Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Ị̀ Ma Ihe Niile Merenụ?

Ị̀ Ma Ihe Niile Merenụ?

“Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.”—ILU 18:13.

ABỤ: 126, 95

1, 2. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta, maka gịnị? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

EBE anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịmụta otú anyị ga-esi eleru akụkọ anyị nụrụ anya iji mata ma ọ̀ bụ eziokwu. (Ilu 3:21-23; 8:4, 5) Ọ bụrụ na anyị amụtaghị ya, ọ ga-adịrị Setan na ụwa ya mfe ime ka anyị na-eche echiche otú na-ekwesịghị ekwesị. (Efe. 5:6; Kọl. 2:8) Ma, ọ bụ mgbe anyị matara ihe niile merenụ ka ọ ga-edo anyị anya ma ihe ahụ anyị nụrụ ọ̀ bụ eziokwu. Ilu 18:13 kwuru, sị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.”

2 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ọtụtụ ihe mere o ji esi ike ịmata otú ihe niile si mee tupu anyị ekweta na ọ bụ eziokwu. Ka anyị na-atụle ha, anyị ga-atụlekwa ụkpụrụ Baịbụl ụfọdụ na ihe atụ ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịmụtakwu otú anyị ga-esi na-enyocha akụkọ ndị anyị nụrụ iji mata nke bụ́ eziokwu.

EKWERELA “OKWU NIILE”

3. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mee ihe e kwuru n’Ilu 14:15? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

3 Taa, akụkọ na-ezo ka mmiri. Ọ bụ n’Ịntanet, tiivi na ihe ndị ọzọ ka e si enweta akụkọ ndị ahụ. Ndị enyi anyị na ndị ọzọ nwekwara ike izitere anyị ọtụtụ ozi n’ekwentị nakwa n’iimel. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-ama ụma agbasa ọtụtụ akụkọ ndị  na-abụghị eziokwu, anyị kwesịrị ịkpachara anya ma chọpụta ma akụkọ ndị ahụ anyị nụrụ hà bụ eziokwu. Olee ụkpụrụ Baịbụl ga-enyere anyị aka? Ilu 14:15 kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”

4. Olee otú Ndị Filipaị 4:8, 9 ga-esi enyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ịhọrọ ihe anyị ga-agụ? Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mata akụkọ nke bụ́ eziokwu? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ụfọdụ Ndị Ga-enyere Anyị Aka Ịmata nke Bụ́ Eziokwu.”)

4 Ka anyị nwee ike ime mkpebi dị mma, anyị kwesịrị ịmata nke bụ́ eziokwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịsa anya ná mmiri họrọ ihe ndị anyị ga-agụ. (Gụọ Ndị Filipaị 4:8, 9.) Anyị ekwesịghị iji oge anyị na-agụ akụkọ ụwa n’ebe a na-enyo enyo n’Ịntanet ma ọ bụ na-agụ ozi iimel a na-amaghị ma hà mere eme. Anyị kwesịrị izere ebe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-agbasa ozi n’Ịntanet. Ihe bụ́ mkpa ha bụ ime ka okwukwe ndị ohu Chineke ghara isi ike na ime ka ndị mmadụ kwere ihe ndị na-abụghị eziokwu. Ọ bụrụ na anyị ana-agụ akụkọ ndị anyị na-amaghị ma hà bụ eziokwu, ọ ga-eme ka anyị mee mkpebi ndị na-adịghị mma. Anyị ekwesịghị iche na o nweghị ihe akụkọ ndị na-abụghị eziokwu anyị nụrụ ga-eme anyị.—1 Tim. 6:20, 21.

