Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Soro Jehova Na-arụ Ọrụ Kwa Ụbọchị

Soro Jehova Na-arụ Ọrụ Kwa Ụbọchị

“Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.”—1 KỌR. 3:9.

ABỤ: 64, 111

1. Olee ụzọ dị iche iche anyị na Jehova nwere ike isi na-arụkọ ọrụ?

MGBE Jehova kechara ụmụ mmadụ, ọ chọrọ ka ha na ya na-arụkọ ọrụ iji mezuo ihe bụ́ nzube ya. N’agbanyeghị na ụmụ mmadụ ezughị okè, ndị na-efe Jehova na Jehova ka nwekwara ike ịrụkọ ọrụ kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, anyị na “Chineke na-arụkọ ọrụ” ma anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ya ma na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (1 Kọr. 3:5-9) Chegodị ụdị ùgwù Onye kere eluigwe na ụwa, bụrụkwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, kwanyeere anyị ma họrọ anyị ịrụ ọrụ o weere ka ọrụ dị ezigbo mkpa. Ma, ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs abụghị naanị ụzọ anyị na Jehova si na-arụkọ ọrụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ ndị ọzọ anyị nwere ike isi eme ya. Ha bụ inyere ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna anyị aka, ile ndị ọzọ ọbịa, iwepụta onwe anyị na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, na ijekwuru Jehova ozi.—Kọl. 3:23.

2. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji ihe anyị nwere ike imere Jehova tụnyere ihe ndị ọzọ nwere ike ime?

2 Mgbe anyị na-atụle isiokwu a, ejila ihe i nwere ike imere Jehova tụnyere ihe ndị ọzọ nwere ike ime. Cheta na afọ ndụ anyị, ahụ́ ike anyị, ọnọdụ anyị, na ihe ndị anyị nwere ike imeli abụghị otu. Pọl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya,  mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”—Gal. 6:4.

NA-ENYERE EZINỤLỌ GỊ NA ỤMỤNNA GỊ AKA

3. Gịnị mere e nwere ike iji ekwu na onye na-elekọta ezinụlọ ya so Chineke na-arụ ọrụ?

3 Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-elekọta ndị ezinụlọ ha. Dị ka ihe atụ, i nwere ike na-arụ ọrụ iji nweta ego ị ga-eji na-akpa afọ ezinụlọ gị. Ọtụtụ ndị nne na-anọ n’ụlọ na-elekọta ụmụaka ha. Ụfọdụ ụmụ ndị torola eto nwere ike ịna-elekọta ndị nne na nna ha na-enwezighị ike ilekọta onwe ha. Ọrụ ndị a bara ezigbo uru. Okwu Chineke kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Tim. 5:8) Ọ bụrụ na ị na-arụ ụdị ọrụ ndị a, o nwere ike isiri gị ike iwepụta oge jekwuoro Jehova ozi otú ị gaara achọ ijere ya. Ma, nwee obi ike. Obi na-atọ Jehova ụtọ ma ị na-akpa afọ ezinụlọ gị.—1 Kọr. 10:31.

4. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke? Olee uru ọ na-abara ha?

4 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na Jehova na-arụkọ ọrụ mgbe ha na-enyere ụmụ ha aka ka ha kpebie ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova. Ọtụtụ ndị nne na nna emeela otú ahụ. Nke a emeela ka ụmụ ha mechaa kpebie ije ozi oge niile n’ebe dị anya. Ụfọdụ bụ ndị ozi ala ọzọ, ndị ọzọ abụrụ ndị ọsụ ụzọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. E nwekwara ndị nke na-eje ozi na Betel. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ụmụ anọrọ ebe dị anya na-eje ozi, ha na ndị mụrụ ha agaghị na-anọrị otú ha si chọọ. Ma, ndị nne na nna ndị na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru na-agba ụmụ ha ume ịnọgide na-eje ozi ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi na-atọ ha ụtọ na ụmụ ha bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (3 Jọn 4) Ọ na-adị ọtụtụ ndị nne na nna otú ahụ ọ dị Hana, bụ́ onye kwuru na ya ‘gbazinyere’ Samuel nwa ya Jehova. Ha weere ya na ihe a ha mere bụ ùgwù Jehova kwanyeere ha.—1 Sam. 1:28.

