Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ekpebisiri M Ike na Agaghị M Akụda Aka

Ekpebisiri M Ike na Agaghị M Akụda Aka

IHE ọtụtụ ndị na-eto eto nọ na Betel na-akpọkarị m bụ “PAPA” ma ọ bụ “DEEDE.” Ebe m dị afọ iri asatọ na itoolu, ọ na-atọ m ụtọ ma ha na-akpọ m ya. M weere ya na aha a ha na-akpọ m iji gosi na ha hụrụ m n’anya bụ otu ụzọ Jehova si gọzie m maka ijere ya ozi oge niile afọ iri asaa na abụọ. N’ihi ihe ndị m hụrụla n’ozi Jehova, m na-eji obi m niile agwa ndị na-eto eto, sị, ‘Jehova ga-agọzi unu maka ozi unu na-ejere ya ma ọ bụrụ na unu akụdaghị aka.’—2 Ihe 15:7.

NDỊ MỤRỤ M NA ỤMỤNNE M

Ndị mụrụ m si Yukren gaa biri na Kanada. Ha bi n’otu obodo a na-akpọ Rọsbọn, dị na Manitoba. Nne m ọma mụrụ ụmụ nwoke asatọ na ụmụ nwaanyị asatọ. O nweghị onye n’ime anyị bụ́ ejima. Abụ m nwa nke iri na anọ. Papa m ejighị Baịbụl egwu egwu. Ọ na-agụrụ anyị ya n’ụtụtụ Sọnde ọ bụla. Ma, ọ na-eche na ihe bụ́ mkpa ndị isi chọọchị bụ otú ha ga-esi anata ndị mmadụ ego, ọ bụghị otú ha ga-esi enyere ha aka. Ọ na-ejikarị egwuregwu ajụ, sị, “Ònye kwụkwaranụ Jizọs ụgwọ maka ozi ọma o ziri ndị mmadụ na ihe ọ kụziiri ha?”

Ụmụnne m ndị nwoke anọ na ndị nwaanyị anọ mechara bata n’ọgbakọ. Nwanne m nwaanyị aha ya bụ Rose bụ ọsụ ụzọ ruo mgbe ọ nwụrụ. Abalị ole na ole tupu ya anwụọ, ọ gbara mmadụ niile ume ka ha jiri Okwu Chineke kpọrọ ihe. Ọ gwara ha, sị, “Achọrọ m ịhụ unu n’ụwa ọhụrụ.” Otu n’ime ụmụnne m nwoke tọrọ m aha ya bụ Ted na-akụziburu ndị mmadụ banyere ọkụ ala mmụọ. Ụbọchị Sọnde ọ bụla, ọ na-ezi ozi ọma na redio, na-agwasi ndị mmadụ ike na ndị ajọ omume ga-ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi. Ma, o mechara ghọọ ezigbo ohu Jehova na-anụ ọkụ n’obi.

OTÚ M SI MALITE OZI OGE NIILE

Otu ụbọchị n’ọnwa Jun afọ 1944 mgbe m si ụlọ akwụkwọ lọta, m hụrụ otu akwụkwọ nta a na-akpọ The Coming World Regeneration * n’elu tebụl anyị na-anọ eri nri. M gụrụ peeji nke mbụ, gụọ nke abụọ, gụrụzie ya gawa. Mgbe m gụchara ya, m kpebiri na m ga-efe Jehova otú ahụ Jizọs mere.

Olee otú akwụkwọ a si bata na nke anyị? Nwanne m nwoke ọzọ tọrọ m aha ya bụ Steve gwara m na ụmụ nwoke abụọ “na-ere” akwụkwọ bịara n’ụlọ anyị. O kwuru, sị: “M zụrụ akwụkwọ a n’ihi na ọ dịghị oké ọnụ.” Ụmụ nwoke ahụ laghachiri na Sọnde ya. Ha gwara anyị na ha bụ Ndịàmà Jehova nakwa na ha na-eji Baịbụl aza ndị mmadụ ajụjụ ndị ha nwere. Obi tọrọ anyị ụtọ n’ihi na ndị mụrụ anyị kụziiri anyị ka anyị jiri Okwu Chineke kpọrọ ihe. Ụmụ nwoke abụọ ahụ gwakwara anyị na Ndịàmà Jehova ga-enwe mgbakọ na Winipeg n’oge na-adịghị anya. Ebe ahụ ka nwanne m nwaanyị aha ya bụ́ Elsie bi. M kpebiri na m ga-aga.