5. Olee akụkọ ọjọọ ụmụ Izrel nụrụ, olee otú o si kpaa ha aka?

5 Ikwere akụkọ na-abụghị eziokwu nwere ike ịkpata ezigbo nsogbu. N’oge Mozis, e zipụrụ mmadụ iri na abụọ ka ha gaa ledoo Ala Nkwa ahụ. Mmadụ iri n’ime ha kọọrọ ndị Izrel akụkọ ọjọọ. (Ọnụ Ọgụ. 13:25-33) Otú ha si tinye akụkọ ha nnu na ose mere ka ezigbo ụjọ tụọ ndị Jehova. (Ọnụ Ọgụ. 14:1-4) Gịnị mere ụjọ ji tụọ ha? Ọ ga-abụ na ha chere na ihe mmadụ iri ahụ kwuru ga-abụrịrị eziokwu, ebe ọ bụ na ha kwuru otu ihe. Ha jụrụ ige akụkọ ọma Jọshụa na Keleb kọọrọ ha. (Ọnụ Ọgụ. 14:6-10) Kama ha ga-agbalị mata nke bụ́ eziokwu ma tụkwasị Jehova obi, ha kweere akụkọ ọjọọ ahụ. Ihe a ha mere bụ izuzu nzuzu.

6. Gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya ma anyị nụ akụkọ ndị na-awụ akpata oyi gbasara ndị ohu Jehova?

6 Anyị kwesịrị ịkpachara anya karịchaa ma anyị nụ akụkọ gbasara ndị Jehova. Echefula na Setan bụ onye na-ebo ndị na-efe Chineke ebubo. (Mkpu. 12:10) N’ihi ya, Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị na ndị na-emegide anyị ga ‘na-aghagide anyị ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile’ megide anyị. (Mat. 5:11) Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe a Jizọs kwuru kpọrọ ihe, ọ gaghị eju anyị anya ma anyị nụ akụkọ ndị na-awụ akpata oyi ndị mmadụ na-akọ gbasara ndị ohu Jehova.

7. Tupu anyị ezipụ ozi, olee ihe ndị anyị kwesịrị ichebara echiche?

7 Ọ̀ na-atọ gị ụtọ izigara ndị enyi gị ozi iimel ma ọ bụkwanụ zigara ha ozi n’ekwentị? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ọ bụla ị nụrụ akụkọ ọhụrụ ụlọ ọrụ mgbasa ozi kọrọ ma ọ bụkwanụ nụ ihe merenụ, i nwere ike ime ka onye nta akụkọ chọrọ ibu ụzọ kọọ ihe merenụ. Ma, tupu gị ezipụwa ozi ahụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ò doro m anya na ozi a m chọrọ izipụ bụ eziokwu? M̀ ma ihe niile merenụ?’ Ọ bụrụ na o doghị gị anya, i nwere ike izigara ụmụnna anyị ozi na-abụghị eziokwu. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị maghị ma ọ̀ bụ eziokwu, ezipụla ya.

8. Olee ihe ndị na-emegide anyị ná mba ụfọdụ merela, oleekwa otú anyị nwere ike isi nyere ha aka n’amaghị ama?

8 E nwere nsogbu ọzọ dị n’izigara ndị ọzọ ozi anyị nwetara ozugbo. E nwere obodo ndị a machiri anyị iwu ime ihe ụfọdụ, nweekwa ndị nke machiri anyị iwu kpamkpam. N’obodo ndị ahụ, ndị na-emegide  anyị nwere ike ịma ụma gbasaa akụkọ nwere ike ime ka ụjọ tụwa anyị ma ọ bụkwanụ mee ka anyị ghara ịtụkwasị ibe anyị obi. Chegodị ihe mere n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn. Ndị uwe ojii nzuzo kwuru na ọtụtụ ụmụnna a ma ama na-agbazi ndị ohu Jehova mgba okpuru. * Ọ dị mwute na ọtụtụ ụmụnna kweere n’akụkọ ahụ, ya emee ka ha pụọ n’ọgbakọ. Ọtụtụ n’ime ha mechara lọghachi, ma ụfọdụ alọghachighị. Akụkọ ahụ mere ka okwukwe ha kpuo ka ụgbọ. (1 Tim. 1:19) Olee otú anyị nwere ike isi zere ụdị ihe a? Anyị ekwesịghị izigara ndị ọzọ ozi na-adịghị mma ma ọ bụ ndị anyị na-amaghị ma hà bụ eziokwu. Anyị ekwesịghịkwa ikwere ihe ọ bụla anyị nụrụ, kama anyị kwesịrị ịchọpụta nke bụ́ eziokwu.