5. Olee otú ị ga-esi enyere ụmụnna gị na ha nọ n’ọgbakọ aka? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Ọ bụrụ na i nweghị ibu ezinụlọ gị na ya na-alụ, ì nwere ike inyere ụmụnna ndị ahụ́ na-adịghị na ndị merela agadi aka, ma ọ bụ nyere ndị nwere mkpa ndị ọzọ aka? Ì nwekwara ike inyere ndị na-elekọta ha aka? Legharịa anya n’ọgbakọ unu ka ị chọpụta ndị e kwesịrị inyere aka. Dị ka ihe atụ, e nwere ike nwee nwanna nwaanyị na-elekọta nne na nna ya merela agadi. Ì nwere ike iwepụta oge ka gị na nne na nna ya ahụ nọrịa ka o nwee ike ime ihe ndị ọzọ? I nwekwara ike inye aka kpọrọ ụmụnna ndị chọrọ enyemaka gaa ọmụmụ ihe, ahịa, jeere ha ozi, ma ọ bụ kpọrọ ha gaa leta onye nọ n’ụlọ ọgwụ. Mgbe ị na-eme ihe ndị a, o nwere ike ịbụ na gị na Jehova na-arụkọ ọrụ ịza mmadụ ekpere.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:24.

NA-ELE ỌBỊA

6. Olee otú anyị ga-esi na-ele ọbịa?

6 Ihe e ji mara ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ bụ ile ọbịa. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, okwu a sụgharịrị “ile ọbịa” pụtara “imere ndị anyị na-amaghị ihe ọma.” (Hib. 13:2) E nwere ihe atụ ndị dị n’Okwu Chineke kụziiri anyị otú anyị nwere ike isi na-ele ọbịa. (Jen. 18:1-5) Anyị kwesịrị ịna-enyere ndị ọzọ aka mgbe ọ bụla, ma hà bụ “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe” ma ọ bụ na hà abụghị.—Gal. 6:10.

7. Olee uru ọ ga-abara gị ma ị na-ele ndị ozi oge niile ọbịa?

 7 Ì nwere ike ile ndị ozi oge niile ọbịa ma si otú ahụ mee ka gị na Chineke na-arụkọ ọrụ? (Gụọ 3 Jọn 5, 8.) Oge ahụ bụ oge anyị na-eji ‘agbarịta ibe anyị ume.’ (Rom 1:11, 12) Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Olaf. Mgbe ọ na-eto eto, otu onye nlekọta sekit na-alụbeghị nwaanyị bịara ileta ọgbakọ ha, ma ụmụnna enweghị ebe ọ ga-anọ. Olaf jụrụ nne na nna ya na-abụghị Ndịàmà Jehova ma hà ga-ekwe ka onye nlekọta sekit bịa nọrọ n’ụlọ ha. Ha kwetara ma gwa Olaf na ọ ga na-ehi n’oche kushọn. Olaf mere otú ahụ, ọ kwaghịkwa mmakwaara. O kwuru, sị: “Izu ahụ tọgburu m atọgbu. Mụ na onye nlekọta sekit na-ebili n’isi ụtụtụ ọ bụla ma kwurịta ọtụtụ isiokwu na-atọ anyị ụtọ mgbe anyị na-eri nri ụtụtụ. Ume onye nlekọta sekit gbara m mere ka m banye n’ozi oge niile.” Kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ ugbu a, Olaf ejeela ozi ala ọzọ n’ọtụtụ mba.

8. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-emere ndị ọzọ ihe ọma ọ bụrụgodị na obi adịghị ha ụtọ maka ya? Nye ihe atụ.

8 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gosi ndị anyị na-amaghị ndị ha bụ na anyị hụrụ ha n’anya ọ bụrụgodị na ha ejighị ihe anyị meere ha kpọrọ ihe ná mmalite. Mgbe otu nwanna nwaanyị bi na Spen nọ na-amụrụ otu nwaanyị si Ekwedọ aha ya bụ Yesica Baịbụl, ọ chọpụtara na Yesica nọ na-ebe ákwá. Ọ jụrụ ya ihe mere o ji na-ebe ákwá. Yesica gwara ya na tupu ya abịa Spen na ọ dara ezigbo ogbenye nke na otu ụbọchị na ya enweghị ihe ya ga-eri. Naanị ihe o nwere ike inye nwa ya nwaanyị bụ mmiri. Ka Yesica nọ na-ekpe ekpere maka enyemaka, ọ gbalịrị ime ka nwa ya hie ụra. Ọ dịghị anya, ụmụnna nwaanyị abụọ abịa na nke ya ma nye ya magazin. Ma, ọ gwara ha okwu ọjọọ, dọkasịa magazin ahụ. Ọ jụrụ ha, sị: “Ihe a ọ̀ bụ nri unu ga-enye mụ na nwa m?” Ụmụnna nwaanyị ndị ahụ gbalịrị ịkasi ya obi, ma mgbalị ha kụrụ afọ n’ala. Ha mechara bịa dosa nkata nri n’ọnụ ụzọ Yesica. Ihe a ha mere metụrụ ya n’ahụ́. O wutekwara ya mgbe o chetara na ya egeghị Chineke ntị mgbe ọ zara ekpere ya. Ma ugbu a, o kpebisiela ike ife Jehova. O doro anya na ihe ọma a ụmụnna nwaanyị a mere bara ezigbo uru.—Ekli. 11:1, 6.

