ndị agha ya niile ebe ahụ. A ga na-akpọkwa ebe ahụ Ndagwurugwu Hemọn-Gọg.*+ 12  Ndị Izrel ga-eji ọnwa asaa lie ha iji mee ka ala ha dị ọcha.+ 13  Ndị ala ahụ niile ga-eli ha. Ihe a ga-emekwa ka aha ha na-ede ude n’ụbọchị m ga-enye onwe m otuto.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 14  “‘A ga-ekenye ụfọdụ ndị ọrụ ịna-agagharị n’ala ahụ, na-eli ozu ndị fọdụrụ n’elu ala, iji mee ka ala ahụ dị ọcha. Ha ga na-achọgharị ozu ndị a ọnwa asaa. 15  Ọ bụrụ na ndị ahụ ga na-agagharị n’ala ahụ ahụ ọkpụkpụ mmadụ, ha ga-egwunye ihe a ga-eji hụwa ebe a hụrụ ya ama. Ndị e kenyere ọrụ ili ozu ga-elizi ya na Ndagwurugwu Hemọn-Gọg.+ 16  A ga-enwe obodo a na-akpọ Hamona* n’ebe ahụ. Ha ga-emekwa ka ala ahụ dị ọcha.’+ 17  “Nwa nke mmadụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘Gwa ụdị nnụnụ niile na anụ ọhịa niile, sị, “Zukọtanụ bịa. Zukọtanụ gburugburu ebe àjà m na-akwadebere unu dị. Ọ bụ nnukwu àjà m ga-achụ n’elu ugwu ndị dị n’Izrel.+ Unu ga-eri anụ, ṅụọkwa ọbara.+ 18  Unu ga-eri anụ ndị dike, ṅụọkwa ọbara ndị isi nọ n’ụwa, ndị nọchiri anya ebule, nwa atụrụ, ewu, na oké ehi. Ha niile bụ anụ ndị gbara agba na Beshan. 19  N’àjà ahụ m ga-achụrụ unu, unu ga-eriju abụba afọ, ṅụjuokwa ọbara afọ, ya ana-egbuzi unu ka mmanya.”’ 20  “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Anụ ịnyịnya, anụ ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya, anụ ndị dike, na anụ ụdị ndị agha dị iche iche ga-adị na tebụl m.+ Unu ga-erikwa ha rijuo afọ.’ 21  “‘M ga-eme ka a hụ ebube m ná mba dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa otú m si mee ihe m kpebiri n’ikpe m kpere, hụkwa ihe m ji ike m* mee ha.+ 22  Malite n’ụbọchị ahụ gawa, ndị Izrel ga-amara na m bụ Jehova Chineke ha. 23  Mba dị iche iche ga-amarakwa na ọ bụ mmehie ndị Izrel mere e ji dọrọ ha n’agha. Ha kwụsịrị ife m.+ Ọ bụ ya mere m ji zooro ha ihu m,+ nyefeekwa ha n’aka ndị iro ha,+ ha ejiri mma agha na-egbu ha niile. 24  Ihe m mere ha kwesịịrị ha n’ihi na ha adịghị ọcha, ha mebikwara iwu m. Ọ bụ ya mere m ji zooro ha ihu m.’ 25  “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-akpọghachite ụmụ Jekọb a dọọrọ n’agha,+ meekwara ndị Izrel niile ebere.+ M ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ka a mara na aha m dị nsọ.+ 26  Ha hụsichaa anya maka na ha kwụsịrị ife m,+ ha ga-ebirizi n’ala ha, obi eruo ha ala. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.+ 27  Mgbe m ga-esi ná mba dị iche iche kpọlata ha, sikwa n’ala ndị iro ha kpọkọta ha,+ m ga-eme ka ọtụtụ mba mara na m dị nsọ.’+ 28  “‘Ha ga-amara na m bụ Jehova Chineke ha mgbe m mere ka mba dị iche iche dọrọ ha n’agha nakwa mgbe m ga-akpọghachi ha n’ala ha, ma ghara ịhapụ onye ọ bụla n’ime ha ná mba ndị ahụ.+ 29  Agaghị m ezoro ndị Izrel ihu m ọzọ,+ n’ihi na m ga-enye ha mmụọ nsọ m.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “okpiri pịrị ọnụ.”
Ma ọ bụ “Ndagwurugwu Ndị Agha Gọg.”
Hamona pụtara Ìgwè.
Na Hibru, “aka m.”