IHE NDỊ A NA-AMACHAGHỊ OTÚ HA SI MEE

9. Olee ihe ọzọ na-eme ka o siere anyị ike ịmata akụkọ ndị bụ́ eziokwu?

9 Mgbe ụfọdụ, anyị na-anụ akụkọ ndị na-abụchaghị eziokwu. E nwekwara ndị nke a na-anaghị ekwucha ihe niile merenụ. Nke a na-emekwa ka o siere anyị ike ịchọpụta nke bụ́ eziokwu. Akụkọ na-abụchaghị eziokwu nwere ike iduhie mmadụ. Olee ihe anyị ga-eme ka a ghara iji ụdị akụkọ ndị ahụ duhie anyị?—Efe. 4:14.

10. Gịnị mere o ji fọ obere ka ụmụ Izrel gaa buso ụmụnne ha agha, gịnịkwa mere na ha emeghị ya?

10 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe mere ụmụ Izrel bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan n’oge Jọshụa. (Jọsh. 22:9-34) Ha nụrụ na ụmụ Izrel ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan (ya bụ, ebo Ruben na Gad nakwa ọkara ebo Manase) arụọla nnukwu ebe ịchụàjà n’akụkụ Jọdan. Ihe ụfọdụ a kọrọ n’akụkọ ahụ bụ eziokwu. Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ amachaghị ihe niile merenụ, ha kwuru na ụmụnne ha ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ enupụrụla Jehova isi. N’ihi ya, ha zukọtara ka ha gaa buso ụmụnne ha ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ agha. (Gụọ Jọshụa 22:9-12.) Ma tupu ha emee ihe ọ bụla, ha bu ụzọ zipụ ụfọdụ ndị ka ha gaa sie imi n’ala chọpụta nke bụ́ eziokwu. Gịnị ka ha chọpụtara? Ha chọpụtara na  ụmụ Izrel ndị si n’ebo Ruben na Gad nakwa ọkara ebo Manase rụrụ ebe ịchụàjà n’eziokwu, ma ọ bụghị ka ha nọrọ na ya na-achụ àjà, kama ka ọ bụrụ ihe àmà. Ihe mere ha ji rụọ ya bụ ka ụmụ niile ha ga-amụta n’ọdịnihu mara na ha na-efe Jehova. Chegodị otú obi si tọọ ụmụ Izrel ụtọ na ha asụghị ụmụnne ha akwụ n’ihi ihe na-abụchaghị eziokwu ha nụrụ, kama na ha bu ụzọ jụọ ase ka ha mata nke bụ́ eziokwu.

11. (a) Olee ihe mere Devid ji mee Mefiboshet ihe na-adịghị mma? (b) Olee ihe Devid gaara eme?

11 E nwekwara mgbe obi nwere ike ịjọ anyị njọ n’ihi na ndị mmadụ kwuru ihe na-abụchaghị eziokwu banyere anyị. Chegodị gbasara Eze Devid na Mefiboshet. Devid meere Mefiboshet ihe ọma ma nye ya ala niile bụ́ nke Sọl nna nna ya. (2 Sam. 9:6, 7) Ma ka oge na-aga, Devid nụrụ ihe na-abụghị eziokwu e kwuru gbasara Mefiboshet. Devid napụrụ ya ala niile ahụ n’ebughị ụzọ mata nke bụ́ eziokwu. (2 Sam. 16:1-4) Mgbe ya na Devid mechara kparịta nkata, ọ chọpụtara na ya mere ihe na-adịghị mma ma nyeghachi ya ụfọdụ ala ahụ. (2 Sam. 19:24-29) A sị na Devid bu ụzọ chọpụta nke bụ́ eziokwu, ọ garaghị eme ngwa ngwa nara Mefiboshet ala ndị ahụ.