M gbara ígwè ihe dị ka narị kilomita atọ na iri abụọ ruo Winipeg. Ma, m kwụsịtụrụ n’ebe a na-akpọ Kelwood, bụ́ ebe Ndịàmà Jehova abụọ ahụ bịara n’ụlọ anyị bi. Mgbe m nọ ebe ahụ, m so ha gaa ọmụmụ ihe ma mara ihe ọgbakọ bụ. M bịara ghọta na mmadụ niile, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị nakwa ụmụaka kwesịrị ịga n’ụlọ n’ụlọ kụziere ndị mmadụ ihe otú Jizọs mere.

Ná mgbakọ ahụ m gara na Winipeg, m hụrụ nwanne m nwoke ọzọ tọrọ m aha ya bụ Jack. O si n’ebe ugwu Ọnterio bịa. N’abalị mbụ nke mgbakọ ahụ, otu nwanna mara ọkwa na a ga-eme ndị mmadụ baptizim. Mụ na Jack kpebiri na anyị ga-eme baptizim. Anyị kpebikwara na anyị ga-amalite ịsụ ụzọ ozugbo e mechara anyị baptizim. Jack malitere ịsụ ụzọ ozugbo e mechara mgbakọ ahụ. Alaghachiri m ụlọ akwụkwọ n’ihi na adị m afọ iri na isii mgbe ahụ. Ma n’afọ ọzọ ya, m ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile.

M MỤTARA ỌTỤTỤ IHE MGBE M NA-ASỤ ỤZỌ

Mụ na Stan Nicolson malitere ịsụ ụzọ n’obodo Soris dị na Manitoba. Mgbe ahụ ka m ghọtara na ịsụ ụzọ anaghị adị mfe mgbe niile. Ego anyị nwere bịara na-agwụ, ma anyị nọgidere na-ekwusa ozi ọma. E nwere otu ụbọchị anyị lọtara ozi ọma, ezigbo agụụ ejide anyị, ma o nweghị ego dị anyị n’akpa. O juru anyị anya na anyị hụrụ otu nnukwu akpa nri juru n’ọnụ ụzọ anyị. Anyị amaghị onye dọsara ya ruo taa. Ná mgbede ahụ, anyị riri nri ka ndị eze. Otú a ka Jehova si gọzie anyị n’ihi na anyị akụdaghị aka. Nke bụ́ eziokwu bụ na ná ngwụcha ọnwa ahụ, m buru ibu otú m na-ebutụbeghị kemgbe a mụrụ m.

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, e zigara anyị n’obodo Gịlbat Plens. Obodo a dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri anọ ma e si n’ebe ugwu Soris gawa ya. N’oge ahụ, ọgbakọ ọ bụla na-enwe chaatị na-adị n’ebe ikpo okwu. Chaatị a na-egosi akụkọ ozi ọgbakọ kwa ọnwa. E nwere otu ọnwa ụmụnna na-ejeghị ozi ọma nke ọma, m gwasiri ha okwu ike mgbe m na-eme ihe omume ka ha mekwuo nke ọma n’ozi ha. Mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, otu ọsụ ụzọ katarala ahụ́ di ya na-anọghị n’ọgbakọ ji anya mmiri gwa m, sị: “M gbara mbọ, ma enweghị m ike ime karịa otú ahụ mere.” M bekwara ákwá, ma rịọ ya mgbaghara.

Ụmụ okorobịa ume dị n’ahụ́ nwekwara ike imehie ihe ma kwaa mmakwaara n’ikpeazụ otú ahụ m mere. Ma, amụtala m na mmadụ ekwesịghị ikwe ka ihe ndị o mejọrọ mee ka ọ daa mbà, kama o kwesịrị ịmụta ihe na ha. Jehova ga-agọzikwa ya ma ọ na-ejere ya ozi.

MGBA ANYỊ GBARA NA KWEBEK

M gara klas nke iri na anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ihe a bụ ezigbo ihe ọma meere m n’ihi na adị m afọ iri abụọ na otu mgbe ahụ. Anyị gụchara n’ọnwa Febụwarị afọ 1950. E kee anyị ụzọ anọ, e zigara otu ụzọ n’ime anyị na Kwebek dị ná Kanada, bụ́ ebe a na-asụ asụsụ French. A naghị ekwe Ndịàmà Jehova ṅụrụ mmiri tọgbọ iko n’ebe ahụ. E zigara m n’obodo a na-akpọ Valdọ, bụ́ ebe a na-egwu ọlaedo. Otu ụbọchị, ụfọdụ n’ime anyị gara ozi ọma n’obodo dị nso a na-akpọ Valsenvil. Ụkọchukwu nọ ebe ahụ yiri anyị egwu na ọ ga-emerụ anyị ahụ́ ma ọ bụrụ na anyị apụghị ozugbo. Egwu a o yiri anyị mere ka m gbaa ya akwụkwọ n’ụlọikpe. E riri ụkọchukwu ahụ nhá. *

