Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Otú E Si Kụọ Mkpụrụ Alaeze Mbụ na Pọtugal

Otú E Si Kụọ Mkpụrụ Alaeze Mbụ na Pọtugal

MGBE Nwanna George Young nọ n’ụgbọ mmiri na-aga Yurop n’agbanyeghị aka ọjọọ oké ifufe Atlantik nọ na-akpa ụgbọ ha, obi nọ na-atọ ya ụtọ ka ọ na-eche gbasara mkpụrụ Alaeze ọ ghara na Brazil. * Ma ka ha nọ na-aga, ọ malitere iche gbasara ọrụ ọhụrụ e nyere ya, ya bụ, ịga kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe a na-ekwusatụbeghị ozi ọma na Spen nakwa na Pọtugal. Ozugbo o rutere, ọ chọrọ ịhazi otú ọ ga-esi enyefe narị puku traktị atọ, haziekwa ka Nwanna J. F. Rutherford bịa kwuo okwu ihu ọha n’ebe ahụ.

Nwanna Young ji ụgbọ mmiri gaa ebe dị iche iche kwusaa ozi ọma

Ozugbo Nwanna Young rutere Lisbọn n’afọ 1925, ọ chọpụtara na e nwere ọgba aghara n’obodo a. Mgbanwe e mere n’ọchịchị n’afọ 1910 mere ka ndị eze kwụsị ịchị Pọtugal, meekwa ka ndị Chọọchị Katọlik gharakwa ịbụ ndị ọnụ na-eru n’okwu. Ndị mmadụ bịara nwerekwuo onwe ha, ma ọgba aghara ka na-aga n’ihu ebe niile na Pọtugal.

Mgbe Nwanna Young haziri ka Nwanna Rutherford bịa kwuo okwu ihu ọha, ndị ọchịchị nyere iwu kpụ ọkụ n’ọnụ n’ihi na e nwere ndị kpara nkata ịkwatu ọchịchị. Odeakwụkwọ nke otu òtù na-asụgharị Baịbụl gwara Nwanna Young na a ga-emesi ya ike. Ma, Nwanna Young rịọrọ ka e nye ya ụlọ a na-anọ emega ahụ́ n’otu ụlọ akwụkwọ sekọndrị ka a nọrọ na ya kwuo okwu ihu ọha ahụ, e nye ya.

Ụbọchị Nwanna Rutherford ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ eruola, ya bụ, n’abalị iri na atọ n’ọnwa Mee. Ndị mmadụ nọ na-atụsi anya ụbọchị ahụ ike. A kpọsara ya n’akwụkwọ akụkọ, dee ya n’obodobo akwụkwọ ma mapawa ya n’ụlọ dị iche iche. Isiokwu okwu ihu ọha ahụ bụ “Otú Ị Ga-esi Adị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa.” Ndị okpukpe na-emegide anyị mere ngwa ngwa dee otu isiokwu n’akwụkwọ akụkọ ha iji dọọ ndị na-agụ ya aka ná ntị maka “ndị amụma ụgha” ọhụrụ bịaranụ. Ha nọkwa n’ọnụ ụzọ e si abata n’ebe ahụ a nọ na-ekwu okwu ihu ọha ahụ nyefee ndị mmadụ ọtụtụ puku broshọ ndị na-ekwu ihe ndị megidere ihe ndị ahụ Nwanna Rutherford na-akụzi.

N’agbanyeghị ihe niile ha mere, ihe dị ka puku mmadụ abụọ juru n’ebe ahụ, ebe ihe dị ka puku mmadụ abụọ enweghị ike ịbata n’ihi na e nweghị ebe ha ga-anọ. Ụfọdụ ndị ọ na-agụsi agụụ ike ịnụ okwu ihu ọha ahụ rigooro n’ubube dị n’akụkụ ebe ahụ, ndị ọzọ arịgoro n’elu ihe ndị ahụ e ji emega ahụ́.

Ihe niile agachaghị siriri werere. Ndị na-emegide anyị nọ na-eti mkpu, na-emebisi oche. Ma, Nwanna Rutherford atụghị ụjọ ọ bụla, o ji nwayọọ rigoro n’elu tebụl ka ndị mmadụ nwee ike ịna-anụ ihe ọ na-ekwu. Mgbe o kwuchara n’ihe fọrọ obere ka o ruo elekere iri na abụọ nke ime abalị, ihe karịrị otu puku na narị mmadụ abụọ nyere aha ha na adres ha a ga-eji na-ezitere ha akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. N’echi ya, otu akwụkwọ akụkọ a na-akpọ O Século  kọrọ gbasara okwu ihu ọha ahụ Nwanna Rutherford kwuru.