12, 13. (a) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị mmadụ kwuru ihe na-abụghị eziokwu banyere ya? (b) Olee ihe anyị nwere ike ime ma mmadụ ghagide anyị ụgha?

12 Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ kọsaa ihe na-abụghị eziokwu banyere gị? Ụdị ihe a mere Jizọs na Jọn Onye Na-eme Baptizim. (Gụọ Matiu 11:18, 19.) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị mmadụ kwuru ihe na-abụghị eziokwu banyere ya? O jighị oge ya na ike ya niile zọwa isi ya. Kama, ọ gwara ndị mmadụ ka ha jiri anya ha hụ nke bụ́ eziokwu. Ọ chọrọ ka uche ha dịrị n’ihe ndị ọ na-eme na n’ihe ndị ọ na-akụzi. Jizọs sịrị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.”—Mat. 11:19.

13 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe Jizọs mere. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ nwere ike ikwu okwu ọjọọ gbasara anyị. Anyị nwere ike chọọ ime ihe ka ndị mmadụ ghara ịna-ele anyị anya ọjọọ. Ma, e nwere ihe anyị nwere ike ime. Ọ bụrụ na mmadụ ghagidere anyị ụgha, anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ga-eme ka ndị mmadụ ghara ikwere n’ụgha ahụ. Ihe anyị mụtara n’aka Jizọs gosiri na ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ka ezigbo Ndị Kraịst, ndị mmadụ ga-amara na ebubo ndị mmadụ na-ebo anyị na ihe ndị na-abụchaghị eziokwu a na-ekwu gbasara anyị bụ ụgha.

Ị̀ TỤKWASỊRỊ ONWE GỊ OBI GABIGA ÓKÈ?

14, 15. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụkwasị onwe anyị obi gabiga ókè?

14 Anyị ahụla na o nwere ike isiri anyị ike ịmata ihe niile merenụ. Ihe ọzọ nwekwara ike ịbụ nsogbu anyị bụ ezughị okè. Ọ bụrụkwanụ na anyị efeela Jehova ọtụtụ afọ? O nwere ike ịbụ na anyị na-eche echiche nke ọma, na-aghọtakwa ihe nke ọma. Ndị ọzọ nwekwara ike na-akwanyere anyị ùgwù n’ihi na anyị na-eche echiche nke ọma. Ma, ihe a ò nwere ike ịghọrọ anyị nsogbu?

15 Ee, o nwere ike ịghọrọ anyị nsogbu ma ọ bụrụ na anyị ana-atụkwasị onwe anyị obi gabiga ókè. Otú obi dị anyị na otú anyị chọrọ ka ihe dịrị nwere ike ịkpa otú anyị si eche echiche aka. O nwere ike ime ka anyị chewe na anyị nwere ike ịghọta ihe merenụ a sịgodị na anyị amaghị ihe niile merenụ. Nke a jọgburu onwe ya. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị n’ụzọ doro anya ka anyị ghara ịdabere ná nghọta anyị.—Ilu 3:5, 6; 28:26.

16. N’ihe atụ a, olee ihe mere n’ebe a na-eri nri? Olee ihe Tom chere?

 16 Ihe atụ a na-egosi otú o nwere ike isi eme: Ka e were ya na n’otu mgbede, otu okenye ma nke a na-akọ aha ya bụ Tom gara n’ebe a na-eri nri hụ okenye ọzọ aha ya bụ John ka ya na otu nwaanyị na-abụghị nwunye ya nọ ọdụ. O yiri ka ha na-ekpori ndụ. Tom hụrụ ha ka ha na-achị ma na-amakụ ibe ha. Ihe a nyere Tom ezigbo nsogbu n’obi, ya ana-eche, sị: ‘John na nwunye ya hà ga-agba alụkwaghịm? Gịnị ka nwunye John ga-eme? Oleekwanụ maka ụmụ ha?’ Tom ahụkwala ebe ụdị ihe a mere. Olee otú obi ga-adị gị ma a sị na ị bụ Tom?