NA-EWEPỤTA ONWE GỊ ARỤ ỤLỌ NDỊ A NA-ARỤ NÁ NZUKỌ JEHOVA

9, 10. (a) Olee oge ụfọdụ ndị Izrel wepụtara onwe ha rụọ ọrụ? (b) Olee ụzọ ụmụnna nwoke nwere ike isi enye aka n’ọgbakọ taa?

9 N’oge gara aga, ndị Izrel nwere ọtụtụ ụzọ ha si wepụta onwe ha rụọ ọrụ. (Ọpụ. 36:2; 1 Ihe 29:5; Nehe. 11:2) Taa, e nwekwara ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi jiri oge gị, ihe ndị i nwere, na nkà gị nyere ụmụnna gị aka. Obi ga na-atọ gị ụtọ, Jehova ga-agọzikwa gị mmaji kwuru mmaji.

10 Okwu Chineke gwara ụmụnna nwoke ka ha gbalịa ruo eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ma si otú ahụ mee ka ha na Jehova na-arụkọ ọrụ. (1 Tim. 3:1, 8, 9; 1 Pita 5:2, 3) Ndị na-eme otú a na-achọ igboro ndị mmadụ mkpa ha, nyekwara ha aka n’ihe ndị gbasara ofufe Chineke. (Ọrụ 6:1-4) Ndị okenye hà agwatụla gị ka ị bụrụ onye atendantị ma ọ bụ na-enye aka elekọta akwụkwọ, ókèala, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ? Ụmụnna ndị na-arụ ọrụ ndị a ga-agwa gị na obi na-atọ ha ezigbo ụtọ inyere ndị ọzọ aka.

Mmadụ iwepụta onwe ya na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova na-eme ka o nweta ndị enyi ọhụrụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee uru otu nwanna nwaanyị riterela n’ihi ndị enyi o metara mgbe ha na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova?

11 Ndị na-ewepụta onwe ha arụ ọrụ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova na-emetakarị  ndị enyi ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Margie so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo afọ iri na asatọ. N’afọ niile ahụ, o metere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-eto eto enyi ma kụziere ha ọrụ. O kwuru na ime ihe ndị a bụ ụzọ magburu onwe ya ha si na-agbarịta ibe ha ume. (Rom 1:12) Mgbe nwanna nwaanyị a nwere nsogbu, ndị enyi o metere mgbe ha na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze gbara ya ume. Ì wepụtatụla onwe gị rụọ ụdị ọrụ a? Ma ì nwere aka ọrụ ma ọ bụ na i nweghị, ì nwere ike iwepụta onwe gị?

12. Olee otú i nwere ike isi enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka?

12 Mgbe e nwere ọdachi, ndị ohu Chineke na-eji ohere ahụ enyere ụmụnna ha aka ma si otú ahụ na-eme ka ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ha na-enye ego iji nyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. (Jọn 13:34, 35; Ọrụ 11:27-30) Ụzọ ọzọ bụ inye aka na-ehicha ma ọ bụ na-emezigharị ụlọ ndị ọdachi mebiri. Obi tọrọ otu nwanna nwaanyị onye Poland aha ya bụ Gabriela ụtọ mgbe ụmụnna ndị si n’ọgbakọ dị nso bịara inyere ya aka mgbe ọdachi mebiri ụlọ ya. Mgbe o chetara ihe ahụ mere ya, o kwuru na ya achọghị ichegbu onwe ya banyere ihe ndị funahụrụ ya, kama na ya na-elekwasị anya n’uru o ritere. O kwuru, sị: “Ihe a mere m emeela ka obi sie m ike na ịnọ ná nzukọ Jehova bụ ihe ùgwù pụrụ iche na ihe na-eme obi ụtọ.” Ọtụtụ ụmụnna ndị e nyeere aka mgbe ọdachi mebichara ihe ha na-ekwukwa otu ihe ahụ. Ndị ha na Jehova na-arụkọkwa ọrụ inyere ụmụnna ha aka na-enwe ezigbo obi ụtọ.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:35; 2 Ndị Kọrịnt 9:6, 7.