Ihe ahụ merenụ nakwa ọtụtụ ndị nke yiri nke a bịara soro na “Mgba Anyị Gbara na Kwebek.” Ọ bụ Chọọchị Roman Katọlik na-atụ ihe na-eme na Kwebek kemgbe ihe karịrị narị afọ atọ. Ndị ụkọchukwu na ndị ọchịchị ha na ha na-arụkọ ọrụ megidere Ndịàmà Jehova. Ọ dịghịrị anyị mfe n’oge ahụ, anyị dịkwa naanị ole na ole. N’agbanyeghị ya, anyị akụdaghị aka. Ndị nwere ezi obi gere anyị ntị. M mụụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl ha abata n’ọgbakọ. Otu ezinụlọ dị mmadụ iri so n’ime ha. Ha niile malitere ife Jehova. Otú ha si kata obi bata n’ọgbakọ mere ka ndị ọzọ hapụ Chọọchị Katọlik. Anyị nọgidere na-ekwusa ozi ọma, ma mechaa merie na mgba ahụ.

IJI ASỤSỤ ỤMỤNNA NA-ASỤ AKỤZIRI HA IHE

N’afọ 1956, e zigara m na Heiti. N’agbanyeghị na ọ dịghịrị ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ ahụ bịara ọhụrụ mfe ịmụta asụsụ French, ndị mmadụ gere ha ntị. Nwanna Stanley Boggus, bụ́ onye ozi ala ọzọ kwuru, sị: “O juru anyị anya na ndị mmadụ gbasiri mbọ ike inyere anyị aka ịsụ French.” Na mbụ, ọ dịịrị m mfe n’ihi na m mụrụ French mgbe m nọ na Kwebek. Ma ọ dịghị anya anyị achọpụta na ihe ọtụtụ ụmụnna na-asụ bụ naanị asụsụ Heshan Kriol. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyịnwa bụ́ ndị ozi ala ọzọ chọrọ ka ozi ọma ruo ndị mmadụ n’obi, anyị kwesịrị ịmụ asụsụ ha. Anyị mụkwara ya, Jehova agọziekwa mgbalị anyị.

Iji nyekwuoro ụmụnna aka, Òtù Na-achị Isi nyere anyị ikike ịsụgharị Ụlọ Nche na akwụkwọ anyị ndị ọzọ n’asụsụ Heshan Kriol. Nke a mere ka ọtụtụ ndị malite ịbịa ọmụmụ ihe. N’afọ 1950, ndị nkwusa e nwere na Heiti dị iri itoolu na itoolu, ma n’afọ 1960, ha bịara karịa narị asatọ. N’oge ahụ, a gwara m ka m jewe ozi na Betel. N’afọ 1961, obi dị m ụtọ iso duzie Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. Ndị anyị kụziiri ihe n’ụlọ akwụkwọ ahụ dị iri anọ, ma ndị okenye ma ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ná mgbakọ e nwere n’ọnwa Jenụwarị afọ 1962, anyị gbara ụmụnna ndị ruru eru ume ka ha jekwuoro Jehova ozi. A họpụtakwara ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ume a a gbara ụmụnna kwesịrị ekwesị n’ihi na a ga-akpagbu ha n’oge na-adịghị anya.

Ozugbo e mechiri mgbakọ ahụ n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 1962, a bịara n’alaka ụlọ ọrụ nwụchie mụ na onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Andrew D’Amico, bukọrọkwa Teta! Jenụwarị 8, 1962 e dere n’asụsụ French. Teta! a kwuru ihe otu akwụkwọ akụkọ kwuru. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na ndị Heiti na-eme magik. Ihe ahụ e dere were ụfọdụ iwe, ha ekwuokwa na ọ bụ anyị dere ya n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Mgbe izu ole na ole gachara, a gbaara ndị ozi ala ọzọ ụgbọ nwa mkpi. * Ma ụmụnna ndị ahụ anyị zụrụ nọgidere na-arụ ọrụ. Taa, obi dị m ụtọ n’ihi otú ha si tachie obi nakwa otú okwukwe ha si sikwuo ike. Ha nwedịrị Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Heshan Kriol. Ihe a bụ ihe anyị na-atụwadịghị anya ya n’oge ahụ.