17. N’ihe atụ a, olee ihe Tom mechara chọpụta? Olee ihe ihe a na-akụziri anyị?

17 Ma chetụgodị. Ọ bụ eziokwu na Tom chere n’obi ya na John na-agba n’èzí, ọ̀ ma ihe niile merenụ? Ná mgbede ahụ, Tom kpọrọ John n’ekwentị. Chegodị otú obi si ruo Tom ala mgbe ọ matara na nwaanyị ahụ bụ nwanne afọ John si ebe dị anya bịa ileta ya. Ha abụọ ahụbeghị ibe ha kemgbe ọtụtụ afọ. Ebe nwanne ya a ga-alakwa ụbọchị ahụ, ya na John so gaa ebe ahụ a na-eri nri ka ha rie nri. Nwunye ya enwelighị ike iso ha. Ọ dị mma na Tom akọrọghị ndị ọzọ ihe ahụ o cheburu. Olee ihe anyị na-amụta n’akụkọ a? N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị ka kwesịrị ibu ụzọ chọpụta ihe niile merenụ tupu anyị amata nke bụ́ eziokwu.

18. Olee ihe nwere ike ime ka anyị kweta ihe na-abụghị eziokwu e kwuru gbasara nwanna anyị?

18 Ihe ọzọ mere o nwere ike iji siere anyị ike ma anyị chọọ ịmata otú ihe si mee nwere ike ịbụ mgbe anyị na nwanna anyị na ya nọ n’ọgbakọ nwere nghọtahie. Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere nghọtahie ahụ, ọ ga-eme ka anyị nyowe nwanna ahụ enyowe. O nweziri ike ime ka anyị kwere ihe na-adịghị mma e kwuru gbasara ya. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe a? Iburu nwanna anyị iwe n’obi nwere ike ime ka anyị kweta ihe na-abụghị eziokwu e kwuru gbasara ya. (1 Tim. 6:4, 5) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ wepụ iwe na anyaụfụ n’obi anyị. Kama ibuwere ụmụnna anyị iwe n’obi ma ọ bụ nwewere ha anyaụfụ, ka anyị cheta na anyị kwesịrị ịhụ ha n’anya ma jiri obi anyị gbaghara ha.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:12-14.

ỤKPỤRỤ BAỊBỤL GA-ECHEBE ANYỊ

19, 20. (a) Olee ụkpụrụ Baịbụl ga-enyere anyị aka ịchọpụta ma akụkọ ndị anyị nụrụ hà bụ eziokwu? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Taa, ọ na-esi ezigbo ike ịmata gbasara ihe merenụ na ịchọpụta nke bụ́ eziokwu. Ihe na-akpata ya bụ na akụkọ ndị na-abụchaghị eziokwu juru ebe niile. Ihe ọzọ abụrụ na anyị ezughị okè. Gịnị ga-enyere anyị aka? Ọ bụ ịmara ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl ma na-eme ha eme. Otu n’ime ha bụ na ọ bụụrụ mmadụ nzuzu na mmechuihu ịzaghachị okwu tupu ya anụ ya. (Ilu 18:13) Ụkpụrụ ọzọ dị na Baịbụl na-echetara anyị ka anyị ghara ikwere okwu niile n’achọpụtaghị ma hà bụ eziokwu. (Ilu 14:15) N’ikpeazụ, n’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara idabere ná nghọta anyị. (Ilu 3:5, 6) Ụkpụrụ Baịbụl ga-abara anyị uru ma anyị chọpụta otú ihe niile si mee ma jiri ha mee mkpebi ndị dị mma.

20 Ma, a ka nwere ihe ọzọ nwere ike ime ka o siere anyị ike ịmata otú ihe niile si mee. Ebe anyị bụ mmadụ, anyị na-ejikarị ihe anyị na-ahụ anya ekpebi ihe ozugbo. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ihe ndị nwere ike ime ka anyị mee ụdị ihe a, nakwa ihe ndị ga-enyere anyị aka ịgbara ha ọsọ.

^ para. 8 Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 2004, peeji nke 111-112, nakwa nke afọ 2008, peeji nke 133-135. Ha dị na Bekee.