13. Olee otú iwepụta onwe anyị si eme ka anyị hụkwuo Jehova n’anya? Nye ihe atụ.

13 Obi tọrọ Nwanna Nwaanyị Stephanie na ụmụnna ndị ọzọ ụtọ na ha so Chineke na-arụkọ ọrụ n’inyere ndị gbatara ọsọ ndụ n’Amerịka aka n’ihi agha a na-alụ n’obodo ha. Ha nyeere ụmụnna ndị a aka inweta ụlọ na oche. Stephanie kwuru, sị: “Obi ụtọ ha nwere mgbe ụmụnna n’ụwa niile gbataara ha ọsọ enyemaka mekwara ka obi na-atọ anyị ụtọ. Ụmụnna ndị a chere na anyị nyeere ha aka, ma nke bụ́ eziokwu bụ na hanwa nyeere anyị  ezigbo aka.” O kwukwara, sị: “Anyị ji anya anyị hụ otú ụmụnna si hụ ibe ha n’anya, nwee okwukwe, ma tụkwasị Jehova obi. Nke a emeekwala ka anyị hụkwuo Jehova n’anya, meekwa ka obi na-atọkwu anyị ụtọ maka ihe niile nzukọ Jehova na-emere anyị.”

NA-EJEKWURU JEHOVA OZI

14, 15. (a) Olee àgwà Aịzaya onye amụma kpara? (b) Olee otú ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze nwere ike isi na-eṅomi ya taa?

14 Ị̀ ga-achọ ka gị na Jehova na-arụkọkwu ọrụ? Ị̀ ga-achọ ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ma jeere ya ozi? Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị ohu Chineke ekwesịghị ịsị na ha ga-akwaga n’ebe dị ezigbo anya tupu ha enwee ike ijere ya ozi. Ma, e nwere ụfọdụ ụmụnna nwere ike ime otú ahụ. Ha na-akpa àgwà ka Aịzaya onye amụma. Mgbe Jehova jụrụ “Ònye ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” Ọ gwara Jehova, sị: “Lee m! Ziga m.” (Aịza. 6:8) Ì dị njikere iwepụta onwe gị otú ahụ nye aka ná nzukọ Jehova? Olee ụzọ ụfọdụ i nwere ike isi eme ya?

15 Jizọs kwuru gbasara ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:37, 38) Ì nwere ike ịsụ ụzọ n’ebe achọkwuru ndị nkwusa? Ma ọ bụ, ì nwere ike inyere onye ọzọ aka ime otú ahụ? Ọtụtụ ụmụnna chere na ụzọ kacha mma ha ga-esi egosi na ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya bụ ịga sụọ ụzọ n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Ì nwere ike icheta ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi? I mee otú ahụ, ị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ.

16, 17. Olee ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?

16 Ị̀ ga-achọ ije ozi na Betel ma ọ bụ nye aka rụọ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova? Ị̀ ga-achọ iji nwa oge ma ọ bụ jiri otu ụbọchị ma ọ bụ karịa na-arụ ọrụ kwa izu na Betel ma ọ bụ nye aka rụọ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova? Nzukọ Jehova na-achọ ndị ga-ejere Jehova ozi ebe ọ bụla e zigara ha, nakwa ndị ga-arụ ọrụ ọ bụla e nyere ha rụọ. Nke a nwere ike ịpụta na ha ga-arụ ọrụ n’ebe a chọrọ ka ha rụọ ọrụ n’agbanyeghị na ha nwere ọrụ ọzọ ha ma arụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ ewepụta onwe ya na-arụ ọrụ n’ebe ọ bụla a chọrọ ka ọ rụọ ọrụ, Jehova anaghị eji onye ahụ eti epele.—Ọma 110:3.

17 Ị̀ ga-achọ ka e nyekwuo gị ọzụzụ ka i nwee ike ijekwuru Jehova ozi? Ọ bụrụ na ị chọrọ, i nwere ike dejupụta akwụkwọ ka ị gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ụlọ akwụkwọ a na-azụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe nọ n’ozi oge niile ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ndị chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ a kwesịrị ịdị njikere ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere ha ma ha gụchaa akwụkwọ. Ị̀ ga-achọ isi otú a jekwuoro Jehova ozi?—1 Kọr. 9:23.

18. Olee uru ọ ga-abara gị ma gị na Jehova na-arụkọ ọrụ kwa ụbọchị?

18 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị na-emesapụrụ ndị ọzọ aka, na-emere ha ihe ọma, na-emere ha ebere, ma na-ahụ ha n’anya. Ihe gbasara ndị ọzọ na-echukwa anyị ụra kwa ụbọchị. Anyị mee otú a, anyị ga na-enwe obi ụtọ na udo. (Gal. 5:22, 23) N’agbanyeghị otú ihe si dịrị gị, i nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ị na-emesapụ aka ka Jehova, gị na ya anọgidekwa na-arụkọ ọrụ.—Ilu 3:9, 10.