IWU ỤLỌ NZUKỌ ALAEZE NA SENTRAL AFRỊKAN RIPỌBLIK

Mgbe m jechara ozi na Heiti, e zigara m Sentral Afrịkan Ripọblik ka m gaa bụrụ onye ozi ala ọzọ. M mechakwara bụrụ onye nlekọta sekit nakwa onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ.

N’oge ahụ, ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze e nwere abụghị ụlọ gbamgbam. Amụtara m otú e si egbute ahịhịa n’ọhịa na otú e si eji ya ekpuchi elu ụlọ. Ọ na-eju ndị na-agafe agafe anya ma ha hụ otú m si na-arụ ọrụ a. Ọ gbakwara ụmụnna ume ka ha wepụtakwuo oge n’ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na ilekọta ya. Ndị isi okpukpe nọ na-achị anyị ọchị n’ihi na ha ji gbamgbam kụọ elu ụlọ chọọchị ha ma anyị akụghị nke anyị gbamgbam. Ma nke a emeghị ka anyị kwụsị ịna-amụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze e ji ahịhịa rụọ. Ha kwụsịrị ịchị anyị ọchị mgbe oké ifufe fere na Bangui, bụ́ isi obodo Sentral Afrịkan Ripọblik. Ifufe ahụ buuru gbamgbam ha ji rụọ elu ụlọ chọọchị ha busa ya n’okporo ámá. Ma Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị kwụkwa chịm. Ka anyị nwee ike ịhazi ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa ahazi, anyị ji naanị ọnwa ise rụọ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ nakwa ụlọ ndị ozi ala ọzọ. *

OTÚ M SI LỤỌ EZIGBO NWAANYỊ NA-ANỤ ỌKỤ N’OBI

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ

N’afọ 1976, a machibidoro ọrụ anyị iwu na Sentral Afrịkan Ripọblik. E zigara m Njamina, bụ́ isi obodo Chad. Ọ bụ ebe a ka m hụrụ nwanna nwaanyị aha ya bụ Happy, bụ́ onye Kameruun. Ọ bụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na-anụ ọkụ n’obi. Anyị lụrụ n’abalị mbụ n’ọnwa Eprel afọ 1978. Ọ bụkwa n’ọnwa ahụ ka a malitere ịlụ agha na Chad. Ọtụtụ n’ime anyị gbagara n’ebe ndịda. Mgbe a lụchara agha, anyị laghachiri ma chọpụta na ụlọ anyị bụzi isi ụlọ ọrụ nke otu òtù nnupụisi. Anyị chọpụtakwara na akwụkwọ anyị niile, uwe nwunye m ji gbaa akwụkwọ, na onyinye ndị e nyere anyị n’agbamakwụkwọ anyị emiela ala. Ma, anyị akụdaghị aka. Anyị ka hụrụ ibe anyị n’anya ma na-atụ anya ijekwuru Jehova ozi.

Mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara, a kagburu iwu ahụ a machiri anyị na Sentral Afrịkan Ripọblik. Anyị laghachiri ma malite ọrụ sekit. Ihe anyị ji mere ụlọ bụ ụgbọala nwere àkwà a na-afụkọta afụkọta, nnukwu drọn, frij na ihe dị ka stoovu na-eji gas arụ ọrụ. Ime njem na-esi ike. N’otu njem anyị mere, ndị uwe ojii kwụsịrị anyị ọtụtụ ugboro n’ụzọ.

Ọtụtụ mgbe, obodo Sentral Afrịkan Ripọblik na-ekpo ezigbo ọkụ. E nwee mgbakọ, ọ naghị adị mfe inweta mmiri ga-ezu ime ndị mmadụ baptizim. N’ihi ya, ụmụnna na-egwu ala n’ebe mmiri dịbu ma jiri nwayọọ nwayọọ nweta mmiri ha ga-eji eme ndị mmadụ baptizim. Ha na-emekarị ndị mmadụ baptizim ná nnukwu drọn.