N’ihe dị ka n’ọnwa Septemba afọ 1925, a malitere ibipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Pọtugiiz n’obodo Pọtugal. Tupu mgbe ahụ, a malitela ibipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Pọtugiiz n’obodo Brazil. Ọ bụ n’oge ahụ ka Nwanna Virgílio Ferguson, bụ́ Onye Mmụta Baịbụl na Brazil chọrọ ịkwaga Pọtugal ka o nye aka ikwusa ozi ọma Alaeze. Ya na Nwanna Young rụburu ọrụ n’obere alaka ụlọ ọrụ nke Ndị Mmụta Baịbụl dị na Brazil. Ọ dịghị anya, Nwanna Virgílio na nwunye ya Lizzie akwaga na Pọtugal ka ya na Nwanna Young rụwakwa ọrụ. Nwanna Ferguson bịara n’oge kwesịrị ekwesị n’ihi na ọ gaghị adị anya Nwanna Young agaa ebe ndị ọzọ ikwusa ozi ọma, ma na Sọviet Yuniọn.

Akwụkwọ e ji nye Nwanna Virgílio Ferguson na nwunye ya Lizzie ikike ibi na Pọtugal n’afọ 1928

Mgbe ndị amị malitere ọchịchị aka ike na Pọtugal, mmegide kpụụrụ ọkụ n’ọnụ. Nwanna Ferguson katara obi nọrọ, ma mee ka okwukwe Ndị Mmụta Baịbụl ahụ sie ike, meekwa ka ha kata obi na-ezi ozi ọma. Ọ rịọrọ ka e kwe ka a na-eji ụlọ ya na-enwe ọmụmụ ihe. Ha mechara kweta n’ọnwa Ọktoba afọ 1927.

N’afọ mbụ ndị amị malitere ọchịchị na Pọtugal, ihe dị ka narị mmadụ anọ na iri ise tụrụ ọda Ụlọ Nche. E jikwa traktị na akwụkwọ nta dị iche iche mee ka eziokwu ruo ebe niile ndị Pọtugal na-achị. Ha bụ Angola, Azores, Goa, Ist Timọ, Kep Vad, Madera, na Mozambik.

N’afọ 1929, otu onye Pọtugal na-akọ ugbo kwatara na Lizbọn. Aha ya bụ Manuel da Silva Jordão. Mgbe o bi na Brazil, o gere okwu ihu ọha Nwanna Young kwuru. Ọ ghọtara eziokwu ahụ ma dị njikere inyere Nwanna Ferguson aka ime ka ọtụtụ ndị nụ ozi ọma na Pọtugal. Ka o nwee ike ime otú ahụ, Nwanna Manuel ghọrọ onye kọpọtụa. Ọ bụ ihe a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ n’oge ahụ. N’ihi otú e si na-ebipụta akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ma na-ekesa ha, ọgbakọ ọhụrụ a nọ na Lizbọn malitere ito.

N’afọ 1934, Nwanna Ferguson na nwunye ya laghachiri Brazil. Ma, tupu ha alaghachi, a kụọla eziokwu ahụ na Pọtugal. N’agbanyeghị ọgba aghara e nwere na Yurop n’oge ahụ a na-alụ agha na Spen, nakwa Agha Ụwa nke Abụọ, ụmụnna ndị ahụ nọ na Pọtugal nọgidere na-efe Jehova. Ruo oge ụfọdụ, ha dị ka icheku ọkụ. Ma n’afọ 1947, ha malitere inwu dị ka ọkụ mgbe e zitere onye ozi ala ọzọ mbụ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied aha ya bụ John Cooke n’obodo ahụ. Mgbe nke ahụ gachara, ndị nkwusa e nwere na Pọtugal bịara na-ebukwu ibu. Ma mgbe ndị ọchịchị machibidoro anyị iwu n’afọ 1962, ndị nkwusa nọkwa na-amụba. N’ọnwa Disemba afọ 1974, mgbe e debara aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ka okpukpe iwu kwadoro, e nwere ihe karịrị ndị nkwusa puku iri na atọ na Pọtugal.

Taa, ihe karịrị puku ndị nkwusa iri ise na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke na Pọtugal nakwa n’ọtụtụ agwaetiti ndị a na-asụ Pọtugiiz, ma na Azores na Madera. Ụfọdụ ndị nkwusa nọ n’obodo a ugbu a bụ ụmụ ndị ahụ gere okwu ihu ọha ahụ dere ude Nwanna Rutherford kwuru n’afọ 1925.

Anyị na-ekele Jehova nakwa ụmụnna ndị mbụ ahụ katara obi kwusaa ozi ọma dị ka ‘ndị ozi Kraịst Jizọs ndị na-ejere ọha mmadụ bụ́ ndị mba ọzọ ozi.’—Rom 15:15, 16.—Ihe si n’ebe anyị na-edebe ihe ochie na Pọtugal.

^ para. 3 Gụọ isiokwu bụ́ “A Ga-arụ Nnukwu Ọrụ Ka E Nwee Ike Ịkụziri Ndị Mmadụ Eziokwu Baịbụl.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Mee 15, 2014, peeji nke 31 ruo na nke 32.