ỌRỤ NDỊ ANYỊ RỤRỤ NÁ MBA AFRỊKA NDỊ ỌZỌ

N’afọ 1980, e zigara anyị Naịjirịa. Anyị ji afọ abụọ na ọkara nyere ụmụnna aka ịkwado otú a ga-esi arụ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ. Ụmụnna zụrụ ụlọ elu dị okpukpu abụọ a na-akwakọba ihe. A ga-akwatu ya ma rụọ alaka ụlọ ọrụ anyị ebe ahụ. N’otu ụtụtụ, m rigooro n’ebe dị ezigbo elu n’ụlọ ahụ ka m nye aka kwatuo ya. Mgbe o ruwara ehihie, m si otú ahụ m si rigoro na-arịtu. Ebe ọ bụ na a kụtuola ọtụtụ ihe n’ụlọ ahụ, m zọhiere ụkwụ ma si n’elu ebe ahụ daa. O yiri ka ihe mere m abụghị obere ihe, ma mgbe e lechara m ahụ́, dọkịta gwara nwunye m, sị: “Enyela onwe gị nsogbu, ọ bụ naanị na ụfọdụ akwara ya dọbiri. Ọ ga-agbake n’otu izu ma ọ bụ karịa.”

Mgbe anyị nọ “n’ụgbọ ọhaneze” na-aga mgbakọ”

N’afọ 1986, anyị kwagara Kot Devụa, bụ́ ebe anyị rụrụ ọrụ sekit. Ọrụ a mere ka anyị gaa Bokina Faso. E nwetụdịghị mgbe m chere ya n’echiche na n’afọ ndị na-abịa abịa na anyị ga-emecha bịa biri n’obodo a ruo oge ụfọdụ.

Mgbe anyị nọ n’ọrụ sekit, anyị ji ụgbọala a mere ụlọ

M hapụrụ Kanada n’afọ 1956. Ma n’afọ 2003, m laghachiri n’alaka ụlọ ọrụ dị na Kanada mgbe afọ iri anọ na asaa gachara. Ma na nke ugbu a, ọ bụ mụ na nwunye m Happy sozi. Anyị bụ ndị Kanada, ma ọ na-adị anyị ka ànyị bụ ndị Afrịka.

Mgbe m na-amụrụ mmadụ ihe na Bokina Faso

N’afọ 2007, mgbe m dị afọ iri asaa na itoolu, anyị laghachikwara Afrịka. E zigara anyị Bokina Faso, bụ́ ebe m so na Kọmitii Na-elekọta Mba ahụ. E mechakwara jiri ọfis anyị na-anọ mere ọfis ndị nsụgharị, ọ bụkwa alaka Bene (Rịpọblik) na-elekọta ya. N’ọnwa Ọgọst afọ 2013, e zigara anyị ka anyị jewe ozi na Betel dị na Bene (Rịpọblik).

Mụ na nwunye m, mgbe anyị na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Bene (Rịpọblik)

N’agbanyeghị na ahụ́ esichaghị m ike, m ka ji ozi ọma kpọrọ ihe. N’ime afọ atọ gara aga, ndị okenye na nwunye m m hụrụ n’anya enyerela m ezigbo aka ịmụrụ Gédéon na Frégis ihe ha emee baptizim. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi ugbu a.

Ka ọ dị ugbu a, mụ na nwunye m na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Saụt Afrịka, bụ́ ebe ụmụnna anyị na-elekọta m nke ọma. Saụt Afrịka bụ obodo nke asaa n’Afrịka m jerela ozi. Ma, e nwere ihe ọma meere anyị n’ọnwa Ọktoba afọ 2017. Anyị gara Wọwik nke dị na Niu Yọk maka inyefe Jehova isi ụlọ ọrụ anyị dị ebe ahụ. Anyị agaghị echefu ya echefu.

Akwụkwọ Mgbaafọ nke afọ 1994, peeji nke 255 kwuru, sị: “Anyị na-agba ndị niile tachiri obi n’ọrụ a kemgbe ọtụtụ afọ ume, sị, ‘Nweenụ obi ike, unu enwela nkụda aka, n’ihi na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ unu.’—2 Ihe 15:7.” Mụ na nwunye m kpebisiri ike ime ihe a e kwuru, na-agbakwa ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ.

^ para. 9 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya n’afọ 1944. Ma a naghịzi ebipụta ya.

^ para. 18 Gụọ isiokwu bụ́ “Quebec Priest Convicted for Attack on Jehovah’s Witnesses” (Ụlọikpe Ama Ụkọchukwu Kwebek Ikpe Maka Imesi Ndịàmà Jehova Ike.) Ọ gbara na Teta! November 8, 1953, peeji nke 3 ruo na nke 5, nke Bekee.

^ para. 23 A kọkwuru gbasara ya n’Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 1994, peeji nke 148 ruo na nke 150, nke Bekee.

^ para. 26 Gụọ isiokwu bụ́ “Building on a Solid Foundation” (Iwu Ụlọ n’Elu Ntọala Siri Ike.) Ọ gbara na Teta!, May 8, 1966, peeji nke 27, nke Bekee.